Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 13

Ife Jehova Otú Ọ Chọrọ Ga-eme Ka Anyị Na-enwekwu Obi Ụtọ

Ife Jehova Otú Ọ Chọrọ Ga-eme Ka Anyị Na-enwekwu Obi Ụtọ

“Jehova Chineke anyị, onye dị ike, i ruru eru ka ndị niile too gị ma sọpụrụ gị.”​—MKPU. 4:11.

ABỤ NKE 31 Soro Chineke Na-eje Ije

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova nabata ofufe anyị?

 OLEE ihe na-agbata gị n’obi ma ị nụ okwu ahụ bụ́ “ofufe”? O nwere ike ịbụ na ihe gbatara gị n’obi bụ otu nwanna gburu ikpere n’ala na-ekpe ekpere tupu ya ehie ụra. O nwekwara ike ya abụrụ na i chetara otu ezinụlọ na-enwe ofufe ezinụlọ na-atọ ha ụtọ.

2 Ihe ndị ahụ ndị a anyị kwuru okwu ha na-eme so n’otú e si efe Jehova. Ma, ì chere na Jehova ga-anabata ofufe ha? Ọ ga-anabata ya ma ọ bụrụ na ha na-efe ya otú ọ chọrọ, hụ ya n’anya ma na-asọpụrụ ya. Anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Anyị ma na o kwesịrị ka e fee ya ofufe. Anyị chọkwara ife ya otú ọ chọrọ.

3. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova nabatara ka e si na-efe ya n’oge ochie. Anyị ga-ekwukwa ihe asatọ anyị na-eme iji fee Jehova n’oge a. Ọ ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ịma ebe ọ ga-emekwu nke ọma n’otú o si na-efe Jehova. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe mere ife Jehova otú ọ chọrọ ga-eji eme anyị obi ụtọ.

OTÚ JEHOVA NABATARA KA E SI NA-EFE YA N’OGE OCHIE

4. Olee otú ndị fere Jehova tupu Jizọs abịa n’ụwa si gosi na ha hụrụ Jehova n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù?

4 Tupu oge Ndị Kraịst, ụmụ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ebel, Noa, Ebreham, na Job gosiri na ha hụrụ Jehova n’anya ma kwanyere ya ùgwù. Olee otú ha si mee ya? Ha rubeere Jehova isi, nwee okwukwe na ya, ma chụọkwara ya àjà. Baịbụl agwaghị anyị ihe niile ha mere iji fee Jehova. Ma, o doro anya na ha gbalịsiri ike sọpụrụ Jehova. Ọ nabatakwara ofufe ha. Jehova mechara si n’aka Mosis nye ndị Izrel Iwu. Iwu ahụ kwuru ụzọ dị iche iche Jehova chọrọ ka ha si na-efe ya.

5. Olee ihe gbanwere n’otú Jehova si chọọ ka e si na-efe ya mgbe Jizọs nwụchara, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ?

5 Mgbe Jizọs nwụchara, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, Jehova achọghịzi ka a na-efe ya otú ahụ e kwuru n’Iwu Mosis. (Rom 10:4) Ndị Kraịst ga-esowezi iwu ọhụrụ, ya bụ, “iwu Kraịst.” (Gal. 6:2) Iwu nke Kraịst a adịghị ka Iwu Mosis e depụtachara ihe ndị a ga-eme na ihe ndị a na-agaghị eme. Otú Ndị Kraịst si erube isi n’iwu a abụghị ibu ya n’isi, kama ọ bụ ịna-eme ka Jizọs ma na-eme ihe niile ọ kụziri. Taa, ọtụtụ Ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịna-eme ka Jizọs iji mee ihe dị Jehova mma nakwa iji ‘nweta ume.’​—Mat. 11:29.

6. Olee otú isiokwu a ga-esi baara anyị uru?

6 Ka anyị na-atụle nke ọ bụla n’ime ihe ndị anyị na-eme iji fee Jehova taa, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-eme nke ọma na ya?’ I nwekwara ike ịjụ onwe gị, sị, ‘M̀ nwere ike ime ka otú m si efe Jehova kakwuo mma?’ Obi kwesịrị ịtọ gị ụtọ ma ị hụ ebe ndị ị na-eme nke ọma. Ma, i kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị hụ ebe ndị ị ga-emekwu nke ọma.

OLEE IHE NDỊ ANYỊ NA-EME IJI FEE JEHOVA?

7. Olee otú Jehova si ewere ekpere anyị si n’ala ala obi kpee?

7 Anyị na-efe Jehova mgbe anyị na-ekpe ekpere. Baịbụl ji ekpere anyị si n’ala ala obi kpee tụnyere insens a mụnyere n’ụlọikwuu ma ọ bụ n’ụlọ nsọ. (Ọma 141:2) Insens ahụ na-esi ísì ọma na-atọ Jehova ụtọ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ekpere anyị si n’ala ala obi kpee si ‘eme ya obi ụtọ,’ ọ bụrụgodị na ọ bụ okwu ndị dị mfe ka anyị kwuru. (Ilu 15:8; Diut. 33:10) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji kweta na ọ na-atọ Jehova ụtọ nke ukwuu ịnụ ka anyị na-agwa ya na anyị hụrụ ya n’anya nakwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị. Ọ chọrọ ka anyị na-akọrọ ya ihe ndị bụ́ mkpa anyị, olileanya anyị, na ihe ndị na-amasị anyị n’ekpere. Tupu anyị ekpewe ekpere, anyị kwesịrị ibu ụzọ chebara ihe ndị anyị chọrọ ịgwa Jehova n’ekpere echiche. Anyị mee ya, ekpere anyị ga-adị ka insens na-esi ísì ọma anyị mụnyeere Nna anyị nke eluigwe.

8. Olee ohere magburu onwe ya anyị nwere iji too Jehova?

8 Anyị na-efe Jehova mgbe anyị na-eto ya. (Ọma 34:1) Anyị na-eto Jehova mgbe anyị na-akọrọ ndị ọzọ otú àgwà ọma ya na ọrụ ọma ya dị iche iche si amasị anyị. Anyị ga-enwe ọtụtụ ihe anyị ga-akọrọ ndị mmadụ ma ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma ndị ọ na-emere anyị. Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge chebara ihe ọma dị iche iche ndị Jehova meere anyị echiche, ọ ga-eme ka anyị na-enwe ihe ndị mere anyị ga-eji na-eto ya. Ozi ọma anyị na-ekwusa bụ ohere magburu onwe ya anyị ji ‘achụrụ Chineke àjà otuto mgbe niile, ya bụ, okwu ọnụ anyị.’ (Hib. 13:15) Otú ahụ anyị si eche echiche nke ọma tupu anyị agwawa Jehova okwu n’ekpere, ka anyị kwesịkwara ịkwadebe ihe anyị ga-agwa ndị mmadụ tupu anyị agaa izi ha ozi ọma. Anyị chọrọ ka “àjà otuto” anyị bụrụ nke kacha mma. N’ihi ya, anyị na-esi n’ala ala obi anyị agwa ndị mmadụ okwu mgbe anyị na-ezi ha ozi ọma.

9. Olee otú ịga ọmụmụ ihe na-esi abara anyị uru otú ọ baara ndị Izrel? Kọọ otú ịga ọmụmụ si baara gị uru.

9 Anyị na-efe Jehova ma anyị gaa ọmụmụ ihe. A gwara ụmụ Izrel oge ochie, sị: “Ugboro atọ n’afọ ka ụmụ nwoke unu niile ga-abịa n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe ọ ga-ahọrọ.” (Diut. 16:16) Ha ga-ahapụ ụlọ ha na ubi ha n’enweghị onye ga-elekọta ya. Ma Jehova kwere ha nkwa, sị: “E nweghịkwa onye ga-achọ iwere ala gị mgbe ị na-aga n’ihu Jehova.” (Ọpụ. 34:24) Ndị Izrel na-aga ememme a na-eme kwa afọ n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi. Ịga ya baara ha uru. Dị ka ihe atụ, ha ghọtakwuru Iwu Jehova. Ha tụgharịrị uche n’ihe ọma ndị Jehova na-emere ha. Ha na ndị Izrel ibe ha gbarịtakwara onwe ha ume. (Diut. 16:15) Taakwa, ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ hapụ ihe ụfọdụ iji gaa ọmụmụ ihe, ọ na-abara anyị uru. Chegodị otú obi si atọ Jehova ụtọ mgbe anyị kwadebere maka ọmụmụ ihe, zaa ajụjụ ndị dị mfe ma gbaa ụmụnna anyị ume.

10. Gịnị mere ịbụ abụ ji bụrụ otu ụzọ dị mkpa anyị si efe Jehova?

10 Anyị na-efe Jehova ma anyị soro ụmụnna anyị na-abụ abụ. (Ọma 28:7) Ndị Izrel weere ịbụ abụ ka otu ụzọ dị mkpa ha si efe Jehova. Eze Devid họpụtara narị ndị Livaị abụọ na iri asatọ na asatọ ka ha na-abụ abụ n’ụlọ nsọ. (1 Ihe 25:​1, 6-8) Taakwa, anyị ga-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-abụ abụ Alaeze. Ọ dịghị mkpa na anyị ga-enwerịrị olu abụ ka anyị nwee ike iso na-abụ abụ Alaeze. Chegodị ihe a: Anyị kwuwe okwu, “anyị niile na-emejọ ihe ọtụtụ ugboro.” Ma, ọ naghị egbochi anyị ikwu okwu ma anyị gaa ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ gbochie anyị izi ozi ọma. (Jems 3:2) N’ihi ya, anyị ka nwere ike ịbụ abụ iji too Jehova ọ bụrụgodị na anyị chere na anyị enweghị olu abụ.

11. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 48:​13, olee ihe mere anyị kwesịrị iji na-ewepụta oge enwe ofufe ezinụlọ?

11 Anyị na-efe Jehova mgbe anyị na-amụ Okwu ya ma na-akụziri ụmụ anyị gbasara Chineke. Ndị Izrel anaghị arụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike. Kama, ha na-eji ụbọchị ahụ eme ka ha na Jehova dịrịkwuo ná mma. (Ọpụ. 31:​16, 17) Ndị Izrel ji ife Jehova kpọrọ ihe na-eji ụbọchị ahụ akụziri ụmụ ha gbasara Jehova na ihe ọma ndị o meere ha. Taakwa, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iwepụta oge ọ ga-eji na-agụ ma na-amụ Okwu Chineke. Ọ bụ otu ụzọ anyị si efe Jehova. Ọ na-emekwa ka anyị bịarukwuo ya nso. (Ọma 73:28) Ọ bụrụkwa na anyị ana-enwe ofufe ezinụlọ, ọ ga-enyere ụmụ anyị aka ime ka ha na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya dịrị ná mma.​—Gụọ Abụ Ọma 48:13.

12. Gịnị ka anyị mụtara n’otú Jehova si were ịrụ ụlọikwuu ahụ na idozi ya?

12 Anyị na-efe Jehova mgbe anyị na-arụ ma na-elekọta ụlọ ndị a na-anọ efe ya. Baịbụl kwuru na ịrụ ụlọikwuu ahụ na idozi ya bụ ọrụ “dị nsọ.” (Ọpụ. 36:​1, 4) Taakwa, Jehova na-ewere ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na ụlọ ndị ọzọ a na-arụ ná nzukọ Jehova ka ụzọ anyị si ejere ya ozi dị nsọ. Ụfọdụ ụmụnna anyị na-eji oge buru ibu arụ ụdị ọrụ ndị a. N’eziokwu, obi dị anyị ụtọ maka ọrụ ụmụnna anyị ndị a na-arụ. Ha na-ekwusakwa ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịchọ ịbụ ndị ọsụ ụzọ. Ndị okenye ga-egosi na ha na-akwado ọrụ a ma ọ bụrụ na ha anaghị egbu oge ahọpụta ụmụnna ndị a na-arụsi ọrụ ike ịbụ ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụrụ na ha ruru eru. Ma ànyị nwere nkà ịrụ ụlọ ma ọ bụ na anyị enweghị, anyị niile nwere ike iso na-edebe ụlọ ndị a ọcha, na-esokwa arụzi ha.

13. Olee otú anyị kwesịrị isi ewere onyinye ndị anyị na-enye iji na-akwado nzukọ Jehova?

13 Anyị na-efe Jehova ma anyị na-enye onyinye iji kwadoo nzukọ ya. Ndị Izrel ekwesịghị ịgba aka bịa n’ihu Jehova. (Diut. 16:16) Ha kwesịrị iweta onyinye otú ike ha hà. Ha na-esi otú ahụ egosi na obi dị ha ụtọ maka ihe niile Jehova na-emere ha. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya nakwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị o ji nzukọ ya na-emere anyị? Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ inye onyinye iji kwadoo ego a na-emefu n’ọgbakọ anyị nakwa maka ọrụ zuru ụwa ọnụ, otú ọ bụla akpa anyị hà. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Onyinye Chineke kacha anabata bụ onyinye si mmadụ n’obi, n’ihi na Chineke na-atụ anya ka mmadụ nye ihe ọ ga-enyeli, ọ bụghị ihe ọ na-agaghị enyeli.” (2 Kọr. 8:​4, 12) Jehova ji onyinye ọ bụla anyị si n’obi anyị nye ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị otú ọ hà.​—Mak 12:​42-44; 2 Kọr. 9:7.

14. Dị ka e kwuru n’Ilu 19:​17, olee otú Jehova si ewere aka anyị nyeere ụmụnna anyị nọ ná mkpa?

14 Anyị na-efe Jehova ma anyị na-enyere Ndị Kraịst ibe anyị nọ ná mkpa aka. Jehova kwere nkwa ịgọzi ndị Izrel ma ha meere ndị ogbenye ihe ọma. (Diut. 15:​7, 10) Mgbe ọ bụla anyị nyeere nwanna anyị nọ ná mkpa aka, Jehova na-ewere ya ka onyinye anyị nyere ya. (Gụọ Ilu 19:17.) Dị ka ihe atụ, mgbe Ndị Kraịst nọ na Filipaị zigaara Pọl onyinye mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ kpọrọ ya “àjà Chineke na-anabata, nke dị ya mma.” (Fil. 4:18) Chee gbasara ndị nọ n’ọgbakọ unu ma jụọ onwe gị, sị: ‘È nwere onye m nwere ike inyere aka?’ Obi ga-adị Jehova ụtọ ma ọ hụ ka anyị na-eji oge anyị, ike anyị, nkà anyị, nakwa ihe onwunwe anyị enyere ndị nọ ná mkpa aka. Ọ na-ewere ya ka otú anyị si efe ya ofufe.​—Jems 1:27.

IFE JEHOVA NA-EME KA ANYỊ NA-ENWE OBI ỤTỌ

15. Ebe ọ bụ na anyị na-ewepụta oge na ike anyị iji fee Jehova, gịnị mere na o sighị oké ike?

15 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ife Jehova, anyị ga-ewepụta oge na ike anyị iji mee ya. Ma ime ya esighị oké ike. (1 Jọn 5:3) Gịnị mere na o sighị oké ike? Ọ bụ n’ihi na ihe mere anyị ji efe Jehova bụ n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. Chegodị banyere otu nwatakịrị chọrọ ise ihe nye nna ya. Ise ihe ahụ nwere ike iwe ya ogologo oge. Mana, ọ naghị ewute nwa ahụ na o were ya oge há otú ahụ iji see ya n’ihi na ọ hụrụ nna ya n’anya. Ọ chọkwara inye ya onyinye ahụ n’ihi na obi dị ya ụtọ maka ihe nna ya na-emere ya. Ọ bụkwa otú ọ dị anyịnwa. Ebe ọ bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, obi na-adị anyị ụtọ ma anyị jiri oge na ike anyị na-efe ya.

16. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 6:​10, olee otú Jehova si ele mbọ onye ọ bụla n’ime anyị na-agba iji fee ya anya?

16 Ndị nne na nna anaghị atụ anya ka ọ bụrụ otu ụdị onyinye ka nwa ha nke ọ bụla ga-enye ha. Ha ma na nwa nke ọ bụla dị iche n’ibe ya nakwa na otú ihe si dịrị ha dị iche iche. Nna anyị nke eluigwe makwa otú ihe si dịrị onye nke ọ bụla n’ime anyị. O nwere ike ịbụ na ị ga-ejeliri ya ozi karịa ọtụtụ ndị ị ma ma ọ bụkwanụ ndị gị na ha dị ná mma. O nwekwara ike ịbụ na ị gaghị emeli ka ha n’ihi afọ ole ị dị, ọrịa ị na-arịa, ma ọ bụkwanụ ibu ezinụlọ. Ya emekwala ka ị daa mbà. (Gal. 6:4) Jehova agaghị echefu ọrụ gị. Ọ bụrụhaala na ị na-enye Jehova ihe kacha mma i nwere ike inye ya, burukwa ezi ihe n’obi na-enye ya, ọ ga-anabata ya. (Gụọ Ndị Hibru 6:10.) Jehova ma ihe ị ga-achọ ime n’ozi ya. Ma, ọ chọrọ ka obi na-atọ gị ụtọ n’ihe ndị i nwere ike ime n’ofufe ya.

17. (a) Ọ bụrụ na o nwere ihe na-esiri anyị ike ime n’ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị na-eme iji fee Chineke, gịnị ka anyị nwere ike ime? (b) Olee otú ime otu n’ime ihe ndị e sere n’igbe isiokwu ya bụ “ Mee Ihe Ga-eme Ka Ị Na-enwekwu Obi Ụtọ” sirila nyere gị aka?

17 Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ime ụfọdụ n’ime ihe ndị a anyị tụlerela anyị na-eme iji fee Chineke, dị ka ịna-amụ ihe n’onwe anyị ma ọ bụ ịna-ekwusa ozi ọma, gịnị ka anyị nwere ike ime? Anyị ga-achọpụta na ọ bụrụ na anyị ana-eme ha mgbe ọ bụla, ọ ga-ebido tọwa anyị ụtọ, na-abakwara anyị uru. Anyị nwere ike iji ihe ndị anyị na-eme n’ofufe Jehova tụnyere ịmụ otú e si akpọ ngwá egwú. Ọ bụrụ na anyị na-eme ya naanị mgbe ọ dabara, ọ ga-esiri anyị ike ịmụta ya. Ma ọ bụrụ na anyị ana-ewepụta obere oge na-amụ ya kwa ụbọchị, ọ ga-ebido ịmara anyị ahụ́. Ka ọ na-amara anyị ahụ́, anyị ejirizie nwayọọ na-agbatịkwu oge ya. Ka anyị na-ahụ uru mbọ anyị na-agba na-abara anyị, ọ ga-eme ka anyị na-atụsi anya ike oge anyị ga-eji amụ ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị n’ihe gbasara ofufe anyị na-efe Jehova.

18. Olee ihe kacha mkpa anyị ga-eji ndụ anyị eme? Oleekwa ihe ga-eme ma ọ bụrụ na anyị emee ya?

18 Ime ike anyị niile iji fee Jehova bụ ihe kacha mma anyị ga-eji ndụ anyị mee. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ya, obi ga na-atọ anyị ụtọ, ndụ anyị ga-enwekwa isi. Anyị ga-enwekwa olileanya ịna-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi. (Ilu 10:22) Obi na-eru anyị ala ugbu a n’ihi na anyị ma na Jehova na-enyere ndị na-efe ya aka mgbe ihe siiri ha ike. (Aịza. 41:​9, 10) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ ma anyị na-efe Nna anyị hụrụ anyị n’anya bụ́ onye ruru eru ka ihe niile o kere ‘too ma sọpụrụ.’​—Mkpu. 4:11.

ABỤ NKE 24 Bịanụ n’Ugwu Jehova

^ par. 5 Ọ bụ Jehova kere ihe niile. N’ihi ya, o kwesịrị ka anyị na-efe ya. Ihe ga-eme ka ọ nabata ofufe anyị na-efe ya bụ ma anyị na-erubere ya isi ma na-ebi ndụ otú dị ya mma. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe asatọ anyị na-eme iji fee Jehova. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma na ha na otú ime ha ga-esi na-eme anyị obi ụtọ.