Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 14

Ndị Okenye, Na-emenụ Ka Pọl Onyeozi

Ndị Okenye, Na-emenụ Ka Pọl Onyeozi

“Na-emenụ ka m.”​—1 KỌR. 11:1

ABỤ NKE 99 Anyị Bụ Ìgwè Ụmụnna

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee otú ihe Pọl onyeozi mere ga-esi enyere ndị okenye aka taa?

 PỌL onyeozi hụrụ ụmụnna ya n’anya. Ọ rụsiri ọrụ ike n’ihi ha. (Ọrụ 20:31) Ụmụnna ya hụkwara ya n’anya maka ya. N’otu oge, mgbe ndị okenye nọ n’Efesọs matara na ha agaghị ahụ Pọl ọzọ, “ha niile malitere ibe ezigbo ákwá.” (Ọrụ 20:37) Ndị okenye na-arụsi ọrụ ike na-emekwa ka Pọl. Ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, na-emekwa ike ha niile iji nyere ha aka. (Fil. 2:​16, 17) Mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri ndị okenye ike ime ihe niile ha kwesịrị ime. Gịnị ga-enyere ha aka?

2 Ndị okenye na-arụsi ọrụ ike nwere ike ịmụta ihe n’aka Pọl. (1 Kọr. 11:1) Pọl bụ mmadụ nkịtị dị ka anyị. O zughị okè. O nwekwara mgbe o siiri ya ike ime ihe dị mma. (Rom 7:​18-20) O nwekwara ọtụtụ nsogbu ndị ya na ha lụrụ. Ma ihe ndị a niile emeghị ka Pọl kwụsị ịna-arụsi ọrụ ike iji nyere ụmụnna ya aka ma ọ bụ mee ka ọ kwụsị ịna-enwe ọṅụ. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-eme ka Pọl, ha ga-eji ọṅụ na-efe Jehova, ma mgbe ihe siiri ha ike. Ka anyị hụ otú ha nwere ike isi eme ya.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a, oleekwa uru ọ ga-abara anyị?

3 N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anọ nwere ike isiri ndị okenye ike ime: (1) iwepụta oge na-aga ozi ọma ma na-arụ ọrụ ndị ọzọ ha nwere n’ọgbakọ, (2) iwepụta oge na-aga agba ụmụnna ha ume, (3) ịghara ikwe ka ihe ndị ha na-anaghị emeta mee ka ha daa mbà, na (4) ịna-emere ụmụnna ha obiọma ma ha mejọọ ihe n’ihi ezughị okè. Anyị ga-amụta ihe nyeere Pọl aka imeri nsogbu ndị a na otú ndị okenye nwere ike isi eme ka ya.

IWEPỤTA OGE NA-AGA OZI ỌMA MA NA-ARỤ ỌRỤ NDỊ ỌZỌ N’ỌGBAKỌ

4. Gịnị mere o nwere ike iji siere ndị okenye ike ibute ụzọ n’ikwusa ozi ọma?

4 Ihe mere o nwere ike iji esi ike. E wezụga ibute ụzọ n’ikwusa ozi ọma, ndị okenye nwere ọtụtụ ọrụ ndị ha na-arụ n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime ha na-abụ ndị isi oche n’ọmụmụ ihe etiti izu ma ọ bụkwanụ na-eduzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. E nwekwara ike ikenye ha ikwu okwu n’ebe ndị ọzọ na-abụghị n’ọgbakọ ha. Ha na-azụ ndị ohu na-eje ozi. Obi na-adịkwa ha ụtọ ịna-agba ụmụnna ha ume. (1 Pita 5:2) Ụfọdụ ndị okenye na-eso arụ ma na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze na ụlọ ndị ọzọ nzukọ a nwe. N’agbanyeghị ya, ọrụ kacha mkpa ndị okenye na-arụ bụ ikwusa ozi ọma, dịkwa ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ.​—Mat. 28:​19, 20.

5. Olee otú Pọl si kwusaa ozi ọma anyị kwesịrị ịmụta ihe na ya?

5 Ihe Pọl mere.Ndị Filipaị 1:​10, Pọl gwara anyị ihe mere o ji bụrụ ezigbo onye na-ekwusa ozi ọma. O kwuru, sị: “Ka unu na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.” Pọl mere ihe a o kwuru. A họpụtara ya ịna-ekwusa ozi ọma. Ruokwa ọtụtụ afọ, o ji ọrụ ikwusa ozi ọma mere ihe kacha mkpa ná ndụ ya. O kwusara ozi ọma “n’ihu ọha nakwa n’ụlọ n’ụlọ.” (Ọrụ 20:20) O nweghị oge ọ kapịrị ọnụ ọ ga-eji na-ekwusa ozi ọma n’ụbọchị. O nweghịkwa naanị otu ụbọchị o wepụtara iji na-ekwusa ozi ọma n’izu. Ọ na-eji ohere ọ bụla o nwere na-ekwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-eche ndị ibe ya n’Atens, ọ malitere ikwusara ụfọdụ ndị a ma ama ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha ghọkwara ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 17:​16, 17, 34) Pọl kwusadịịrị ndị ya na ha nọ ozi ọma mgbe ‘a tụrụ ya mkpọrọ.’​—Fil. 1:​13, 14; Ọrụ 28:​16-24.

6. Gịnị ka Pọl kụziiri ndị ọzọ?

6 Pọl ji oge ya mee ihe bara uru. Ọ na-akpọkarị ndị ọzọ ka ya na ha soro gaa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ gara ozi ala ọzọ mbụ, ọ kpọọrọ Jọn Mak, na nke abụọ, ya akpọrọ Timoti. (Ọrụ 12:25; 16:​1-4) Pọl gbalịrị ịkụziri ụmụ okorobịa ndị a otú e si ahazi ọgbakọ, otú e si agba ụmụnna ume, na otú e si akụzi ihe nke ọma.​—1 Kọr. 4:17.

Otu ụzọ ị ga-esi na-eme ka Pọl bụ ịdị njikere ịna-ekwusa ozi ọma mgbe ọ bụla (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7. Olee otú ndị okenye ga-esi eme ihe Pọl kwuru ná Ndị Efesọs 6:​14, 15?

7 Ihe ndị okenye ga-amụta na ya. Otú ndị okenye ga-esi eme ka Pọl abụghị naanị ịna-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ, kama ha kwesịkwara ịdị njikere ikwusa ozi ọma n’oge ọ bụla nakwa n’ebe ọ bụla ha nọ. (Gụọ Ndị Efesọs 6:​14, 15.) Dị ka ihe atụ, ha nwere ike izi mmadụ ozi ọma ma ha gaa ịzụ ihe ma ọ bụ n’ebe ha na-arụ ọrụ. Ha gaa ịrụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova, ha nwere ike izi ndị bi gburugburu ebe ahụ ma ọ bụ ndị na-eresị ha ihe ozi ọma. Ndị okenye nwekwara ike ịna-eme ka Pọl ma ọ bụrụ na ha ejiri oge ha nọ n’ozi ọma na-azụ ndị ọzọ, ma ndị ohu na-eje ozi.

8. Olee ihe o nwere ike ịdị mkpa ka okenye mee mgbe ụfọdụ?

8 Ndị okenye ekwesịghị ikwe ka ọrụ ndị ha na-arụ n’ọgbakọ ma ọ bụ na sekit mee ka ha ghara inwe ohere ikwusa ozi ọma. Iji nwee ohere rụọ ọrụ ndị ha kwesịrị ịrụ, o nwere ike ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka ha jụ ọrụ ụfọdụ. Ọ bụrụ na ha echebara ya echiche ma kpee ekpere maka ya, ha nwere ike ịchọpụta na ọ bụrụ na ha ekweta ịrụ ọrụ ahụ, ọ ga-eme ka ha ghara inwe ike ime ihe ndị kacha mkpa. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ kacha mkpa bụ ịna-enwe ofufe ezinụlọ n’izu ọ bụla, iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma, nakwa ịkụziri ụmụ ha otú e si ezi ozi ọma. Ọ na-esiri ụfọdụ ndị okenye ike ịjụ ọrụ ụfọdụ. Ma, ha kwesịrị ịghọta na Jehova ma na ha chọrọ ịrụ ọrụ ndị ha na-arụ nke ọma.

IWEPỤTA OGE NA-AGA AGBA ỤMỤNNA HA UME

9. Olee ihe nwere ike isiri ndị okenye ike ime n’ihi ọtụtụ ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ?

9 Ihe mere o nwere ike iji esi ike. Ndị Jehova na-enwe ọtụtụ nsogbu. N’oge ikpeazụ a, ọ dị mkpa ka a na-agba anyị niile ume, na-enyere anyị aka, ma na-akasi anyị obi. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ka e nyere ụfọdụ aka ka ha ghara ime ihe ọjọọ. (1 Tesa. 5:14) Ọ bụ eziokwu na ndị okenye agaghị emeli ka nsogbu niile na-abịara ndị Jehova kwụsị, ma Jehova chọrọ ka ndị okenye na-eme ike ha niile iji na-agba atụrụ ya ume ma na-echebe ha. Olee otú ndị okenye nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ n’ọgbakọ ga-esi enwe oge ha ga-eji enyere ụmụnna ha aka?

Na-aja ndị ọzọ mma ma na-agba ha ume (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 12) *

10. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 2:​7, gịnị ka Pọl mere iji nyere ụmụnna ya aka?

10 Ihe Pọl mere. Pọl na-adịkarị njikere ịja ụmụnna ya mma na ịgba ha ume. Ọ ga-adị mma ma ndị okenye na-eme ka ya ma na-egosi ụmụnna ha na ha hụrụ ha n’anya, na-enwekwara ha ọmịiko. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:7.) Pọl gwara ụmụnna ya na ọ hụrụ ha n’anya nakwa na Jehova hụrụ ha n’anya. (2 Kọr. 2:4; Efe. 2:​4, 5) Pọl weere ndị nọ n’ọgbakọ ka ndị enyi ya, na-ewepụtakwa oge ya na ha ana-anọrị. Ọ gwara ha ihe na-echegbu ya nakwa ebe ndị ọ na-anaghị emete n’ihi na ọ tụkwasịrị ha obi. (2 Kọr. 7:5; 1 Tim. 1:15) Ma ihe mere Pọl ji gwa ha ihe ndị a abụghị ka ha metewere ya ebere, kama ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ inyere ha aka.

11. Gịnị mere Pọl ji nye ụmụnna ya ndụmọdụ?

11 O nwere mgbe ụfọdụ ọ dị mkpa ka Pọl nye ụmụnna ya ndụmọdụ. Ma, ihe mere o ji nye ha ndụmọdụ abụghị maka na iwe na-ewe ya, kama ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya, chọọkwa ka ha ghara ịbanye ná nsogbu. Ọ gbalịrị ka ndụmọdụ ọ na-enye dịrị ndị ọ na-enye ya mfe ịghọta, chọọkwa ka ha mee ihe ọ gwara ha. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kọrịnt, ọ dọsiri ha aka ná ntị ike. Mgbe o dechara akwụkwọ ozi ahụ, o zigaara ha Taịtọs. Ihe mere o ji mee ya bụ na ọ chọrọ ịma otú obi dị ha mgbe ha natara akwụkwọ ozi ahụ. Obi tọkwara ya ezigbo ụtọ mgbe ọ nụrụ na ha nabatara ndụmọdụ o nyere ha.​—2 Kọr. 7:​6, 7.

12. Olee otú ndị okenye ga-esi eme ka okwukwe ụmụnna ha sie ike?

12 Ihe ndị okenye ga-amụta na ya. Ndị okenye nwere ike ime ka Pọl ma ọ bụrụ na ha ana-ewepụta oge ka ha na ụmụnna ha na-anọrị. Otu ụzọ ha nwere ike isi eme ya bụ ịna-abịa ọmụmụ ihe n’oge ka ha nwee ike ịna-agba ụmụnna ha ume. Nkeji ole na ole nwere ike izu iji gbaa nwanna ume. (Rom 1:12; Efe. 5:16) Okenye na-eme ka Pọl na-eji Okwu Chineke eme ka okwukwe ụmụnna ya sie ike, na-emekwa ka obi sie ha ike na Jehova hụrụ ha n’anya. Ihe ọzọ ọ na-eme bụ ime ka ụmụnna ya mara na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ na-eso ha ekwurịta okwu mgbe niile, na-achọkwa ohere ndị ọ ga-eji jaa ha mma maka ebe ndị ha na-eme nke ọma. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka okenye nye ndụmọdụ, ọ na-agba mbọ hụ na ndụmọdụ ya si n’Okwu Chineke. Ọ naghị ezo ọnụ. Ma ọ na-eji obiọma enye ndụmọdụ n’ihi na ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya, chọọkwa ka ha mee ihe ọ gwara ha.​—Gal. 6:1.

ỊGHARA IKWE KA IHE NDỊ HA NA-ANAGHỊ EMETA MEE KA HA DAA MBÀ

13. Olee otú ihe okenye na-anaghị emetacha nwere ike isi akpa ya aka?

13 Ihe mere o nwere ike iji esi ike. Ndị okenye ezughị okè. Ha na-emejọkwa ihe otú ahụ mmadụ niile na-emejọ. (Rom 3:23) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri ha ike ile ihe ndị ha na-anaghị emeta anya otú kwesịrị ekwesị. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ilekwasị anya n’ihe ndị ha na-anaghị emetacha, ya emee ka ha daa mbà. Ndị ọzọ nwekwara ike ịna-ekwu na ihe ha na-emejọ esighị ha n’aka, ya emee ka ha ghara ịgbanwe.

14. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:​13, olee otú ịdị umeala n’obi si nyere Pọl aka ile ihe ndị ọ na-anaghị emetacha anya otú kwesịrị ekwesị?

14 Ihe Pọl mere. Pọl dị umeala n’obi. Ọ bụ ya mere o ji ghọta na ọ gaghị emerili adịghị ike ya n’onwe ya. Ọ dị mkpa ka Chineke nyere ya aka. Na mbụ, Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi na-emegide Ndị Kraịst. Mgbe e mechara, ọ ghọtara na ihe o mere adịghị mma. Ọ dịkwa njikere ịgbanwe otú o si eche echiche na ihe ndị ọ na-eme. (1 Tim. 1:​12-16) Jehova nyeere Pọl aka ya aghọọ okenye hụrụ ụmụnna ya n’anya, na-enwere ha ọmịiko, dịkwa umeala n’obi. Ọ ma na ya ezughị okè. Ma ọ nọgideghị na-eche banyere ihe ndị ahụ ọ na-anaghị emetacha. Kama, ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-agbaghara ya. (Rom 7:​21-25) Ọ nọghị na-atụ anya na ọ ga-ezu okè. Kama, ọ gbasiri mbọ ike ịna-akpa àgwà ka ezigbo Onye Kraịst, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-enyere ya aka ịrụzu ọrụ o nyere ya.​—1 Kọr. 9:27; gụọ Ndị Filipaị 4:13.

Gbasie mbọ ike ka ị na-eme nke ọma n’ebe ndị ị na-anaghị emeta (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15) *

15. Olee ihe ga-enyere okenye aka ịna-ele ebe ọ na-anaghị emeta anya otú kwesịrị ekwesị?

15 Ihe ndị okenye ga-amụta na ya. Ihe mere e ji họpụta ndị okenye abụghị n’ihi na ha zuru okè. Ma, Jehova na-atụ anya ka ha ghọta na ha ezughị okè ma gbalịa na-akpakwu àgwà ndị e ji mara Ndị Kraịst. (Efe. 4:​23, 24) Okenye kwesịrị ịna-amụ Baịbụl ka o nyere ya aka ịhụ ebe ndị ọ ga-emekwu nke ọma. Ọ bụrụ na ọ na-eme ya, Jehova ga-enyere ya aka ịna-enwe obi ụtọ ma bụrụ ezigbo okenye.​—Jems 1:25.

IMERE ỤMỤNNA HA OBIỌMA MA HA MEJỌỌ IHE N’IHI NA HA EZUGHỊ OKÈ

16. Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na okenye ana-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-anaghị eme nke ọma?

16 Ihe mere o nwere ike iji esi ike. Ọ bụrụ na ndị okenye na ụmụnna ha ana-anọrị, o nwere ike ime ka ndị okenye hụ ebe ụmụnna ha na-anaghị eme nke ọma. Ọ bụrụ na ha akpacharaghị anya, ihe ndị ụmụnna ha na-anaghị emeta nwere ike ịna-agbakasị ha ahụ́ ma ọ bụ mee ka ha na-akatọ ha. Pọl gwara Ndị Kraịst na Setan ga-achọ ka ha mee ụdị ihe ahụ.​—2 Kọr. 2:​10, 11.

17. Olee otú Pọl si were ụmụnna ya?

17 Ihe Pọl mere. Pọl kwetara na ụmụnna ya na-achọ ime ihe dị mma. Ọ ma na o nwere ebe ndị ha na-anaghị emeta n’ihi na e nwere mgbe ụfọdụ ha mere ihe wutere ya. Ma Pọl ma na ọ bụrụ na mmadụ emee ihe na-adịghị mma otu mgbe, ọ pụtaghị na onye ahụ bụ onye ọjọọ. Ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya, na-elekwasịkwa anya n’ebe ndị ha na-eme nke ọma. Ọ bụrụ na ọ na-esiri ụmụnna ya ike ime ihe dị mma, ọ na-ewere ya na ha chọrọ ime ihe dị mma, nakwa na ihe dị ha mkpa bụ ka e nyere ha aka.

18. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Pọl mere mgbe Yuodia na Sintiki nwere nghọtahie? (Ndị Filipaị 4:​1-3)

18 Ka anyị tụlegodị otú Pọl si nyere ụmụnna nwaanyị abụọ nọ na Filipaị aka. (Gụọ Ndị Filipaị 4:​1-3.) O yiri ka Yuodia na Sintiki nwere nghọtahie, ya emee ka ha abụọ gharazie ịdị ná mma. Pọl abịaghị gwawa ha okwu ọjọọ ma ọ bụ bawara ha mba. Kama o lekwasịrị anya n’àgwà ọma ndị ha nwere. Ụmụnna nwaanyị abụọ ndị a ejirila obi ha niile fee Jehova ruo ọtụtụ afọ. Pọl ma na Jehova hụrụ ha n’anya. Ebe ọ bụ na Pọl lekwasịrị anya n’ebe ụmụnna nwaanyị ndị a na-eme nke ọma, ọ gbara ha ume ka ha mee udo. Ilekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma mere ka Pọl na-enwe ọṅụ, meekwa ka ya na ụmụnna ya na-adị ná mma.

Gbalịa ka ị ghara ịna-ele ndị ọzọ anya ọjọọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19) *

19. (a) Olee otú ndị okenye ga-esi na-elekwasị anya n’ebe ụmụnna ha na-eme nke ọma? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta na foto a n’ihe okenye a mere mgbe a na-ehicha Ụlọ Nzukọ Alaeze?

19 Ihe ndị okenye ga-amụta na ya. Ndị okenye, na-elekwasịnụ anya n’ebe ụmụnna unu na-eme nke ọma. O nweghị onye zuru okè. Ma onye ọ bụla n’ime anyị nwere ebe ọ na-eme nke ọma. (Fil. 2:3) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka ndị okenye nye nwanna ndụmọdụ, ma ha chọọ ime ya, ha ga-eme ka Pọl. Ha kwesịrị ịgba mbọ lekwasị anya n’ebe nwanna ahụ na-eme nke ọma, ọ bụghị n’ihe na-adịghị mma o kwuru ma ọ bụ mee. Ha kwesịkwara ilekwasị anya n’otú nwanna ahụ si hụ Jehova n’anya, otú o si jiri ntachi obi na-efe Jehova, nakwa ihe ọma ndị o nwere ike ime n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-elekwasị anya n’ebe ndị ụmụnna ha na-eme nke ọma, ụmụnna ga-ama na a hụrụ ha n’anya.

NỌGIDE NA-EME KA PỌL

20. Olee otú ndị okenye ga-esi na-amụta ihe n’aka Pọl?

20 Ndị okenye, ịmụ ihe Pọl mere ga-enyere unu aka. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgụ akwụkwọ ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke,’ isi nke 12, paragraf nke 17 ruo na nke 20. Ka ị na-agụ ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú ime ka Pọl ga-esi enyere m aka iji ọṅụ na-arụ ọrụ m?’

21. Olee ihe obi kwesịrị isi ndị okenye ike na ya?

21 Ndị okenye, chetanụ na Jehova anaghị atụ anya na unu ga-ezu okè. Naanị ihe ọ chọrọ n’aka unu bụ ka unu na-arụ ọrụ unu nke ọma. (1 Kọr. 4:2) Obi dị Jehova ụtọ maka otú Pọl si rụsie ọrụ ike nakwa otú o si jiri obi ya niile jeere ya ozi. Obi kwesịkwara isi unu ike na Chineke ji ọrụ unu na-arụ kpọrọ ihe. Jehova “agaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe n’ihi na unu jeere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi.”​—Hib. 6:10.

ABỤ NKE 87 Bịa Ka A Gbaa Gị Ume

^ par. 5 Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka otú ndị okenye si na-arụsi ọrụ ike ma na-enyere anyị aka. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anọ na-anaghị adịchara ndị okenye mfe omume. Anyị ga-atụlekwa ihe anọ Pọl onyeozi mere nwere ike inyere ndị okenye aka imeri nsogbu ndị a. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịna-enwere ndị okenye ọmịiko, meekwa ka anyị na-egosi ha na anyị hụrụ ha n’anya ma na-akwado ha.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-ezi onye ọrụ ibe ya ozi ọma mgbe ha na-ala ọrụ.

^ par. 63 NKỌWA FOTO: Ebe otu okenye ji obiọma gakwuru otu nwanna na-achọkarị ịnọrọ onwe ya na-agba ya ume.

^ par. 65 NKỌWA FOTO: Ebe ezigbo iwe ji otu nwanna maka ihe merenụ, nwanna ọzọ ana-enye ya ndụmọdụ maka ya.

^ par. 67 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna hapụrụ ọrụ ọ bịara na-apị ekwentị, okenye ahụ ya, ma ọ baraghị ya mba.