Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 17

Ihe Ndị Nne Nwere Ike Ịmụta n’Aka Yunis

Ihe Ndị Nne Nwere Ike Ịmụta n’Aka Yunis

‘Ahapụkwala ntụziaka nne gị nyere gị. Ọ dị ka okpu mara mma e ji okooko kpaa nke ị ga-ekpu n’isi, dịrịkwa ka ọmarịcha ihe olu ị ga-anya n’olu.’​—ILU 1:​8, 9.

ABỤ NKE 137 Ụmụ Nwaanyị Ndị Nwere Okwukwe

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Ebe obi dị nne Timoti bụ́ Yunis na nne nne ya Lọịs ụtọ mgbe ha na-ele ka a na-eme Timoti baptizim (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1)

1-2. (a) Ònye bụ Yunis, oleekwa ihe mere ka o siere ya ike ịkụziri nwa ya gbasara Jehova na Jizọs Kraịst? (b) Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.

 Ọ BỤ eziokwu na Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla banyere baptizim Timoti, ma ọ ga-abụrịrị na obi tọgburu nne ya bụ́ Yunis atọgbu n’ụbọchị ahụ o mere baptizim. (Ilu 23:25) Weregodị ya na ị na-ahụ nne Timoti n’oge a chọrọ ime Timoti baptizim. Ọ na-ele Timoti ka ọ banyere n’ime mmiri ahụ, ọchị eju ya ọnụ, ya na nne nne Timoti bụ́ Lọịs nọ nso. Mgbe e mikpuru Timoti n’ime mmiri ahụ, obi atọgbuo Yunis. Mgbe e si ná mmiri ahụ na-ekulite Timoti, mmiri ahụ emee mkpọtụ, ihu abụrụ ya ọchị ọchị ka o si ná mmiri ahụ na-apụta. Otú obi si tọọ Yunis ụtọ mere ka anya mmiri gbaa ya. N’agbanyeghị na ọ dịrịghị Yunis mfe, ọ gbalịrị ịkụziri Timoti ịhụ Jehova na Jizọs n’anya. Olee ihe ndị siiri ya ike ime ka ọ na-agba mbọ ịkụziri nwa ya gbasara Jehova?

2 Nne na nna Timoti anaghị ekpe otu okpukpe. Nna ya bụ onye Grik. Nne ya na nne nne ya bụ ndị Juu. (Ọrụ 16:1) Ọ ga-abụ na Timoti ka bụ obere nwa mgbe nne ya Yunis na nne nne ya bụ́ Lọịs ghọrọ Ndị Kraịst. Ma, nna ya aghọghị Onye Kraịst. Olee ihe Timoti ga-eme ugbu a? Ọ ga-abụ na o toruola ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme. Ọ̀ ga-ekpewe okpukpe nna ya, ka ọ̀ ga na-eme omenala ndị Juu a kụziiri ya kemgbe ọ dị obere, ka ọ̀ ga-eso nne ya na nne nne ya ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst?

3. Dị ka e kwuru n’Ilu 1:​8, 9, olee otú Jehova si ewere ọrụ ndị nne na-arụ inyere ụmụ ha aka ka ha bụrụ enyi ya?

3 Ndị nne bụ́ Ndị Kraịst hụkwara ezinụlọ ha n’anya. Ihe kacha ha mkpa bụ ime ka ụmụ ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Jehova jikwa mbọ ha na-agba ime ya kpọrọ ezigbo ihe. (Gụọ Ilu 1:​8, 9.) Jehova enyerela ọtụtụ ndị nne aka ịkụziri ụmụ ha ịhụ ya n’anya na ife ya.

4. Olee ihe na-esiri ndị nne ike taa?

4 O nwere ike ịna-echu ndị nne ụra mgbe ụfọdụ ma ụmụ ha hà ga-ekpebi ife Jehova otú ahụ Timoti kpebiri. Ihe kpatara ya bụ na ha ma na ụwa Ekwensu a na-akpa ụmụaka aka ọjọọ. (1 Pita 5:8) Ihe ọzọ nwere ike ime ka o siere ndị nne ike ịzụ ụmụ ha bụ ma ọ bụrụ na ha enweghịzi di ma ọ bụkwanụ na di ha anaghị efe Jehova. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Christine * sịrị: “Di m bụ ezigbo nna na ezigbo onyeisi ezinụlọ. Ma, ọ chọghị ka m zụọ ụmụ anyị ka ha ghọọ Ndịàmà Jehova. Ihe a mere ka m na-ebe ákwá ruo ọtụtụ afọ, mụ ana-eche ma ụmụ m hà ga-emechakwa fewe Jehova.”

5. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

5 Ọ bụrụ na ị bụ nne bụ́ Onye Kraịst, ị ga-enyeliri ụmụ gị aka ha ahụ Jehova n’anya ma na-efe ya otú ahụ Yunis mere. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe i nwere ike ịmụta n’aka Yunis ga-enyere gị aka iji okwu ọnụ gị na omume gị na-akụziri ụmụ gị ihe. Anyị ga-atụlekwa otú Jehova ga-esi enyere gị aka.

JIRI OKWU ỌNỤ GỊ NA-AKỤZIRI ỤMỤ GỊ IHE

6. Dị ka e kwuru na 2 Timoti 3:​14, 15, olee otú Timoti si ghọọ Onye Kraịst?

6 Mgbe Timoti bụ obere nwa, nne ya gbalịrị ike ya niile ịkụziri ya “ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ” otú ndị Juu si ghọta ya. Ma, e nwere ihe ndị ọ na-amaghị ebe ọ bụ na e nweghị ihe ọ bụla ọ ma gbasara Jizọs. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe Timoti mụtara n’Akwụkwọ Nsọ ga-enyere ya aka ịghọ Onye Kraịst. Ma, ọ̀ ga-aghọ Onye Kraịst? Ebe ọ bụ na o tolitela, ọ bụ ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-abụ Onye Kraịst. O doro anya na ihe so mee ka Timoti kwere eziokwu gbasara Jizọs bụ ihe nne ya kụziiri ya. (Gụọ 2 Timoti 3:​14, 15.) Obi dị Yunis ezigbo ụtọ na ọ kụziiri nwa ya gbasara Jehova n’agbanyeghị na o siiri ya ike. Aha Yunis si n’okwu pụtara mmeri. O merikwara, nyere nwa ya aka ife Jehova na ịhụ ya n’anya n’agbanyeghị na ọ dịrịghị ya mfe.

7. Olee otú Yunis nwere ike isi nyere nwa ya aka ịna-emekwu nke ọma mgbe o mechara baptizim?

7 Timoti mechara mee baptizim. Ihe a bụ ihe dị ezigbo mkpa o mere ná ndụ ya. Ma, Yunis ka na-echegbukwa onwe ya gbasara Timoti mgbe o mechara baptizim. Olee ihe ndị ọ ga-eji ndụ ya eme? Ọ̀ ga-emecha sowe ndị ọjọọ? Ọ̀ ga-aga ụlọ akwụkwọ n’Atens ma kwere ihe ndị na-efe arụsị na-akụzi ebe ahụ? Ọ̀ ga-achọwa ịba ọgaranya, ya emee ka ọ na-eji ike ya niile na ume ya niile na-achụ akụnụba? Ọ bụghị Yunis ga-ekpebiri Timoti ihe ọ ga-eme. Ma, o nwere ike inyere ya aka. Olee otú ọ ga-esi eme ya? O nwere ike inyere nwa ya aka ịhụ Jehova n’anya, nyekwara ya aka inwe obi ụtọ maka ihe niile Jehova na Jizọs meere ha. Ọ bụghị naanị ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-abụghị Ndị Kraịst ka ọ na-esiri ike ịzụlite ụmụ ha. Ọ bụrụgodị na nne na nna bụ Ndị Kraịst, o nwekwara ike isiri ha ike ịkụziri ụmụ ha ịhụ Jehova n’anya ma na-efe ya. Olee ihe ndị nne na nna nwere ike ịmụta n’aka Yunis?

8. Olee otú nwanna nwaanyị ga-esi enyere di ya bụ́ Onyeàmà Jehova aka ịna-akụziri ụmụ ha Okwu Chineke?

8 Na-akụziri ụmụ gị Baịbụl. Ụmụnna nwaanyị, ọ bụrụ na di unu nọ n’ọgbakọ, Jehova chọrọ ka unu na-enyere ha aka ịna-akụziri ụmụ unu ihe. Otu ụzọ unu ga-esi eme ya bụ ịna-akwado Ofufe Ezinụlọ unu. Na-ekwu okwu ọma gbasara Ofufe Ezinụlọ unu, na-echekwa gbasara ihe ndị unu nwere ike ime iji mee ka Ofufe Ezinụlọ unu na-atọ ụtọ. I nwere ike inyere di gị aka unu achọta ihe unu ga-amụ ma ọ bụ ihe unu ga-eme n’Ofufe Ezinụlọ unu. Unu nwekwara ike iji akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi na-amụrụ ụmụ unu ndị nke toruru iji ya amụ ihe ihe.

9. Olee ihe nwere ike inyere nwanna nwaanyị di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova aka ịzụ ụmụ ya?

9 O nwere ike ịbụ naanị nwanna nwaanyị na-amụrụ ụmụ ya ihe. Ihe nwere ike ịkpata ya bụ na o nweghịzi di ma ọ bụ na di ya abụghị Onyeàmà Jehova. Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị n’ezinụlọ gị, echegbula onwe gị. Jehova ga-enyere gị aka. Jiri ihe ndị nzukọ Jehova nyere anyị na-amụrụ ụmụ gị ihe. Ha ga-enyere gị aka. I nwekwara ike ịgakwuru ndị nne na nna bụ́ aka ochie ka ha gosi gị otú ha si eji ihe ndị a enwe Ofufe Ezinụlọ. * (Ilu 11:14) I nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka ịchọta ajụjụ ndị ga-enyere gị aka ịmata ihe dị ụmụ gị n’obi. (Ilu 20:5) Ajụjụ dị ka ‘Olee ihe na-akacha esiri gị ike n’ụlọ akwụkwọ?’ nwere ike inyere gị aka ịchọpụta ihe ya na nwa gị na-alụ.

10. Olee ihe ọzọ i nwere ike ime iji nyere ụmụ gị aka ịmụta gbasara Jehova?

10 Chọta ụzọ ndị ị ga-esi kụziere ụmụ gị gbasara Jehova. Na-agwa ha gbasara Jehova nakwa ọtụtụ ihe ọma ndị o meere gị. (Diut. 6:​6, 7; Aịza. 63:7) Ihe a dị ezigbo mkpa ma ọ bụrụ na ị naghị enweli ike ịmụrụ ụmụ gị ihe mgbe niile n’ụlọ. Nwanna Nwaanyị Christine anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ọ naghị adịchara m mfe ịkụziri ụmụ m Baịbụl mgbe niile. N’ihi ya, m na-eji ohere ọ bụla mụ na ha nọ na-akụziri ha ya. Anyị na-apụ gagharịa ma ọ bụ baa n’ụgbọ mmiri kwọrọ ya baa n’osimiri ka anyị nwee ike ikwu gbasara ihe ndị dị ịtụnanya Jehova kere nakwa ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka ka ha bụrụ enyi Jehova. Mgbe ụmụ m tolitere, m gbara ha ume ka ha na-amụ Baịbụl n’onwe ha.” Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịna-ekwu okwu ọma gbasara nzukọ Jehova nakwa gbasara ụmụnna anyị. Akatọla ndị okenye. Ihe ị na-agwa ụmụ gị gbasara ndị okenye nwere ike ime ka ha gakwuru ha ma ha nọrọ ná nsogbu.

11. Dị ka e kwuru na Jems 3:​18, gịnị mere o ji dị mkpa ime ka udo dịrị n’ezinụlọ?

11 Mee ka udo dịrị n’ụlọ unu. Na-agwa di gị na ụmụ gị mgbe ọ bụla na ị hụrụ ha n’anya. I kwuwe gbasara di gị, na-ekwu okwu gosiri na ị na-akwanyere ya ùgwù, kụziekwara ụmụ gị ịna-eme otú ahụ. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị na-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ unu, ya enyekwara ụmụ gị aka ịmụta gbasara Jehova. (Gụọ Jems 3:18.) Legodị ihe mere otu nwanna aha ya bụ Jozsef. Ọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na Romenia. Mgbe ọ na-eto, papa ya mere ka o siere yanwa, mama ya, na ụmụnne ya ike ife Jehova. Ọ sịrị: “Mama m gbara ezigbo mbọ mee ka udo dịrị n’ezinụlọ anyị. Papa m na-eme ka ihe na-esikwuru anyị ike, mama m ana-egosikwu ya obiọma. Mama m chọpụta na ọ na-esiri anyị ike irubere papa m isi na ịna-akwanyere ya ùgwù, ọ na-agụrụ anyị Ndị Efesọs 6:​1-3. Ọ na-agwazi anyị gbasara àgwà ọma ndị papa anyị nwere, nyekwara anyị aka ịghọta ihe mere anyị ji kwesị iji ya akpọrọ ihe ma na-akwanyere ya ùgwù. Ọ na-esi otú a eme ka anyị dịrị n’udo.”

JIRI OMUME GỊ KỤZIERE ỤMỤ GỊ IHE

12. Dị ka e kwuru na 2 Timoti 1:​5, olee uru àgwà Yunis baara Timoti?

12 Gụọ 2 Timoti 1:5. Yunis kpara àgwà Timoti ga-amụta ihe na ya. Ọ ga-abụrịrị na ọ kụziiri ya na ọ bụ àgwà anyị ka anyị ga-eji egosi na anyị nwere ezigbo okwukwe. (Jems 2:26) O doro anya na Timoti hụrụ na ihe mere mama ya ji eme ihe ndị ọ na-eme bụ n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Timoti hụkwara na ife Jehova mere ka mama ya na-enwe obi ụtọ. Olee uru àgwà Yunis baara Timoti? Dị ka Pọl onyeozi kwuru, Timoti nwere ezigbo okwukwe ka nne ya. Ihe a emeghị ná ndaba. Timoti hụrụ àgwà ọma nne ya ma mụta ya. Taakwa, ọtụtụ ndị nne enyerela ndị ezinụlọ ha aka ife Jehova ‘n’ezighị ha ozi ọma.’ (1 Pita 3:​1, 2) I nwekwara ike ime otú ahụ. Olee otú ị ga-esi eme ya?

13. Gịnị mere ndị nne kwesịrị iji mee ka adịm ná mma ha na Jehova bụrụ ihe kacha ha mkpa ná ndụ?

13 Mee ka adịm ná mma gị na Jehova bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. (Diut. 6:​5, 6) Dịkwa ka ọtụtụ ndị nne, e nwere ọtụtụ ihe dị gị mkpa ị na-ahapụ. Ọ na-ewe gị oge na ego na ihe ndị ọzọ iji lekọta ụmụ gị. Mgbe ụfọdụ, o nwekwara ike ime ka ị ghara ihi ụra. Ma, i kwesịghị ikwe ka ọrụ ndị i ji n’aka mee ka ị ghara inwe oge ị ga-eji eme ka gị na Jehova dịrị ná mma. Na-ewepụta oge mgbe ọ bụla na-ekpe ekpere, na-amụ Baịbụl, ma na-aga ọmụmụ ihe. I mee otú ahụ, gị na Jehova ga-adịkwu ná mma, ya emeekwa ka ndị ezinụlọ gị na ndị ọzọ na-eme otú ahụ.

14-15. Gịnị ka ị mụtara n’aka Leanne, Maria, na João?

14 Ka anyị kọọ gbasara ndị na-eto eto mụtara ịhụ Jehova n’anya ma na-atụkwasị ya obi n’aka nne ha. Leanne bụ́ nwa Nwanna Nwaanyị Christine kwuru, sị: “Anyị na nne anyị enweghị ike ịmụ ihe mgbe papa anyị nọ ya. Ma, mama m na-agachi ọmụmụ ihe anya. Otú o si akpa àgwà nyeere anyị aka okwukwe anyị esikwuo ezigbo ike. Tupu anyị amalitedị ịga ọmụmụ ihe, anyị ma na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu.”

15 E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Maria. Papa ya na-ata ndị ezinụlọ ya ahụhụ mgbe ụfọdụ ma ha gaa ọmụmụ ihe. Ọ sịrị: “Mama m bụ otu n’ime ụmụnna nwaanyị kacha nwee obi ike m ma. Mgbe m ka na-eto eto, ọ na-esiri m ike mgbe ụfọdụ ime ihe ụfọdụ n’ihi ihe ndị mmadụ ga-ekwu. Ma, otú mama m si atụkwasị Jehova obi mgbe niile nyeere m aka ịkwụsị ịtụ ụjọ mmadụ.” E nwere otu nwanna aha ya bụ João. Papa ya machiri ha ikwu gbasara Baịbụl n’ụlọ ha. Ọ sịrị: “O nwere ike ịbụ na ihe kacha nyere m aka bụ otú mama m si agbalị ike ya niile ime papa m obi ụtọ. Ma, ọ naghị achọ imejọ Jehova iji mee ya obi ụtọ.”

16. Olee otú àgwà ọma nne nwere ike isi baara ndị ọzọ uru?

16 Ndị nne, chetanụ na otú unu si akpa àgwà nwere ike ịbara ndị ọzọ uru. Olee otú ọ bụ? Chegodị otú àgwà ọma Yunis si baara Pọl onyeozi uru. Pọl kwuru na Timoti nwere ezigbo okwukwe nakwa na ọ bụ nne ya “bụ́ Yunis bu ụzọ nwee ụdị okwukwe a.” (2 Tim. 1:5) Olee mgbe mbụ Pọl chọpụtara na Yunis nwere okwukwe? O nwere ike ịbụ oge ọ na-aga ozi ala ọzọ nke mbụ ya ka ọ hụrụ Lọịs na Yunis mgbe ọ gara Listra. Ọ ga-abụkwa na o nyeere ha aka ha aghọọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 14:​4-18) Chegodị echiche. Mgbe Pọl degaara Timoti akwụkwọ ozi mgbe ihe dị ka afọ iri na ise gachara, Pọl chetara otú Yunis si nwee okwukwe, kwuokwa na e kwesịrị ịna-eme ka ya. O doro anya na otú o si kpaa àgwà gbara Pọl ume nke ukwuu, o nwekwara ike ịbụ na ọ gbara ọtụtụ Ndị Kraịst ndị ọzọ nọ n’oge ahụ ume. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị gị na-azụ ụmụ gị ma ọ bụkwanụ na di gị abụghị Onye Kraịst, obi sie gị ike na okwukwe gị na-agba ndị ọzọ ume.

Inyere nwatakịrị aka ka ọ hụ Jehova n’anya na-ewe oge. Ma, ike agwụla gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na o yie ka ụmụ gị achọghị ife Jehova n’agbanyeghị mbọ ị na-agba inyere ha aka?

17 Ọ bụrụkwanụ na o yie ka mbọ ị na-agba ịzụ nwa gị na-akụ afọ n’ala? Cheta na ịzụ nwa na-ewe oge. Dị ka e gosiri na foto e ji kọwaa paragraf a, ọ bụrụ na ị kụọ mkpụrụ, i nwere ike ịna-eche mgbe ụfọdụ ma ọ̀ ga-etokwa mịa mkpụrụ. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị gịnwa ga-ekpebi ma ọ̀ ga-emecha too na-amị mkpụrụ, ị ka ga na-agba ya mmiri iji nyere ya aka ka o too. (Mak 4:​26-29) I nwere ike ịna-eche mgbe ụfọdụ ma mbọ ị na-agba inyere ụmụ gị aka ịhụ Jehova n’anya ọ̀ bakwara uru. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị gịnwa ga-ekpebiri ụmụ gị ihe ha ga-eme, ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe niile i nwere ike ime iji na-azụ ha, ọ pụtara na ị na-enyere ha aka ịbụ ndị enyi Chineke.​—Ilu 22:6.

TỤKWASỊ JEHOVA OBI NA Ọ GA-ENYERE GỊ AKA

18. Olee otú Jehova nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ka ha bụrụ ndị enyi ya?

18 Kemgbe oge Baịbụl, Jehova enyerela ọtụtụ ndị na-eto eto aka ịghọ ndị enyi ya. (Ọma 22:​9, 10) O nwekwara ike inyere ụmụ gị aka ịbụ ndị enyi ya ma ọ bụrụ na ha chọrọ. (1 Kọr. 3:​6, 7) Ọ bụrụgodị na o yie ka ụmụ gị achọghị ife Jehova, Jehova agaghị akwụsị ịhụ ha n’anya. (Ọma 11:4) Ọ bụrụ na ha emee ihe ọ bụla gosiri na ha “nwere ezi obi,” ọ ga-adị njikere inyere ha aka ka ha bụrụ ndị enyi ya. (Ọrụ 13:48; 2 Ihe 16:9) O nwere ike inyere gị aka ikwu ihe kwesịrị ekwesị n’oge i kwesịrị ikwu ya ya eruo ụmụ gị n’obi. (Ilu 15:23) O nwekwara ike ime ka nwanna nọ n’ọgbakọ unu anya ruru ala meta ha enyi. Mgbe ụmụ gị tolitechakwara, Jehova nwere ike inyere ha aka icheta ihe ị kụziiri ha n’oge gara aga. (Jọn 14:26) Ọ bụrụ na ị na-eji okwu ọnụ gị na omume gị na-azụ ụmụ gị, Jehova ga-agọzi gị.

19. Gịnị ka ị ga-eme ka ihe gị masị Jehova?

19 Ihe ga-eme ka Jehova hụ gị n’anya abụghị ihe ụmụ gị kpebiri ime. Ọ hụrụ gị n’anya n’ihi na gịnwa hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị gị na-azụ ụmụ gị, Jehova kwere nkwa ịbụrụ ụmụ gị Nna, bụrụkwa Onye na-echebe gị. (Ọma 68:5) Ọ bụghị gị ga-ekpebi ma ụmụ gị hà ga-efe Jehova ma ọ bụ na ha agaghị efe ya. Ma, ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere gị aka, meekwa ihe niile i nwere ike ime iji nyere ụmụ gị aka, ihe gị ga-amasị Jehova.

ABỤ NKE 134 Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke

^ N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị nne ga-amụta n’aka Yunis bụ́ nne Timoti nakwa otú ha ga-esi enyere ụmụ ha aka ịmata Jehova na ịhụ ya n’anya.

^ Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ Dị ka ihe atụ, gụọ ihe ọmụmụ nke 50 n’akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, nakwa isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Anyị Nwere Ike Iji Na-enwe Ofufe Ezinụlọ na Ọmụmụ Ihe Onwe Onye,” nke gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2011, peeji nke 6 na nke 7.