Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 18

Otú Ị Ga-esi Ekpebi Ihe Ndị Ị Ga-emekwu n’Ofufe Jehova ma Mee Ha

Otú Ị Ga-esi Ekpebi Ihe Ndị Ị Ga-emekwu n’Ofufe Jehova ma Mee Ha

“Na-echebara ihe ndị a echiche. Ka obi gị niile dịrịkwa na ha, ka mmadụ niile wee hụ na ị na-eme nke ọma n’ọgbakọ.”​—1 TIM. 4:15.

ABỤ NKE 84 Na-enyekwu Aka n’Ozi Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe ndị anyị nwere ike ikpebi ime n’ozi Jehova?

 EBE anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Anyị chọkwara ime ike anyị niile n’ofufe ya. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe niile anyị nwere ike imere Jehova, anyị kwesịrị ikpebi ihe ndị anyị chọrọ ime n’ozi ya, dị ka ịna-akpakwu àgwà Ndị Kraịst, ịmụta nkà ndị ga-aba uru, nakwa ịna-achọkwu ụzọ ndị anyị ga-esi na-ejere ndị ọzọ ozi.

2. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ihe ndị anyị chọrọ imekwu n’ozi Jehova ma gbaa mbọ mee ha?

2 Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-emekwu nke ọma n’ozi Jehova? Ihe bụ́ isi kpatara ya bụ na anyị chọrọ ịna-eme Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya obi ụtọ. Obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ hụ ka anyị na-eji nkà ndị anyị nwere na-eme ike anyị niile n’ozi ya. Ihe ọzọkwa bụ na anyị na-achọ ịna-emekwu nke ọma n’ozi Jehova ka anyị nwee ike ịna-enyekwuru ụmụnna anyị aka. (1 Tesa. 4:​9, 10) N’agbanyeghị afọ ole anyị nọrọla n’ọgbakọ, anyị ka nwere ike ịna-emekwu nke ọma. Ka anyị lee otú anyị nwere ike isi mee ya.

3. Dị ka e kwuru na 1 Timoti 4:​12-16, gịnị ka Pọl onyeozi gwara Timoti ka o mee?

3 Ọ bụ eziokwu na Timoti bụ okorobịa mgbe Pọl onyeozi detaara ya akwụkwọ ozi nke mbụ, ọ bụ okenye ma nke a na-akọ n’ọgbakọ mgbe ahụ. Ma, Pọl gbara ya ume ka ọ na-emekwu nke ọma n’ozi Jehova. (Gụọ 1 Timoti 4:​12-16.) Ka ị na-echebara ihe a Pọl kwuru echiche, ị ga-achọpụta na ọ chọrọ ka Timoti na-emekwu nke ọma n’ebe abụọ. Nke mbụ bụ ka ọ na-akpakwu àgwà e ji mara Ndị Kraịst, àgwà ndị dị ka ịhụnanya, okwukwe, na ibi ndụ dị ọcha. Nke abụọ abụrụ ka o nwee nkà ndị dị ka ịna-agụpụta ihe nke ọma, ịdụ ndị ọzọ ọdụ, na izi ihe. Anyị ga-atụle ihe Timoti mere iji hụ otú anyị ga-esi kpebie ihe ndị anyị ga-emeli ga-enyere anyị aka ịna-efekwu Jehova nke ọma. Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị ga-esi na-agbakwu mbọ n’ozi ọma.

NA-AKPAKWU ÀGWÀ E JI MARA NDỊ KRAỊST

4. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 2:​19-22, gịnị mere Timoti ji baa uru n’ọgbakọ?

4 Gịnị mere Timoti ji baa uru n’ọgbakọ Jehova? Ọ bụ àgwà ndị magburu onwe ha o nwere. (Gụọ Ndị Filipaị 2:​19-22.) Anyị leba anya n’otú Pọl si kọwaa Timoti, anyị ga-amata na Timoti ejighị ife Jehova egwu egwu. Ọ dị umeala n’obi, jiri ọrụ ya kpọrọ ihe, bụrụkwa onye e nwere ike ịtụkwasị obi. Ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya, ihe gbasara ha na-emetụkwa ya n’obi. Ọ bụ ya mere Pọl ji hụ Timoti n’anya, nyekwa ya ọrụ ụfọdụ siri ike. (1 Kọr. 4:17) Ọ bụrụkwa na anyị chọrọ ka anyị na-abara Jehova na ọgbakọ ya uru, anyị kwesịrị ịmụta àgwà ndị na-amasị ya.​—Ọma 25:9; 138:6.

Chọpụta àgwà Ndị Kraịst ị ga-achọ ịmụtakwu ịna-akpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6)

5. (a) Olee otú ị ga-esi họrọ àgwà ị chọrọ ịna-akpakwu? (b) Dị ka e gosiri na foto e ji kọwaa paragraf a, olee otú nwanna nwaanyị nke na-akatabeghị ahụ́ si agbasi mbọ ike ka ọ na-enwekwuru ndị ọzọ ọmịiko?

5 Họrọ otu àgwà ị ga-achọ ịna-akpa nke ọma. Kpee ekpere ma chee gbasara ebe i kwesịrị ịna-emekwu nke ọma n’àgwà gị. Họrọ otu àgwà. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ikpebi na ị ga na-enwekwuru ụmụnna gị ọmịiko ma ọ bụ ịna-agbakwu mbọ na-enyere ụmụnna gị aka. I nwekwara ike gbalịa ka gị na ndị ọzọ na-adịkwu n’udo ma na-agbagharakwu ndị mejọrọ gị. I nwere ike ịjụ ezigbo enyi gị ka ọ gwa gị otú i nwere ike isi na-emekwu nke ọma.​—Ilu 27:6.

6. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na e nwere àgwà ị ga-achọ ịmụtakwu?

6 Gbaa mbọ ka i mee ihe ahụ i kpebiri ime. Olee otú ị ga-esi eme ya? Otu ụzọ ị ga-esi eme ya bụ ịmụ gbasara àgwà ahụ ị chọrọ ịna-akpakwu. Ka e were ya na ị chọrọ ịgbalị na-agbagharakwu ndị ọzọ, ihe mbụ i nwere ike ime bụ ịgụ akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl gbasara ndị gbaghaara ndị ọzọ na ndị na-agbagharaghị ndị ọzọ ma tụgharịa uche na ha. Chee gbasara ihe Jizọs mere. O ji obi ya niile gbaghara ndị ọzọ. (Luk 7:​47, 48) Ọ na-elegharakwa ihe ndị ha mejọrọ anya ma lekwasị anya n’ihe ọma ndị ha nwere ike ime. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ndị Farisii n’oge Jizọs na-eme. Ha “na-ele ndị ọzọ anya ka ndị na-enweghị ihe ha bụ.” (Luk 18:9) Ọ bụrụ na i chebachaara akụkọ ndị a echiche, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m na-achọpụta n’ebe ndị ọzọ nọ? Olee àgwà ha ndị m na-elekwasịkarị anya?’ Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịgbaghara mmadụ, gbalịa dee àgwà ọma niile onye ahụ nwere i chetara. Jụzie onwe gị, sị: ‘Olee otú Jizọs si were onye a? Jizọs ọ̀ ga-agbaghara ya?’ Isi otú a amụ ihe ga-enyere anyị aka ịgbanwe otú anyị si eche echiche. Na mbụ, o nwere ike isiri anyị ike ịgbaghara onye mejọrọ anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-agbakwu mbọ, ka oge na-aga, ọ ga-adịkwuru anyị mfe ịgbaghara ndị mmadụ.

MỤTA NKÀ NDỊ BARA URU

Wepụta onwe gị ka a kụziere gị otú ị ga-esi na-arụzi ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7. Dị ka e kwuru n’Ilu 22:​29, olee ihe Jehova na-eji ụmụnna ndị nwere nkà arụ taa?

7 Ihe ọzọ i nwere ike ikpebi ime bụ ịmụta otu nkà bara uru. Chegodị gbasara ọtụtụ ndị ọrụ a chọrọ iji rụọ alaka ụlọ ọrụ, Ụlọ Mgbakọ, na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche. Ọtụtụ ụmụnna ndị a mụtara ọrụ ndị ha na-arụ mgbe ha na ụmụnna ndị ọzọ ma ọrụ ndị ahụ nke ọma rụkọrọ ọrụ. Dị ka e gosiri na foto e ji kọwaa paragraf a, ụmụnna ndị ahụ na-amụ nkà ndị dị mkpa ga-enyere ha aka ịna-arụzi Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe a so n’otú Jehova Chineke, bụ́ “Eze mgbe ebighị ebi,” na Jizọs Kraịst, bụ́ “Eze ndị eze,” si jiri ụmụnna anyị ndị a nwere nkà na-arụ ọtụtụ ihe dị ịtụnanya. (1 Tim. 1:17; 6:15; gụọ Ilu 22:29.) Anyị chọrọ ịgbalịsi ike iji nkà anyị na-eto Jehova, ọ bụghị onwe anyị.​—Jọn 8:54.

8. Olee otú ị ga-esi mata nkà ọ dị mkpa ka ị mụta?

8 Kpebie nkà ị chọrọ ịmụta. Olee nkà ị ga-amụ? Jụọ ndị okenye ọgbakọ unu. I nwekwara ike ịjụ onye nlekọta sekit unu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ha gwara gị na ọ dị mkpa ka ị mụtakwuo otú e si ekwu okwu na otú e si akụzi ihe, jụọ ha ebe ha chere ị ga-emekwu nke ọma. Gbazie mbọ ịna-emekwu nke ọma na ya. Olee otú ị ga-esi eme ya?

9. Ọ bụrụ na e nwere nkà ị chọrọ ịmụtakwu, gịnị ka ị ga-eme?

9 Gbaa mbọ ka i mee ihe ahụ i kpebiri. Ka e were ya na ị chọrọ ịmụtakwu otú e si akụzi ihe. Gbaa mbọ ka ị mụọ akwụkwọ Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe nke ọma. Ọ bụrụ na e kenye gị ihe omume n’ọmụmụ ihe etiti izu, tupu gị emewe ihe omume ahụ, i nwere ike ibu ụzọ mee ya n’ihu nwanna ma nke a na-akọ, gwa ya ka ọ tụọrọ gị aro ebe ị ga-emekwu nke ọma. Na-akwadebe ihe omume gị nke ọma ka ndị mmadụ chọpụta na ị na-agba mbọ, nakwa na e nwere ike ịtụkwasị gị obi.​—Ilu 21:5; 2 Kọr. 8:22.

10. Gịnị ga-enyere anyị aka ịmụta ihe anyị chọrọ ime? Nye ihe atụ.

10 Ọ bụrụ na ihe ị chọrọ ịmụta bụ ihe na-anaghị agara gị aka, gịnị ka ị ga-eme? Gbaa mbọ na-eme ya. Ọ na-esiburu otu nwanna aha ya bụ Garry ike ịgụ ihe. Ọ na-echeta otú ihere si eme ya ma ọ na-agụpụta ihe n’ọmụmụ ihe. Ma, ọ kwụsịghị ịgba mbọ na-amụta otú e si agụ ihe. Ugbu a, o kwuru na ọ na-enwezi ike ime ihe omume n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa ná mgbakọ dị iche iche n’ihi aka ụmụnna nyeere ya nakwa n’ihi ihe ndị ọ mụtara n’akwụkwọ anyị.

11. Gịnị ga-enyere anyị aka ijekwuru Jehova ozi ka Timoti?

11 Timoti ò mechara mụtara ịna-ekwu okwu na ịna-akụzi ihe nke ọma? Baịbụl agwaghị anyị. Ma, o doro anya na Timoti akwụsịghị ịna-eme nke ọma n’ozi ya n’ihi na o mere ihe Pọl gwara ya. (2 Tim. 3:10) Ọ bụrụkwa na anyịnwa amụtakwuo ịna-arụ ọrụ anyị nke ọma, anyị ga-adị njikere ịna-ejekwuru Jehova ozi.

NA-ACHỌ OTÚ Ị GA-ESI NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA

12. Olee otú ndị ọzọ sirila nyere gị aka?

12 Obi na-adị anyị niile ụtọ ma mmadụ nyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị anọrọ n’ụlọ ọgwụ, obi na-adị anyị ụtọ ma ndị okenye nọ na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ ma ọ bụkwanụ Ndị Na-aga Eleta Ndị Ọrịa bịa leta anyị. Ọ bụrụkwa na ihe ana-esiri anyị ike, obi na-adị anyị ụtọ ma okenye hụrụ anyị n’anya gee anyị ntị nke ọma ma kasie anyị obi. Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike iduzi ọmụmụ Baịbụl, obi na-adịkwa anyị ụtọ ma ọ bụrụ na ọsụ ụzọ ma nke a na-akọ esoro anyị gaa mụọrọ mmadụ ihe ma tụọrọ anyị aro ga-enyere anyị aka ịna-akụzikwu ihe nke ọma. Obi na-adị ụmụnna anyị ndị a niile ụtọ inyere anyị aka. Otú ahụ ka obi ga-adịkwa anyị ụtọ ma anyị wepụta onwe anyị na-enyere ụmụnna anyị aka. Jizọs sịrị: “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ọ bụrụ na ị chọrọ isi n’ụzọ ndị a ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ na-ejekwuru Jehova ozi, gịnị ga-enyere gị aka?

13. I kpebiwe ihe ị chọrọ ime, olee ihe i kwesịrị iburu n’obi?

13 Gbaa mbọ ka e nwee otu ihe i bu n’obi ime. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịsị, ‘M chọrọ ịna-ejekwuru Jehova ozi n’ọgbakọ.’ Ma, o nwere ike ịna-esiri gị ike ịma otú ị ga-esi mee ya. O nwekwara ike isiri gị ike ịma mgbe i mere ya. N’ihi ya, i kpebiwe ihe ị chọrọ ime, nwee ihe a kapịrị ọnụ i bu n’obi ime. I nwedịrị ike ide ihe ahụ ị chọrọ ime ede, deekwa otú ị chọrọ isi eme ya.

14. Anyị kpebiwe ihe anyị chọrọ ime, gịnị mere na anyị ekwesịghị isi ọnwụ na ọ bụ naanị otu ihe ka anyị ga-eme?

14 Ọ bụrụkwa na anyị ekpebiwe ihe anyị chọrọ ime, anyị ekwesịghị isi ọnwụ na ọ bụ naanị otu ihe ka anyị ga-eme. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụghị anyị ka ihe niile dị n’aka. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi nyere aka hiwe ọgbakọ na Tesalonaịka. O dokwara anya na o bu n’obi ịnọrọ ebe ahụ na-enyere ụmụnna ahụ batara n’ọgbakọ ọhụrụ aka. Ma ndị mmegide mere ka Pọl si n’obodo ahụ pụọ. (Ọrụ 17:​1-5, 10) A sị na Pọl siri ọnwụ nọrọ ebe ahụ, ọ gaara etinye ụmụnna ya ndị nọ ebe ahụ ná nsogbu. Ma, Pọl akwụsịghị inyere ha aka. Ihe o meziri bụ na o mere ihe ọ ga-emeli n’oge ahụ. Mgbe oge ụfọdụ gachara, o zigara Timoti ka ọ gaa nyere ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ na Tesalonaịka aka. (1 Tesa. 3:​1-3) Obi tọgburu ụmụnna nọ na Tesalonaịka atọgbu na Timoti wepụtara onwe ya ịna-ejere ụmụnna ya ozi n’ebe ọ bụla e zigara ya.

15. Olee otú ihe anyị bu n’obi ime nwere ike isi gbanwee mgbe ihe gbanwere ná ndụ anyị? Nye ihe atụ.

15 Anyị ga-amụta ihe n’ihe mere Pọl na Tesalonaịka. O nwere ike ịbụ na e nwere ọrụ anyị na-agbalị ka anyị ruo eruo ịrụ, ma ya abụrụ na otú ihe si dịrị anyị agaghị ekwe anyị iru eru ịrụ ya. (Ekli. 9:11) Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, gbalịa chọta ihe ọzọ ị ga-emeli. Ọ bụ ihe a ka otu nwanna aha ya bụ Ted na nwunye ya Hiedi mere. Ọrịa mere ka ha hapụ Betel. Ma, ha hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere ha ji chọọ ụzọ ndị ọzọ ha ga-esi jekwuoro ya ozi. Ihe mbụ ha mere bụ ịbanye ọsụ ụzọ oge niile. E mechakwara họpụta ha ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. A zụkwara Ted ya eruo eruo ịbụ onye na-arụchitere onye nlekọta sekit ọrụ. Mgbe e mechara gbanwee afọ ole ọ ga-abụ ndị nlekọta sekit ruo, ha akwụsị ọrụ ha, Ted na Heidi chọpụtara na ha agaghị eruli eru ịrụ ọrụ ahụ. Ọ bụ eziokwu na ihe a wutere ha, ma ha ghọtara na ha nwere ike isi n’ụzọ ndị ọzọ jeere Jehova ozi. Ted sịrị: “Anyị achọpụtala na e nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi jeere Jehova ozi.”

16. Gịnị ka anyị na-amụta ná Ndị Galeshia 6:4?

16 E nwere ihe ụfọdụ na-eme ná ndụ anyị anyị na-agaghị emeli ihe ọ bụla maka ha. N’ihi ya, ka ihe anyị ga-eji ekpebi ma ànyị bara uru ma ọ bụ na anyị abaghị uru ghara ịbụ ụdị ozi anyị na-eje ma ọ bụkwanụ anyị ewere ụdị ozi anyị na-eje na-atụnyere nke ndị ọzọ. Nwanna Nwaanyị Heidi sịrị: “Ọ bụrụ na i jiri onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ, ọ ga-eme ka obi ghara ịna-adị gị ụtọ.” (Gụọ Ndị Galeshia 6:4.) Ọ dị mkpa ka anyị na-achọta ụzọ ndị anyị ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka ma na-ejekwuru Jehova ozi. *

17. Olee otú i nwere ike isi gbaa mbọ iru eru ịrụ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ?

17 Ị ga-enwe ike ijekwuru Jehova ozi ma ọ bụrụ na ị naghị ebi ndụ okomoko ma zere ịna-eji ụgwọ ndị na-enweghị isi. Gbalịa ka e nwee obere ihe ndị ị ga-achọ ime ga-enyere gị aka ime nnukwu ihe ndị ị ga-achọ ime. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị ga-achọ ịbụ ọsụ ụzọ oge niile, i nwere ike ile ma ọ̀ ga-ekwe gị omume ịrụrụ ọsụ ụzọ inyeaka na-aga ka ọ dịgodị. Ọ bụrụ na ị chọrọ iru eru ịbụ ohu na-eje ozi, i nwere ike ịna-ewepụtakwu oge na-aga ozi ọma ma na-aga eleta ndị ahụ́ na-adịghị na ndị merela agadi nọ n’ọgbakọ unu. Ihe ndị ị na-eme ugbu a nwere ike inyere gị aka iru eru ịrụ ọrụ ndị ọzọ n’ọdịnihu. Kpebisie ike na ị ga na-eme ike gị niile n’ọrụ ọ bụla e nyere gị.​—Rom 12:11.

Kpebie otu ihe ị ga-emeli (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18) *

18. Dị ka e sere na foto e ji kọwaa paragraf a, gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Beverley?

18 Na anyị emeela agadi agaghị eme ka anyị ghara ịna-agbakwu mbọ n’ofufe Jehova. Ka anyị tụlee gbasara otu nwanna nwaanyị dị afọ iri asaa na ise aha ya bụ Beverley. E nwere ezigbo ọrịa ọ na-arịa nke mere ka ọ na-esiri ya ike ịga ije. Ma, ọ chọsiri ike ime ike ya niile iji kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. O kpebiri ihe ọ ga-achọ ime. Mgbe Nwanna Nwaanyị Beverley mere ihe o kpebiri ime maka ịkpọ òkù a, obi tọgburu ya atọgbu. Otú a o si gbaa mbọ mere ka ndị ọzọ gbalịsikwuokwa ike n’ozi ọma. Jehova ji ọrụ ndị agadi na-arụ kpọrọ ihe, ọ bụrụgodị na otú ihe si dịrị ha mere ka ha ghara ịna-emecha ihe niile ha bu n’obi ime.​—Ọma 71:​17, 18.

19. Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ikpebi ime n’ofufe Jehova?

19 Kpebie ime ihe ndị ị ga-emeli. Gbalịa mụta àgwà ndị ga-eme ka gị na Jehova dịrị ná mma. Mụta nkà ndị ga-enyere gị aka ijekwuru Jehova na ọgbakọ ya ozi. Na-achọpụta ụzọ ị ga-esi na-enyekwuru ụmụnna gị aka. * Dịkwa ka Timoti, Jehova ga-enyere gị aka ka “mmadụ niile wee hụ na ị na-eme nke ọma n’ọgbakọ.”​—1 Tim. 4:15.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

^ Timoti bụ aka ochie n’ikwusa ozi ọma. N’agbanyeghị ya, Pọl onyeozi gbara ya ume ka ọ na-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova. Timoti mere ihe a Pọl gwara ya, ya emee ka ọ na-abakwuru Jehova na ụmụnna ya uru. Dị ka Timoti, ị̀ chọrọ ịna-ejekwuru Jehova na ụmụnna gị ozi? O doro anya na ị chọrọ. Olee ihe ị ga-ekpebi ime ga-enyere gị aka ime otú ahụ? Oleekwa ihe i kwesịrị ime ka i nwee ike ime ihe ndị ahụ i kpebiri ime?

^ Gụọ isiokwu nta bụ́ “Ije Ozi n’Ebe A Chọkwuru Ndị Nkwusa” n’akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, isi nke iri, paragraf nke 6 ruo na nke 9.

^ Gụọ isi nke iri isii n’akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Isiokwu ya bụ “Nọgide Na-eme Ka Gị na Jehova Na-adị ná Mma.”

^ NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-akụziri ụmụnna nwaanyị abụọ otú e si arụzi ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha na-emekwa ihe a kụziiri ha.

^ NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-anaghị apụta èzí ji ekwentị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs.