Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ bụrụ na Onye Kraịst agbaa nwunye ya alụkwaghịm Baịbụl na-akwadoghị, lụọ onye ọzọ, olee otú ọgbakọ ga-esi ewere alụmdi na nwunye ya nke mbụ na nke ọhụrụ?

Ụdị ihe a mee, ọgbakọ na-ewere ya na alụmdi na nwunye nke mbụ ahụ agaala mgbe nwoke ahụ gara lụọ onye ọzọ. Ha na-ewerekwa ya na ya na nwaanyị ahụ ọ lụrụ ọhụrụ bụ di na nwunye. Iji ghọta ihe mere anyị ji kwuo ihe a, ka anyị leba anya n’ihe Jizọs kwuru banyere ịgba alụkwaghịm na mmadụ ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye.

Na Matiu 19:​9, Jizọs kọwara naanị ihe nwere ike ime ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, wee lụọ nwaanyị ọzọ, ma ọ́ bụghị maka na nwunye ya ahụ kwara iko, na-akwa iko.” E nwere ihe abụọ dị mkpa anyị na-amụta n’ihe a Jizọs kwuru. (1) Na ọ bụ naanị ịkwa iko ka Akwụkwọ Nsọ kwuru nwere ike ime ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm. (2) Na nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụrụ na ọ bụghị maka na nwunye ya kwara iko, lụọ nwaanyị ọzọ, ọ na-akwa iko. *

Ihe a Jizọs kwuru ọ̀ pụtara na nwoke kwaa iko, gbaa nwunye ya alụkwaghịm, na Akwụkwọ Nsọ kwadoro ka ọ lụgharịa nwaanyị? Ọ bụchaghị ihe ọ pụtara. Ọ bụrụ na nwoke akwaa iko, nwunye ya nwere ike ikpebi ma ọ̀ ga-agbaghara ya ma ọ bụ na ọ gaghị agbaghara ya. Ọ bụrụ na ọ jụ ịgbaghara ya, gbaa ya alụkwaghịm, ha abụọ nweziri ike ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụrụhaala na ụlọikpe enye ha akwụkwọ ikpeazụ gosiri na ha agbaala alụkwaghịm.

Ma, nwunye ya nwere ike iji obi ya niile chọọ ka ya na di ya ka lụwakwa, ya agwazie di ya na ya agbagharala ya. Ọ bụrụkwanụ na di ya ahụ kwara iko jụrụ mgbaghara ahụ nwunye ya gbaghaara ya, naanị ya agazie gbaa alụkwaghịm? Ebe ọ bụ na nwunye ya dị njikere ịgbaghara ya, chọọkwa ka ha ka na-alụ, Baịbụl akwadoghị ka ọ gaa lụọ nwaanyị ọzọ. Ọ bụrụ na o sie ọnwụ jụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, gaa lụọ nwaanyị ọzọ n’agbanyeghị na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ka o mee otú ahụ, ọ kwaala iko ọzọ. Ndị okenye ọgbakọ ga-ehiwere ya kọmitii ikpe ọzọ ma leba okwu ya anya.​—1 Kọr. 5:​1, 2; 6:​9, 10.

Ọ bụrụ na nwoke agbaa nwunye ya alụkwaghịm Baịbụl na-akwadoghị, lụọ nwaanyị ọzọ, olee otú ọgbakọ ga-esi were alụmdi na nwunye ya nke mbụ na nke ọhụrụ? À ga-ewere ya na ya na nwunye mbụ ya ka bụ di na nwunye n’ihi ihe Baịbụl kwuru? Nwunye mbụ ya ọ̀ ka kwesịrị ikpebi ma ọ̀ ga-agbaghara ya ma ọ bụ ghara ịgbaghara ya? Ọgbakọ ọ̀ ga-ewere ya na nwoke ahụ na nwaanyị ahụ ọ lụrụ ọhụrụ na-akwa iko?

N’oge mbụ, ọgbakọ na-ewere ya na ya na nwaanyị ọhụrụ ahụ na-akwa iko ma ọ bụrụhaala na nwunye mbụ ya ahụ ka dị ndụ, ọ lụgharịbeghị di ma ọ bụ kwaa iko. Ma, Jizọs ekwughị gbasara nwunye nwoke ahụ mgbe ọ na-ekwu gbasara ịgba alụkwaghịm na ịlụgharị nwaanyị. Kama, ọ kọwara na ọ bụrụ na nwoke agbaa nwunye ya alụkwaghịm Baịbụl na-akwadoghị ma lụọ nwaanyị ọzọ, ọ na-akwa iko. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee, alụkwaghịm ahụ nwoke ahụ gbara na nwaanyị ọ lụgharịrị bụ ịkwa iko. Ihe a emeela ka nke ya na nwunye mbụ ya bie.

“Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, wee lụọ nwaanyị ọzọ, ma ọ́ bụghị maka na nwunye ya ahụ kwara iko, na-akwa iko.”​—Mat. 19:9.

Ọ bụrụ na nwoke agbaa nwunye ya alụkwaghịm ma lụọ nwaanyị ọzọ, o nweghịzi otú nwunye mbụ ya ahụ ga-esi gbaghara ya ma ọ bụ ghara ịgbaghara ya. N’ihi ya, ọ baghịzi uru ka nwaanyị ahụ kpebie ma ọ̀ ga-agbaghara ya ma ọ bụkwanụ na ọ gaghị agbaghara ya. Ihe ọzọ bụ na, ma nwunye mbụ ya ahụ ọ̀ nwụrụ anwụ ma ọ bụ lụọ di ọzọ ma ọ bụkwanụ kwaa iko agaghị agbanwe otú ọgbakọ si were alụmdi na nwunye ọhụrụ ahụ. *

N’ihe atụ ahụ anyị mere, nwoke ahụ kwara iko, nke mere ka ha gbaa alụkwaghịm. Ọ bụrụkwanụ na nwoke ahụ akwaghị iko, ma ya agbaa nwunye ya alụkwaghịm, lụọ nwaanyị ọzọ, ma ọ bụkwanụ na ọ kwaghị iko tupu ya agbaa nwunye ya alụkwaghịm ma kwaa iko mgbe ọ gbachara alụkwaghịm lụọ nwaanyị ọzọ n’agbanyeghị na nwunye ya dị njikere ịgbaghara ya? N’ihe atụ ndị a, alụkwaghịm ahụ ọ gbara na nwaanyị ọ lụgharịrị, nke bụ́ ịkwa iko, mere ka alụmdi na nwunye mbụ ahụ bie. Iwu kwadoro alụmdi na nwunye nke ọhụrụ ahụ. Ụlọ Nche May 15, 1980, peeji nke 32, kwuru na ebe ọ bụ na ọ lụọla nwaanyị ọzọ, ọ gaghị akwụsịli alụmdi na nwunye ahụ ma laghachi n’otú ihe dị na mbụ. Alụmdi na nwunye mbụ ya biri mgbe ọ gbara alụkwaghịm, kwaa iko, ma lụọ nwaanyị ọzọ.

Ihe a anyị ghọtara ugbu a emeghị ka alụmdi na nwunye gharazie ịdị nsọ ma ọ bụkwanụ mee ka ịkwa iko ghara ịbụzi ihe jọgburu onwe ya. Ọ bụrụ na nwoke agbaa nwunye ya alụkwaghịm otú Baịbụl na-akwadoghị ma lụọ nwaanyị ọzọ mgbe Baịbụl na-akwadoghị ka o mee otú ahụ, a ga-ekpe ya ikpe n’ọgbakọ maka ịkwa iko. Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ ọ lụrụ ọhụrụ bụ Onye Kraịst, a ga-ekpekwa yanwa ikpe maka ikwa iko. Ọ bụ eziokwu na a gaghị na-ele ha anya ka ndị na-akwa iko ma ha lụchaa, ma nwoke ahụ agaghị eru eru inweta ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ, ruokwa mgbe ndị mmadụ kwụsịrị iwe iwe maka ihe ọjọọ ahụ o mere ma ọ bụkwanụ malitekwa kwanyewere ya ùgwù. Ma, tupu e nyewekwa ya ọrụ n’ọgbakọ, ndị okenye kwesịrị iche gbasara otú ihe dịịrị nwunye mbụ ya ọ ghọgburu nakwa obere ụmụaka ya ọ gbahapụrụ ma ọ bụrụ na e nwere.​—Mal. 2:​14-16.

Mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm otú Baịbụl na-akwadoghị, lụọ onye ọzọ, ọ na-akpata ezigbo nsogbu. N’ihi ya, Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ele alụmdi na nwunye anya ka ihe dị nsọ otú ahụ Jehova si ele ya.​—Ekli. 5:​4, 5; Hib. 13:4.

^ Ka ihe anyị ga-ekwu n’isiokwu a doo anya, anyị ga-ewere ya na ọ bụ nke nwoke kwara iko, onye nke aka ya dị ọcha abụrụ nwaanyị. Ma n’ihe Jizọs kwuru na Mak 10:​11, 12, o mere ka o doo anya na ndụmọdụ o nyere n’okwu a gbasara ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị.

^ Ihe a gbanwere ihe anyị ghọtaburu. Anyị ghọtaburu na a ka ga-ewere ya na ya na nwaanyị ọzọ ahụ ọ lụrụ na-akwa iko ruo mgbe nwunye mbụ ya ahụ nwụrụ ma ọ bụ lụgharịa di ma ọ bụkwanụ kwaa iko.