Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 15

‘Otú I Si Ekwu Okwu Ọ̀ Bụ Ihe E Ji Ama Atụ’?

‘Otú I Si Ekwu Okwu Ọ̀ Bụ Ihe E Ji Ama Atụ’?

“Ka otú i si ekwu okwu . . . bụrụ ihe ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ji ama atụ.”​—1 TIM. 4:12.

ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Ònye nyere anyị onyinye ikwu okwu?

 IKWU okwu bụ onyinye Chineke anyị hụrụ anyị n’anya nyere anyị. Nwoke mbụ bụ́ Adam kwuwere okwu ozugbo Chineke kechara ya, ya na Nna ya nke eluigwe ana-akparịta ụka. Chineke mekwara ka Adam nwee ike ịna-echepụta okwu ọhụrụ. Adam ji onyinye a Chineke nyere ya gụọ ụmụ anụmanụ niile aha. (Jen. 2:19) Obi dịkwa ya ezigbo ụtọ mgbe mbụ ọ hụrụ mmadụ ya na ya ga na-ekwurịta okwu, ya bụ, nwunye ọma ya bụ́ Iv.​—Jen. 2:​22, 23.

2. Olee otú ndị mmadụ si jiri ire ha na-ekwu ihe na-adịghị mma ma n’oge gara aga ma n’oge anyị a?

2 E mechara jiri onyinye ahụ mewe ihe na-ekwesịghị ekwesị. Setan bụ́ Ekwensu ghaara Iv ụgha. Ụgha ahụ mere ka ụmụ mmadụ mee mmehie ma gharazie izu okè. (Jen. 3:​1-4) Adam ejighị ire ya mee ihe kwesịrị ekwesị mgbe ọ tara Iv ụta, taakwa Jehova ụta maka ihe o mejọrọ. (Jen. 3:12) Ken ghaara Jehova ụgha mgbe o gbuchara nwanne ya Ebel. (Jen. 4:9) Mgbe e mechakwara, Lemek si n’agbụrụ Ken dere abụ gosiri na tigbuo zọgbuo juru n’ụwa n’oge ya. (Jen. 4:​23, 24) Olee otú ndị mmadụ si eme taa? Anyị na-ahụ na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpọ ndị mmadụ iyi n’ihu ọha. Ọ na-esikwa ike ịhụ fim a na-anaghị ekwu okwu na-adịghị mma na ya taa. Ụmụ akwụkwọ na-anụ ka ụmụaka ibe ha na-akpọ ndị mmadụ iyi, ndị toro eto na-anụkwa ka a na-akpọ ndị ọzọ iyi n’ebe ha na-arụ ọrụ. Ọ dị mwute na okwu rere ure juru n’ụwa taa. Ọ na-egosikwa na ụwa a anyị nọ na ya jọgburu onwe ya.

3. Olee ihe anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime, oleekwa ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, otú anyị si anụ okwu rere ure ebe niile nwere ike ime ka anyị soro na-ekwu ya. Ebe anyị bụ Ndị Kraist, anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-ekwu okwu rụrụ arụ. Anyị kwesịkwara iji onyinye ikwu okwu na-eme ihe dị mma, ya bụ, iji ya na-eto Chineke. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi na-eme ya n’ụzọ ebe atọ, nke mbụ n’ozi ọma, nke abụọ n’ọmụmụ ihe, nakwa nke atọ mgbe anyị na ndị mmadụ na-akparịta kwa ụbọchị. Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe mere ihe anyị na-ekwu ji agbasa Jehova.

IHE ANYỊ NA-EKWU NA-AGBASA JEHOVA

Gịnị ka okwu gị na-egosi gbasara ihe dị gị n’obi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5) *

4. Dị ka e kwuru na Malakaị 3:​16, gịnị mere ihe anyị na-ekwu ji agbasa Jehova?

4 Gụọ Malakaị 3:16. Jehova nwere “akwụkwọ e dere aha ndị ọ ga-echeta.” Ndị ọ na-edeba aha ha na ya bụ ndị ihe ha na-ekwu na-egosi na ha na-atụ egwu ya ma na-echebara aha ya echiche. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ihe anyị na-ekwu na-egosi ihe dị anyị n’obi. Jizọs sịrị: “Ihe juru mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Mat. 12:34) Ihe anyị na-ekwu gbasara ya na-egosi otú anyị hụruru Jehova n’anya. Jehova chọrọ ka ndị hụrụ ya n’anya dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya.

5. (a) Olee otú ihe anyị na-ekwu si gbasa ofufe anyị na-efe Jehova? (b) Dị ka e gosiri na foto e ji kọwaa paragraf a, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi gbasara ihe anyị na-ekwu?

5 Ihe anyị na-ekwu nwere ike ime ka Jehova nabata ofufe anyị na-efe ya ma ọ bụ ghara ịnabata ya. (Jems 1:26) Ụfọdụ ndị na-ahụghị Jehova n’anya na-eji iwe ekwu okwu, na-ekwu okwu ọjọọ nakwa okwu na-egosi na ha dị mpako. (2 Tim. 3:​1-5) O doro anya na anyị achọghị ịdị ka ha. Anyị chọsiri ike iji okwu ọnụ anyị na-eme Jehova obi ụtọ. Ma, obi ọ̀ ga-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ana-ekwu okwu ọma ma anyị nọrọ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ n’ozi ọma, ma anyị ana-agwa ndị ezinụlọ anyị okwu ọjọọ n’ime ụlọ?​—1 Pita 3:7.

6. Olee uru okwu ọma Nwanna Nwaanyị Kimberly na-ekwu bara?

6 Ọ bụrụ na anyị ana-ekwu okwu dị mma, anyị na-egosi na anyị bụ ndị na-efe Jehova. Anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịhụ ihe dị iche “n’onye na-ejere Chineke ozi na onye na-anaghị ejere ya ozi.” (Mal. 3:18) Ọ bụ ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Kimberly. * E nyere ya na nwa klas ha ihe ha ga-arụ n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe ha mechara ya, nwa klas ha ahụ chọpụtara na Kimberly dị iche n’ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ. Ọ naghị akatọ ndị mmadụ n’azụ ha. Ọ naghị ekwu okwu ọjọọ. Ọ naghịkwa akpọ mmadụ iyi. Ihe ahụ masịrị nwa klas ha ahụ, ya emechaakwa kweta ka a mụwara ya Baịbụl. Obi na-adị Jehova ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na otú anyị si ekwu okwu emee ka ndị mmadụ chọọ ịmatakwu gbasara ya.

7. Olee ihe i kpebisiri ike iji onyinye ikwu okwu Chineke nyere gị na-eme?

7 Anyị niile kwesịrị ịna-ekwu okwu otú ga-eme ka e too Jehova, meekwa ka anyị na ụmụnna anyị dịrịkwuo ná mma. N’ihi ya, ka anyị kwuo ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ka ‘otú anyị si ekwu okwu bụrụ ihe e ji ama atụ.’

NA-EKWU OKWU ỌMA MA Ị NỌRỌ N’OZI ỌMA

Ịna-agwa ndị ọzọ okwu ọma ma anyị nọrọ n’ozi ọma na-eme Jehova obi ụtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

8. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jizọs si saa ndị mmadụ okwu n’ozi ọma?

8 Ndị ọzọ mee ihe ga-eme ka i wewe iwe, jiri obiọma gwa ha okwu ma kwanyere ha ùgwù. Mgbe Jizọs na-ekwusa ozi ọma, e boro ya ebubo na ọ na-aṅụ oké mmanya, na-eri oké nri, na ọ na-arụrụ Ekwensu ọrụ, na-emebi iwu Ụbọchị Izu Ike, na-ekwulukwa Chineke. (Mat. 11:19; 26:65; Luk 11:15; Jọn 9:16) Ma, Jizọs ejighị iwe saa ha okwu. Anyị kwesịrị ịna-eme ka Jizọs. Mmadụ gwa anyị okwu ọjọọ, anyị ekwesịghị iji iwe saa ya okwu. (1 Pita 2:​21-23) Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ gwa anyị okwu ọjọọ, ọ naghị adị mfe iji obiọma asa ya okwu. (Jems 3:2) Gịnị nwere ike inyere anyị aka?

9. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ijide onwe anyị ka anyị ghara ikwu okwu na-adịghị mma n’ozi ọma?

9 Ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu ọjọọ n’ozi ọma, gbalịa ka iwe ghara iwe gị. Otu nwanna aha ya bụ Sam sịrị: “M na-agbalị na-eche gbasara otú o si dị mkpa ka onye m gara izi ozi ọma nụ gbasara Chineke, na-echetakwa na onye ahụ ka nwere ike ịgbanwe.” Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na oge anyị ji bịa izi mmadụ ozi ọma adịcharaghị ya mma. O nwere ike ime ka o wewe iwe. Ọ bụrụ na onye anyị chọrọ izi ozi ọma na-ewe iwe, anyị nwere ike ime ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lucia na-eme. Anyị nwere ike ikpe ekpere dị nkenke rịọ Jehova ka o nyere anyị aka ka anyị ghara iwe iwe ma ọ bụ ikwu ihe na-adịghị mma ma ọ bụ ịkparị onye ahụ.

10. Dị ka e kwuru na 1 Timoti 4:​13, olee ihe anyị kwesịrị ịna-eme?

10 Na-akụzikwu ihe nke ọma. Timoti na-ezi ozi ọma nke ọma. Ma, ọ ka kwesịkwara ịgba mbọ na-akụzi ihe nke ọma. (Gụọ 1 Timoti 4:13.) Olee otú anyị nwere ike isi mụta ịna-akụzikwu ihe nke ọma n’ozi ọma? Anyị kwesịrị ịna-akwadebe nke ọma. Anyị nwere ọtụtụ ihe ga-enyere anyị aka ịna-akụzi ihe nke ọma. Anyị nwere ike ịhụ ihe ga-enyere anyị ezigbo aka na broshọ bụ́ Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe nakwa n’agba nke bụ́ “Mụtakwuo Izi Ozi Ọma nke Ọma” n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Ị̀ na-eji akwụkwọ ndị a akwadebe nke ọma maka ozi ọma? Ọ bụrụ na anyị akwadebe nke ọma, obi ga-eru anyị ala, anyị ejiri obi ike na-ezi ozi ọma.

11. Olee otú ụfọdụ Ndị Kraịst si mụtakwuo ịna-akụzi ihe nke ọma?

11 Anyị nwekwara ike ịmụta ịna-akụzi ihe nke ọma ma anyị na-ele otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ si akụzi ihe, na-amụtakwa ihe n’aka ha. Nwanna Sam anyị kwuburu okwu ya na-ajụ onwe ya ihe mere ụfọdụ ụmụnna ji akụzi ihe nke ọma. Ọ na-ege ntị nke ọma ma ha na-akụzi ihe, na-agbalịkwa ịna-eme ka ha. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Talia na-ege ntị nke ọma mgbe ụmụnna ndị bụ́ aka ochie na-ekwu okwu ihu ọha. Ihe a enyerela ya aka ịmụta otú ya na ndị mmadụ ga-esi na-ekwurịta ihe ndị ha na-ajụkarị ajụjụ gbasara ha n’ozi ọma.

NA-EKWU OKWU ỌMA N’ỌMỤMỤ IHE

Iji obi anyị niile na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe na-eto Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12. Olee ihe na-esiri ụfọdụ ndị ike?

12 Ọ bụrụ na anyị niile esoro na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe ma na-aza ajụjụ anyị kwadebere nke ọma, ọ ga-eme ka ọmụmụ ihe na-aga nke ọma. (Ọma 22:22) Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịbụ abụ ma ọ bụ ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ọ̀ na-esiri gị ike? Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike, ịmụta ihe nyeere ndị ọzọ aka ha akwụsị ịtụ ụjọ ịbụ abụ na ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe ga-enyere gị aka.

13. Gịnị nwere ike inyere gị aka iji obi gị niile na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe?

13 Jiri obi gị niile na-abụ abụ. Anyị bụwa abụ n’ọmụmụ ihe, ihe kwesịrị ịka bụrụ mkpa anyị bụ ito Jehova. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sara anaghị ewere onwe ya ka onye ma abụ abụ. Ma, ọ chọrọ iji abụ na-eto Jehova. N’ihi ya, ọ chọpụtara na ịkwadebe abụ ndị a ga-abụ n’ọmụmụ ihe n’ụlọ otú ahụ o si akwadebe ihe omume ndị ọzọ na-enyere ya aka. Ọ na-abụ abụ ndị a ga-abụ, na-agbalịkwa achọpụta otú ihe ndị e dere na ha si gbasa ihe ndị a ga-amụ n’ụbọchị ahụ. Ọ sịrị: “Ihe a na-enyere m aka itinyekwu uche n’ihe ndị e dere n’abụ ahụ kama ichegbuwe onwe m ma m̀ na-abụtakwa ya nke ọma.”

14. Ọ bụrụ na ị bụ onye ihere, gịnị nwere ike inyere gị aka ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe?

14 Na-aza ajụjụ mgbe niile. Ihe a nwere ike isiri ụfọdụ ndị ike. Nwanna Nwaanyị Talia anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ezigbo ụjọ na-atụ m ma m kwuwe okwu n’ihu ndị mmadụ. E nwere ike ndị ọzọ agaghị na-achọpụta ya n’ihi na ọ naghị apụtakarị m n’olu. N’ihi ya, ịza ajụjụ na-esiri m ezigbo ike.” Ma, ihe a emeghị ka Nwanna Nwaanyị Talia kwụsị ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Mgbe ọ na-akwado ọmụmụ ihe, ọ na-echeta na onye mbụ a kpọrọ ka ọ zaa ajụjụ kwesịrị ịza ihe dị nkenke, zaakwa ihe a jụrụ. Ọ sịkwara: “Ihe ọ pụtara bụ na azịza m nwere ike ịdị nkenke, doo anya, a ghọtakwa ya nke ọma n’ihi na ọ bụ ụdị azịza ahụ ka onye na-eduzi ihe chọrọ.”

15. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta gbasara azịza anyị?

15 E nwekwara Ndị Kraịst na-abụghị ndị ihere ma ya ana-esiri ha ike ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. N’ihi gịnị? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Juliet sịrị: “Mgbe ụfọdụ, anaghị m ekwe aza ajụjụ n’ihi na ụjọ na-atụ m na azịza m na-adị oké nkenke, nakwa na ọ naghị adịcha mma.” Ma, cheta na Jehova chọrọ ka anyị na-aza ajụjụ kacha mma anyị nwere ike ịza. * Obi na-atọ ya ụtọ maka na anyị kpebisiri ike ịna-eto ya n’ọmụmụ ihe nakwa na anyị ekweghị ka ụjọ mee ka anyị ghara ịna-aza ajụjụ.

NA-EKWU OKWU ỌMA MA GỊ NA NDỊ ỌZỌ NA-AKPARỊTA ỤKA KWA ỤBỌCHỊ

16. Olee ụdị okwu anyị kwesịrị izere?

16 Zere “ịkparị mmadụ” n’ụdị ya ọ bụla. (Efe. 4:31) Dị ka anyị kwuburu, Onye Kraịst ekwesịghị ịna-akpọ mmadụ iyi. Ma, e nwere ụzọ ndị ọzọ mmadụ nwere ike isi kparịa mmadụ anyị kwesịkwara izere. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịna-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara ndị si n’agbụrụ ọzọ ma ọ bụ n’obodo ọzọ. Anyị kwesịkwara izere ịgwa ndị ọzọ okwu na-adịghị mma. Otu nwanna sịrị: “E nweela mgbe ụfọdụ m mara mmadụ njakịrị, buru n’obi na ọ bụ naanị ka a chịa ọchị, ma ya abụrụ na okwu ahụ adịghị mma, ya ewutekwa onye ahụ. Ma, nwunye m enyerela m aka kemgbe ọtụtụ afọ n’ihi na ọ na-agwa m ma naanị mụ na ya nọrọ na ihe m kwuru adịghị mma, nakwa na o wutere ya ma ọ bụ ndị ọzọ.”

17. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 4:​29, olee otú anyị nwere ike isi kwuo ihe ga-eme ka okwukwe ụmụnna anyị sikwuo ike?

17 Na-ekwu ihe ga-eme ka okwukwe ndị ọzọ sikwuo ike. Na-aja ndị ọzọ mma kama ịna-akatọkarị ha ma ọ bụ ịna-eme mkpesa. (Gụọ Ndị Efesọs 4:29.) E nwere ọtụtụ ihe ndị Izrel nwere kwesịrị ime ka ha na-enwe obi ụtọ. Ma, ha akwụsịghị ịna-eme mkpesa. Ọ bụrụ na anyị ana-eme mkpesa mgbe niile, o nwere ike ime ka ndị ọzọ na-emekwa mkpesa. Cheta na ihe na-adịghị mma ndị gara inyopụta Ala Nkwa kwuru mere ka “ndị Izrel niile . . . malite ịkatọ Mosis.” (Ọnụ Ọgụ. 13:31–14:4) Ma, ọ bụrụ na anyị ana-aja ndị ọzọ mma, ọ ga-eme ka onye ọ bụla na-enwe obi ụtọ. O doro anya na otú ndị enyi ada Jefta si aja ya mma gbara ya ezigbo ume, ya anọsie ike n’ozi ọ na-ejere Jehova. (Ikpe 11:40) Nwanna Nwaanyị Sara anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ọ bụrụ na anyị ana-aja ndị ọzọ mma, ọ ga-eme ka ha mata na Jehova hụrụ ha n’anya, nakwa na ụmụnna ha hụrụ ha n’anya.” N’ihi ya, na-achọ ụzọ ndị ị ga-esi jiri obi gị niile na-aja ụmụnna gị mma.

18. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 15:​1, 2, gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ekwu eziokwu, gịnịkwa ka anyị na-ekwesịghị ime?

18 Na-ekwu eziokwu. Ọ bụrụ na anyị ana-agha ụgha, anyị agaghị emeli ihe dị Jehova mma. Ọ kpọrọ ụdị ụgha ọ bụla asị. (Ilu 6:​16, 17) Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị n’ụwa taa weere ya na ịgha ụgha dị mma, ma anyị kwesịrị izere ya n’ihi na Jehova sị na ọ dịghị mma. (Gụọ Abụ Ọma 15:​1, 2.) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ekwesịghị ịna-agha ụgha, anyị ekwesịghịkwa ịkpachara anya na-aghọgbu ndị ọzọ.

Ịkwụsị ikwu ihe na-adịghị mma kwuwezie ihe dị mma ga-eme ka anyị na Jehova na-adị ná mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

19. Olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ịkpachara anya maka ya?

19 Zere ịna-agba asịrị. (Ilu 25:23; 2 Tesa. 3:11) Nwanna Nwaanyị Juliet anyị kwuburu okwu ya kọwara ihe ige asịrị na-eme ya. Ọ sịrị: “Ige ebe e ji ndị ọzọ agba asịrị na-eme ka obi ghara ịdị m mma. Ọ na-emekwa ka m ghara ịtụkwasịzi onye ahụ na-agba asịrị obi. A sị ka e kwuwe, olee otú m si mara na ọ gaghịkwa eji m agbara ndị ọzọ asịrị?” Gị na mmadụ kwuwe okwu, gị achọpụta na ọ banyewela n’asịrị, kwuwe gbasara ihe dị mma.​—Kọl. 4:6.

20. Gịnị ka i kpebisiri ike iji okwu ọnụ gị na-eme?

20 Ebe ọ bụ na anyị bi n’ụwa ọtụtụ ndị na-ekwu okwu na-adịghị mma, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-ekwu okwu otú dị Jehova mma. Cheta na ọ bụ Jehova mere ka anyị na-ekwu okwu. Ihe anyị na-ekwu gbasakwara ya. Ọ ga-agọzi mbọ anyị na-agba ịna-ekwu okwu dị mma n’ozi ọma, n’ọmụmụ ihe, nakwa ma anyị na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu kwa ụbọchị. Mgbe ụwa ochie a ga-agafe, ọ gaghị esiri anyị ike iji okwu ọnụ anyị na-eto Jehova. (Jud 15) Ma ka ọ dị ugbu a, kpebisie ike iji ‘ihe ị na-ekwu’ na-eme Jehova obi ụtọ.​—Ọma 19:14.

ABỤ NKE 121 Anyị Kwesịrị Ịna-ejide Onwe Anyị

^ Jehova nyere anyị onyinye magburu onwe ya, ya bụ, onyinye ikwu okwu. Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ ndị anaghị eji onyinye a eme ihe Jehova chọrọ ka anyị jiri ya na-eme. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịna-ekwu ihe ga-agba ndị ọzọ ume na ihe ga-eme ka obi dị Jehova ụtọ n’ụwa ọjọọ a? Olee otú anyị nwere ike isi na-ekwu okwu na-eme Jehova obi ụtọ ma anyị nọrọ n’ozi ọma, ma anyị gaa ọmụmụ ihe, nakwa ma anyị na ndị ọzọ na-akparịta ụka? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

^ Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ Ị chọọ ịmatakwu gbasara ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, gụọ isiokwu bụ́ “Na-eto Jehova n’Ọgbakọ.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Jenụwarị 2019.

^ NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna ji iwe na-asa onye ọ gara izi ozi ọma iwe ji okwu; ebe nwanna na-ekweghị abụ abụ n’ọmụmụ ihe; nakwa ebe otu nwanna nwaanyị na-ege asịrị.