Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 16

Na-enwe Obi Ụtọ ma I Meere Jehova Ike Gị Niile

Na-enwe Obi Ụtọ ma I Meere Jehova Ike Gị Niile

“Ka onye ọ bụla na-eleru ihe ọ na-eme anya.”​—GAL. 6:4.

ABỤ NKE 37 M Ji Obi M Niile Na-efe Jehova

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo ọṅụ?

 JEHOVA chọrọ ka anyị na-enwe ọṅụ. Otú anyị si mata bụ na ọṅụ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22) Ebe ọ bụ na a na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri ozi ọma kpọrọ ihe nakwa ma ọ bụrụ na anyị esi n’ụzọ dị iche iche na-enyere ụmụnna anyị aka.​—Ọrụ 20:35.

2-3. (a) Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:​4, olee ihe abụọ nwere ike inyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ n’ozi Jehova? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Pọl onyeozi kwuru ihe abụọ ga-enyere anyị aka ịna-enwe ọṅụ ná Ndị Galeshia 6:4. (Gụọ ya.) Nke mbụ, anyị kwesịrị ịna-emere Jehova ike anyị niile. Ọ bụrụ na anyị ana-emere ya ike anyị niile, anyị kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ. (Mat. 22:​36-38) Nke abụọ, anyị ekwesịghị iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ. Anyị kwesịrị ikele Jehova n’ihi ihe ọ bụla anyị nwere ike imeli n’agbanyeghị ma ahụ́ ọ̀ dị anyị, nkà anyị nwere, ma ọ bụkwanụ ọzụzụ e nyere anyị. A sị ka e kwuwe, ihe niile anyị nwere si n’aka ya. Ọ bụrụkwa na e nwere otú ndị ọzọ si ka anyị eme nke ọma n’ozi ọma, anyị kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ na ha ji onyinye Jehova nyere ha na-eto ya, ọ bụghị iji ya na-eto onwe ha ma ọ bụ ime ihe ga-abara naanị ha uru. N’ihi ya, anyị kwesịrị isi n’aka ha mụta ihe kama anyị ịga ka anyị na ha mawa aka.

3 N’isiokwu a, anyị ga-ahụ ihe nwere ike inyere anyị aka ma ọ bụrụ na ike agwụwa anyị n’ihi na anyị anaghị emelizi ihe niile anyị chọrọ ime n’ozi Jehova. Anyị ga-ahụkwa otú anyị ga-esi jiri onyinye ọ bụla Jehova nyere anyị na-eto ya, na-amụtakwa ihe n’aka ndị ọzọ.

MGBE ANYỊ NA-AGAGHỊ EMELI IHE NDỊ ANYỊ CHỌRỌ IME

Ọ bụrụ na anyị ana-eme ike anyị niile ná ndụ anyị niile, anyị na-eme Jehova obi ụtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo na nke 6) *

4. Olee ihe nwere ike ime ka ike gwụwa ụfọdụ ndị? Mee ihe atụ.

4 Ụfọdụ n’ime ndị na-efe Jehova enweghịzi ike ime ihe ndị ha chọrọ ime n’ozi Jehova n’ihi na ha akawala nká ma ọ bụ na ha na-arịa ọrịa. Ihe a nwere ike ịna-eme ka ike na-agwụ ha. Ọ bụ ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Carol. O nweburu mgbe ọ na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. N’oge ahụ, o nwere mmadụ iri atọ na ise ọ na-amụrụ Baịbụl. O nyekwaara ọtụtụ ndị aka ha enyefee Jehova onwe ha ma mee baptizim. Ozi Nwanna Nwaanyị Carol nọ na-atọ ya ezigbo ụtọ mgbe ahụ. Ma, o mechara rịawa ọrịa, ya emee ka ọ na-anọkarịzi n’ụlọ. Ọ sịrị: “Ama m na ọrịa emeela ka m ghara ịna-emelizi ihe ndị ọzọ na-eme. Ma, ọ bịaziri dị m ka mụ abụghịzi ezigbo Onye Kraịst otú ahụ ha bụ. Anaghịzi m emeli ihe niile m chọrọ ime, ya ana-eme ka ike na-agwụ m.” Nwanna Nwaanyị Carol chọrọ imere Jehova ihe niile o nwere ike ime. Ihe a o mere dị ezigbo mma. Obi sikwara anyị ike na obi dị Jehova ụtọ maka na ọ na-emere ya ike ya niile.

5. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na ike na-agwụ anyị n’ihi na e nwere ihe anyị na-anaghị emeli? (b) Dị ka anyị hụrụ na foto e ji kọwaa paragraf a, olee otú nwanna ahụ si na-emere Jehova ihe niile o nwere ike ime n’ozi ya?

5 Ọ bụrụ na e nwee ihe ị na-anaghị emeli, ya emee ka ike na-agwụ gị mgbe ụfọdụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka Jehova chọrọ m n’aka?’ Jehova chọrọ ka ị na-emere ya ihe niile i nwere ike imere ya ugbu a. Legodị ihe atụ a. Ka e were ya na e nwere otu nwanna nwaanyị dị afọ iri asatọ ike na-agwụ n’ihi na ọ naghịzi agali ozi ọma otú ọ na-agabu mgbe ọ dị afọ iri anọ. N’agbanyeghị na ọ na-eme ike ya niile, o chere na obi adịghị Jehova ụtọ maka ya. Ma, ihe a o chere ọ̀ bụ eziokwu? Chebagodịrị ya echiche. Ọ bụrụ na nwanna nwaanyị a meere Jehova ihe niile o nwere ike imere ya mgbe ọ dị afọ iri anọ, ka na-emekwara Jehova ihe niile o nwere ike imere ya ugbu a ọ dị afọ iri asatọ, ọ kwụsịbeghị imere Jehova ike ya niile. Ọ bụrụ na anyị echee na obi anaghị adị Jehova ụtọ maka ozi anyị na-ejere ya ugbu a, anyị kwesịrị ichetara onwe anyị na ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe dị ya mma na ihe na-adịghị ya mma. Ọ bụrụ na anyị emeere Jehova ihe niile anyị nwere ike imere ya, ọ ga-enwe ezigbo obi ụtọ. Ọ ga-asị anyị, ‘Unu mere nke ọma.’​—I nwere ike ịtụle Matiu 25:​20-23.

6. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Maria?

6 Ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ana-elekwasị anya n’ihe anyị ga-emeli kama ilekwasị anya n’ihe anyị na-agaghị emeli. Legodị ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Maria. E nwere ọrịa ọ na-arịa nke mere ka ọ gharazie ịna-aga ozi ọma otú o si agabu. Na mbụ, ọ na-eme ka ike na-agwụ ya, ya echee na e nweghịzi uru ọ bara. Ma, o mechara chee gbasara otu nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ ha na-anaghị ebili ebili. O kpebiri inyere ya aka. Maria sịrị: “Ahaziri m ka mụ na ya jiri ekwentị na akwụkwọ ozi na-ekwusa ozi ọma. Mgbe ọ bụla mụ na ya rụchara n’ozi ọma, obi na-adị m ezigbo ụtọ na m mere ike m niile iji nyere ya aka.” Anyị ga na-enwekwu ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị ana-elekwasị anya n’ihe ndị anyị ga-emeli kama ịna-elekwasị anya n’ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Ma, ọ bụrụkwanụ na e nwere ebe anyị kwesịrị ịna-emekwu nke ọma n’ozi anyị na-ejere Jehova ma ọ bụkwanụ na e nwere ebe anyị na-eme nke ọma n’ozi Jehova?

Ọ BỤRỤ NA I NWERE ONYINYE, JIRI YA JEERE JEHOVA OZI

7. Olee ihe Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha mee?

7 N’akwụkwọ ozi mbụ Pita onyeozi dere, ọ gbara ụmụnna ya ume ka ha jiri onyinye ọ bụla ma ọ bụ nkà ọ bụla ha nwere na-agba ụmụnna ha ume. Pita dere, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu jiri onyinye Chineke nyere ya na-ejere ibe ya ozi, ebe unu bụ ezigbo ndị ohu Chineke ji ihe akpọrọ ihe, ndị Chineke meere amara.” (1 Pita 4:10) Anyị ekwesịghị ịghara ime ike anyị niile n’ihi na anyị chere na ọ ga-eme ka ndị ọzọ mewere anyị anyaụfụ ma ọ bụkwanụ mee ka ha daa mbà. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ pụtara na anyị anaghị emere Jehova ihe niile anyị nwere ike imere ya.

8. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 4:​6, 7, gịnị mere anyị ekwesịghị iji onyinye anyị nwere na-etu ọnụ?

8 Anyị kwesịrị iji onyinye anyị nwere na-eme ike anyị niile n’ofufe Jehova. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịna-eji ya etu ọnụ. (1 Ndị Kọrịnt 4:​6, 7.) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ na-adịrị gị mfe ịmalite ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl. I kwesịrị ịna-agba mbọ na-eme ya. Ma, anyị kwesịrị icheta na anyị ekwesịghị ịna-eji ya na-etu ọnụ. Ka e were ya na e nwere onye ị malitere ịmụrụ Baịbụl n’ozi ọma. Ị chọrọ ịkọrọ ndị nọ n’ìgwè ozi ubi unu otú o si mee. Ma mgbe i rutere n’ebe ha nọ, ị hụrụ ka otu nwanna nwaanyị na-akọ otú o si nye mmadụ magazin. Yanwa nyere magazin, gịnwa amalite ọmụmụ Baịbụl. Gịnị ka ị ga-eme? Ị ma na ihe ahụ ị chọrọ ịkọ ga-agba ụmụnna ahụ ume, mana gị ekpebie na ọ ka mma iche ruo oge ọzọ dabara adaba ka i nwee ike ịkọ ya n’ihi na ị chọghị ime ka nwanna nwaanyị ahụ chee na ị ka ya eme nke ọma n’ozi ọma. Ihe a bụ imere ya obiọma. Ma, ọ ganụghị eme ka ị kwụsị ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ebe ọ bụ na i nwere onyinye ịmalite ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl, na-eme ya.

9. Olee ihe anyị kwesịrị iji onyinye ndị anyị nwere eme?

9 Anyị kwesịrị icheta na nkà ọ bụla anyị nwere bụ onyinye si n’aka Chineke. Anyị kwesịrị iji onyinye ndị ahụ na-agba ụmụnna anyị ume, ọ bụghị iji ha eme ka e towe anyị. (Fil. 2:3) Ọ bụrụ na anyị ejiri ike anyị na nkà ndị anyị nwere na-eme uche Chineke, anyị ga-enwe obi ụtọ. Ma, ihe mere anyị ga-eji na-enwe obi ụtọ abụghị n’ihi na anyị chọrọ ịna-eme ihe karịrị nke ndị ọzọ mere ma ọ bụ ka anyị gosi na anyị ka ha, kama, n’ihi na anyị ji onyinye ndị ahụ na-eme ka e too Jehova.

10. Gịnị mere na ọ dịghị mma ka anyị na-eji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ?

10 Ọ bụrụ na mmadụ akpacharaghị anya, o nwere ike ịmalite iji ihe ndị ọ na-emeta na-atụnyere ihe onye ọzọ na-anaghị emeta. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwanna na-ekwu okwu ihu ọha nke ọma. Ihe a bụ ihe ọ na-emeta. Ma n’obi ya, o nwere ike ịna-eleda nwanna ọzọ ikwu okwu ihu ọha na-esiri ike anya. Ma, nwanna ahụ nwere ike ịna-ele ọbịa nke ọma, na-azụ ụmụ ya nke ọma, ma ọ bụ jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nwere ọtụtụ ụmụnna na-eji nkà ha nwere na-ejere Jehova ozi ma na-enyere ụmụnna ha aka.

MỤTA IHE N’AKA NDỊ ỌZỌ

11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbalịa na-eme ka Jizọs?

11 Ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị ịna-eji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ, ma anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị ọzọ na-efe Jehova. Iji maa atụ, ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’aka Jizọs. N’agbanyeghị na o zuru okè, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’ọmarịcha àgwà ndị o nwere na ihe ndị magburu onwe ha o mere. (1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike na-eme ka ya, anyị ga na-efekwu Jehova nke ọma, na-emekwu nke ọma n’ozi ọma.

12-13. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Eze Devid?

12 Na Baịbụl, anyị ga-ahụ akụkọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị anyị nwere ike ịna-eme ka ha n’agbanyeghị na ha ezughị okè. (Hib. 6:12) Chee gbasara Eze Devid. Jehova kpọrọ ya “nwoke obi m nabatara.” Otú Baịbụl ọzọ si sụgharịa ya bụ “ụdị mmadụ m chọrọ.” (Ọrụ 13:22) Devid ezughị okè. N’eziokwu, e nwere ụfọdụ ihe jọgburu onwe ha o mere. Ma, anyị ka nwere ike ịmụta ihe n’aka ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na mgbe a gbaziri ya, ọ bịaghị gọrọwa onwe ya. Kama, ọ nabatara ndụmọdụ e nyere ya, chegharịakwa. Ihe o mere wuteruru ya n’ọkpụkpụ. Ọ bụ ya mere Jehova ji gbaghara ya.​—Ọma 51:​3, 4, 10-12.

13 Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Devid ma ọ bụrụ na anyị ajụọ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka m na-eme ma e nye m ndụmọdụ? M̀ na-achọpụta ebe m mejọrọ ihe ozugbo, ka m̀ na-agbalị igosi na ihe m mere dị mma? M̀ na-ata ndị ọzọ ụta ozugbo maka ihe m mere? M̀ na-agbalịsi ike ka m ghara ime ihe ọjọọ ahụ ọzọ?’ I nwere ike ịna-ajụ onwe gị ụdị ajụjụ ndị a ma ị na-agụ gbasara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ fere Jehova a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Nsogbu ha nwere ò yiri nke gịnwa nwere? Olee àgwà ndị mara mma ha kpara? Ị gụwa gbasara onye nke ọ bụla n’ime ha, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m nwere ike isi na-emekwu ka ohu Jehova a ji obi ya niile fee ya?’

14. Olee uru ile ihe ụmụnna anyị na-eme ga-abara anyị?

14 Anyị nwekwara ike ịmụta ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe ụmụnna anyị na-eme, ma nwata ma okenye. Dị ka ihe atụ, è nwere nwanna ị ga-echeta n’ọgbakọ unu ji obi ya niile na-edi ọnwụnwa bịaara ya? O nwere ike ịbụ na ndị ọgbọ ya chọrọ ka o mee ihe na-adịghị mma ma ọ bụ na ndị ezinụlọ ya na-akpagbu ya ma ọ bụkwanụ na ọ na-arịa ọrịa. È nwere ọmarịcha àgwà nwanna ahụ na-akpa gịnwa chọkwara ịgbakwu mbọ na-akpa? Ọ bụrụ na i chebara ihe ndị o mere echiche, ị ga-ahụ ụzọ ndị ị ga-esi na-edi ọnwụnwa nke gịnwa. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nwere ụdị ụmụnna ahụ anyị nwere ike inwe ụdị okwukwe ha nwere.​—Hib. 13:7; Jems 1:​2, 3.

KA OBI NA-ATỌ GỊ ỤTỌ N’OFUFE JEHOVA

15. Olee ndụmọdụ Pọl nyere ga-enyere anyị aka iji ọṅụ na-efe Jehova?

15 Iji mee ka ọgbakọ dịrị n’udo, dịrịkwa n’otu, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-eme ike ya niile. Chegodị gbasara Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs. Ha nwere onyinye dị iche iche na ọrụ dị iche iche. (1 Kọr. 12:​4, 7-11) Ma, o meghị ka ha na-ama aka ma ọ bụ na-alụso ibe ha ọgụ. Kama nke ahụ, Pọl gbara onye ọ bụla n’ime ha ume ka ọ na-eme ihe o kwesịrị ime “ka ahụ́ Kraịst sie ike.” Pọl degaara ndị Efesọs akwụkwọ ozi, sị: “Ọ bụrụ na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ na-arụ ọrụ ya nke ọma, ahụ́ ga na-eto eto, gbasiekwa ike n’ihi na ihe nke ọ bụla dị n’ahụ́ hụrụ ibe ya n’anya.” (Efe. 4:​1-3, 11, 12, 16) Ndị mere ihe a Pọl kwuru mere ka udo dịrị n’ọgbakọ, ha adịrịkwa n’otu. Anyị na-ahụkwa ụdị ihe a n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa.

16. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? (Ndị Hibru 6:10)

16 Kpebisie ike na ị gaghị na-eji onwe gị atụnyere ndị ọzọ. Kama nke ahụ, mụta ihe n’aka Jizọs, na-agbalịkwa ime ka ya. Mụta ihe n’aka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nakwa ụmụnna ndị nwere okwukwe taa. Ka ị na-eme ike gị niile n’ofufe Jehova, ka obi sie gị ike na Jehova “abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ” gị. (Gụọ Ndị Hibru 6:10.) Na-enwe obi ụtọ n’ofufe ị na-efe Jehova ebe ị ma na obi dị ya ụtọ maka otú i si jiri obi gị niile na-efe ya.

ABỤ NKE 65 Gaa n’Ihu

^ Anyị niile nwere ike ịmụta ihe n’ihe ndị ọzọ mere n’ozi Jehova. Ma, e nwere ihe anyị kwesịrị izere. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi na-enwe ọṅụ ma ghara ịdị mpako ma ọ bụ ikwe ka ike gwụwa anyị n’ihi na anyị ji ihe ndị anyị nwere ike imeli n’ozi Jehova na-atụnyere ihe ndị ọzọ na-eme.

^ NKỌWA FOTO: Otu nwanna na-eje ozi na Betel mgbe ọ bụ nwa okorobịa. Mgbe ọ lụrụ nwaanyị, ha malitere ịsụ ụzọ. Mgbe ọ mụrụ ụmụ, ọ na-akụziri ha otú e si ezi ozi ọma. Ugbu a o merela agadi, ọ ka na-emekwa ike ya niile n’ozi ọma. Ọ na-eji akwụkwọ ozi ekwusa ozi ọma.