Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 25

Jehova Na-agọzi Ndị Na-agbaghara

Jehova Na-agọzi Ndị Na-agbaghara

“Jehova gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.”​—KỌL. 3:13.

ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Jehova kwuru ga-emesi ndị mmehie chegharịrị echegharị obi ike?

 Ọ BỤ eziokwu na Jehova bụ Onye kere anyị, Onye na-enye anyị iwu, na Onyeikpe anyị, ọ bụkwa Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya. (Ọma 100:3; Aịza. 33:22) Ọ bụrụ na anyị emehie ya ma jiri obi anyị niile chegharịa, ọ bụghị naanị na ọ ga-agbagharali anyị, ọ chọkwara ịgbaghara anyị. (Ọma 86:5) Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gwa anyị ihe ga-emesi anyị obi ike. Ọ sịrị: “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.”​—Aịza. 1:18.

2. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma?

2 Anyị niile na-ekwu ma ọ bụ mee ihe ndị nwere ike ịkpasu ndị ọzọ iwe n’ihi na anyị ezughị okè. (Jems 3:2) Ma nke ahụ apụtaghị na anyị na ha agaghị adịli ná mma. Anyị na ha ga-adịli ná mma ma ọ bụrụ na anyị amụta ịna-agbaghara. (Ilu 17:9; 19:11; Mat. 18:​21, 22) Ọ bụrụ na mmadụ emee obere ihe were anyị iwe, Jehova chọrọ ka anyị gbaghara ya. (Kọl. 3:13) E nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịgbaghara ya. A sịdị ka e kwuwe, Jehova na-agbaghara anyị “kpamkpam.”​—Aịza. 55:7.

3. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ike isi na-agbaghara ka Jehova. Olee mmehie ndị anyị kwesịrị ịkọrọ ndị okenye? Gịnị mere Jehova ji gwa anyị ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ? Olee ihe anyị ga-amụta n’aka ụmụnna anyị mmehie ndị ọzọ mere ka ha taa ezigbo ahụhụ?

ONYE KRAỊST MEE MMEHIE DỊ OKÉ NJỌ

4. (a) Ọ bụrụ na nwanna emee mmehie dị oké njọ, gịnị ka o kwesịrị ime? (b) Olee ihe bụ́ ọrụ ndị okenye ma ha na onye mere mmehie nọkọọ?

4 Anyị kwesịrị ịgwa ndị okenye ma ọ bụrụ na nwanna emee mmehie dị oké njọ. E dere ụfọdụ mmehie ndị a dị oké njọ ná 1 Ndị Kọrịnt 6:​9, 10. Mmehie dị oké njọ bụ ihe ndị jọgburu onwe ha mmadụ mere nke bụ́ ịda iwu Chineke. Ọ bụrụ na Onye Kraịst emee mmehie dị oké njọ, o kwesịrị ikpe ekpere, rịọ Jehova ka ọ gbaghara ya, gaakwa gwa ndị okenye ọgbakọ. (Ọma 32:5; Jems 5:14) Olee ihe ndị okenye ga-eme gbasara ya? Ọ bụ naanị Jehova nwere ikike ịgbaghara mmadụ kpamkpam. Ọ na-agbagharakwa anyị n’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ. * Ma, Jehova nyere ndị okenye ọrụ isi n’Akwụkwọ Nsọ kpebie ma onye mmehie ọ̀ ka kwesịrị ịnọ n’ọgbakọ Jehova. (1 Kọr. 5:12) Iji mee ihe a, otu ihe ha kwesịrị ime bụ ịmata azịza ajụjụ ndị a: Onye ahụ ọ̀ kpachaara anya mee mmehie ahụ? Ọ̀ gbalịrị izochiri ndị ọzọ mmehie ahụ? Ò mere ya ruo ogologo oge? Nke kacha nke, ò nwere ihe gosiri na onye ahụ ji obi ya niile chegharịa? È nwekwara ihe ndị gosiri na Jehova agbagharala ya?​—Ọrụ 3:19.

5. Olee uru ọrụ ndị okenye na-aba?

5 Ihe na-abụ mkpa ndị okenye ma ha na onye mere mmehie nọkọọ bụ ikpebi ihe ahụ e kpebirila n’eluigwe. (Mat. 18:18) Olee uru ihe a na-abara ọgbakọ? Ọ na-eme ka a chụpụ onye mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ ka ọ ghara ịkpatara ndị ohu Jehova ndị ọzọ nsogbu. (1 Kọr. 5:6, 7, 11-13; Taị. 3:10, 11) O nwekwara ike inyere onye mmehie ahụ aka ichegharị, Jehova agbagharakwa ya. (Luk 5:32) Ndị okenye na-ekpere ya ekpere ma rịọ Jehova ka o nyere ya aka ka ya na ya dịghachi ná mma.​—Jems 5:15.

6. Ọ bụrụ na a chụọ mmadụ n’ọgbakọ, Jehova ọ̀ ka nwere ike ịgbaghara ya? Kọwaa.

6 Ọ bụrụkwanụ na mmadụ echegharịghị mgbe ya na ndị okenye nọkọrọ? A ga-achụpụ ya n’ọgbakọ. Ọ bụrụkwa na ọ dara iwu obodo, ndị okenye agaghị ezo ya ka ọ ghara ịta ahụhụ ihe o metara. Jehova nyere ndị ọchịchị ikike ka ha kpee onye ọ bụla dara iwu obodo ikpe ma taa ya ahụhụ, ma ò chegharịrị ma ọ bụ na o chegharịghị. (Rom 13:4) Ma ọ bụrụ na anya mechaa doo onye ahụ, ya ejiri obi ya niile chegharịa ma laghachikwute Jehova, Jehova dị njikere ịgbaghara ya. (Luk 15:​17-24) Jehova ga-agbaghara ya ọ bụrụgodị na o mere mmehie dị oké njọ.​—2 Ihe 33:9, 12, 13; 1 Tim. 1:15.

7. Olee otú anyị nwere ike isi gbaghara onye mejọrọ anyị?

7 Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịmata na ọ bụghị anyị ga-ekpebi ma Jehova ọ̀ ga-agbaghara mmadụ ma ọ bụ na ọ gaghị agbaghara ya. Ma, e nwere ihe anyị kwesịrị ikpebi. Gịnị ka ọ bụ? Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ime anyị ezigbo ihe ọjọọ, ma ya abịa rịọ anyị ka anyị gbaghara ya. E nwekwara mgbe onye ahụ na-agaghị abịa rịọ anyị mgbaghara. Ụdị ihe a mee, anyị nwere ike ikpebi ịgbaghara onye ahụ ma kwụsị iburu ya iwe n’obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị nwere ike ịgbasi mbọ ike, ya eweekwa anyị oge iji gbaghara onye ahụ, karịchaa, ma ọ bụrụ na ihe o mere anyị wuteruru anyị n’ọkpụkpụ. Ụlọ Nche Septemba 15, 1994 kwuru na ịgbaghara onye mere mmehie apụtaghị na anyị nabatara mmehie ahụ o mere. Onye Kraịst gbaghara, ọ pụtara na ọ tụkwasịrị Jehova obi ma hapụrụ ya ihe ahụ merenụ. Ọ bụ ya na-ekpe ikpe ziri ezi ma n’eluigwe ma n’ụwa. Ọ ga-ekpekwa ikpe ziri ezi mgbe oge ruru. Gịnị mere Jehova ji agba anyị ume ka anyị gbaghara ma hapụrụ ya ikpe, tụkwasịkwa ya obi na ọ ga-ekpe ikpe ziri ezi?

IHE MERE JEHOVA JI AGWA ANYỊ KA ANYỊ NA-AGBAGHARA

8. Olee otú ịgbaghara ndị ọzọ si egosi na obi dị anyị ụtọ maka ebere Jehova na-emere anyị?

8 Ịgbaghara ndị ọzọ na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka obi ebere Jehova. N’otu ihe atụ Jizọs mere, o ji Jehova tụnyere nna ukwu gbaghaara ndị ohu ya nnukwu ụgwọ ha ji ya ha na-agaghị akwụli. Ma, otu n’ime ndị ohu ndị ahụ ekweghị emere ohu ibe ya ebere. Ego ohu ahụ ji ya aharughị ka nke nna ya ukwu gbaghaara ya. (Mat. 18:​23-35) Gịni ka Jizọs ji ya na-akụziri anyị? O ji ya na-akụziri anyị na ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka ebere Jehova na-emere anyị, anyị ga na-agbaghara ndị ọzọ. (Ọma 103:9) Otu Ụlọ Nche e bipụtara ọtụtụ afọ gara aga kwuru na n’agbanyeghị ugboro ole anyị gbaghaara ndị mmadụ ibe anyị, e nweghị ike iji ya tụnyere ugboro ole Jehova si n’aka Jizọs Kraịst gbaghara anyị.

9. Olee ndị Jehova na-emere ebere? (Matiu 6:14, 15)

9 Jehova ga-agbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị ọzọ. Jehova na-emere ndị na-emere ndị ọzọ ebere ebere. (Mat. 5:7; Jems 2:13) Jizọs mere ka ihe a doo anya mgbe ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere. (Gụọ Matiu 6:​14, 15.) Anyị mụtakwara otu ihe ahụ n’ihe Jehova gwara ohu ya Job. Ihe ndị enyi ya atọ bụ́ Elifaz, Bildad, na Zofa gwara ya gbawara ya obi. Jehova gwara Job ka o kpeere ndị enyi ya ndị ahụ ekpere. Mgbe Job mechara otú ahụ, Jehova gọziri ya.​—Job 42:​8-10.

10. Olee nsogbu ibu iwe n’obi nwere ike ịkpatara anyị? (Ndị Efesọs 4:31, 32)

10 Iburu mmadụ iwe n’obi na-akpatara anyị nsogbu. Iwe dị ka ibu arọ. Jehova chọkwara ka anyị kwụsị iburu mmadụ iwe n’obi ka obi nwee ike iru anyị ala. (Gụọ Ndị Efesọs 4:​31, 32.) Ọ gwara anyị ka anyị “hapụ iwe, hapụkwa ọnụma.” (Ọma 37:8) Ime ihe a Jehova kwuru na-abara anyị uru. Iburu mmadụ iwe n’obi nwere ike ịkpatara anyị ọrịa. (Ilu 14:30) Ọ bụrụ na anyị ebuoro mmadụ iwe n’obi, ọ bụghị onye ahụ ka anyị na-akpatara nsogbu. O yiri mmadụ ịṅụ nsí. Ọ bụ onwe ya ka ọ ga-akpatara nsogbu. Mana, ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ, ọ bụ onwe anyị ka anyị na-emere ihe ọma. (Ilu 11:17) Obi na-eru anyị ala, anyị enweekwa ike ịna-efe Jehova.

11. Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara imegwara onye mere anyị ihe ọjọọ? (Ndị Rom 12:19-21)

11 Ọ bụ Jehova ga-abọ ọbọ. Jehova enyeghị anyị ikike imegwara onye mere anyị ihe ọjọọ. (Gụọ Ndị Rom 12:​19-21.) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị agaghị ekpeli ikpe ziri ezi n’ihe niile otú ahụ Jehova na-eme. (Hib. 4:13) Mgbe ụfọdụkwa, otú obi dị anyị nwere ike imegharị anyị anya, mee ka o siere anyị ike ịma ihe anyị kwesịrị ime. Jehova si n’ike mmụọ nsọ mee ka Jems dee, sị: “Onye na-ewe iwe anaghị eme ezi omume Chineke chọrọ ka anyị na-eme.” (Jems 1:20) Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-eme ihe dị mma nakwa na ọ ga-ekpe ikpe ziri ezi.

Kwụsị iwe iwe na iburu ndị ọzọ iwe n’obi. Hapụrụ Jehova ihe ahụ e mere gị. Ọ ga-ewepụ ihe ọjọọ niile mmehie kpatara (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na obi siri anyị ike na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi?

12 Ịgbaghara onye mejọrọ anyị gosiri na obi siri anyị ike na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ bụrụ na anyị ahapụrụ Jehova ihe mmadụ mere anyị, anyị na-egosi na obi siri anyị ike na Jehova ga-edozili nsogbu niile mmehie kpatara. N’ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa, “a gaghịzi echeta ihe” niile na-ewute anyị. “Ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịza. 65:17) Ma, ọ bụrụ na ihe e mere anyị gbawara anyị obi, ọ̀ ga-ekwe anyị omume ịgbaghara ma ghara iburu onye ahụ iwe n’obi? Ka anyị hụ otú ụfọdụ ụmụnna anyị sirila mee otú ahụ.

ỊGBAGHARA NDỊ ỌZỌ NA-ABARA ANYỊ URU

13-14. Gịnị ka ị mụtara gbasara mgbaghara n’akụkọ Tony na José?

13 Ọtụtụ ụmụnna anyị ekpebiela ịgbaghara onye mere ha ihe wuteruru ha n’ọkpụkpụ. Olee ihe ọma ndị sirila na ya pụta?

14 O nwere otu nwanna aha ya bụ Tony * bi na Filipinz. Ọtụtụ afọ tupu ya abata n’ọgbakọ, ọ chọpụtara na ọ bụ otu nwoke aha ya bụ José gburu nwanne ya nwoke nke tọrọ ya. N’oge ahụ, Tony bụ onye iwe ọkụ, na-emekwa tigbuo zọgbuo. Ọ chọkwara igbu onye ahụ gburu nwanne ya. A kpọchiri José ma tụọ ya mkpọrọ maka ihe ọjọọ ahụ o mere. Ma, e mechara tọhapụ José n’ụlọ mkpọrọ. Tony kpebisiri ike ịchọta ya gbagbuo ya. Ọ zụtara égbè ọ ga-eji eme ya. N’oge ahụ, Tony na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. O kwuru, sị: “Ka m nọ na-amụ Baịbụl, m mụtara na m kwesịrị ịgbanwe otú m si akpa àgwà, kwụsịkwa iwe m na-ewe.” Tony mechara mee baptizim, ghọọkwa okenye n’ọgbakọ. Chegodị otú obi dị ya mgbe ọ chọpụtara na José bụzi Onyeàmà Jehova e mere baptizim. Ha abụọ mechara hụ makụọ, Tony agwa José na ya agbagharala ya. Tony kwuru na o nweghị ike ịkọwa ụdị ọṅụ ọ na-enwe n’ihi na ọ gbagharala José. N’eziokwu, Jehova gọziri Tony n’ihi na ọ gbaghaara José.

Akụkọ Nwanna Peter na Sue na-egosi na anyị nwere ike ịkwụsị iwe iwe na iburu mmadụ iwe n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16)

15-16. Gịnị ka ị mụtara gbasara mgbaghara n’akụkọ Nwanna Peter na nwunye ya?

15 N’afọ 1985, Nwanna Peter na nwunye ya Sue nọ n’ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe bọmbụ gbawara. Otu nwoke tinyere bọmbụ n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe ahụ merụrụ Sue ezigbo ahụ́ ma mee ka anya ya na ntị ya na-enye ya nsogbu mgbe niile. Ọ naghịzikwa anụ ísì ihe ọ bụla. * Peter na Sue na-ajụkarị onwe ha, sị, ‘Olee ụdị onye mere ụdị ihe ọjọọ a?’ Onye mere ihe ahụ abụghị Onyeàmà Jehova. Mgbe ọtụtụ afọ gara, a nwụchiri ya ma tụọ ya mkpọrọ mkpụrụ ọka. Mgbe a jụrụ Nwanna Peter na nwunye ya ma hà agbagharala nwoke ahụ, ha sịrị: “Jehova na-akụziri anyị ka anyị ghara ịna-eburu mmadụ iwe n’obi n’ihi na o nwere ike ịkpatara anyị ọrịa. N’ihi ya, ozugbo ihe ahụ mechara, anyị rịọrọ Jehova ka o nyere anyị aka ka anyị chefuo ihe ahụ ma ghara iburu onye ahụ iwe n’obi ka anyị nwee ike ịna-enwe obi ụtọ.”

16 Ọ̀ dịịrị ha mfe ịgbaghara onye ahụ? Mba. Ha sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na Sue atawakwa ahụhụ n’ihi ahụ́ ahụ o merụrụ, anyị na-amalite wewe iwe. Ọ na-abụ anyị chetụ ya, anyị ahapụ ya, iwe anyị adajụọkwa. N’eziokwu, ọ bụrụ na onye ahụ tụrụ bọmbụ ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze aghọọ nwanna anyị otu ụbọchị, anyị ga-anabata ya. Ihe a mere anyị akụzierela anyị na ime ihe Baịbụl kwuru na-eme ka anyị nwere onwe anyị. N’eziokwu, ihe Baịbụl kwuru na-eme ka anyị nwere onwe anyị karịa otú anyị tụrụ anya ya. Ihe ọzọ na-akasi anyị obi bụ ịmata na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka nsogbu niile ihe a kpataara anyị kwụsị.”

17. Gịnị ka ị mụtara gbasara mgbaghara n’akụkọ Myra?

17 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Myra mụtara eziokwu mgbe ọ lụrụla di, mụtakwa ụmụ abụọ ka dị obere. Di ya aghọghị Onyeàmà Jehova. Ka oge na-aga, ọ kwara iko ma gbahapụ ezinụlọ ya. Myra sịrị: “Mgbe di m hapụrụ mụ na ụmụ anyị abụọ, obi dị m otú ọ na-adị ọtụtụ ndị onye ha gbahapụrụ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eju m anya, na-ewute m, mụ ana-akwa mmakwaara, na-ata onwe m ụta, ezigbo iwe ana-ewekwa m.” Ọ bụ eziokwu na ha agbaala alụkwaghịm, mgbahapụ a di ya gbahapụrụ ya ka na-ewute ya. Myra sịrị: “M nọ na-echegbu onwe m, ezigbo iwe ana-ewekwa m ruo ọtụtụ ọnwa, mụ achọpụtakwa na ọ bịara na-akpa adịm ná mma mụ na Jehova na ndị ọzọ aka ọjọọ.” Ugbu a, Myra kwuru na ọ naghịzi ewe iwe maka ihe a onye ahụ bụ́bu di ya mere ya nakwa na ọ naghị ebuziri ya iwe n’obi. O nwere olileanya na otu ụbọchị, ọ ga-abịa fewe Jehova. Ihe a Myra mere nyeere ya aka ilekwasị anya n’ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu. Naanị ya zụrụ ụmụ ya abụọ ndị ahụ, ha ana-efe Jehova. Taa, obi dị Myra ụtọ na ya na ụmụ ya ndị ahụ na ndị ezinụlọ ha na-efekọ Jehova ọnụ.

JEHOVA BỤ ONYEIKPE ZURU OKÈ

18. Olee ihe obi siri anyị ike na Onyeikpe Kacha Elu, bụ́ Jehova, ga-eme?

18 Obi dị anyị ụtọ ịmata na ọ bụghị anyị ga-ekpebi ma à ga-agbaghara mmadụ ma ọ bụ na a gaghị agbaghara ya. Ọ bụ Jehova nwe ọrụ a dị ezigbo mkpa n’ihi na ọ bụ ya bụ Onyeikpe Kacha Elu. (Rom 14:​10-12) Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eji iwu ya zuru okè kpee ikpe ziri ezi n’ihe niile. (Jen. 18:25; 1 Eze 8:32) O nweghị mgbe ọ ga-eme ihe na-ezighị ezi.

19. Olee uru ikpe ziri ezi Jehova na-ekpe ga-abara anyị?

19 Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ mgbe Jehova ga-ewepụ ihe ọjọọ niile mmehie na ezughị okè mmadụ kpatara. N’oge ahụ, ma ahụ́ niile e merụrụ anyị ma obi mgbawa ya na ya so ga-ala kpamkpam. (Ọma 72:​12-14; Mkpu. 21:​3, 4) Anyị agaghị echetakwa ha. Ka anyị na-eche ka oge ahụ magburu onwe ya ruo, obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova mere ka anyị nwee ike ịna-agbaghara ndị ọzọ ka yanwa.

ABỤ NKE 18 Anyị Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta

^ Jehova chọrọ ịgbaghara ndị mmehie chegharịrị echegharị. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị chọrọ ịna-eme ka Jehova ma mmadụ mehie anyị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya ná mmehie ndị anyị nwere ike ịgbaghara mmadụ na ndị nke anyị kwesịrị ịkọrọ ndị okenye. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe mere Jehova ji chọọ ka anyị gbaghara mmadụ ibe anyị nakwa ngọzi ndị anyị ga-enweta ma anyị mee otú ahụ.

^ Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” nke gbara n’Ụlọ Nche April 15, 1996.

^ Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ Gụọ Teta! Bekee nke January 8, 1992, peeji nke 9 ruo na nke 13. Leekwa vidio dị n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova aha ya bụ Ezinụlọ Schulzes: Mmadụ Ga-edili Nsogbu Na-agbawa Obi.