Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 28

Alaeze Chineke Na-achị

Alaeze Chineke Na-achị

“Alaeze ụwa aghọọla Alaeze nke Chineke na nke Kraịst ya.”—MKPU. 11:15.

ABỤ NKE 22 Alaeze Chineke Na-achị—Ya Bịawa

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Olee ihe obi siri anyị ike na ya, n’ihi gịnịkwa?

 I LEE ihe ndị na-eme n’ụwa taa, hà na-eme ka i chee na ihe agaghị aka mma n’ọdịnihu? Ndị ezinụlọ ahụghịzi ibe ha n’anya. Ndị mmadụ na-emekwu tigbuo zọgbuo, na-ewekwu iwe ọkụ, ihe kakwa ha mkpa bụ naanị onwe ha. Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịtụkwasị ndị isi obi. Ma, ihe ndị a nwere ike ime ka obi sie anyị ike na ihe ka ga-aka mma n’ọdịnihu. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị mmadụ na-eme ihe Baịbụl buru amụma ga-eme ‘n’oge ikpeazụ.’ (2 Tim. 3:1-5) Onye chọrọ ịgwa onwe ya eziokwu ga-ekweta na amụma a na-emezu ugbu a. O gosikwara na Alaeze Chineke nke Jizọs Kraịst bụ Eze ya amalitela ịchị. Ma ihe a bụ naanị otu n’ime ọtụtụ amụma e buru gbasara Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na anyị amụọ gbasara amụma ndị ọzọ mezurula n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike.

Otú ahụ iwekọta foto a dọkara adọka ọnụ na-eme ka ihe e sere na foto ahụ doo anya ka ịmụ gbasara amụma ndị Baịbụl buru n’akwụkwọ Daniel na Mkpughe na-eme ka oge anyị nọ na ya ugbu a doo anyị anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2)

2. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a, n’ihi gịnịkwa?

2 N’isiokwu a, anyị ga-amụ gbasara (1) amụma na-enyere anyị aka ịmata mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị, (2) amụma ndị na-enyere anyị aka ịmata na Jizọs aghọọla Eze nke Alaeze Chineke n’eluigwe, nakwa (3) amụma ndị na-egosi otú a ga-esi bibie ndị iro Alaeze Chineke. Otú ahụ ịdụkọta ibé ákwà dị iche iche ọnụ si eme ka ọ bụrụ uwe ka ịmụ gbasara amụma ndị anyị na-aga ịmụ banyere ha ga-enyere anyị aka ịghọta nke ọma oge anyị nọ na ya ugbu a.

OTÚ ANYỊ GA-ESI MATA MGBE ALAEZE CHINEKE MALITERE ỊCHỊ

3. Olee ihe amụma e dere na Daniel 7:13, 14 mere ka obi sie anyị ike gbasara Eze nke Alaeze Chineke.

3 Amụma e dere na Daniel 7:13, 14 mere ka obi sie anyị ike na ọ bụ Jizọs kacha ruo eruo ịbụ Eze nke Alaeze Chineke. Ndị si ná mba niile ga-eji obi ụtọ “na-ejere ya ozi,” e nweghịkwa onye ga-achị ma ọ chịchaa. Amụma ọzọ e buru n’akwụkwọ Daniel kwuru na Jizọs ga-amalite ịchị n’Alaeze Chineke ma oge a kpọrọ oge asaa gafee. Ọ̀ ga-ekwe omume ịmata mgbe Jizọs ghọrọ Eze nke Alaeze Chineke?

4. Kọwaa otú Daniel 4:10-17 si nyere anyị aka ịmata afọ Jizọs ghọrọ Eze nke Alaeze Chineke. (Kọwaakwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

4 Gụọ Daniel 4:10-17. “Oge asaa” ahụ nọchiri anya puku afọ abụọ, narị ise na iri abụọ (2,520). Oge ahụ malitere n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst mgbe ndị Babịlọn chụturu eze ikpeazụ nọrọ n’ocheeze Jehova dị na Jeruselem. Oge ahụ gwụrụ n’afọ 1914 mgbe Jehova chiri Jizọs, bụ́ “onye o ruuru,” Eze nke Alaeze Chineke. bEzik. 21:25-27.

5. Olee otu uru amụma gbasara “oge asaa” baara anyị?

5 Olee uru amụma a ga-abara anyị? Ịmata gbasara “oge asaa” ahụ na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere ma oge ya ruo. Jehova kpebiri oge Alaeze ya ga-amalite ịchị. Mgbe oge ahụ ruru, Alaeze ahụ malitere ịchị. N’ihi ya, anyị ma na ọ ga-emezu amụma ndị ọzọ e buru ma oge o kpebiri na ha ga-eme ruo. N’eziokwu, ụbọchị Jehova ‘agaghị anọ ọdụ.’—Hab. 2:3.

OTÚ ANYỊ SI MARA NA JIZỌS AGHỌỌLA EZE NKE ALAEZE CHINEKE

6. (a) Olee ihe ndị anyị na-ahụ n’ụwa na-egosi na Jizọs na-achị ugbu a n’eluigwe? (b) Olee otú amụma e buru ná Mkpughe 6:2-8 si akwado ihe ndị a na-eme ugbu a?

6 Mgbe Jizọs na-achọ ijecha ozi ya n’ụwa, o buru amụma na ihe ụfọdụ ga-eme n’ụwa nke ga-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka ịmata na ọ malitela ịchị n’eluigwe. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ọ kpọrọ aha bụ agha, ụkọ nri, na ala ọma jijiji. O kwuru na ọrịa na-efe efe ga-adị “n’ebe dị iche iche.” Ọrịa koronavaịrọs bụ otu n’ime ha. Ihe ndị a na-emenụ so n’ihe Baịbụl kpọrọ “ihe àmà” na Kraịst amalitela ịchị. (Mat. 24:3, 7; Luk 21:7, 10, 11) Mgbe Jizọs nwụrụ laghachi n’eluigwe, ihe karịrị afọ iri isii agaa, ọ gwara Jọn onyeozi ihe ndị ọzọ na-egosi na ihe ndị ahụ o kwuru ga-eme. (Gụọ Mkpughe 6:2-8.) Ihe ndị ahụ niile emeela kemgbe Jizọs malitere ịchị n’afọ 1914.

7. Gịnị mere ọtụtụ ihe ọjọọ ji na-eme n’ụwa kemgbe Jizọs ghọrọ Eze?

7 Gịnị mere ihe ji ka njọ n’ụwa mgbe Jizọs ghọrọ Eze? Mkpughe 6:2 gwara anyị ihe kpatara ya. Ihe mbụ Jizọs mere mgbe ọ ghọrọ Eze bụ ịlụ agha. Olee ndị ọ lụsoro agha? Ọ bụ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya. Mkpughe isi 12 gwara anyị na Jizọs meriri Ekwensu, chụdata ya na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. Ọ bụ ya mere ndị nọ ‘n’ụwa ji ata ahụhụ’ n’ihi na ezigbo iwe ji Ekwensu, ya ana-alụsokwa ụmụ mmadụ agha.—Mkpu. 12:7-12.

Akụkọ ọjọọ anaghị eme anyị obi ụtọ. Ma, anyị hụ ka amụma ndị e buru na Baịbụl na-emezu taa, ọ na-eme ka obi sie anyị ike na Alaeze Chineke na-achị n’eluigwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8. Ka anyị na-ahụ ka amụma ndị e buru na Baịbụl na-emezu, olee uru ọ ga-abara anyị?

8 Olee uru amụma ndị a ga-abara anyị? Ihe ndị na-eme n’ụwa na otú àgwà ndị mmadụ si gbanwee ga-eme ka anyị ghọta na Jizọs aghọọla Eze. N’ihi ya, kama iwewe iwe ma anyị hụ ebe ihe ka ndị mmadụ mkpa bụ onwe ha nakwa ịrụsa ndị mmadụ arụrụala, anyị na-echeta na ihe ndị a ha na-eme bụ imezu amụma Baịbụl. Alaeze Chineke amalitela ịchị. (Ọma 37:1) Ihe ọzọ bụkwa na ihe ga na-aka njọ ka Amagedọn na-eru nso. (Mak 13:8; 2 Tim. 3:13) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya nyeere anyị aka ịghọta ihe mere e ji nwee ọtụtụ nsogbu n’ụwa a.

OTÚ A GA-ESI BIBIE NDỊ IRO ALAEZE CHINEKE

9. Olee otú amụma e dere na Daniel 2:28, 31-35 si kọwaa ọchịchị ikpeazụ ga-achị ụwa, oleekwa mgbe ọ malitere ịchị?

9 Gụọ Daniel 2:28, 31-35. Anyị na-ahụ ka amụma a na-emezu taa. Nrọ Nebukadneza rọrọ gosiri ihe ga-eme “n’oge ikpeazụ,” mgbe Jizọs malitechara ịchị. Ndị so ná ndị iro Jizọs n’ụwa bụ ọchịchị ikpeazụ ga-achị ụwa Baịbụl buru amụma ya. Ọ bụ “ala ala ụkwụ ya ahụ e ji ígwè na ụrọ kpụọ” ka e ji dochie anya ya. Ọchịchị a achịwala. Ọ bụ ọchịchị Briten na Amerịka. Ha abụọ gbakọrọ aka malite ịchị n’Agha Ụwa nke Mbụ. Nnukwu ihe ahụ a kpụrụ akpụ Nebukadneza hụrụ ná nrọ gosiri na ọ dịkarịa ala, a ga-enwe ihe abụọ ga-eme ka ọchịchị a dịrị iche ná ndị nke ọzọ chịburu ụwa.

10. (a) Gịnị ka anyị na-ahụ n’ọchịchị Briten na Amerịka Daniel buru amụma ya? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịkpachara anya maka ya? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ O Nwere Ike Ịghọrọ Anyị Ọnyà.”)

10 Nke mbụ, ihe nọchiri anya ọchịchị Briten na Amerịka ná nrọ ahụ dị iche n’ihe nọchiri anya ọchịchị ndị ọzọ chịrị ụwa. Ihe nọchiri anya ya bụ ígwè a gwakọtara ya na ụrọ, ọ bụghị ihe siri ike ka ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo. Ụrọ ahụ nọchiri anya “ụmụ mmadụ,” ya bụ, ndị nkịtị. (Ihe e dere n’ala ala peeji Dan. 2:43.) Taa, anyị na-ahụ otú ndị nkịtị si etinye aka ná ntụliaka ọchịchị, n’ịzọtara ndị mmadụ ihe ruuru ha, ná ngagharị iwe, nakwa n’òtù ndị ọrụ, nke na-eme ka o siere ọchịchị a ike ime ihe ha chọrọ ime.

11. Olee otú ọchịchị Briten na Amerịka si mee ka obi sie anyị ike na anyị bi n’oge ikpeazụ?

11 Nke abụọ, ọchịchị Briten na Amerịka, nke ụkwụ ihe ahụ a kpụrụ akpụ nọchiri anya ya, bụ ọchịchị ikpeazụ Baịbụl kwuru okwu ya ga-achị ụwa. E nweghị ọchịchị mmadụ ọzọ ga-anọchi ya. Kama nke ahụ, Alaeze Chineke ga-ebibi ya n’Amagedọn, ya na ọchịchị ụmụ mmadụ ndị ọzọ. cMkpu. 16:13, 14, 16; 19:19, 20.

12. Olee ihe ọzọ Daniel buru n’amụma na-akasi anyị obi, na-emekwa ka anyị nwee olileanya?

12 Olee uru amụma a ga-abara anyị? Amụma Daniel kwukwara ihe ndị ọzọ na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ. Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị ise (2,500) gara aga, Daniel buru amụma na Babịlọn chịchaa, ọchịchị anọ ọzọ ndị ga-achị ụwa ga-achị ndị Chineke. O kwukwara na ọchịchị Briten na Amerịka ga-abụ nke ikpeazụ n’ime ha. Ihe a na-akasi anyị obi, na-emekwa ka anyị nwee olileanya na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ niile ma chịwa ụwa niile.—Dan. 2:44.

13. Gịnị ka “eze nke asatọ” na “ndị eze iri” e kwuru okwu ha ná Mkpughe 17:9-12 nọchiri anya ha, oleekwa otú amụma a si mezuo?

13 Gụọ Mkpughe 17:9-12. Ebe ọ bụ na Agha Ụwa nke Mbụ bibiri nnukwu ihe, o mere ka e nwee otu ihe mere n’oge ahụ gosiri na anyị bi n’oge ikpeazụ. Ndị ọchịchị ụwa chọrọ ime ka e nwee udo n’ụwa niile. N’ihi ya, n’afọ 1920, ha hiwere Njikọ Mba Niile, nke Òtù Mba Ụwa mechara nọchie n’ọnwa Ọktoba afọ 1945. A kpọrọ òtù a “eze nke asatọ.” Ma, ọ bụghị ọchịchị ụwa. Ọ bụ ndị ọchịchị na-enye ya ike ma na-akwado ya. Baịbụl kpọrọ ndị ọchịchị ndị a “ndị eze iri.”

14-15. (a) Gịnị ka Mkpughe 17:3-5 kwuru gbasara “Babịlọn Ukwu”? (b) Gịnị ka ọtụtụ ndị na-akwadobu okpukpe ụgha na-emezi?

14 Gụọ Mkpughe 17:3-5. N’ọhụụ Chineke gosiri Jọn, ọ hụrụ nwaanyị akwụna a kpọrọ “Babịlọn Ukwu,” nke nọchiri anya okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. Olee otú amụma a si mezuo? Kemgbe ụwa, okpukpe ụgha na ndị ọchịchị ụwa na-eri n’otu efere, ha ana-akwadokwa ha. Ma, n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka ‘imezu nzube ya dịrị n’obi’ ndị ọchịchị ụwa. Gịnị ka ọ ga-akpata? Ndị ọchịchị ahụ a kpọrọ “ndị eze iri” ga-alụso okpukpe ụgha ọgụ ma bibie ya.—Mkpu. 17:1, 2, 16, 17.

15 Olee otú anyị si mara na mgbe a ga-ebibi Babịlọn Ukwu dị nso? Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a bụ icheta na mmiri Osimiri Yufretis nke gbara Babịlọn oge ochie gburugburu so na-echebe ya. Akwụkwọ Mkpughe ji ọtụtụ nde ndị mmadụ na-akwado Babịlọn Ukwu ahụ tụnyere “mmiri” na-echebe ya. (Mkpu. 17:15) Ma, o kwukwara na mmiri ahụ ga-atakpọ, nke na-egosi na ọtụtụ ndị na-akwado okpukpe ụgha ga-akwụsị ịkwado ya. (Mkpu. 16:12) Taa, amụma ahụ na-emezu n’ihi na ihe gbasara okpukpe anaghịzi amasị ọtụtụ ndị. Anya ha dịzi n’ebe ndị ọzọ a ga-egboro ha mkpa ha.

16. Olee uru ịghọta amụma a e buru gbasara Òtù Mba Ụwa na mbibi a ga-ebibi Babịlọn Ukwu ga-abara anyị?

16 Olee uru amụma a ga-abara anyị? Òtù Mba Ụwa a e hiwere na otú ọtụtụ ndị si kwụsị ịkwado okpukpe ụgha na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị nọbu n’okpukpe ụgha anaghịzi akwado ya, ma ọ bụghị otú ahụ ka okpukpe ụgha ga-esi nwụọ pịị. Dị ka anyị kwuburu, Jehova ga-eme ka ‘imezu nzube ya dịrị n’obi’ ndị ọchịchị ụwa, ya bụ, “ndị eze iri” na-akwado Òtù Mba Ụwa. Ndị ọchịchị ndị ahụ ga-ebibi Babịlọn Ukwu n’otu ntabi anya. Ihe a ga-eju ụwa niile anya. d (Mkpu. 18:8-10) Mbibi a ga-ebibi Babịlọn Ukwu ga-akpa ụwa niile aka. O nwekwara ike ime ka ihe sie ike. Ma, e nwere ọ dịkarịa ala ihe abụọ ga-eme ka ndị Chineke na-enwe obi ụtọ. Nke mbụ bụ na Babịlọn Ukwu a, bụ́ onye iro Jehova Chineke kemgbe ụwa, agaghịzi adị. Nke abụọ bụ na oge a ga-azọpụta anyị n’ụwa a jọgburu onwe ya adịla nso.—Luk 21:28.

OBI SIE GỊ IKE NA JEHOVA GA-ECHEBE NDỊ YA N’ỌDỊNIHU

17-18. (a) Olee otú anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-eso nke a?

17 Daniel buru amụma na ‘eziokwu a ga-amụta ga-ehi nne.’ O mezuokwala. Anyị aghọtala ọtụtụ amụma e buru gbasara oge anyị a. (Dan. 12:4, 9, 10) Otú amụma ndị ahụ si na-emezu mere ka anyị na-atụkwasịkwu Jehova na Okwu ya bụ́ Baịbụl obi. (Aịza. 46:10; 55:11) N’ihi ya, gbalịa na-eme ka okwukwe gị na-esikwu ike. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-amụsi Baịbụl ike na ịna-enyere ndị ọzọ aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Ọ ga-echebe ndị niile tụkwasịrị ya obi ha niile. Ọ ga-emekwa “ka ha na-ebi n’udo mgbe niile.”—Aịza. 26:3.

18 N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’amụma ndị gbasara ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ikpeazụ a. Anyị ga-amụta na amụma ndị ahụ na-egosikwa na anyị bi n’oge ikpeazụ. Anyị ga-ahụkwa ihe ndị ọzọ gosiri na Jizọs na-achị ugbu a n’eluigwe, nakwa na ọ na-edu ezigbo ndị na-eso ụzọ ya.

ABỤ NKE 61 Ndịàmà Jehova, Gaanụ n’Ihu

a Oge a anyị bi so n’oge kacha eme obi ụtọ. Alaeze Chineke ahụ Baịbụl buru amụma ya ọtụtụ ugboro amalitela ịchị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ amụma e buru ga-enyere anyị aka ka okwukwe anyị sikwuo ike na Jehova, meekwa ka obi ruo anyị ala, anyị atụkwasịkwuo ya obi ugbu a nakwa n’ọdịnihu.

b Gụọ isi nke 32, nọmba nke 4 n’akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Leekwa vidio dị na jw.org aha ya bụ Alaeze Chineke Malitere Ịchị n’Afọ 1914.

c Ị chọọ ịmatakwu gbasara amụma Daniel, gụọ Ụlọ Nche Jun 15, 2012, peeji nke 14 ruo na nke 19.

d Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya, gụọ isi nke 21 n’akwụkwọ bụ́ Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!