Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị: “Unu echela na m bịara ime ka udo dịrị”?

Jizọs kụziiri ndị mmadụ ka ha na ibe ha na-adị n’udo. Ma ọ gwara ndịozi ya n’otu oge, sị: “Unu echela na m bịara ime ka udo dịrị n’ụwa. Abịara m iweta mma agha, ọ bụghị udo. N’ihi na m bịara ikewa ezinụlọ. Nwoke ga na-emegide nna ya, nwa nwaanyị ana-emegide nne ya, nwunye nwa ana-emegidekwa nne di ya.” (Mat. 10:34, 35) Gịnị ka Jizọs bu n’obi kwuo ihe a?

Jizọs ebughị n’obi ikewa ezinụlọ. Ma ọ ma na ihe ndị ọ na-akụzi ga-ekewa ụfọdụ ezinụlọ. N’ihi ya, ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs e mere baptizim kwesịrị ịghọta na ihe ha kpebiri ime nwere ike ime ka obi ghara ịdị ndị ezinụlọ ha ụtọ. Di ha, nwunye ha, ma ọ bụ onye ezinụlọ ha na-anaghị efe Jehova megidewe ha, o nwere ike ime ka o siere ha ike ime ihe Jizọs kụziri.

Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha “na mmadụ niile dịrị n’udo.” (Rom 12:18) Ma, ihe Jizọs kụziri nwere ike ịdị ka “mma agha” n’ezinụlọ ụfọdụ. Ụdị ihe ahụ na-eme ma ọ bụrụ na otu onye anabata ihe Jizọs kụziri ma ndị ọzọ ajụ ya ma ọ bụ na-emegide ya. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee, ndị ezinụlọ onye ahụ na-eme onwe ha ka ha bụrụ “ndị iro” onye ahụ nabatara eziokwu Baịbụl.—Mat. 10:36.

Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka Ndị Kraịst ha na ndị ezinụlọ ha na-anaghị ekpe otu okpukpe kpebie ma hà ga-eme ihe dị Jehova na Jizọs mma, ka hà ga-eme ihe dị ndị ezinụlọ ha mma. Dị ka ihe atụ, ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst nwere ike inyewe ha nsogbu ka ha mee ememme okpukpe. Ụdị ihe ahụ mee, ònye ka ha ga-eme obi ụtọ? Jizọs sịrị: “Onye hụrụ nne ya ma ọ bụ nna ya n’anya karịa m erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m.” (Mat. 10:37) N’eziokwu, ihe Jizọs na-ekwu abụghị na ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya ga-akpọ ndị mụrụ ha asị. Kama, ọ na-akụziri ha otú ha ga-esi na-ekpebi ihe ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ ha. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova enyewe anyị nsogbu ka anyị ghara ife Jehova, anyị ka ga-ahụ ha n’anya. Ma, anyị na-aghọta na ọ bụ ịhụ Chineke n’anya bụ ihe kacha mkpa.

O doro anya na ndị ezinụlọ anyị megidewe anyị, o nwere ike iwuteru anyị n’ọkpụkpụ. Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs na-echeta na Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke na-achọghị iburu osisi ịta ahụhụ ya sowe m n’azụ erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m.” (Mat. 10:38) Ihe ọ pụtara bụ na Ndị Kraịst na-aghọta na mmegide ndị ezinụlọ ha na-emegide ha so n’ahụhụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-edi. Ma ha na-enwekwa olileanya na àgwà ọma ha na-akpa ga-eme ka ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst gbanwee obi ha ma chọọ ịmụta eziokwu Baịbụl.—1 Pita 3:1, 2.