Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 38

Bụrụ Onye A Ga-atụkwasịli Obi

Bụrụ Onye A Ga-atụkwasịli Obi

“Onye a tụkwasịrị obi anaghị ekwu ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ mara.”​—ILU 11:13.

ABỤ NKE 101 Anyị Na-arụkọ Ọrụ ma Dịrị n’Otu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú anyị nwere ike isi mata onye a ga-atụkwasịli obi?

 ONYE a ga-atụkwasịli obi na-agbalịsi ike ka o mezuo nkwa o kwere. Ọ na-ekwukwa eziokwu. (Ọma 15:4) Ọ na-edo ndị mmadụ anya na ha ga-atụkwasịli ya obi. Anyị chọrọ ka ụmụnna anyị si otú ahụ na-ele anyị anya. Gịnị ka anyị ga-eme ka ha nwee ike ịna-atụkwasị anyị obi?

2. Olee otú anyị ga-esi gosi na a ga-atụkwasịli anyị obi?

2 Anyị agaghị amanyeli ndị ọzọ ka ha tụkwasị anyị obi. Ọ bụ omume anyị ga-eme ka ha tụkwasị anyị obi. Ịtụkwasị mmadụ obi dị ka ego. Inweta ya na-esi ike. Ma, ịtụfu ya dị mfe. Jehova egosila na anyị ga-atụkwasịli ya obi. Anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi mgbe niile n’ihi na ‘e nwere ike ịtụkwasị ọrụ ya niile obi.’ (Ọma 33:4) Ọ chọkwara ka anyị na-eme ka ya. (Efe. 5:1) Ka anyị kwuo gbasara ụfọdụ ndị ohu Jehova ndị mere ka Nna ha nke eluigwe ma gosi na a ga-atụkwasịli ha obi. Anyị ga-amatakwa àgwà ise ga-enyere anyị aka ịbụ ndị a ga-atụkwasịli obi.

MỤTA IHE N’AKA NDỊ OHU JEHOVA A TỤKWASỊRỊ OBI

3-4. Olee otú Daniel onye amụma si gosi na ọ bụ onye a ga-atụkwasịli obi? Oleekwa ajụjụ ndị o kwesịrị ime ka anyị jụọ onwe anyị?

3 Daniel onye amụma gosiri otú e si abụ onye a tụkwasịrị obi. N’agbanyeghị na a dọọrọ ya n’agha laa Babịlọn, àgwà ya mere ka a mata na ọ bụ onye a ga-atụkwasịli obi. Ndị mmadụ tụkwasịkwuru ya obi mgbe Jehova nyeere ya aka, ya akọwaa nrọ ndị Eze Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn rọrọ. N’otu oge, Daniel gwara eze na Jehova na-ewesa ya iwe. Ọ bụghị ụdị ozi ahụ ka eze ga-achọ ịnụ. Daniel ga-enwerịrị obi ike tupu ya ezilie ụdị ozi ahụ n’ihi na Nebukadneza bụ onye iwe ọkụ. (Dan. 2:12; 4:20-22, 25) Mgbe ọtụtụ afọ gara, Daniel gosikwara na ọ bụ onye a ga-atụkwasịli obi mgbe ọ kọwara ozi gbara onye ọ bụla gharịị, nke e dere n’ahụ́ ájá n’obí eze Babịlọn. (Dan. 5:5, 25-29) Darayọs eze ndị Midia na ndị o mere ndị isi mechara chọpụtakwa na “mmụọ pụrụ iche na-akpa ike n’ahụ́” Daniel. Ha kwuru na Daniel “na-akwụwa aka ọtọ. Ọ naghị eleghara ọrụ ya anya, ọ naghịkwa arụrụ aka.” (Dan. 6:3, 4) Ị hụlanụ na ndị ọchịchị na-ekpere arụsị matadịrị na a ga-atụkwasịli onye a na-efe Jehova obi.

4 Ka anyị na-echebara àgwà ọma Daniel echiche, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee otú ndị na-anọghị n’ọgbakọ si ele m anya? Hà weere m ka onye ji ọrụ ya kpọrọ ihe nakwa onye a ga-atụkwasịli obi?’ Gịnị mere ajụjụ ndị a ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na anyị ga-eme ka e too Jehova ma anyị bụrụ ndị a ga-atụkwasịli obi.

Nehemaya họtara ndị a tụkwasịrị obi ga-arụ ọrụ ndị dị mkpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Gịnị nyeere Hananaya aka ịbụ onye a tụkwasịrị obi?

5 N’afọ 455 Tupu Oge Ndị Kraịst, mgbe Nehemaya bụ́ gọvanọ rụghachichara mgbidi Jeruselem, ọ pịrị aka họta ndị a tụkwasịrị obi ga na-elekọta obodo ahụ. Onye so ná ndị Nehemaya họọrọ bụ Hananaya, bụ́ onyeisi Ebe A Rụsiri Ike. Baịbụl kpọrọ Hananaya “nwoke a kacha tụkwasị obi,” kwuo na “ọ na-atụkwa egwu ezi Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.” (Nehe. 7:2) O ji obi ya niile rụọ ọrụ ọ bụla e nyere ya maka na ọ hụrụ Jehova n’anya, na-atụkwa egwu ime ihe ga-ewe ya iwe. Àgwà ndị a ga-enyekwara anyị aka ịbụ ndị a tụkwasịrị obi n’ozi anyị na-ejere Chineke.

6. Olee otú Tikikọs si gosi na ọ bụ enyi Pọl onyeozi ga-atụkwasịli obi?

6 Onye ọzọ bụ Tikikọs. Ọ bụ nwanna Pọl onyeozi tụkwasịrị obi. Mgbe a kpọchiri Pọl n’ụlọ ya, o jighị Tikitọs egwu egwu. Pọl kpọdịrị ya “onye ozi e kwesịrị ịtụkwasị obi.” (Efe. 6:21, 22) Pọl tụkwasịrị ya obi, ọ bụghị naanị ka o wegara ụmụnna nọ n’Efesọs nakwa na Kọlọsi akwụkwọ ozi Pọl deere ha, kamakwa ka ọ gbaa ha ume ma kasie ha obi. Tikikọs na-echetara anyị ụmụnna kwesịrị ntụkwasị obi ji obi ha niile na-enyere anyị aka taa ka okwukwe anyị sie ike.​—Kọl. 4:7-9.

7. Gịnị ka i si n’aka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nọ n’ọgbakọ unu mụta gbasara ịbụ onye a tụkwasịrị obi?

7 Taa, obi dị anyị ezigbo ụtọ na ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi bụ ndị anyị tụkwasịrị obi. Dị ka Daniel, Hananaya, na Tikikọs, ha anaghị eji ọrụ ha egwu egwu. Dị ka ihe atụ, anyị gaa ọmụmụ ihe etiti izu, obi na-esi anyị ike na e nweela ndị e kenyere ihe omume niile. Obi na-adịkwa ndị okenye ezigbo ụtọ ma ndị e nyere ihe omume kwadebe ya nke ọma ma bịa mee ya. Dị ka ihe atụ, ịkpọ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ka ha bịa ọmụmụ ihe ná ngwụcha izu anaghị eme anyị obi abụọ maka na obi siri anyị ike na onye na-ahazi okwu ihu ọha agaghị echefu ikenye ya onye ga-ekwu ya. Obi na-esikwa anyị ike na a ga-enwe akwụkwọ ndị anyị ga-eji aga ozi ọma. Ezigbo ụmụnna ndị a na-elekọta anyị nke ọma. Anyị na-ekelekwa Jehova maka ha. Ma, olee otú anyị ga-esi bụrụ ndị a tụkwasịrị obi?

BỤRỤ ONYE A GA-ATỤKWASỊLI OBI NKE NA-ANAGHỊ EKWU IHE A NA-ACHỌGHỊ KA NDỊ ỌZỌ NỤ

8. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime n’agbanyeghị na anyị na-achọ ịma otú ụmụnna anyị mere? (Ilu 11:13)

8 Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. Anyị na-achọkwa ịma otú ha mere. Ma, anyị ekwesịghị ịna-enyonye anya n’ihe ha na-achọghị ka onye ọzọ mara. Ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs “na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha, na-ekwukwa ihe ndị ha na-ekwesịghị ikwu.” (1 Tim. 5:13) O doro anya na anyị achọghị ime ka ha. Ma, ọ bụrụkwanụ na mmadụ agwa anyị ihe ụfọdụ gbasara onwe ya, sị anyị agwala ya onye ọzọ? Dị ka ihe atụ, nwanna nwaanyị nwere ike ịkọrọ anyị ọrịa ọ na-arịa ma ọ bụ nsogbu ọzọ bịaara ya, gwa anyị ka anyị ghara ịkọrọ ya onye ọzọ. Anyị kwesịrị ime ihe ọ gwara anyị. * (Gụọ Ilu 11:13.) Ka anyị kwuo gbasara ebe ndị ọzọ ọ dị mkpa ka anyị ghara ịgwa onye ọzọ ihe mmadụ gwara anyị.

9. Olee otú ndị nọ n’ezinụlọ ga-esi gosi na ha bụ ndị a tụkwasịrị obi?

9 N’ezinụlọ. Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ kwesịrị ịgba mbọ ka ọ ghara ịkọsa ihe naanị ndị ezinụlọ ha kwesịrị ịma. Dị ka ihe atụ, nwaanyị bụ́ Onye Kraịst nwere ike inwe àgwà na-atọ di ya ọchị. Di ya ò kwesịrị ịkọwara ya ndị ọzọ, si otú ahụ menye ya ihere? Mbanụ. Ebe ọ bụ na ọ hụrụ nwunye ya n’anya, ọ gaghị achọ ime ihe ọ bụla ga-akpasu ya iwe. (Efe. 5:33) Ndị na-eto eto na-achọ ka a na-akwanyetụrụ ha ùgwù. Ndị nne na nna kwesịrị ịna-echeta ihe a. Ha ekwesịghị ịna-emenye ụmụ ha ihere, na-akọrọ ndị ọzọ ihe ụmụ ha na-emetaghị. (Kọl. 3:21) Ụmụaka kwesịrị inwe uche. Ha ekwesịghị ịna-akọrọ ndị ọzọ ihe nwere ike imenye ndị ezinụlọ ha ihere. (Diut. 5:16) Ndị nọ n’ezinụlọ ga na-adịkwu ná mma ma onye nke ọ bụla na-agbasi mbọ ike ka ọ ghara ịna-akọrọ ndị ọzọ ihe dịịrị naanị ndị ezinụlọ ha.

10. Gịnị ka ịbụ ezigbo enyi pụtara? (Ilu 17:17)

10 N’ebe ndị enyi anyị nọ. E nwere ihe ga-eme mgbe ụfọdụ, ọtụtụ n’ime anyị achọwa ezigbo enyi ha ga-akọrọ otú obi dị ha. O nwere ike isi ike mgbe ụfọdụ. O nwere ike ọ naghị adịrị anyị mfe ịkọrọ onye ọzọ ihe dị anyị n’obi. Obi ga-agbawakwa anyị ma anyị mata na enyi anyị kọọrọ ndị ọzọ ihe anyị kọọrọ ya. Ma, obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị nwee enyi obi siri anyị ike na ntị ọzọ agaghị anụ ihe anyị kọọrọ ya. Onye ahụ bụ “ezigbo enyi.”​—Gụọ Ilu 17:17.

Ndị okenye anaghị akọrọ ndị ezinụlọ ha ihe a na-ekwesịghị ịkọrọ ndị ọzọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. (a) Olee otú ndị okenye na ndị nwunye ha si egosi na ha bụ ndị a tụkwasịrị obi? (b) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka otu okenye ya na ndị ezinụlọ ya nọ mgbe o lebachara anya n’ihe ọ na-ekwesịghị ịkọrọ ndị ọzọ n’ọgbakọ? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 N’ọgbakọ. Ndị okenye na-anaghị agwa ndị ọzọ ihe mmadụ gwara ha na-abụrụ ụmụnna ha ‘ebe ha ga-agbaba’ ma nsogbu bịara ha. (Aịza. 32:2) Obi na-esi anyị ike ịkọrọ ụmụnna ndị a otú ọ dị anyị maka na anyị ma na ntị ọzọ agaghị anụ ihe anyị gwara ha. Anyị anaghị aghụ ha ọnụ ka ha gwa anyị ihe ha na-ekwesịghị ịgwa onye ọzọ. Anyị na-akwanyekwara ndị bụ́ nwunye ndị okenye ùgwù maka na ha anaghị enye di ha nsogbu ka ha gwa ha ihe mmadụ gwara ha, nke onye ahụ na-achọghị ka ntị ọzọ nụ. N’eziokwu, ọ dị mma na onye bụ́ okenye anaghị agwa nwunye ya ihe ụmụnna na-achọghị ka onye ọzọ mara. Otu nwanna nwaanyị di ya bụ okenye sịrị: “Obi dị m ụtọ na di m anaghị akọrọ m gbasara ndị ọ gaara nleta ọzụzụ atụrụ ma ọ bụ ndị ndị okenye kwesịrị inyere aka. Ọ naghịdị agwa m aha ha. Obi na-adị m ụtọ na ọ naghị agwa m ihe ọ na-ekwesịghị ịgwa m, ka m ghara ichegbuwe onwe m gbasara ihe a na-enweghị ihe m ga-emeli maka ya. O meela ka obi na-eru m ala mgbe mụ na onye ọ bụla na-ekwurịta okwu n’ọgbakọ. Obi na-esikwa m ike na ọ bụrụ na mụ akọọrọ di m otú obi dị m ma ọ bụ ihe bụ́ nsogbu m, na ọ gaghị akọrọ ya onye ọzọ.” O doro anya na anyị niile chọrọ ka a mata na a ga-atụkwasịli anyị obi. Olee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịbụ ndị a ga-atụkwasịli obi? Ka anyị kwuo ise n’ime ha.

MỤTA ÀGWÀ NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA ỊBỤ ONYE A GA-ATỤKWASỊLI OBI

12. Gịnị mere a ga-eji kwuo na ọ bụ ịhụnanya ga-eme ka a tụkwasị anyị obi? Nye ihe atụ.

12 Ọ bụ ịhụnanya ga-eme ka a tụkwasị anyị obi. Jizọs kwuru na iwu abụọ kacha iwu niile bụ ịhụ Jehova n’anya na ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 22:37-39) Anyị hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụ ya mere anyị ji agba mbọ ka anyị bụrụ ndị a tụkwasịrị obi otú ahụ ọ bụ. Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. N’ihi ya, ha kọọrọ anyị ihe ha na-achọghị ka onye ọzọ nụ, anyị agaghị agwa ya onye ọzọ. Anyị agaghị anwa anwa kwuo ihe nwere ike imebiri ha ihe, menye ha ihere, ma ọ bụ wute ha.​—Jọn 15:12.

13. Olee otú ịdị umeala n’obi si enyere anyị aka ịbụ ndị a ga-atụkwasịli obi?

13 Ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka ịbụ ndị a ga-atụkwasịli obi. Onye Kraịst dị umeala n’obi anaghị agbawa mbọ ka ọ bụrụ ya ga-ebu ụzọ kwuo ihe ka e nwee ike ito ya. (Fil. 2:3) Ọ naghị etu ọnụ ma ọ bụ mee ka ndị ọzọ chee na ọ ma ihe ụfọdụ dị mkpa a sịrị ya agwala onye ọzọ. Ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ghara ịna-akọrọ ndị ọzọ ihe anyị chere gbasara ihe a na-ekwughị na Baịbụl ma ọ bụ n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl.

14. Olee otú nghọta si enyere anyị aka ịbụ ndị a ga-atụkwasịli obi?

14 Nghọta ga-enyere Onye Kraịst aka ịmata “oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekli. 3:7) N’obodo ụfọdụ, a na-ekwukarị na “ikwu okwu bụ ọlaọcha, ma ịgbachi nkịtị bụ ọlaedo.” Ihe ọ pụtara bụ na e nwere mgbe ụfọdụ ịgba nkịtị na-aba uru karịa ikwu okwu. Ọ bụ ya mere Ilu 11:12 ji sị: “Onye na-aghọta ihe nke ọma na-agbachi nkịtị.” Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna bụrụla okenye ọtụtụ afọ. Ọ bụ ya ka a na-agwakarị ka o nyere ọgbakọ ndị ọzọ nwere nsogbu tara akpụ aka. Nwanna ọzọ bụ́kwa okenye kwuru banyere okenye ahụ, sị: “Ọ na-akpachara anya mgbe niile ka ọ ghara ịkọ ihe ọ na-ekwesịghị ịkọ banyere ọgbakọ ndị ọzọ ahụ.” Otú okenye a si egosi na o nwere nghọta emeela ka ndị okenye ibe ya n’ọgbakọ ha na-akwanyere ya ùgwù. Obi siri ha ike na ọ gaghị akọrọ ndị ọzọ ihe ha na-achọghị ka onye ọzọ nụ.

15. Nye ihe atụ na-egosi otú ịkwụwa aka ọtọ nwere ike isi mee ka ndị ọzọ na-atụkwasị anyị obi.

15 Ịkwụwa aka ọtọ bụ ihe ọzọ ga-eme ka a tụkwasị anyị obi. Anyị na-atụkwasị onye na-akwụwa aka ọtọ obi maka na anyị ma na ọ ga-ekwu eziokwu mgbe niile. (Efe. 4:25; Hib. 13:18) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị chọrọ ịmụtakwu otú e si akụzi ihe nke ọma, gị agwa otu nwanna ka o gee okwu gị ma tụọrọ gị aro ndị ga-enyere gị aka ịna-akụzikwu ihe nke ọma. Ònye ka obi ga-esi gị ike na ọ ga-enye gị ezigbo ndụmọdụ? Ọ̀ bụ onye ga-agwa gị ihe ị chọrọ ịnụ, ka ọ̀ bụ onye ga-eji obiọma gwa gị nke bụ́ eziokwu? Ị manụ azịza ya. Baịbụl sịrị: “Ọ ka mma ịbara mmadụ mba n’ihu ọha kama ịhụ mmadụ n’anya ma ghara igosi ya na a hụrụ ya n’anya. Ọnyá ezigbo enyi mmadụ na-emepụ ya dị mma.” (Ilu 27:5, 6) Ọ bụ eziokwu enyi anyị gwara anyị n’ezoghị ọnụ ga-emecha baara anyị uru n’agbanyeghị na o nwere ike ibu ụzọ gbaa anyị agba ná ntị.

16. Olee otú Ilu 10:19 si gosi na anyị kwesịrị ịna-ejide onwe anyị?

16 Anyị kwesịrị ịna-ejide onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndị ọzọ na-atụkwasị anyị obi. Àgwà ahụ ga-enyere anyị aka ijide ọnụ anyị aka ma anyị chọwa ikwu ihe mmadụ gwara anyị, sị anyị agwala onye ọzọ. (Gụọ Ilu 10:19.) Anyị nwere ike ịchọpụta na ọ na-esiri anyị ike ijide onwe anyị mgbe anyị gara n’Ịntanet. Ma anyị akpacharaghị anya, e nwere ike anyị agaghị ama mgbe anyị ji gwa ọtụtụ ndị ihe anyị na-ekwesịghị ịgwa onye ọzọ. Ozugbo anyị si n’Ịntanet zipụ ozi, ihe a ga-eji ozi ahụ mee ma ọ bụ nsogbu ọ ga-akpata adịghịzi anyị n’aka. Ijide onwe anyị ga-emekwa ka anyị gbachi nkịtị ma ndị na-emegide anyị gbalịwa ịghọgbu anyị ka anyị gwa ha ihe nwere ike itinye ụmụnna anyị ná nsogbu. O nwere ike ịbụ mgbe ndị uwe ojii na-agba anyị ajụjụ ná mba a machiri ozi ọma anyị iwu ma ọ bụ sị anyị emela ihe ụfọdụ. Ụdị ihe a mee, anyị “ga-eji ihe kechie ọnụ” anyị otú ahụ Baịbụl kwuru. (Ọma 39:1) Anyị kwesịrị ịbụ ndị mmadụ niile ga-atụkwasịli obi, ma ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, ụmụnna anyị, ma onye ọ bụla ọzọ. Anyị chọọ ịbụ ndị a tụkwasịrị obi, anyị kwesịrị ịna-ejide onwe anyị.

17. Olee otú anyị ga-esi mee ka ndị nọ n’ọgbakọ anyị na-atụkwasị anyị obi?

17 Obi atọgbuola anyị na Jehova kpọbatara anyị n’ọgbakọ ya ndị nọ na ya bụ ndị hụrụ ibe ha n’anya ma tụkwasị ibe ha obi. Anyị niile ga na-agbalịsi ike ịna-eme ihe ga-eme ka ụmụnna anyị na-atụkwasị anyị obi. Ọ bụrụ na anyị ana-agbakwu mbọ na-ahụ ndị ọzọ n’anya, dịrị umeala n’obi, nwee nghọta, na-akwụwa aka ọtọ, ma na-ejide onwe anyị, anyị ga-eme ka ndị nọ n’ọgbakọ anyị na-atụkwasị anyị obi. Anyị agaghị akwụsị ịna-agbalịsi ike ka ndị ọzọ tụkwasị anyị obi. Ka anyị na-eme ka Chineke anyị, bụ́ Jehova, ma na-egosi mgbe niile na anyị bụ ndị a ga-atụkwasịli obi.

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

^ Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndị ọzọ tụkwasị anyị obi, anyị ga-ebugodị ụzọ gosi na e kwesịrị ịtụkwasị anyị obi. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere anyị ji kwesị ịna-atụkwasị ụmụnna anyị obi nakwa àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịbụ ndị a ga-atụkwasịli obi.

^ Anyị mata na nwanna emeela mmehie dị oké njọ, anyị kwesịrị ịgwa ya ka ọ gaa gwa ndị okenye ka ha nyere ya aka. Ya jụ, anyị ga-aga gwa ndị okenye maka na anyị na-erubere Jehova na ọgbakọ ya isi.

^ NKỌWA FOTO: Okenye ya na ndị ezinụlọ ya nọ, ma ọ gwaghị ha gbasara okwu o so leba anya na ya nke ọ na-ekwesịghị ịkọrọ ndị ọzọ