Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa, oleekwa ụdị mbilite n’ọnwụ ha ga-enweta?

Legodị otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị a.

Ọrụ Ndịozi 24:15 gwara anyị na Chineke “ga-akpọlite ndị ezi omume na ndị ajọ omume nwụrụ anwụ.” Ndị ezi omume ahụ bụ ndị rubeere Chineke isi tupu ha anwụọ. N’ihi ya, aha ha dị n’akwụkwọ nke ndụ. (Mal. 3:16) Ndị so ná ndị ajọ omume ahụ bụ ndị a na-enyeghị ohere zuru ezu ịmụta gbasara Jehova tupu ha anwụọ. N’ihi ya, aha ha adịghị n’akwụkwọ nke ndụ.

Jọn 5:​28, 29 (Baịbụl Nsọ​—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ) kwukwara gbasara ụzọ ndị abụọ ahụ e kwuru okwu ha n’Ọrụ Ndịozi 24:15. Jizọs kwuru na “ndị mere ezi ihe ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” Ndị ezi omume ahụ mere ihe ọma tupu ha anwụọ. A ga-akpọlite ha n’ọnwụ ha enweta ndụ ebighị ebi n’ihi na aha ha ka dị n’akwụkwọ nke ndụ. Ma, ndị ajọ omume ahụ mere ihe ọjọọ tupu ha anwụọ. Ha ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe. Aha ha adịbeghị n’akwụkwọ nke ndụ. A ga-elerukwa àgwà ha anya. N’oge ahụ, a ga-enye ha ohere ka ha mụta gbasara Jehova ka e nwee ike ideba aha ha n’akwụkwọ nke ndụ.

Mkpughe 20:12, 13 kwuru na ndị niile a ga-akpọlite n’ọnwụ kwesịrị irube isi “n’ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ,” ya bụ, iwu ọhụrụ ndị Chineke ga-enye anyị n’ụwa ọhụrụ. Jehova ga-egbu ndị na-erubeghị isi n’iwu ndị ahụ.​—Aịza. 65:20.

Daniel 12:2 kwuru na ọtụtụ n’ime ndị nwụrụ anwụ ga-eteta. Ụfọdụ “ga-enweta ndụ ebighị ebi. Ma a ga-akọcha ndị ọzọ, ihere ga-emekwa ha ruo mgbe ebighị ebi.” Ihe amaokwu a na-ekwu okwu ya bụ ihe ga-emecha mee ndị ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ. Ha ga-enweta “ndụ ebighị ebi” ma ọ bụ ‘ihere emee ha ruo mgbe ebighị ebi.’ N’ihi ya, mgbe Jizọs ga-achịcha otu puku afọ, ụfọdụ ga-enweta ndụ ebighị ebi, e bibiekwa ụfọdụ ndị ruo mgbe ebighị ebi.​—Mkpu. 20:15; 21:3, 4.

Legodị ihe atụ a. E nwere ike iji ihe ga-eme ụzọ ndị abụọ a kpọlitere n’ọnwụ tụnyere ihe na-eme ndị chọrọ ibi n’obodo ọzọ. Ndị ezi omume dị ka ndị e nyere akwụkwọ ikike ịrụwazi ọrụ ma ọ bụ ibiwezi n’ebe ahụ. Ọ ga-eme ka a mata ndị ha bụ, ha enwerekwa onwe ha. Ma, ndị ajọ omume dị ka ndị nke e nyere akwụkwọ ikike ibi ma ọ bụ ịnọ obere oge. E nwere ihe ndị ahụ bịara abịa ga-eme tupu e nye ha ikike ibiwezi n’obodo ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị ajọ omume a kpọlitere n’ọnwụ. Ha kwesịrị irube isi n’iwu Jehova tupu ha egosi na ha ruru eru ibi na Paradaịs. Ihe ọzọ bụ na n’agbanyeghị ụdị akwụkwọ ikike e nyere ndị bịara obodo ọzọ, e nwere ike imecha mee ụfọdụ n’ime ha ndị obodo ahụ, ma gbaara ụfọdụ n’ime ha ụgbọ nwa mkpi. Ihe a ga-eji kpebie nke a ga-eme mmadụ bụ otú o si kpaa àgwà n’obodo ahụ ọ gara. Ọ bụkwa otú ọ ga-adị ndị a kpọlitere n’ọnwụ. Ihe a ga-eji kpebie ma à ga-ebibi ha ma hà ga-enweta ndụ ebighị ebi bụ okwukwe ha na otú ha si kpaa àgwà n’ụwa ọhụrụ.

Jehova bụ Chineke ịhụnanya. Ma, ọ na-ekpekwa ikpe ziri ezi. (Diut. 32:4; Ọma 33:5) Otú ọ ga-esi gosi ịhụnanya ya bụ ịkpọlite ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume. Ma, ọ ga-achọ ka ha niile na-erubere iwu ya isi. Ọ bụ naanị ndị hụrụ ya n’anya ma na-erubere ya isi ka ọ ga-ekwe ka ha biri n’ụwa ọhụrụ.