Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isiokwu A na-amụ Amụ nke 40

‘Inyere Ọtụtụ Ndị Aka Ka Ha Bụrụ Ndị Ezi Omume’

‘Inyere Ọtụtụ Ndị Aka Ka Ha Bụrụ Ndị Ezi Omume’

“Ndị na-enyere ọtụtụ ndị aka ka ha bụrụ ndị ezi omume ga na-enwukwa ka kpakpando ruo mgbe niile ebighị ebi.”​—DAN. 12:3.

ABỤ NKE 151 Ọ Ga-akpọ Òkù

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe ga-eme anyị obi ụtọ n’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị?

 OBI ga-abụ anyị sọ aṅụrị mgbe a ga-amalite ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ụwa n’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị. Ndị niile ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ na-atụsi anya ike ịhụ ha ọzọ. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa Jehova. (Job 14:15) Chegodị otú ọnụ ga-esi bụrụ ndị niile nọ n’ụwa ọchị ọchị mgbe a ga-akpọlite ndị ha nwụrụ anwụ. Dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ, a ga-akpọlite “ndị ezi omume,” bụ́ ndị e dere aha ha n’akwụkwọ nke ndụ, ha ‘enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ.’ (Ọrụ 24:15; ihe e dere n’ala ala peeji Jọn 5:29.) Ọtụtụ ndị anyị hụrụ n’anya nwere ike iso ná ndị mbụ a ga-akpọlite n’ụwa mgbe Amagedọn gachara. * E nwekwara “ndị ajọ omume,” bụ́ ndị a na-enyeghị ohere zuru ezu ịmata Jehova ma ọ bụ iji obi ha niile fee ya tupu ha anwụọ. Ha “ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”

2-3. (a) Dị ka e kwuru n’Aịzaya 11:9, 10, olee ụdị nkụzi a ga-akụzi nke karịrị nke a kụzitụrụla kemgbe ụwa? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

2 E kwesịrị ịkụziri ndị a niile a ga-akpọlite n’ọnwụ ihe. (Aịza. 26:9; 61:11) N’ihi ya, a ga-akụziri ụmụ mmadụ ihe karịa otú e metụrụla kemgbe ụwa. (Gụọ Aịzaya 11:9, 10.) Maka gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ndị ajọ omume a kpọlitere n’ọnwụ kwesịrị ịmụta banyere Jizọs Kraịst, Alaeze Chineke, ihe mgbapụta, na mkpa aha Jehova dị nakwa igosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị. Ndị ezi omume kwesịkwara ịmata ihe ndị Jehova ji nwayọọ nwayọọ kụziere ndị ya gbasara ihe o bu n’obi maka ụwa. Ụfọdụ n’ime ndị ezi omume ahụ nwụrụ ọtụtụ afọ tupu e dechaa Baịbụl. E nwere ọtụtụ ihe ndị ezi omume na ndị ajọ omume ga-amụta.

3 N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Olee otú a ga-esi kụzie nnukwu ihe ahụ a ga-akụzi? Olee otú ihe ahụ a ga-akụzi ga-esi eme ka e dee aha mmadụ n’akwụkwọ nke ndụ otú a na-agaghị ehichapụli ya ehichapụ ma ọ bụ ghara ide ya? Azịza ajụjụ ndị a dị anyị mkpa taa. Dị ka anyị ga-ahụ, ụfọdụ amụma ndị dị ịtụnanya e buru n’akwụkwọ Daniel na Mkpughe ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe ga-eme ma a kpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ka anyị buru ụzọ leba anya n’amụma e dere na Daniel 12:1, 2.

“NDỊ NWỤRỤ ANWỤ GA-ETETA”

4-5. Gịnị ka Daniel 12:1 kwuru gbasara oge ikpeazụ?

4 Gụọ Daniel 12:1. Akwụkwọ Daniel kwuru otú ihe ndị ga-eme n’oge ikpeazụ ga-esi eme na usoro ha ga-esi eme. Dị ka ihe atụ, Daniel 12:1 kwuru na Maịkel, ya bụ, Jizọs, ‘na-enyere ndị Chineke aka.’ Amụma ahụ malitere imezu n’afọ 1914, mgbe Jizọs ghọrọ Eze nke Alaeze eluigwe.

5 Ma, a gwakwara Daniel na Jizọs “ga-ebili” mgbe “a ga-enwe oge nsogbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe a malitere inwe mba ruo n’oge ahụ.” “Oge nsogbu” ahụ bụ “oké mkpagbu” ahụ e kwuru okwu ya na Matiu 24:21. Jizọs ga-ebili ichebe ndị Chineke ná ngwụcha oge nsogbu ahụ, ya bụ, n’Amagedọn. Akwụkwọ Mkpughe kwuru na ha bụ oké ìgwè mmadụ ndị “si n’oké mkpagbu ahụ pụta.”​—Mkpu. 7:9, 14.

6. Gịnị ga-eme ma oké ìgwè mmadụ ahụ sichaa n’oké mkpagbu ahụ pụta? Kọwaa. (Kọwaakwa ihe e dere ‘n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ’ nke gbara n’Ụlọ Nche a gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa.)

6 Gụọ Daniel 12:2 na ihe e dere n’ala ala peeji ya. Gịnị ga-eme ma oké ìgwè mmadụ ahụ sichaa n’oké mkpagbu ahụ pụta? N’oge gara aga, anyị chere na amaokwu a na-ekwu banyere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe ma ọ bụ otú e si kwusasiwe ozi ọma ike mgbe ndị mmegide gbalịchara ịkwụsị ozi ọma anyị n’afọ 1918. * Ma, anyị aghọtala ugbu a na ọ na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? E kwukwara gbasara ájá na Job 17:16. Okwu a sụgharịrị “ime ala” n’ihe e dere n’ala ala peeji Daniel 12:2 bụkwa otu okwu ahụ a sụgharịrị “ájá” na Job 17:16. Ihe ọ pụtara n’amaokwu ahụ bụ ili. Ihe ọ na-egosi bụ na Daniel 12:2 na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ma oge ikpeazụ a gachaa, mgbe a lụchara agha Amagedọn.

7. (a) Olee otú ụfọdụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-esi enweta ndụ ebighị ebi? (b) Olee otú o si bụrụ “mbilite n’ọnwụ ka mma”?

7 Ma, Daniel 12:2 kwuru na ụfọdụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ “ga-enweta ndụ ebighị ebi.” Gịnị ka ọ pụtara? Ihe ọ pụtara bụ na n’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị, ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-enweta ndụ ebighị ebi ma ha bịa mata Jehova na Jizọs, gharakwa ịkwụsị ịmata ha, ma na-erubere ha isi. (Jọn 17:3) Ọ ga-abụ “mbilite n’ọnwụ ka mma.” Ọ ga-aka nke ụmụ mmadụ a kpọlitere n’ọnwụ n’oge gara aga mma. (Hib. 11:35) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị ahụ na-ezughị okè a kpọlitere n’ọnwụ mechara nwụọ ọzọ.

8. Olee otú ụfọdụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-esi ‘nweta nkọcha, ihere emeekwa ha ruo mgbe ebighị ebi’?

8 Ma, ọ bụghị ndị niile a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-achọ ka Jehova kụziere ha ihe. Daniel buru amụma na ụfọdụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ‘ga-enweta nkọcha, ihere emeekwa ha ruo mgbe ebighị ebi.’ A gaghị ede aha ha n’akwụkwọ nke ndụ, ha agaghịkwa enweta ndụ ebighị ebi, maka na ha ga-enupụ isi. Kama inweta ndụ ebighị ebi, “ihere ga-eme ha ruo mgbe ebighị ebi,” ya bụ, na a ga-ebibi ha. Ọ pụtara na Daniel 12:2 na-ekwu gbasara ihe ga-emecha mee ndị niile a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ihi ihe ha mere mgbe a kpọlitechara ha n’ọnwụ. * (Mkpu. 20:12) Ụfọdụ ga-enweta ndụ ebighị ebi. Ụfọdụ agaghị enweta.

‘INYERE ỌTỤTỤ NDỊ AKA KA HA BỤRỤ NDỊ EZI OMUME’

9-10. Gịnị ọzọ ga-eme ma oké mkpagbu gachaa, oleekwa ndị “ga na-enwu ka ìhè mbara igwe”?

9 Gụọ Daniel 12:3. Olee ihe ọzọ ga-eme ma “oge nsogbu” ahụ gachaa? E wezụga ihe e kwuru na Daniel 12:2, amaokwu nke 3 kwuru ihe ga-eme ma oké mkpagbu gachaa.

10 Olee ndị “ga na-enwu ka ìhè mbara igwe”? Ihe Jizọs kwuru na Matiu 13:43 ga-enyere anyị aka. Ọ sịrị: “N’oge ahụ, ndị ezi omume ga-enwu gbaa dị ka anyanwụ n’Alaeze Nna ha.” Amaokwu ndị ọzọ dị na Matiu isi 13 gosiri na Jizọs na-ekwu gbasara “ụmụ Alaeze,” ya bụ, ụmụnna ya e tere mmanụ, ndị ga-eso ya achị n’eluigwe. (Mat. 13:38) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na Daniel 12:3 na-ekwu gbasara ndị e tere mmanụ na ọrụ ha ga-arụ n’ime otu puku afọ ahụ ha na Jizọs ga-achị.

Ndị e tere mmanụ ga-eso Jizọs na-eduzi ọrụ ịkụzi ihe a ga-arụ n’ime otu puku afọ ahụ ha ga-achị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11-12. Olee ọrụ ndị e tere mmanụ ga-arụ n’ime otu puku afọ ahụ ha ga-eso Jizọs chịa?

11 Olee otú ndị e tere mmanụ ga-esi “na-enyere ọtụtụ ndị aka ka ha bụrụ ndị ezi omume?” Ndị e tere mmanụ ga-eso Jizọs na-eduzi ọrụ ịkụzi ihe a ga-arụ n’ụwa n’ime otu puku afọ ahụ ha ga-achị. Ọ bụghị naanị na ha ga-abụ ndị eze, kama ha ga-abụkwa ndị nchụàjà. (Mkpu. 1:6; 5:10; 20:6) N’ihi ya, ha ga-enye aka ‘gwọọ mba niile,’ ya bụ, jiri nwayọọ nwayọọ mee ka ụmụ mmadụ zuo okè. (Mkpu. 22:1, 2; Ezik. 47:12) Ọ ga-atọgbu ndị e tere mmanụ atọgbu.

12 Olee ndị ga-eso ‘n’ọtụtụ ndị’ a ga-enyere aka ka ha bụrụ ndị ezi omume? Ọ bụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ na ndị gafere Amagedọn na ụmụ ndị ha nwere ike ịmụta n’ụwa ọhụrụ. Mgbe otu puku afọ ahụ gachara, ndị niile nọ n’ụwa ga-ezu okè. Ma, olee mgbe a ga-ede aha ha n’akwụkwọ nke ndụ otú a na-agaghị ehichapụli ya ehichapụ, ya bụ, mgbe a ga-eji ịnk dee aha ha, kama iji pensụl?

ULE IKPEAZỤ

13-14. Gịnị ka ndị niile zuru okè nọ n’ụwa kwesịrị ime tupu ha enweta ndụ ebighị ebi?

13 Anyị kwesịrị icheta na mmadụ izu okè apụtaghị na ọ ga-enwetarịrị ndụ ebighị ebi. Chegodị gbasara Adam na Iv. Ha zuru okè ná mbido. Ma, ha kwesịrị ịna-erubere Jehova Chineke isi ma ọ bụrụ na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi. Ọ dị mwute na ha nupụụrụ ya isi.​—Rom 5:12.

14 Gịnị ga-eme ndị nọ n’ụwa ma Jizọs chịchaa otu puku afọ? Ha niile ga-ezu okè mgbe ahụ. Ha niile hà ga na-erubere Jehova isi ruo mgbe ebighị ebi? Ka à ga-enwe ndị ga-eme ka Adam na Iv, bụ́ ndị nupụụrụ Jehova isi n’agbanyeghị na ha zuru okè? Anyị kwesịrị ịmata azịza ajụjụ ndị a. Ma, olee otú anyị ga-esi amata ha?

15-16. (a) Olee mgbe a ga-enye mmadụ niile ohere igosi ma hà ga-erubere Jehova isi? (b) Olee ihe ga-eme ma ule ikpeazụ ahụ gachaa?

15 A ga-atụ Setan mkpọrọ ruo otu puku afọ. N’oge ahụ, ọ gaghị enwe ike iduhie onye ọ bụla. Ma, otu puku afọ ahụ gachaa, a ga-atọhapụ ya. Ọ ga-agbalịzi iduhie ndị mmadụ zuru okè. Mmadụ niile zuru okè ga-ejizi oge ule ahụ gosi ma hà ga-asọpụrụ aha Jehova ma kwado ọchịchị ya. (Mkpu. 20:7-10) A ga-eji ihe onye ọ bụla n’ime ha mere n’oge ahụ kpebie ma à ga-ede aha ya n’akwụkwọ nke ndụ otú a na-agaghị ehichapụli ya ehichapụ.

16 Ụfọdụ ndị ga-emekwa ka Adam na Iv, jụ ọchịchị Jehova. Gịnị ga-eme ha? Mkpughe 20:15 gwara anyị, sị: ‘A tụbara onye ọ bụla a na-edeghị aha ya n’akwụkwọ nke ndụ n’ọdọ ọkụ ahụ.’ A ga-ebibi ndị niile nupụụrụ Jehova isi ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ọtụtụ n’ime ndị ahụ zuru okè ga-erubere Jehova isi n’oge ahụ. A ga-ede aha ha n’akwụkwọ nke ndụ otú a na-agaghị ehichapụli ya ehichapụ.

“N’OGE ỌGWỤGWỤ”

17. Gịnị ka otu mmụọ ozi gwara Daniel ga-eme n’oge anyị? (Daniel 12:4, 8-10)

17 Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ iche gbasara ihe ndị a ga-eme n’ọdịnihu. Ma, e nwekwara ihe ụfọdụ dị mkpa otu mmụọ ozi gwara Daniel gbasara oge anyị, ya bụ, “oge ọgwụgwụ.” (Gụọ Daniel 12:4, 8-10; 2 Tim. 3:1-5) Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: “Eziokwu a ga-amụta ga-ehikwa nne.” N’eziokwu, ndị Chineke ga-aghọtakwu amụma ndị e buru n’akwụkwọ Daniel. Mmụọ ozi ahụ kwukwara na n’oge ahụ, “ndị ajọ omume ga na-eme ajọ omume, e nweghịkwa onye ajọ omume ga-aghọta ihe ndị a.”

18. Gịnị ga-eme ndị ajọ omume n’oge na-adịghị anya?

18 Taa, o nwere ike ịdị ka à ga-asị na o nweghị ihe a na-eme ndị mere ihe ọjọọ. (Mal. 3:14, 15) Ma n’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-ekpe ndị yiri ewu, ya bụ, ndị ajọ omume, ikpe, sikwa n’ebe ndị yiri atụrụ nọ wepụ ha. (Mat. 25:31-33) Ndị ajọ omume ahụ agaghị agafe oké mkpagbu, a gaghịkwa akpọlite ha n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa ọhụrụ. Aha ha agaghịkwa adị “n’akwụkwọ e dere aha ndị ọ ga-echeta” e kwuru okwu ya na Malakaị 3:16.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a, n’ihi gịnịkwa? (Malakaị 3:16-18)

19 Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị igosi na anyị esoghị ná ndị ajọ omume. (Gụọ Malakaị 3:16-18.) Jehova na-akpọkọta ndị o weere ka “ndị pụrụ iche,” ya bụ, ndị ọ na-ejighị egwu egwu. O doro anya na anyị chọrọ iso ná ndị ahụ.

Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ ịhụ ka Daniel, ndị nwụnahụrụ anyị, na ọtụtụ ndị ọzọ “ga-ebili” ka ha nweta òkè ha n’ụwa ọhụrụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20)

20. Olee nkwa ikpeazụ e kwere Daniel, gịnịkwa mere i ji atụsi anya ike mgbe a ga-emezu nkwa ahụ?

20 N’eziokwu, anyị bi n’oge na-eme obi ụtọ. Ma, ihe ndị ga-aka mee anyị obi ụtọ ga-eme n’oge na-adịghị anya. Anyị ga-ahụ ka a na-ebibi ndị ajọ omume niile. Nke ahụ mechaa, anyị ga-ahụ ka Jehova na-emezu nkwa o kwere Daniel. Ọ sịrị ya: “Ị ga-ebili ka i nweta òkè gị mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.” (Dan. 12:13) Ị̀ na-atụsi anya ike mgbe Daniel na ndị gị niile nwụrụ anwụ “ga-ebili”? Ọ bụrụ na ị na-atụsi anya ya ike, gbalịa ike gị niile ugbu a ka i rubere Jehova isi. I mee otú ahụ, obi ga-esi gị ike na a gaghị ehichapụ aha gị n’akwụkwọ nke ndụ Jehova na-ede.

ABỤ NKE 80 ‘Detụ Jehova Ire, Hụ na Ọ Dị Mma’

^ Isiokwu a ga-akọwa ihe a gbanwere n’otú anyị si ghọta ọrụ ịkụzi ihe kachanụ a rụtụrụla kemgbe ụwa, nke e kwuru okwu ya na Daniel 12:2, 3. Anyị ga-amata mgbe a ga-arụ ya na ndị ga-eso rụọ ya. Anyị ga-ahụkwa otú nkụzi a ga-esi mee ka ndị bi n’ụwa jikere maka ule ikpeazụ a ga-enwe mgbe Jizọs chịchara otu puku (1,000) afọ.

^ Ndị mbụ a ga-akpọlite n’ọnwụ nwere ike ịbụ ndị ezi omume nwụrụ n’oge ikpeazụ a, ndị ga-eso ha abụrụ ndị nwụrụ tupu hanwa, e sizie otú ahụ laghachiwe azụ, si n’otu ọgbọ gaa n’ọgbọ ọzọ. O mee otú ahụ, ọgbọ nke ọ bụla ga-enwe ike ịnabata ndị ha mabu ama. Nke ọ bụla ọ bụ, ihe Baịbụl kwuru banyere ndị ga-aga eluigwe bụ na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ “n’usoro.” Obi kwesịrị isi anyị ike na a ga-akpọlitekwa ndị ga-ebi n’ụwa n’usoro.​—1 Kọr. 14:33; 15:23.

^ Ihe a a kọwara gbanwere ihe anyị ghọtaburu e dere n’isi nke 17 n’akwụkwọ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! nakwa n’Ụlọ Nche July 1, 1987, peeji nke 21 ruo na nke 25.

^ Ma, “ndị ezi omume” na “ndị ajọ omume” e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 24:15 na “ndị mere ezi ihe” na “ndị mere ajọ omume” e kwuru na Jọn 5:29 (Baịbụl Nsọ​—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ) na-ekwu gbasara ihe ndị a kpọlitere n’ọnwụ mere tupu ha anwụọ.