Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 3

Jehova Na-eme Ka Ihe Anyị Na-eme Na-aga Nke Ọma

Jehova Na-eme Ka Ihe Anyị Na-eme Na-aga Nke Ọma

“Jehova nọnyeere Josef . . . , na-eme ka ihe niile ọ na-eme na-aga nke ọma.”—JEN. 39:2, 3.

ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. (a) Gịnị mere na ọ naghị eju anyị anya na nsogbu na-abịara anyị? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

 EBE anyị bụ ndị Jehova, ọ naghị eju anyị anya na nsogbu na-abịara anyị. Anyị ma na Baịbụl kwuru na “ọtụtụ nsogbu ga-abịara anyị tupu anyị abanye n’Alaeze Chineke.” (Ọrụ 14:22) Anyị makwa na ụfọdụ nsogbu anyị nwere taa agaghị akwụsị ruo mgbe anyị ga-abanye n’ụwa ọhụrụ Chineke ebe ‘ọnwụ na-agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.”—Mkpu. 21:4.

2 Jehova anaghị echebe anyị ka nsogbu ọ bụla ghara ịbịara anyị. Ma, ọ na-enyere anyị aka idi ya. Legodị ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bi na Rom. O bu ụzọ kwuo nsogbu ụfọdụ na-abịara ya na ụmụnna ya. Ọ sịziri: “Anyị na-emeri n’ihi na onye ahụ hụrụ anyị n’anya na-enyere anyị aka.” (Rom 8:35-37) Ihe ọ pụtara bụ na Jehova ga-emeli ka ihe ị na-eme na-aga nke ọma ọ bụrụgodị na nsogbu gị akwụsịbeghị. Ka anyị hụ otú Jehova si nyere Josef aka ka ihe ọ na-eme na-aga nke ọma na otú o nwere ike isi nyere gị aka.

MGBE IHE GBANWERE NA MBEREDE

3. Gịnị gbanwere ná ndụ Josef n’otu ntabi anya?

3 Jekọb mere ka o doo anya na ọ hụrụ nwa ya bụ́ Josef n’anya nke ukwuu. (Jen. 37:3, 4) N’ihi ya, ụmụnne ya ndị tọrọ ya malitere imere ya anyaụfụ. Mgbe ha nwetara ohere, ha resịrị ya ndị Midian. Ndị Midian kpọọrọ Josef gaa Ijipt. Obodo a dị ezigbo anya n’obodo ha. N’ebe ahụ, ha resịrị ya Pọtịfa bụ́ onyeisi ndị nche Fero. Ndụ Josef gbanwere n’otu ntabi anya. O si n’ebe ọ bụ nwa nna ya na-ejighị egwu egwu gaa n’ebe ọ bụ ohu onye Ijipt.—Jen. 39:1.

4. Olee otú ụdị nsogbu bịaara Josef nwere ike isi bịara anyị?

4 Baịbụl kwuru na ‘ọdachi na-abịara mmadụ niile.’ (Ekli. 9:11) Mgbe ụfọdụ, nsogbu ndị na-abịara ndị ọzọ na-abịakwara anyị. (1 Kọr. 10:13) Nsogbu nwekwara ike ịbịara anyị n’ihi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Dị ka ihe atụ, e nwere ike ịna-akwa anyị emo, na-emegide anyị, ma ọ bụdị na-akpagbu anyị n’ihi ihe anyị kweere. (2 Tim. 3:12) N’agbanyeghị ụdị nsogbu bịaara gị, Jehova nwere ike ime ka ihe ị na-eme na-aga nke ọma. Olee otú o si meere ya Josef?

Jehova mere ka ihe Josef na-eme na-aga nke ọma ma mgbe e rere ya ka ọ bụrụ ohu Pọtịfa n’Ijipt (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Gịnị ka Pọtịfa chọpụtara bụ́ ihe mere ihe ji na-agara Josef nke ọma? (Jenesis 39:2-6)

5 Gụọ Jenesis 39:2-6. Pọtịfa chọpụtara na Josef ma ihe, na-arụsikwa ọrụ ike. Ọ makwa ihe kpatara ya. Pọtịfa hụrụ na “Jehova na-eme ka ihe niile [Josef] na-eme na-aga nke ọma.” b Ka oge na-aga, o mere Josef onye ozi ya ọ tụkwasịrị obi. O nyekwara ya ọrụ ilekọta ụlọ ya niile. Gịnị meziri? Ihe nọ na-agara Pọtịfa nke ọma.

6. Olee otú ọ ga-abụ na obi dị Josef maka ihe ndị mere ya?

6 Chegodị otú obi dị Josef mgbe ihe ndị ahụ na-eme. Olee ihe kacha ya mkpa? Ọ̀ bụ ka Pọtịfa hụ ihe ọ na-eme ma meere ya ihe ọma? Ọ ga-abụ na ihe kacha ya mkpa bụ ka a hapụ ya ka ọ lakwuru nna ya. A sị ka e kwuwe, n’agbanyeghị ọkwá ọ bụla e nyere ya n’ụlọ Pọtịfa, ọ ka na-agbara onye na-anaghị efe Jehova ohu. Jehova emeghị ka Pọtịfa hapụ Josef. Ihe ga-emecha kadịrị ya njọ.

Ọ BỤRỤ NA IHE AKA NJỌ

7. Olee otú nsogbu Josef si ka njọ? (Jenesis 39:14, 15)

7 Dị ka e kwuru na Jenesis isi 39, ihe Josef masịwara nwunye Pọtịfa, ya achọọkwa ugboro ugboro ịnwata Josef ka ya na ya dinaa. Ma, Josef ekweghị. N’ikpeazụ, iwe were nwunye Pọtịfa, ya ebo Josef ebubo na ọ chọrọ idina ya n’ike. (Gụọ Jenesis 39:14, 15.) Mgbe Pọtịfa nụrụ ya, ọ tụbara Josef n’ụlọ mkpọrọ. Ọ nọrọ ebe ahụ ruo afọ ụfọdụ. (Jen. 39:19, 20) Olee otú ụlọ mkpọrọ ahụ dị? Okwu Hibru Josef ji kọwaa “ụlọ mkpọrọ” ahụ nwere ike ịpụta “olulu.” Ihe ọ na-egosi bụ na ebe ahụ gbara ọchịchịrị, ọ dịkwa ya ka nke ya agwụla. (Jen. 40:15 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl kwuru na e nwere mgbe a tụrụ ya ịga n’ụkwụ, keekwa ya agbụ ígwè n’olu. (Ọma 105:17, 18) Nsogbu Josef nọ na-aka njọ. O si n’ịbụ ohu a tụkwasịrị obi ghọzie onye mkpọrọ.

8. Ọ bụrụgodị na nsogbu anyị aka njọ, olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

8 È nweela mgbe nsogbu bịaara gị kakwuru njọ n’agbanyeghị na ị na-ekpesi ekpere ike gbasara ya? Ụdị ihe ahụ nwere ike ime. Jehova anaghị echebe anyị ka nsogbu ọ bụla ghara ịbịara anyị n’ụwa a Ekwensu na-achị. (1 Jọn 5:19) N’agbanyeghị ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ma nsogbu anyị niile, ihe gbasara anyị na-emetụkwa ya n’obi. (Mat. 10:29-31; 1 Pita 5:6, 7) Ihe ọzọkwa bụ na o kwere anyị nkwa, sị: “E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka m gbakụta gị azụ.” (Hib. 13:5) Jehova ga-enyere gị aka ịtachi obi, ọ bụrụgodị na nsogbu gị eyie ihe a na-enweghị ihe a ga-emeli gbasara ya. Ka anyị hụ otú Jehova si meere Josef ihe a.

Jehova nọnyeere Josef ma mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ e mere ya onyeisi ndị mkpọrọ niile (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. Gịnị gosiri na Jehova nọnyeere Josef mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ? (Jenesis 39:21-23)

9 Gụọ Jenesis 39:21-23. Ma n’oge ahụ Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ ihe siiri ya ike, Jehova mere ka ihe ọ na-eme na-aga nke ọma. Olee otú o si mee ya? Onyeisi ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ mechara tụkwasịwa Josef obi ma na-akwanyere ya ùgwù otú ahụ Pọtịfa meburu. O teghị aka, ya emee Josef onyeisi ndị mkpọrọ niile. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl sịrị na “onyeisi ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ anaghị etinye anya n’ihe ọ bụla o nyefere n’aka Josef.” E nweziri ọrụ dị mkpa Josef na-arụ ugbu a. O nweghị onye tụrụ anya ụdị mgbanwe a. Cheta na e boro Josef ebubo na ọ chọrọ idina nwunye onye na-eje ozi n’obí eze n’ike. Olee otú e si nye ya ụdị ọrụ a a na-enye onye a tụkwasịrị obi? Ọ bụ naanị otu ihe ga-eme ka ụdị ihe a kwe omume. Jenesis 39:23 kwuru na “Jehova nọnyeere Josef. Jehova mekwara ka ihe niile Josef na-eme na-aga nke ọma.”

10. Kọwaa ihe mere o nwere ike iji bụrụ na Josef echeghị na ihe ọ na-eme na-aga nke ọma.

10 Chegodị otú obi dị Josef. Ì chere na Josef chere na ihe niile ọ na-eme na-aga nke ọma mgbe e bochara ya ebubo ma tụọ ya mkpọrọ? Olee ihe kacha ya mkpa? Ọ̀ bụ ka onyeisi ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ lewe ya anya ọma? Ọ ga-abụ na ihe kacha Josef mkpa n’oge ahụ bụ ka a mata na aka ya dị ọcha nakwa ka a tọhapụ ya. Ọ gwadịrị onye mkpọrọ ọzọ a chọrọ ịtọhapụ ka ọ gwa Fero gbasara yanwa ka e nwee ike ịtọhapụ ya na mkpọrọ ọ nọ. (Jen. 40:14) Ma, onye ahụ agwaghị Fero gbasara Josef ozugbo ọ pụtara na mkpọrọ ahụ. Ihe ahụ mere ka Josef nọkwuo ebe ahụ afọ abụọ ọzọ. (Jen. 40:23; 41:1, 14) Ma, Jehova ka na-emekwa ka ihe ọ na-eme na-aga nke ọma. Olee otú o si mee ya?

11. Olee nkà pụrụ iche Jehova mere ka Josef nwee, oleekwa otú o si nye aka mee ka nzube Jehova mezuo?

11 Mgbe Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ, Jehova mere ka eze Ijipt rọọ nrọ abụọ nyere ya nsogbu n’obi. Fero chọsiri ike ịmata ihe nrọ ndị ahụ pụtara. Mgbe eze matara na Josef nwere ike ịkọwa nrọ, o kwuru ka a kpọta ya. Jehova nyeere Josef aka, ya akọwaa nrọ ndị ahụ, gwakwa Fero ihe ndị ọ ga-eme. Ihe ahụ tọgburu Fero atọgbu. Ebe ọ bụ na Fero ahụla na Jehova nọnyeere Josef, o mere Josef onye na-elekọta nri n’Ijipt niile. (Jen. 41:38, 41-44) Mgbe e mechara, ezigbo ụnwụ dara n’Ijipt nakwa na Kenan, bụ́ ebe ndị ezinụlọ Josef hà bi. Josef zọziri ndị ezinụlọ ya ndụ. Ọ bụ otú a ka e si chebe ezinụlọ e si mụta Mezaya.

12. Olee otú Jehova si mee ka ihe ndị Josef na-eme na-aga nke ọma?

12 Chee gbasara ihe ndị ụfọdụ dị ịtụnanya mere ná ndụ Josef. Ònye mere ka Pọtịfa hụ ihe Josef bụ́ ohu nkịtị ga-emeli? Ònye mere ka onye na-elekọta ndị mkpọrọ lewe Josef bụ́ onye mkpọrọ anya ọma? Ònye mere ka Fero rọọ nrọ ndị ahụ nyere ya nsogbu n’obi, meekwa ka Josef nwee ike ịkọwa ha? Ònye mere ka a họpụta Josef ka ọ bụrụ onye na-elekọta nri n’Ijipt? (Jen. 45:5) O doro anya na ọ bụ Jehova mere ka ihe Josef na-eme na-aga nke ọma. Ọ bụ eziokwu na ụmụnne Josef chọrọ igbu ya, Jehova gbanwere ihe ndị merenụ iji mezuo uche ya.

OTÚ JEHOVA SI EME KA IHE Ị NA-EME NA-AGA NKE ỌMA

13. Jehova ọ̀ na-etinye aka n’ihe niile na-eme ná ndụ anyị? Kọwaa.

13 Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Josef? Jehova ọ̀ na-etinye aka n’ihe niile na-eme ná ndụ anyị? Ọ̀ na-echebe anyị, mee ka ihe ọjọọ niile na-eme ná ndụ anyị mechaa ghọọrọ anyị ngọzi? Mba. Ọ bụghị ihe Baịbụl na-akụzi. (Ekli. 8:9; 9:11) Ma, ihe anyị ma bụ na mgbe ọ bụla nsogbu bịaara anyị, Jehova na-ahụ ya, ọ na-anụkwa arịrịọ anyị na-arịọ ya ka o nyere anyị aka. (Ọma 34:15; 55:22; Aịza. 59:1) Nke kachanụ bụ na Jehova na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Olee otú o si eme ya?

14. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ma anyị nwee nsogbu?

14 Otu ụzọ Jehova si enyere anyị aka bụ ịkasi anyị obi na ịgba anyị ume n’oge ọ dị anyị mkpa. (2 Kọr. 1:3, 4) Ọ bụ ihe o meere otu nwanna bi na Tọkmenestan aha ya bụ Eziz. A tụrụ ya mkpọrọ afọ abụọ n’ihi ihe o kweere. Nwanna Eziz sịrị: “N’ụtụtụ ụbọchị a ga-ekpe m ikpe, otu nwanna gụụrụ m Aịzaya 30:15, ebe sịrị: ‘Unu ga-adị ike naanị ma unu nọrọ jii ma tụkwasị m obi.’ Amaokwu ahụ nyeere m aka ịnọrọ jii ma tụkwasị Jehova obi n’ihe niile. Ichebara amaokwu a echiche nyeere m aka n’oge niile m nọ n’ụlọ mkpọrọ.” Ì nwere ike icheta oge Jehova mere ka i nweta nkasi obi na agbamume n’oge ọ kacha dị gị mkpa ná ndụ gị?

15-16. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Tori?

15 Ọtụtụ mgbe, anyị anaghị aghọta otú Jehova si enyere anyị aka mgbe anyị nọ ná nsogbu ruo mgbe nsogbu ahụ kwụsịrị. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Tori chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Nwa ya nwoke aha ya bụ Mason rịara kansa afọ isii tupu ya anwụọ. Obi gbawara Tori. Ọ sịrị: “Echeghị m na e nwere ihe ọzọ ga-agbawa m obi ka ọnwụ nwa m.” Ọ sịkwara: “Ama m na ndị nne na nna ndị ọzọ ga-ekweta na ọ na-aka agbawa obi ma mmadụ hụ ka nwa ya na-ata ahụhụ karịa otú o si agbawa ya obi mgbe yanwa na-ata ahụhụ.”

16 Ma, n’agbanyeghị otú obi si gbawaa Tori, o mechara chee gbasara otú Jehova si nyere ya aka idi nsogbu ahụ. Ọ sịrị: “M cheta oge ahụ, m na-ahụ na Jehova nyeere m aka n’oge niile nwa m na-arịa ọrịa. Dị ka ihe atụ, n’oge ọrịa nwa m kara njọ nke na a naghị ekwe ka ndị mmadụ hụ ya, ụmụnna na-agbadị n’ụzọ awa abụọ iji bịa leta anyị n’ụlọ ọgwụ. A na-enwerịrị onye nọ n’ụlọ ọgwụ dị njikere inyere anyị aka. Ihe ọzọkwa bụ na ụmụnna nyere anyị ihe ndị dị anyị mkpa. Ma mgbe ihe siri ezigbo ike, anyị na-enweta ihe niile dị anyị mkpa.” Jehova nyere Tori na Mason nwa ya ihe niile dị ha mkpa iji die nsogbu ha.—Kọwaa ihe e dere n’igbe bụ́ “ Jehova Nyere Anyị Ihe Niile Dị Anyị Mkpa.”

ECHEFULA OTÚ JEHOVA SI NYERE GỊ AKA

17-18. Olee otú anyị ga-esi chọpụta ụzọ dị iche iche Jehova si enyere anyị aka n’oge nsogbu ma na-enwe obi ụtọ maka ha? (Abụ Ọma 40:5)

17 Gụọ Abụ Ọma 40:5. Ọ bụrụ na mmadụ na-aga obodo dị anya, o nwere ike ịkwụsị n’ụzọ ọtụtụ ugboro ka o zurutụ ike tupu ya eruo ebe ọ na-aga. Anyịnwa kwesịkwara anyị nọtụ, anyị akwụsịtụ chee gbasara ihe ndị Jehova meerela anyị iji mee ka ihe anyị na-eme na-aga nke ọma, ma n’oge anyị nọ ná nsogbu. Ná ngwụcha ụbọchị ọ bụla, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ụzọ Jehova si gọzie m taa? N’agbanyeghị na nsogbu m akwụsịbeghị, olee otú Jehova si enyere m aka idi ya?’ Lee ma ị̀ ga-achọpụta, ọ dịkarịa ala, otu ụzọ Jehova si mee ka ihe ị na-eme na-aga nke ọma.

18 N’eziokwu, i nwere ike ịna-ekpe ekpere ka nsogbu gị ahụ kwụsị. Ọ bụ ihe i kwesịrị ime. (Fil. 4:6) Ma, anyị kwesịkwara ịna-achọpụta ụzọ dị iche iche Jehova si agọzi anyị ugbu a. A sị ka e kwuwe, Jehova kwere nkwa ime ka anyị dị ike ma nyere anyị aka idi nsogbu anyị. N’ihi ya, na-ekele Jehova mgbe niile maka ụzọ ndị o si akwado gị. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị ga-ahụ otú Jehova si eme ka ihe ị na-eme na-aga nke ọma, otú ahụ o meere Josef, ma n’oge ihe siri ike.—Jen. 41:51, 52.

ABỤ NKE 32 Na-akwado Jehova

a Ọ bụrụ na e nwere nsogbu anyị na ya na-alụ, o nwere ike anyị agaghị eche na ‘ihe anyị na-eme na-aga nke ọma.’ Anyị nwere ike ịna-eche na ọ bụ mgbe nsogbu ahụ kwụsịrị ka ihe ga-agawara anyị nke ọma. Ma, ihe mere ná ndụ Josef na-akụziri anyị otu ihe dị ezigbo mkpa. Ọ na-akụziri anyị na Jehova nwere ike ime ka ihe anyị na-eme na-aga nke ọma, ma mgbe nsogbu bịaara anyị. Isiokwu a ga-akọwara anyị otú o si eme ya.

b Ọ bụ naanị n’amaokwu ole na ole ka Baịbụl kọrọ gbasara ihe ndị mbụ ahụ gbanwere mgbe Josef na-agba ohu. Ma, o nwere ike ịbụ na ha mere n’ime ọtụtụ afọ.