Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 8

“Na-echenụ Echiche Nke Ọma, Na-echekwanụ Nche”

“Na-echenụ Echiche Nke Ọma, Na-echekwanụ Nche”

“Na-echenụ echiche nke ọma, na-echekwanụ nche.”​—1 PITA 5:8.

ABỤ NKE 144 Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya gbasara oge ọgwụgwụ, oleekwa aka ná ntị ọ dọrọ ha?

 ABALỊ ole na ole tupu Jizọs anwụọ, mmadụ anọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe àmà nke ọgwụgwụ oge a?’ (Mat. 24:3) Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji jụọ ya ajụjụ ahụ bụ ka ha mara mgbe a ga-ebibi Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Ihe Jizọs gwara ha abụghị naanị gbasara mbibi a ga-ebibi Jeruselem na ụlọ nsọ ya, kama, ọ gwakwara ha gbasara “ọgwụgwụ oge a” anyị bi na ya. Jizọs kwuru gbasara oge ọgwụgwụ, sị: “E nweghị onye ma ụbọchị ma ọ bụ awa ọ ga-abụ. Ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama naanị Nna m ma.” Ọ dọziri ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha ‘mụrụ anya’ ma “na-eche nche.”​—Mak 13:32-37.

2. Olee ihe mere o ji dị ezigbo mkpa ka Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs na-eche nche?

2 Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu n’oge ndịozi Jizọs kwesịrị ịnọrọ na nche n’ihi na ọ ga-eme ka ha dịrị ndụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị ọ ga-abụ ha mewe, ha amara na oge a ga-ebibi Jeruselem na ụlọ nsọ ya adịla nso. Ọ gwara ha, sị: “Mgbe unu hụrụ ka ìgwè ndị agha gbara Jeruselem gburugburu, maranụ na oge a ga-eme ka ọ tọgbọrọ nkịtị adịla nso.” Ọ bụrụ na ihe a emee, ha kwesịrị ‘ịmalite ịgbaga n’ugwu’ otú ahụ Jizọs gwara ha. (Luk 21:20, 21) Ndị gere Jizọs ntị esoghị ná ndị e gburu mgbe ndị Rom bịara bibie Jeruselem.

3. Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Oge a anyị bi na ya bụ oge ọ fọrọ obere ka e bibie ụwa ochie Setan a. N’ihi ya, anyịnwa kwesịkwara ịna-eche echiche nke ọma ma nọrọ na nche. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara ihe anyị kwesịrị iburu n’obi ka anyị na-ahụ ihe ndị na-eme n’ụwa a, otú anyị ga-esi kpachara anya n’ihe ndị anyị na-eme, nakwa otú anyị ga-esi jiri oge fọrọ ugbu a na-eme ihe ndị kacha mkpa.

IHE ANYỊ KWESỊRỊ IBURU N’OBI KA ANYỊ NA-AHỤ IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA

4. Olee ihe mere o ji amasị anyị ịma otú ihe ndị na-eme n’ụwa taa si emezu amụma Baịbụl?

4 E nwere ezigbo ihe mere ọ na-eji atọ anyị ụtọ ịhụ otú ihe ndị na-eme n’ụwa taa si emezu amụma Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịma na oge a ga-ebibi ụwa Ekwensu a adịla nso. (Mat. 24:3-14) Pita onyeozi gbara anyị ume ka anyị na-echebara otú amụma ndị e buru na Baịbụl si emezu echiche ka o nwee ike ime ka okwukwe anyị sie ike. (2 Pita 1:19-21) Ihe akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl ji bido bụ: “Ihe ndị a ka Jizọs Kraịst kpughere. Ọ bụ Chineke kpugheere ya ihe ndị a ka o gosi ndị ohu ya ihe ndị ga-emerịrị n’oge na-adịghị anya.” (Mkpu. 1:1) N’ihi ya, ọ na-amasị anyị ịmata ihe ndị na-eme n’ụwa taa nakwa ịchọpụta otú ha nwere ike isi na-emezu amụma Baịbụl. O nwekwara ike ịna-agụsi anyị agụụ ike anyị na ndị ọzọ ikwurịta ya.

Anyị na ndị ọzọ kwurịtawa gbasara amụma dị na Baịbụl, olee ihe anyị na-ekwesịghị ime, oleekwanụ ihe anyị kwesịrị ime? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5) b

5. Gịnị ka anyị kwesịrị izere, oleekwa ihe anyị kwesịrị ime? (Kọwaakwa ihe ndị e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

5 Ọ bụrụ na anyị na mmadụ ana-ekwurịta gbasara amụma dị na Baịbụl, anyị ekwesịghị ikwuwe ihe anyị chere nwere ike ime. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị achọghị ikwuwe ihe ga-eme ka ọgbakọ ghara ịdị n’otu. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịnụ ka ndị ọchịchị na-ekwu gbasara otú ha ga-esi dozie otu nsogbu ma ọ bụkwanụ otú ha ga-esi mee ka udo dịrị, obi eruo ndị mmadụ ala. Kama ịna-ekwu na ihe a ha kwuru na-emezu amụma e buru ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:3, anyị kwesịrị ịgbalị na-achọpụta ihe ndị kacha ọhụrụ nzukọ Jehova bipụtara. Ọ bụrụ na ihe anyị na-ekwurịta abụrụ ihe nzukọ Jehova bipụtara, anyị na-eme ka ọgbakọ nwee otu obi, ‘ihe ha na-eche abụrụkwa otu.’​—1 Kọr. 1:10; 4:6.

6. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta na 2 Pita 3:11-13?

6 Gụọ 2 Pita 3:11-13. Pita onyeozi nyeere anyị aka ịmara ihe anyị kwesịrị iburu n’obi ma anyị lebawa anya n’amụma ndị e buru na Baịbụl. Ọ gbara anyị ume ka anyị ‘buru ụbọchị Jehova n’uche.’ N’ihi gịnị? Ọ bụghị ka anyị jiri aka anyị gbakọta “ụbọchị na awa” Jehova ga-eme ka agha Amagedọn malite. Kama, ọ bụ n’ihi na anyị chọrọ iji oge fọọrọ anyị ‘na-akpa àgwà dị nsọ, na-efekwa Chineke.’ (Mat. 24:36; Luk 12:40) Otú ọzọ e nwere ike isi ekwu ya bụ na anyị chọrọ ịna-akpa àgwà dị mma, jidekwa n’aka na ihe mere anyị ji agba mbọ na-efe Chineke bụ na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-eme.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-AKPACHARA ANYA?

7. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-akpachara anya? (Luk 21:34)

7 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eleru anya n’ihe ndị na-eme n’ụwa nakwa ka ha na-akpachara anya. Ihe o kwuru na Luk 21:34 mere ka ihe a doo anya. (Gụọ ya.) Jizọs gwara ha, sị: “Kpacharanụ anya.” Onye na-akpachara anya na-eleru anya ka ọ chọpụta ihe ndị nwere ike ime ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma, gbaakwa mbọ zere ihe ndị ahụ. Onye ahụ na-esi otú ahụ eme ka Chineke na-ahụ ya n’anya.​—Ilu 22:3; Jud 20, 21.

8. Gịnị ka Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst?

8 Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha kpachara anya. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs, sị: “Kpacharanụ nnọọ anya ka unu ghara ịna-akpa àgwà ka ndị na-amaghị ihe, kama na-akpanụ àgwà ka ndị ma ihe.” (Efe. 5:15, 16) Ekwensu na-agbalịsi ike ka o mee ka anyị na Jehova gharazie ịdị ná mma. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị ‘gbalịa na-aghọta ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme’ ka Ekwensu ghara inweta anyị.​—Efe. 5:17.

9. Olee otú anyị ga-esi agbalị na-aghọta ihe Jehova chọrọ ka anyị mee?

9 Baịbụl ekwughị ihe niile nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. E nwere ọtụtụ mgbe ọ ga-adị mkpa ka anyị kpebie ihe anyị ga-eme n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwughị ihe ọ bụla gbasara ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ikpebi ihe dị mma, anyị kwesịrị ịgbalị “na-aghọta ihe Jehova chọrọ” ka anyị mee. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-amụ Baịbụl mgbe niile na ịna-echebara ihe anyị mụrụ echiche. Ọ bụrụ na anyị ana-aghọtakwu uche Jehova ma na-enwekwu “uche Kraịst,” anyị ga na-akpa àgwà “ka ndị ma ihe,” ọ bụrụgodị na e nweghị iwu ọ bụla gwara anyị ihe anyị ga-eme. (1 Kọr. 2:14-16) Mgbe ụfọdụ, ọ na-adịrị anyị mfe ịchọpụta ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ na-esi ike.

10. Olee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị izere?

10 Ihe ụfọdụ anyị kwesịrị izere bụ ịchụ nwoke ma ọ bụ ịchụ nwaanyị, ịṅụ oké mmanya, iwe iwe ọkụ, ikwu okwu ọjọọ, ile ndị na-eme tigbuo zọgbuo, ile ndị gba ọtọ, na ihe ndị ọzọ yiri ha. (Ọma 101:3) Ekwensu bụ́ onye iro anyị na-agbasi mbọ ike mgbe niile ka ọ hụ na anyị mere ihe ga-eme ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. (1 Pita 5:8) Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, Ekwensu nwere ike ime ka anyaụfụ, aghụghọ, anyaukwu, ịkpọ ndị mmadụ asị, mpako, ma ọ bụkwanụ iburu ndị mmadụ iwe n’obi batawa anyị n’obi. (Gal. 5:19-21) Na mbụ, anyị nwere ike iche na o nweghị ihe ihe ndị a mere. Ma, ọ bụrụ na anyị agbaghị mbọ ozugbo wepụ ha n’obi anyị, ha nwere ike ịgbanye mgbọrọgwụ n’obi anyị ma kpatara anyị nsogbu.​—Jems 1:14, 15.

11. Olee otu ihe yichara ihe na-enweghị oké ihe ọ bụ anyị kwesịrị izere, maka gịnị?

11 Otu ihe yichara ihe na-enweghị oké ihe ọ bụ anyị kwesịrị izere bụ anyị na ndị ọjọọ ịna-akpakọrịta. Ka e were ya na e nwere onye gị na ya na-arụkọ ọrụ na-abụghị Onyeàmà Jehova. Ị chọrọ ka ọ na-ele Ndịàmà Jehova anya ọma. N’ihi ya, ị na-emere ya obiọma, na-enyekwara ya aka. E nwere mgbe ụfọdụ gị na ya so rie nri ehihie. Ma, o teghị aka, gị na ya eriwe nri ehihie mgbe niile. Mgbe ụfọdụ, ọ na-anọkata kwuo ihe ndị rụrụ arụ. Na mbụ, ụdị ihe ahụ anaghị amasị gị. Ma, ka oge na-aga, ihe ndị ahụ ọ na-ekwu maara gị ahụ́, ọ naghịzi ewe gị iwe. Ma, otu ụbọchị, onye ọrụ ibe gị ahụ gwara gị ka gị na ya soro gaa ṅụọ mmanya mgbe ọrụ mechiri, gị ekweta. I mechara chọpụta na ị na-echezi echiche ka onye ahụ. Ugbu a, ọ gaghịzi adị anya gị akpawa àgwà ka ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị ịna-emere onye ọ bụla obiọma, na-akwanyekwara onye ọ bụla ùgwù. Ma, anyị kwesịrị icheta na anyị ga-ebido kpawa àgwà ka ndị anyị na ha na-anọkarị. (1 Kọr. 15:33) Ọ bụrụ na anyị akpachara anya dị ka Jizọs gwara anyị, anyị na ndị na-anaghị eme ihe Jehova chọrọ agaghị na-akpakọrịta. (2 Kọr. 6:15) Anyị kwesịrị ịchọpụta na ihe a bụ nsogbu ma zere ya.

JIRI OGE GỊ NA-EME IHE KACHA MKPA

12. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs ga na-eme ka ha na-eche ka e bibie ụwa ochie a?

12 Ndị na-eso ụzọ Jizọs agaghị afanye aka n’ụkwụ na-eche ka e bibie ụwa ochie a. Jizọs nyere ha ọrụ ha ga-arụ. Ọ gwara ha ka ha na-ekwusa ozi ọma “na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:6-8) Ọrụ a Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya abụghị obere ọrụ. Ọ bụrụ na ha ejiri obi ha niile na-arụ ya, ha ji oge ha na-eme ihe kacha mkpa.

13. Gịnị mere anyị ji kwesị iji oge anyị na-eme ihe kacha mkpa? (Ndị Kọlọsi 4:5)

13 Gụọ Ndị Kọlọsi 4:5. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-akpachara anya, anyị kwesịrị ichebara ihe ndị anyị ji oge anyị eme echiche. “Ọdachi” nwere ike ịbịara onye ọ bụla n’ime anyị. (Ekli. 9:11) Anyị nwekwara ike ịnwụ na mberede.

Olee otú anyị nwere ike isi jiri oge anyị na-eme ihe kacha mkpa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)

14-15. Olee otú anyị nwere ike isi eji oge anyị eme ihe kacha mkpa? (Ndị Hibru 6:11, 12) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

14 Otu ụzọ anyị nwere ike isi eji oge anyị na-eme ihe kacha mkpa bụ ịna-eme uche Jehova nakwa ịna-eme ka anyị na ya na-adịkwu ná mma. (Jọn 14:21) Anyị kwesịrị ‘iguzosi ike, kwụrụ chịm, nweekwa ọtụtụ ihe anyị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (1 Kọr. 15:58) Ọ bụrụ na ọgwụgwụ abịazie, ma ọ̀ bụ ọgwụgwụ nke ndụ anyị ma ọ̀ bụ nke ụwa ochie a, anyị agaghị akwa mmakwaara.​—Mat. 24:13; Rom 14:8.

15 Taa, Jizọs ka na-eduzi ndị na-eso ụzọ ya n’ozi ọma Alaeze Chineke ha na-ekwusa n’ụwa niile. O mezuola nkwa o kwere. O ji ọgbakọ Jehova na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma, na-enyekwa anyị ihe ndị anyị ga-eji na-ekwusa ya. (Mat. 28:18-20) Anyị na-eme ihe Jizọs chọrọ ka anyị mee ma ọ bụrụ na anyị ana-agbasi mbọ ike na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl, nakwa ma ọ bụrụ na anyị anọrọ na nche ka anyị na-eche ka Jehova bibie ụwa ochie a. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe e kwuru ná Ndị Hibru 6:11, 12, anyị ga-enwe olileanya “ruo ọgwụgwụ.”​—Gụọ ya.

16. Gịnị ka anyị kpebisiri ike ime?

16 Jehova ekpebiela ụbọchị na awa ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ Setan a. Ọ bụrụ na ụbọchị ahụ eruo, e nweghị ihe ọ bụla ga-egbochi Jehova imezu amụma ndị e dere n’Okwu ya. Mana, mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịna-adị anyị ka ọgwụgwụ ọ̀ na-egbu oge ịbịa. Ma, ụbọchị Jehova ‘agaghị anọ ọdụ.’ (Hab. 2:3) N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ‘ịna-ele anya Jehova, na-echere Chineke, onye nzọpụta anyị.’​—Maị. 7:7.

ABỤ NKE 139 Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

a N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi na-eche echiche nke ọma ma nọrọ na nche maka ihe ndị na-eme n’ụwa. Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị ga-esi na-akpachara anya n’ihe ndị anyị na-eme nakwa otú anyị ga-esi eji oge anyị na-eme ihe bara uru.

b NKỌWA FOTO5: (N’elu) Otu di na nwunye na-ele akụkọ ụwa na tiivi. Mgbe a gbasara ọmụmụ ihe, ha nọ na-akọrọ ndị ọzọ ihe ha kwetasiri ike ihe ahụ ha nụrụ n’akụkọ ụwa pụtara. (N’okpuru) Otu di na nwunye na-ele akụkọ si n’aka Òtù Na-achị Isi ka ha nwee ike ịmata ihe ọhụrụ a kọwara gbasara amụma dị na Baịbụl. Ha na-enye ndị ọzọ akwụkwọ ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi wepụtara anyị ji amụ Baịbụl.