Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 9

Jiri Ndụ Chineke Nyere Anyị Kpọrọ Ihe

Jiri Ndụ Chineke Nyere Anyị Kpọrọ Ihe

“Ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-eje ije, na-adịkwa ndụ.”​—ỌRỤ 17:28.

ABỤ NKE 141 Ndụ Bụ Ọrụ Ebube

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Olee otú Jehova si were ndụ anyị?

 KA E were ya na otu enyi gị nyere gị ụlọ. Ma, e nwere ebe na-adịchaghị mma na ebe na-ehi mmiri na ya. N’agbanyeghị na ụlọ ahụ nwere nsogbu ndị ahụ, e ree ya, a ga-ereta ya ọtụtụ nde naịra. O doro anya na obi ga-adị gị ụtọ maka onyinye ahụ enyi gị nyere gị. Ị ga-emekwa ike gị niile iji lekọta ya nke ọma. Jehova nyere anyị onyinye bara ezigbo uru. Onyinye ahụ bụ ndụ. N’eziokwu, Jehova gosiri na o ji ndụ anyị kpọrọ ihe mgbe o nyere anyị Ọkpara ya ka ọ gbapụta anyị.​—Jọn 3:16.

2. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 7:1, gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị?

2 Ọ bụ Jehova na-enye ndụ. (Ọma 36:9) Pọl onyeozi kwetara na ihe a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-eje ije, na-adịkwa ndụ.” (Ọrụ 17:25, 28) N’ihi ya, ọ dabara adaba ma anyị kwuo na ndụ anyị dị bụ onyinye si n’aka Chineke. Jehova na-enyekwa anyị ihe ndị ga-eme ka anyị dịrị ndụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. (Ọrụ 14:15-17) Ma Jehova anaghị eji ọrụ ebube eme ka anyị dịrị ndụ, kama, ọ na-atụ anya ka anyị na-eme ike anyị niile iji hụ na ahụ́ gbasiri anyị ike nakwa na anyị na-efe ya. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 7:1.) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agba mbọ ka ahụ́ na-agbasi anyị ike nakwa ka anyị dị ndụ? Oleekwa otú anyị ga-esi eme ya?

JIRI NDỤ KPỌRỌ IHE

3. Olee otu ihe mere anyị kwesịrị iji na-agba mbọ ka ahụ́ na-agbasi anyị ike?

3 Otu ihe mere anyị kwesịrị iji na-agba mbọ ka ahụ́ na-agbasi anyị ike bụ na ọ ga-eme ka anyị jiri ike anyị niile na-ejere Jehova ozi. (Mak 12:30) Anyị chọrọ inyefe Chineke ahụ́ anyị “ka àjà dị ndụ, nke dị nsọ, nke dịkwa Chineke mma.” N’ihi ya, anyị anaghị eme ihe ọ bụla anyị ma na ọ ga-emerụ anyị ahụ́ ma ọ bụ kpatara anyị ọrịa. (Rom 12:1) Ma, n’agbanyeghị ihe ọ bụla anyị mere, anyị agaghị egbochili ọrịa niile. Ma, anyị na-eme ike anyị niile n’ihi na anyị ma na ọ ga-egosi Nna anyị nke eluigwe na anyị ji ndụ o nyere anyị kpọrọ ihe.

4. Olee ihe Eze Devid kpebiri ime?

4 Eze Devid kọwara ihe mere o ji jiri ndụ Chineke nyere ya kpọrọ ihe. O dere, sị: “Ọ bụrụ na m nwụọ, olee uru ọ bara? Olee uru ọ ga-aba ma m gbadaa n’olulu? Ájá ọ̀ ga-eto gị? Ọ̀ ga-ekwu na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi?” (Ọma 30:9) O nwere ike ịbụ mgbe ọ fọrọ obere ka Devid nwụọ ka o dere ihe ndị a. Ma, o kpebisiri ike ime ihe niile o nwere ike ime ka ọ dịrị ndụ ka o nwee ike ịna-eto Jehova. O doro anya na anyị niile kpebikwara ime otú ahụ.

5. N’agbanyeghị ọrịa ma ọ bụ nká, olee ihe anyị nwere ike ime?

5 Ọrịa na nká nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eme ọtụtụ ihe ndị anyị na-emebu. Ihe a nwere ike ime ka obi na-ajọ anyị njọ. Ma, o kwesịghị ime ka anyị gharazie ime ihe ndị ga-eme ka ahụ́ na-agbasi anyị ike. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na n’agbanyeghị ọrịa ma ọ bụ nká, anyị ka nwere ike ịna-eto Jehova otú ahụ Eze Devid mere. Obi dị anyị ụtọ na Jehova ji anyị kpọrọ ihe n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. (Mat. 10:29-31) Ọ bụrụgodị na anyị anwụọ, Jehova ga-achọsi ike ịkpọlite anyị. (Job 14:14, 15) Ebe ọ bụ na anyị dị ndụ, anyị kwesịrị ịgba mbọ na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ na-agbasi anyị ike.

EMEKWALA IHE NDỊ GA-EMERỤ GỊ AHỤ́

6. Olee ihe Jehova chọrọ ka anyị mee n’ihe gbasara ihe anyị ga-eri na ihe anyị ga-aṅụ?

6 Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ na-ekwu ihe ga-eme ka ahụ́ gbasie anyị ike ma ọ bụkwanụ nke ga-agwa anyị ihe anyị ga-eri na ihe anyị na-agaghị eri, mana ọ na-agwa anyị otú Jehova si ele ihe ndị ahụ anya. Dị ka ihe atụ, ọ na-agba anyị ume ka anyị wepụ ‘ihe ọ bụla ga-akpatara anyị nsogbu’ n’ahụ́ anyị. (Ekli. 11:10) Iri oké nri na ịṅụ oké mmanya nwere ike ịkpatara anyị ọnwụ. Baịbụl katọkwara ha. (Ilu 23:20) Jehova chọrọ ka anyị na-ejide onwe anyị mgbe anyị na-ekpebi ihe ndị anyị ga-eri na ihe ndị anyị ga-aṅụ, nakwa otú ha ga-aha.​—1 Kọr. 6:12; 9:25.

7. Olee otú ihe e kwuru n’Ilu 2:11 si enyere anyị aka ikpebi ihe ndị dị mma gbasara ahụ́ anyị?

7 Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ndụ Jehova nyere anyị ma anyị na-echebara ihe echiche nke ọma. (Ọma 119:99, 100; gụọ Ilu 2:11.) Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-eri. Ọ bụrụ na e nwere nri na-amasị anyị, mana ya abụrụ na ọ na-akpatara anyị ọrịa, anyị ekwesịghị iche ka mmadụ gwa anyị ka anyị kwụsị iri nri ahụ. Anyị na-egosikwa na anyị ma ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-ehi ụra nke ọma, na-emega ahụ́ mgbe niile, na-edewekwa onwe anyị na ụlọ anyị ọcha.

GBALỊA ZERE IHE MBEREDE

8. Olee otú Baịbụl si mee ka anyị mata na Jehova achọghị ka anyị na-emerụ ahụ́?

8 N’Iwu Jehova nyere ụmụ Izrel, ọ gwara ha ihe ndị ga-enyere ha aka ka ha ghara imerụ ahụ́ ma n’ụlọ ha ma n’ebe ha na-arụ ọrụ. (Ọpụ. 21:28, 29; Diut. 22:8) Ọ bụrụ na mmadụ egbuo mmadụ n’amaghị ama, e nwere ntaramahụhụ ya na ya so. (Diut. 19:4, 5) Iwu ahụ kwukwara na ọ bụrụ na mmadụ emerụọ nwa nọ n’afọ ahụ́ n’amaghị ama, a ga-atakwa ya ahụhụ. (Ọpụ. 21:22, 23) Baịbụl mere ka o doo anya na Jehova chọrọ ka anyị na-akpachapụ anya ka anyị nwee ike izere ihe mberede.

Olee ihe anyị ga-eme n’ihe ndị a iji gosi na anyị ji ndụ kpọrọ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji zere ihe mberede? (Kọwaakwa ihe ndị e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

9 Anyị na-egosi na anyị ji ndụ Jehova nyere anyị kpọrọ ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-agbalị ka ihe ghara imerụ anyị ahụ́ ma n’ụlọ anyị ma n’ebe anyị na-arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, anyị na-atụfu ihe ndị nwere ike imerụ anyị ahụ́, kemịkal, ma ọ bụkwanụ ọgwụ n’ebe e kwesịrị ịtụfu ha. Anyị anaghịkwa edosa ha n’ebe aka ụmụaka ga-eru. Anyị na-akpachara anya ma anyị mụnye ọkụ, sinye mmiri ọkụ, ma ọ bụ jiri ngwá ọrụ ụfọdụ na-arụ ọrụ. Anyị anaghị ahapụ ha pụọ. Anyị anaghị anya ụgbọala ma ọ bụrụ na ọgwụ anyị ṅụrụ na-akpaghasị anyị ahụ́, ma ọ bụrụ na anyị ṅụrụ mmanya, ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na anyị ehighị ụra nke ọma. Anyị anaghịkwa apị ekwentị anyị ma anyị nyawa ụgbọala.

MGBE ỌDACHI MERE

10. Gịnị ka anyị ga-eme tupu e nwee ọdachi na mgbe e nwere ọdachi?

10 Mgbe ụfọdụ, e nwere ihe ndị nwere ike ịta isi anyị anyị na-agaghị egbochili, dị ka ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọrịa na-efe efe, ma ọ bụkwanụ ọgba aghara. Ma, ọ bụrụ na ụdị ihe ndị a emee, e nwere ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime iji chebe onwe anyị, dị ka ime ihe ndị ọchịchị kwuru. Ha nwere ike ịgwa anyị ka anyị si ebe ahụ pụọ ma ọ bụkwanụ nye iwu ndị ọzọ. (Rom 13:1, 5-7) E nwere ụfọdụ ọdachi anyị nwere ike ịkwadebe maka ha. Anyị kwesịkwara ime ihe ndị ọchịchị gwara anyị iji kwadebe maka ọdachi ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịchọpụta na ọ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị enwee mmiri, nri ndị na-anaghị emebi ngwa ngwa, nakwa ọgwụ ụfọdụ anyị dowere maka ihe gbata gbata.

11. Ọ bụrụ na e nwee ọrịa na-efe efe n’ebe anyị bi, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

11 Gịnị ka anyị ga-eme ma e nwee ọrịa na-efe efe n’ebe anyị bi? Anyị kwesịrị ige ndị ọchịchị ntị. Ha nwere ike ịgwa anyị ka anyị na-akwọ aka anyị, ghara ịna-anọ ndị mmadụ nso, na-ekpuchi imi na ọnụ, ma ọ bụkwanụ ka anyị na-anọpụ iche ma anyị bute ọrịa ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, anyị na-egosi na anyị ji ndụ Jehova nyere anyị kpọrọ ihe.

12. Olee otú ihe e kwuru n’Ilu 14:15 si enyere anyị aka ịmata ụdị akụkọ anyị kwesịrị ịna-ege ma e nwee ọdachi?

12 Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee, ndị enyi anyị na ndị agbata obi anyị nwere ike ịna-akọsa ihe na-abụghị eziokwu, ma ọ bụkwanụ a na-akọsa ya na tiivi na redio. Kama ikwere “ihe niile e kwuru,” anyị kwesịrị ikwere ihe ndị doro anya na ha si n’aka ndị ọchịchị nakwa ndị dọkịta. (Gụọ Ilu 14:15.) Òtù Na-achị Isi na alaka ụlọ ọrụ na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka ha mata otú ihe si aga tupu ha agwa anyị ihe anyị ga-eme gbasara ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma. (Hib. 13:17) Ọ bụrụ na anyị emee ihe ha gwara anyị, anyị nwere ike ichebe onwe anyị nakwa ndị ọzọ. Ihe a nwekwara ike ime ka a na-eto Ndịàmà Jehova n’ebe anyị bi.​—1 Pita 2:12.

JIKERE KA A GHARA ỊMỊNYE GỊ ỌBARA

13. Olee otú anyị si egosi na anyị ji ndụ Chineke nyere anyị kpọrọ ihe n’ihe banyere mmịnye ọbara?

13 A ma Ndịàmà Jehova ama na ha kweere na ọbara dị nsọ. Anyị na-erubere iwu Jehova gbasara ọbara isi. Anyị anaghị ekwe ka a mịnye anyị ọbara, ọ bụrụgodị na ihe gbata gbata emee. (Ọrụ 15:28, 29) Ma, ọ pụtaghị na anyị chọrọ ịnwụ. Kama, anyị ji ndụ Chineke nyere anyị kpọrọ ihe. Anyị na-aga ka ndị dọkịta ma nke a na-akọ, dịkwa njikere ịgwọ anyị, gwọọ anyị n’ejighị ọbara.

14. Olee ihe anyị nwere ike ime iji belata ihe ndị nwere ike ịkpatara anyị ịga ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ịwa ahụ́?

14 Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị e kwuru ná mmalite isiokwu a, o nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ịrịawa ọrịa ga-eme ka e buru anyị gaa ụlọ ọgwụ. Ọ bụrụ na ahụ́ agbasie anyị ike, ọ ga-eme ka anyị gbakee ngwa ngwa ma ọ bụrụ na a waa anyị ahụ́. Ihe ọzọkwa anyị nwere ike ime iji zere ihe ga-akpata ịwa anyị ahụ́ bụ ma anyị na-ewepụsị ihe ndị nwere ike imerụ anyị ahụ́ n’ụlọ anyị na n’ebe anyị na-arụ ọrụ, nakwa ma anyị na-erubere iwu okporo ụzọ isi.

Anyị na-edejupụta kaadị DPA anyị ma jiri ya na-aga ebe ọ bụla anyị na-aga n’ihi na anyị ji ndụ anyị kpọrọ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15) c

15. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị jiri kaadị DPA anyị na-aga ebe ọ bụla anyị na-aga? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.) (b) Dị ka anyị hụrụ na vidio ahụ, olee otú anyị ga-esi kwadebe akwadebe n’ihe gbasara mmịnye ọbara?

15 Ebe ọ bụ na anyị ji ndụ kpọrọ ihe, anyị na-edejupụta kaadị DPA anyị, na-ejikwa ya aga ebe ọ bụla anyị na-aga. Na kaadị ahụ, anyị na-ekwu ihe anyị chọrọ ka e meere anyị n’ihe gbasara mmịnye ọbara nakwa otú a ga-esi agwọ anyị. Kaadị nke gị ọ̀ dị otú o kwesịrị ịdị? Ọ bụrụ na ị chọrọ ide nke ọhụrụ ma ọ bụkwanụ idezigharị nke i nwere enwe, egbula oge. Ọ bụrụ na anyị edee ihe anyị chọrọ ka e meere anyị otú doro anya, ọ ga-enye aka ka a ghara igbu oge ịgwọ anyị. Ọ ga-emekwa ka a ghara ịgwọ anyị otú anyị na-achọghị ma ọ bụkwanụ ka a ghara inye anyị ọgwụ ga-akpatara anyị nsogbu. b

16. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị amaghị otú anyị ga-esi edejupụta kaadị DPA?

16 N’agbanyeghị otú ahụ́ si gbasie anyị ike ma ọ bụ otú anyị si bụrụ okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa, anyị nwere ike inwe ihe mberede ma ọ bụ daa ọrịa. (Ekli. 9:11) N’ihi ya, ọ ga-adị mma ma anyị dejupụta kaadị DPA. Ọ bụrụ na ị maghị otú ị ga-esi edejupụta ya, biko, gaa ka ndị okenye ọgbakọ unu nyere gị aka. Ha ga-enyere gị aka idejupụta ya, ma ọ bụghị ha ga-ekpebiri gị otú a ga-esi agwọ gị. Ọ bụ gịnwa ga-eji aka gị ekpebi ya. (Gal. 6:4, 5) Ha nwere ike inyere gị aka ịghọta otú ụfọdụ e nwere ike isi agwọ mmadụ, nyekwara gị aka ide ya ede.

NA-ELE IHE ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ

17. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị n’ihe gbasara ahụ́ ịgbasi anyị ike?

17 Anyị na-eji akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ ekpebi ihe anyị ga-eme ka ahụ́ gbasie anyị ike nakwa otú a ga-esi agwọ anyị ọrịa. (Ọrụ 24:16; 1 Tim. 3:9) Mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị chọrọ ime nakwa mgbe anyị na ndị ọzọ na-akparịta ya, anyị na-agbalị ime ihe e dere ná Ndị Filipaị 4:5. Ebe ahụ sịrị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.” Ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, ihe ga-aka anyị mkpa abụghị ka ahụ́ gbasie anyị ike, anyị agakwanụghị achọ ịmanye ndị ọzọ ka ha lewe ihe anya otú anyịnwa si ele ya. Anyị ka ga na-ahụ ụmụnna anyị n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù, ọ bụrụgodị na ihe ha kpebiri ime dị iche n’ihe anyị kpebiri ime.​—Rom 14:10-12.

18. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ndụ Jehova nyere anyị?

18 Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ndụ Jehova nyere anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-agbalị ike anyị ka anyị ghara ime ihe ga-akpatara anyị ọnwụ nakwa ma anyị na-eme ike anyị niile n’ozi ya. (Mkpu. 4:11) Ma, ka ọ dị ugbu a, anyị na-arịa ọrịa, ọdachi na-adakwasịkwa anyị. Ma, ọ bụghị ihe a ka Onye kere anyị bu n’obi kee anyị. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi ebe ihe mgbu na ọnwụ na-agaghị adị. (Mkpu. 21:4) Ma, ka ọ dịgodị, obi dị anyị ụtọ na anyị dị ndụ na-efe Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya bụ́ Jehova.

ABỤ NKE 140 Lee Ndụ Ebighị Ebi

a Isiokwu a ga-enyere anyị aka iji ndụ Chineke nyere anyị kpọrọkwuo ihe. Anyị ga-ahụ ihe ụfọdụ anyị ga-eme ka ihe ghara ime anyị ma ọdachi mee, nakwa ihe ndị anyị ga-eme iji belata ihe mberede. Anyị ga-ekwukwa ihe anyị ga-eme iji kwadebe maka ọrịa ndị nwere ike ịbịa na mberede.

c NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna bụ́ okorobịa na-edejupụta kaadị DPA ya. Ọ na-ejikwa ya aga ebe ọ bụla ọ na-aga.