Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Gị Aka na JW.ORG

Ihe Ga-enyere Gị Aka na JW.ORG

Ịchọta Isiokwu Ndị Gbara n’Isimbido JW.ORG

Ọtụtụ ụmụnna anyị na-eji isiokwu ndị gbara n’isimbido jw.org ezi ozi ọma. Ọ na-adị mfe isi n’ekwentị zigara ya onye ọzọ. Ha na-ekwukarịkwa otú ihe ndị na-eme n’ụwa taa si emezu amụma Baịbụl. Otu nwanna kwuru na isiokwu ndị na-agba n’isimbido jw.org bụ “nnọọ ihe dị anyị mkpa n’ihi otú anyị sizi ekwusa ozi ọma ugbu a.”

Mana, a na-etinye isiokwu ndị ọhụrụ ebe ahụ. N’ihi ya, olee otú ị ga-esi achọta isiokwu ndị na-adịghịzi n’isimbido jw.org?

  • Ị nọrọ n’isimbido jw.org, pịa ebe e dere “Lee Isiokwu Ndị Ọzọ.” Ọ dị n’ebe elu. Ị pịa ya, ọ ga-ebuga gị n’ebe e dere “Isiokwu Ndị Gbara n’Isimbido JW.ORG na Nso Nso A.” Ị ga-ahụ isiokwu ndị kacha ọhụrụ gbara n’isimbido jw.org n’ebe ahụ.

  • Na jw.org ma ọ bụ na JW Library®, pịa ebe e dere “Ihe Ndị Anyị Nwere” ma ọ bụ “Library,” pịa “Isiokwu Dị Iche Iche,” pịzie “Isiokwu Ndị Ọzọ.” Ọtụtụ isiokwu ndị dị ebe a agbaala n’isimbido jw.org.