Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 12

Si n’Ihe Ndị Jehova Kere Mụtakwuo Gbasara Ya

Si n’Ihe Ndị Jehova Kere Mụtakwuo Gbasara Ya

“E leruo otú e si kee ụwa anya, a na-ahụ àgwà ya ndị a na-anaghị ahụ anya. Ihe ndị o kere na-eme ka a ghọta ụdị onye ọ bụ.”—ROM 1:20.

ABỤ NKE 6 Eluigwe Na-akọ Ebube Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Olee otu ụzọ Job si matakwuo Jehova nke ọma?

 N’OGE niile Job dị ndụ, ya na ọtụtụ ndị kparịtara ụka. Ma, nke kacha pụọ iche bụ nke ya na Jehova Chineke kparịtara. Jehova ji ihe ụfọdụ o kere eke dị ịtụnanya mee ka obi sie Job ike na ya nwere amamihe nakwa na ya ga-elekọtali ndị na-efe ya. Dị ka ihe atụ, Jehova chetaara Job na ọ na-elekọta ụmụ anụmanụ. N’ihi ya, ọ ga-elekọtali Job. (Job 38:39-41; 39:1, 5, 13-16) Job si n’ihe ndị Chineke kere eke mụta ọtụtụ àgwà ndị Chineke ya nwere.

2. Gịnị mere o nwere ike iji esiri anyị ike ileru ihe ndị Chineke kere anya?

2 Anyịnwa nwekwara ike ịmụtakwu gbasara Chineke ma ọ bụrụ na anyị eleruo ihe ndị o kere eke anya. Ma, o nwere ike ịna-esitụrụ anyị ike mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na anyị bi n’obodo mepere emepe, o nwere ike anyị agaghị na-ahụcha ihe ndị Jehova kere eke kwa ụbọchị. Ọ bụrụgodị na anyị bi n’ime obodo, o nwere ike ịdị anyị ka anyị enweghị oge anyị ga-eji na-eleru ihe ndị Chineke kere eke anya. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ihe mere o ji baa uru iwepụta oge ma gbaa mbọ na-eleru ihe ndị Chineke kere eke anya. Anyị ga-eleba anya n’otú Jehova na Jizọs si jiri ihe ndị e kere eke kụzie ihe nakwa ihe anyị nwere ike ime iji mụtakwuo ihe n’ihe ndị Chineke kere.

GỊNỊ MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI NA-ELERU IHE NDỊ E KERE EKE ANYA?

Jehova chọrọ ka ihe ndị o kere eke na-atọ Adam ụtọ. Ọ chọkwara ka ọ gụọ ụmụ anụmanụ aha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)

3. Olee ihe gosiri na Jehova chọrọ ka ihe ndị o kere na-atọ Adam ụtọ?

3 Jehova chọrọ ka ihe ndị o kere eke na-atọ nwoke mbụ o kere ụtọ. Mgbe o kere Adam, o nyere ya paradaịs mara ezigbo mma ka o biri na ya, nyekwa ya ọrụ ilekọta ebe ahụ ma mee ka ọ gbasaa. (Jen. 2:8, 9, 15) Chegodịnụ otú o si tọọ Adam ụtọ ịhụ ka mkpụrụ ọ kụrụ na-epulite, hụkwa ka okooko osisi na-awa. Ọrụ a Chineke nyere Adam ilekọta ogige Iden bụ ọrụ pụrụ ezigbo iche. Jehova gwakwara Adam ka ọ gụọ ụmụ anụmanụ dị iche iche aha. (Jen. 2:19, 20) Jehova gaara eji aka ya họrọ aha ọ ga-agụ anụmanụ nke ọ bụla. Ma, kama ime otú ahụ, o nyere Adam ọrụ ahụ. O doro anya na tupu Adam ekpebie ihe ọ ga-akpọ nke ọ bụla, ọ ga-ebu ụzọ leruo ya anya nke ọma, mata otú o si akpa àgwà. Ọ ga-abụkwa na ihe a tọrọ Adam ezigbo ụtọ. Ọ ga-abụrịrị na ọrụ a ọ rụrụ nyeere ya aka ịghọta na Jehova nwere amamihe nakwa na ihe ndị o kere mara mma, na-atụkwa n’anya.

4. (a) Olee otu ihe mere anyị kwesịrị iji na-eleru ihe ndị Chineke kere anya? (b) Olee ihe Chineke kere eke kacha amasị gị?

4 Otu ihe mere anyị kwesịrị iji na-eleru ihe ndị Chineke kere anya bụ na Jehova chọrọ ka anyị mee otú ahụ. Ọ gwara anyị, sị: “Leenụ anya n’eluigwe hụ ihe ndị a,” ya ajụzie, sị: “Ònye kere ha?” Azịza ya doro anya. (Aịza. 40:26) Ihe ndị dị ịtụnanya Jehova kere anyị ga-esi na ha amụta ihe juru ma n’eluigwe ma n’ụwa. (Ọma 104:24, 25) Chegodị otú Chineke si kee anyị. O kere anyị otú ihe ndị mara mma ga na-amasị anyị. O kere anyị otú anyị ga-enwe ike ịna-ahụ ụzọ, ịna-anụ ihe, ịna-emetụ ihe aka, ịna-anụ ụtọ ihe, na ịna-anụ ísì ihe. Ihe mere o ji mee ya bụ ka ihe ndị ọzọ niile o kere na-atọ anyị ụtọ.

5. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 1:20, olee otú ịmụ gbasara ihe ndị Jehova kere si abara anyị uru?

5 Baịbụl gwara anyị ihe ọzọ dị mkpa mere anyị kwesịrị iji na-eleru ihe ndị Chineke kere anya. Anyị na-esi na ha amụta àgwà ndị Jehova nwere. (Gụọ Ndị Rom 1:20.) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i lee ihe ndị Jehova kere anya, ị ga-achọpụta na otú Jehova si kee ha dị egwu. Ọ̀ bụ na ha anaghị egosi na Jehova nwere amamihe? Cheekwa gbasara ụdị nri dị iche iche anyị nwere taa. Ihe a na-egosi na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ọ bụrụ na anyị esi n’ihe ndị Jehova kere mụta àgwà ndị o nwere, ọ ga-eme ka anyị matakwuo ya nke ọma, meekwa ka anyị na ya bụrụ ezigbo enyi. Ka anyị lebagodị anya n’ụzọ ụfọdụ Jehova si jiri ihe ndị o kere kụziere ụmụ mmadụ ihe ndị dị ezigbo mkpa.

JEHOVA JI IHE NDỊ O KERE EKE NA-AKỤZIRI ANYỊ GBASARA ONWE YA

6. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú nnụnụ na-esi esi otu ebe efega ebe ọzọ?

6 Jehova nwere oge maka ihe ọ bụla. N’afọ ọ bụla, n’agbata ngwụcha ọnwa Febụwarị na etiti ọnwa Mee, ndị Izrel na-ahụ ka ụgbala ọcha na-esi n’obodo ha na-efefe na-aga n’ebe ugwu. Chineke gwara ndị Izrel, sị: “Ụgbala ọcha ma oge o kwesịrị iji fega ebe ọzọ.” (Jere. 8:7) Otú ahụ Jehova wepụtara oge ụmụ nnụnụ ndị a ga-eji na-esi otu ebe efega ebe ọzọ, ka o wepụtakwara oge ọ ga-eji eme ihe o kpebiri. Taa, anyị hụ ka ụmụ nnụnụ si otu ebe na-efega ebe ọzọ, ọ na-echetara anyị na obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova nwere “oge a kara aka” ọ ga-eji bibie ụwa ochie a.—Hab. 2:3.

7. Olee ihe ile otú nnụnụ si efe na-eme ka obi sie anyị ike na ya? (Aịzaya 40:31)

7 Jehova na-enye ndị ohu ya ike. Jehova si n’ọnụ Aịzaya kwe nkwa na ọ ga-enye ndị ya ike ha ga-eji ‘na-efeli elu ka à ga-asị na ha nwere nku ka ugo’ mgbe ọ bụla ike gwụrụ ha ma ọ bụ mgbe ha dara mbà. (Gụọ Aịzaya 40:31.) Ndị Izrel na-ahụkarị ka ugo na-agbasa nku ya na mbara igwe na-efego elu elu kama ịda. Ihe na-enyere ya aka bụ ikuku ọkụ na-ebugharị ya. Ihe a na-echetara anyị na Jehova ga-enyeli anyị ike otú ahụ ọ na-enye ụmụ nnụnụ ike. Ọ bụrụ na ị hụ ka nnụnụ buru ibu na-erugharị na mbara igwe, cheta na Jehova ga-enyeli gị ike ị ga-eji emeri nsogbu gị.

8. Gịnị ka Job mụtara mgbe o chere gbasara ihe ndị Chineke kere? Gịnịkwa ka anyị na-amụta na ya?

8 Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. Jehova nyeere Job aka ịtụkwasịkwu ya obi. (Job 32:2; 40:6-8) Mgbe ya na Job na-akparịta ụka, o kwuru gbasara ọtụtụ ihe ndị o kere eke, ma kpakpando, urukpuru, na àmụ̀mà. O kwukwara gbasara ụmụ anụmanụ ndị dị ka atụ́ na ịnyịnya. (Job 38:32-35; 39:9, 19, 20) Ihe ndị a niile gosiri na ike Chineke enweghị atụ, gosikwa na o nwere amamihe, hụkwa anyị n’anya. Ụka a Job na Jehova kparịtara mere ka Job tụkwasịkwuo Jehova obi. (Job 42:1-6) Ọ bụrụkwa na anyị ana-amụ gbasara ihe ndị Chineke kere, ọ ga-echetara anyị na Jehova ka anyị mara ihe, karakwa anyị ike. O nwere ikike ịkwụsị nsogbu niile anyị nwere. Ọ ga-akwụsịkwa ha. Ịmata ihe a ga-eme ka anyị na-atụkwasịkwu ya obi.

JIZỌS JI IHE NDỊ JEHOVA KERE KỤZIERE ANYỊ GBASARA NNA YA

9-10. Olee ihe anwụ na mmiri na-akụziri anyị gbasara Jehova?

9 Jizọs ma gbasara ihe ndị Chineke kere nke ọma. Ebe ọ bụ “ọkà n’ọrụ,” o so Nna ya kee eluigwe na ụwa. (Ilu 8:30) Mgbe Jizọs mechara bịa n’ụwa, o ji ihe ndị e kere eke kụziere ndị na-eso ụzọ ya gbasara Nna ya. Legodị ihe ụfọdụ ọ kụziri.

10 Jehova hụrụ onye ọ bụla n’anya. N’ihe Jizọs nọ n’elu ugwu kụzie, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya mata ihe abụọ Chineke kere eke ọtụtụ ndị na-anaghị echebara echiche. Ha bụ anwụ na mmiri. Ihe abụọ a na-eme ka anyị na-adị ndụ. A sị na Jehova chọrọ, ọ gaara asị na ọ gaghị enye ụmụ mmadụ na-anaghị erubere ya isi ihe ndị a. Ma, ọ hụrụ anyị niile n’anya. Ọ bụ ya mere o ji enye onye ọ bụla ma anwụ ma mmiri. (Mat. 5:43-45) Jizọs ji ya kụziere ndị na-eso ụzọ ya na Jehova chọrọ ka anyị na-ahụ mmadụ niile n’anya. Anyị hụ otú anyanwụ si ama mma mgbe ọ na-ada ma ọ bụ hụ ka mmiri na-ezo, anyị nwere ike iji ohere ahụ cheta otú Jehova si hụ mmadụ niile n’anya. Ịhụnanya ya nwere ike ime ka anyị na-ekwusara mmadụ niile ozi ọma iji gosi na anyị hụrụ ha n’anya.

11. Olee otú ikiri ụmụ nnụnụ nwere ike isi agba anyị ume?

11 Jehova na-egboro anyị mkpa anyị. N’ihe ahụ Jizọs kụziri n’elu ugwu, ọ sịrị: “Leruonụ nnụnụ anya. Ha anaghị akụ mkpụrụ. Ha anaghị aghọrọ mkpụrụ, ha anaghịkwa ekpokọta mkpụrụ n’ụlọ a na-akwasa ihe. Ma, Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri.” Ọ ga-abụ na ndị Jizọs na-agwa okwu na-ahụ ka ụmụ nnụnụ na-efefe n’isi ha mgbe ọ jụrụ ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu abaghị uru karịa ha?” (Mat. 6:26) Jizọs si otú ahụ mee ka anyị ghọta na Jehova ga na-egboro anyị mkpa anyị. (Mat. 6:31, 32) Ihe a anyị si n’ihe ndị Chineke kere eke mụta na-agba ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ume. E nwere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ na Spen. Obi bidoro ịjọ ya njọ maka na o nwetaghị ebe dị mma ọ ga-ebi. Ma, mgbe o lechara otú ụmụ nnụnụ si na-atụrụ mkpụrụ dị iche iche, obi kwụsịrị ịjọ ya njọ. Ọ sịrị: “Ụmụ nnụnụ ndị ahụ kụziiri m na Jehova na-elekọta ha nakwa na ọ ga-elekọta m.” Ọ dịghị anya nwanna nwaanyị a enweta ebe ọ ga-ebi.

12. Dị ka e kwuru na Matiu 10:29-31, olee ihe nza na-akụziri anyị gbasara Jehova?

12 Jehova ji onye nke ọ bụla n’ime anyị kpọrọ ihe. Tupu Jizọs ezipụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusawa ozi ọma, o nyeere ha aka ịkwụsị ịtụ ụjọ mkpagbu. (Gụọ Matiu 10:29-31.) Otú o si mee ya bụ na ọ gwara ha gbasara otu n’ime ụmụ nnụnụ ha kacha mara, ya bụ, nza. Nnụnụ a adịghị oké ọnụ n’oge Jizọs. Ma, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “O nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma.” Ọ gwaziri ha, sị: “Unu bara uru karịa ọtụtụ nza.” Jizọs si otú a mee ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike na Jehova ji onye nke ọ bụla n’ime ha kpọrọ ihe. N’ihi ya, ha ekwesịghị ịtụ ụjọ mmegide. O doro anya na ndị na-eso ụzọ Jizọs na-echeta ihe a Jizọs gwara ha mgbe ọ bụla ha hụrụ nza ma ha gaa ikwusa ozi ọma. Mgbe ọ bụla ị hụrụ obere nnụnụ, cheta na Jehova ji gị kpọrọ ihe n’ihi na gịnwakwa “bara uru karịa ọtụtụ nza.” Ebe ọ bụ na Jehova na-akwado gị, i kwesịghị ịtụ ụjọ ma e megidewe gị.—Ọma 118:6.

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI SI N’IHE NDỊ E KERE EKE MỤTAKWUO GBASARA CHINEKE?

13. Gịnị ga-enyere anyị aka isi n’ihe ndị e kere eke mụta gbasara Jehova?

13 Anyị nwere ike isi n’ihe ndị Jehova kere mụta ọtụtụ ihe gbasara ya. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Nke mbụ, anyị kwesịrị iwepụta oge leruo ihe ndị e kere eke anya. Ihe ọzọ anyị kwesịrị ime bụ iche gbasara ihe ihe ndị ahụ na-akụziri anyị banyere Jehova. Ọ gaghị adịchara anyị mfe mgbe niile ime ihe ndị a. Otu nwanna nwaanyị si Kameruun aha ya bụ Géraldine sịrị: “M toro n’obodo mepere emepe. N’ihi ya, m ghọtara na m kwesịrị ịgba ezigbo mbọ ma ọ bụrụ na m chọrọ ileru ihe ndị Chineke kere anya.” Otu okenye aha ya bụ Alfonso sịrị: “Amụtala m na ekwesịrị m ịhazi oge m ga-eji na-aga ebe m ga-anọ naanị m ka m nwee ike ileru ihe ndị Jehova kere anya ma chee gbasara ihe ndị ha na-akụziri m banyere ya.”

Devid leruru ihe ndị e kere eke nọ ya nso anya, cheekwa echiche gbasara ihe ndị ha na-akụziri ya banyere Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Gịnị ka Devid mụtara mgbe o chebaara ihe ndị Chineke kere echiche?

14 Devid chesiri echiche ike banyere ihe ndị Chineke kere. Ọ gwara Jehova, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ọrụ aka gị, ọnwa na kpakpando ndị i kere, gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere i ji na-echeta ya? Gịnịkwa ka nwa nke mmadụ bụ nke mere i ji na-elekọta ya?” (Ọma 8:3, 4) Ka Devid leliri anya n’eluigwe n’abalị, ọ bụghị naanị na ihe ọ hụrụ masịrị ya, kama o chekwara gbasara ihe ndị kpakpando na-akụziri ya gbasara Chineke. Ọ ghọtara na Jehova dị ebube. N’oge ndị ọzọ, Devid chebaara otú o si too n’afọ nne ya echiche. Ka ọ na-echebara ihe ndị a dị ịtụnanya echiche, obi tọkwuru ya ụtọ maka otú Jehova si nwee amamihe.—Ọma 139:14-17.

15. Kwuo otú ụfọdụ i sirila si n’ihe ndị Jehova kere hụ àgwà ndị o nwere. (Abụ Ọma 148:7-10)

15 O nwere ike ịdịrị anyị mfe ịhụ ihe ndị Chineke kere eke anyị ga-echebara echiche otú ahụ ọ dị Devid. Ọ bụrụ na anyị elegharịa anya, anyị ga-ahụ ihe ndị ga-akụziri anyị gbasara àgwà ndị Jehova nwere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anwụ emee ka ahụ́ kporo gị ọkụ, ọ ga-eme ka ị ghọta na Jehova dị ike. (Jere. 31:35) Chee gbasara otú Jehova si nwee amamihe ma ị hụ ka nnụnụ na-akpa akwụ́ ya. Ọ bụrụ na ị hụ ka nwa nkịta na-achụgharị ọdụ ya, ọ ga-eme ka ị mata na ihe ọchị na-amasị Jehova. Keleekwa Jehova maka otú o si hụ anyị n’anya mgbe ọ bụla ị hụrụ ka nne na nwa ya na-egwuri egwu. Anyị nwere ọtụtụ ohere ịmụta gbasara Jehova n’ihi na ihe niile o kere eke na-eto ya, ma ndị nke buru ibu ma ndị nke dị obere, ma ndị nke dị anyị nso ma ndị nke dị anyị anya.—Gụọ Abụ Ọma 148:7-10.

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

16 Chineke anyị kacha nwee amamihe, hụ anyị n’anya, dịrịkwa ike. Ihe niile o kere makwara ezigbo mma. Anyị nwere ike ịmụ gbasara àgwà ndị a Chineke nwere nakwa àgwà ya ndị ọzọ ma anyị leruo ihe ndị e kere eke nọ gburugburu anyị anya. Ka anyị niile na-ewepụta oge mgbe niile leruo ihe ndị Chineke kere anya ma chebara ihe ndị ha na-akụziri anyị gbasara Jehova echiche. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú a, anyị ga na-abịarukwu Chineke anyị nso. (Jems 4:8) N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-ahụ otú ndị nne na nna ga-esi jiri ihe ndị Chineke kere eke na-enyere ụmụ ha aka ịbịarukwu Jehova nso.

ABỤ NKE 5 Ọrụ Chineke Dị Ebube

a Ihe ndị Jehova kere dị egwu. Ha niile na-atụ anyị n’anya, malite n’anyanwụ nke na-akpa ezigbo ike ruo n’okooko osisi nke na-esichaghị ike. Ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị Jehova kere nwere ike inyere anyị aka ịmụta àgwà ndị Jehova nwere. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere anyị kwesịrị iji na-ewepụta oge na-eleru ihe ndị Chineke kere anya nakwa otú ime ya ga-esi nyere anyị aka ịbịarukwu Chineke anyị nso.