Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 35

Na-enwe Ndidi

Na-enwe Ndidi

‘Yirinụ ndidi ka uwe.’​—KỌL. 3:12.

ABỤ NKE 114 ‘Na-enwenụ Ndidi’

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị mere obi ji atọ gị ụtọ ma ị hụ ndị na-enwe ndidi?

 OBI na-adị anyị niile ụtọ ma anyị hụ ndị na-enwe ndidi. Maka gịnị? Ọ na-amasị anyị ma anyị hụ ndị nwere ike ichere ihe n’enweghị mgbakasị ahụ́. Obi na-adị anyị ụtọ na ndị mmadụ na-enwere anyị ndidi ma anyị mejọọ ihe. Obi dịkwa anyị ụtọ na onye mụụrụ anyị Baịbụl nweere anyị ndidi ka anyị na-agbalị ịmụta otu ihe Baịbụl kwuru, ikwere ya, ma ọ bụkwanụ ime ya eme. Anyị kacha ekele Jehova maka na ọ na-enwere anyị ndidi.​—Rom 2:4.

2. Olee mgbe o nwere ike isiri anyị ike inwe ndidi?

2 N’agbanyeghị na ọ na-adị anyị mma ka ndị ọzọ na-enwere anyị ndidi, o nwere ike isiri anyịnwa ike ịna-enwe ndidi mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike isiri anyị ike inwe ndidi mgbe anyị nọ n’ụgbọala, ya abụrụ na ụzọ kpọchiri akpọchi n’ihi na ọtụtụ ụgbọala nọ n’ụzọ, karịchaa, ma ọ dịrị anyị ọsọ ọsọ. Iwe nwere ike iwe anyị ma mmadụ mee ihe na-adịghị anyị mma. Mgbe ụfọdụkwa, o nwere ike isiri anyị ike ichere ụwa ọhụrụ Jehova kwere anyị ná nkwa. Ị̀ ga-achọ ịna-enwekwu ndidi? N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe inwe ndidi pụtara nakwa ihe mere o ji dịrị ezigbo mkpa. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-enwekwu ndidi.

GỊNỊ KA INWE NDIDI PỤTARA?

3. Gịnị ka onye na-enwe ndidi na-eme ma a kpasuo ya iwe?

3 Ka anyị leba anya n’ụzọ anọ anyị ga-esi gosi na anyị na-enwe ndidi. Nke mbụ, onye na-enwe ndidi anaghị ewe iwe ngwa ngwa. Ọ na-agbalị ịnọrọ jụụ ma ghara imegwara ihe e mere ya ma ọ bụkwanụ ghara imesi ndị ọzọ ike ma e nwee ihe na-echegbu ya. Ebe mbụ okwu bụ́ “onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ” gbara na Baịbụl bụ mgbe e kwuru na Jehova bụ “Chineke nwere ọmịiko ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya na eziokwu ya dị ukwuu.”​—Ọpụ. 34:6.

4. Gịnị ka onye na-enwe ndidi na-eme mgbe o kwesịrị ichere?

4 Nke abụọ, onye na-enwe ndidi na-anọrọ jụụ na-echere. Ọ bụrụ na ihe ewee oge karịrị oge a tụrụ anya ya, onye na-enwe ndidi anaghị agbakasịwa ahụ́ ma ọ bụ na-ewe iwe. (Mat. 18:​26, 27) E nwere ọtụtụ mgbe anyị kwesịrị ịnọrọ jụụ chere. Dị ka ihe atụ, mmadụ kwuwe okwu, anyị kwesịrị inwe ndidi gee ya ntị nke ọma, ghara ịnapụ ya okwu n’ọnụ. (Job 36:2) Anyị kwesịkwara inwe ndidi mgbe anyị na-enyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi ma ọ bụ ịkwụsị àgwà ọjọọ.

5. Olee otú ọzọ anyị si egosi na anyị na-enwe ndidi?

5 Nke atọ, onye na-enwe ndidi anaghị eme ihe n’echeghị echiche. N’eziokwu, e nwere mgbe ụfọdụ o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee ihe ngwa ngwa. Ma, onye na-enwe ndidi nwee ihe ọ bụla ọ chọrọ ime, ọ naghị emewe ya ọkụ ọkụ ka o mechaa ya. Kama, ọ na-ewepụta oge kwesịrị ekwesị, hazie ihe ọ ga-eme. O mechazie, ya ewepụta ezigbo oge mee ihe ahụ ọ chọrọ ime.

6. Olee ihe onye na-enwe ndidi na-eme ma ọnwụnwa bịara ya?

6 Nke anọ, onye na-enwe ndidi na-edi ọnwụnwa n’atamughị ntamu. Ihe ọ pụtara bụ na onye na-enwe ndidi na-atachi obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị njọ mmadụ ịkọrọ ezigbo enyi ya otú obi dị ya maka ọnwụnwa bịaara ya. Ma, onye na-enwe ndidi ga-eme ike ya niile ka o nwee ike ịna-atachi obi n’ọnwụnwa bịaara ya ma jiri obi ụtọ na-efe Jehova. (Kọl. 1:11) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi n’ihe ndị a niile. N’ihi gịnị? Ka anyị leba anya n’ihe ole na ole kpatara ya.

IHE MERE INWE NDIDI JI DỊ EZIGBO MKPA

Otú ahụ onye ọrụ ugbo na-enwe ndidi, obi esie ya ike na ọ ga-aghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ otu ụbọchị, anyị na-enwe ndidi, obi esie anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere mgbe oge ya ruru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Dị ka e kwuru na Jems 5:7, 8, gịnị mere inwe ndidi ji dị ezigbo mkpa? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

7 Anyị kwesịrị inwe ndidi ma anyị chọọ ka a zọpụta anyị. Anyị kwesịrị ime ka ndị fere Jehova n’oge ochie, nwee ndidi ma chere ka Chineke mezuo nkwa ndị o kwere anyị. (Hib. 6:11, 12) Baịbụl ji anyị tụnyere onye ọrụ ugbo. (Gụọ Jems 5:7, 8.) Onye ọrụ ugbo na-agbasi mbọ ike ịkụ mkpụrụ nakwa ịgba ya mmiri. Ma, ọ maghị kpọmkwem mgbe ihe ọ kụrụ ga-eto. N’ihi ya, onye ọrụ ugbo na-enwe ndidi na-echere, obi na-esikwa ya ike na ọ ga-emecha ghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ. Anyịnwa kwesịkwara ịna-agbasi mbọ ike ịna-eso ụzọ Jizọs n’agbanyeghị na anyị ‘amaghị ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa.’ (Mat. 24:42) Anyị na-enwe ndidi na-echere, obi esiekwa anyị ike na mgbe oge ruru, Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere. Ọ bụrụ na anyị anaghị enwe ndidi, ike nwere ike ịgwụ anyị, anyị ejiri nwayọọ nwayọọ na-ahapụ Jehova. Anyị nwekwara ike ịchụwa ihe ndị ga-eme ka obi na-adị anyị ụtọ ugbu a. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi, anyị nwere ike ịtachi obi ruo ọgwụgwụ, a zọpụta anyị.​—Maị. 7:7; Mat. 24:13.

8. Olee otú inwe ndidi si eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma? (Ndị Kọlọsi 3:12, 13)

8 Inwe ndidi ga-eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma. Ọ na-enyere anyị aka ige ndị ọzọ ntị nke ọma ma ha na-ekwu okwu. (Jems 1:19) Ọ na-emekwa ka udo dịrị. Ọ na-eme ka anyị ghara iji ọkụ ọkụ kwuo ma ọ bụ mee ihe na-adịghị mma mgbe e nwere ihe na-echegbu anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi, anyị agaghị ewe iwe ngwa ngwa ma mmadụ mee ihe wutere anyị. Kama imegwara onye ahụ, anyị ga ‘na-ediri ibe anyị ihe, na-agbagharakwa ibe anyị kpamkpam.’​—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:12, 13.

9. Olee otú inwe ndidi si enyere anyị aka mgbe anyị chọrọ ikpebi ihe anyị ga-eme? (Ilu 21:5)

9 Inwe ndidi nwekwara ike inyere anyị aka ikpebi ihe ndị dị mma. Kama ime ihe ọkụ ọkụ ma ọ bụ n’echeghị echiche, anyị ga-ewetu obi mee nchọnchọ, chebara ihe ndị anyị nwere ike ime echiche ma họrọ nke ga-akacha mma. (Gụọ Ilu 21:5.) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-achọ ọrụ, o nwere ike ịdị anyị ka ọ̀ bụ anyị nara ọrụ mbụ e nyere anyị ọ bụrụgodị na ọrụ ahụ agaghị ekwe ka anyị na-emechi ihe ndị gbasara ofufe Jehova anya. Ma, ọ bụrụ na anyị nwee ndidi, anyị ga-eweda obi, chebara ihe ụfọdụ gbasara ọrụ ahụ echiche, dị ka ebe anyị ga na-aga ọrụ ahụ, oge anyị ga-eji na-arụ ya, nakwa otú ọ ga-esi akpa ezinụlọ anyị na ofufe anyị na-efe Jehova aka. Inwe ndidi nwere ike ime ka anyị ghara ikpebi ihe na-adịghị mma.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ENWEKWU NDIDI

10. Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi mụta inwe ndidi ma na-enwe ndidi?

10 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịna-enwekwu ndidi. Ndidi so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22, 23) N’ihi ya, anyị nwere ike ikpe ekpere ka Jehova nye anyị mmụọ nsọ ya ka o nyere anyị aka ịmụta àgwà a. Ọ bụrụ na ọnwụnwa nke ga-eme ka o siere anyị ike inwe ndidi abịara anyị, anyị ga ‘na-arịọ’ Chineke ka o jiri mmụọ nsọ ya nyere anyị aka ịna-enwe ndidi. (Luk 11:9, 13) Anyị nwekwara ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịna-ele ihe anya otú yanwa si ele ya. Anyị kpechaa ekpere, anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka anyị na-enwe ndidi kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na anyị ana-ekpekwu ekpere ka Jehova nyere anyị aka inwe ndidi ma na-agba mbọ ịna-enwe ndidi, anyị ga na-enwekwu ndidi, ya abụrụkwa ihe e ji mara anyị ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe e jibu mara anyị.

11-12. Olee otú Jehova si gosi na ọ na-enwe ndidi?

11 Chee gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Anyị gụọ Baịbụl, anyị ga-ahụ ọtụtụ ndị nwere ndidi. Ọ bụrụ na anyị echebara akụkọ ha echiche, anyị ga-amụta ụzọ ndị anyị ga-esi na-enwekwu ndidi. Tupu anyị eleba anya n’ụfọdụ n’ime ha, ka anyị buru ụzọ kwuo banyere onye kacha enwe ndidi, ya bụ, Jehova.

12 N’ogige Iden, Setan kwutọrọ aha Jehova ma kwuo na otú Jehova si achị adịghị mma nakwa na ọ hụghị ndị ọ na-achị n’anya. Jehova egbughị Ekwensu ozugbo ahụ. Kama, o jidere onwe ya ma nwee ndidi n’ihi na ọ ma na ọ ga-ewe oge ka a mata na ọchịchị ya kacha mma. Ka Jehova na-eche ka oge ahụ ruo, o diela ọtụtụ nkwutọ e kwutọrọ aha ya. Jehova nọkwa na-enwe ndidi na-eche ka ọtụtụ ndị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. (2 Pita 3:9, 15) Ihe a emeela ka ọtụtụ nde mmadụ bịa mata ya. Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’uru ndidi Jehova nwere na-aba, ọ ga-eme ka ọ dịkwuoro anyị mfe ichere ụbọchị ọ ga-ebibi ụwa a.

Inwe ndidi ga-enyere anyị aka ka anyị ghara iwe iwe ọsọ ọsọ ma a kpasuo anyị iwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Olee otú Jizọs si nwee ndidi ka Nna ya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 Jizọs na-enwe nnọọ ndidi ka Nna ya. O nwekwara ndidi mgbe ọ nọ n’ụwa. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe niile ka ọ dịịrị ya mfe inwe ndidi, karịchaa, n’ihi otú ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii si eme ihu abụọ. (Jọn 8:25-27) Ma, Jizọs mere ka Nna ya. O weghị iwe ọsọ ọsọ. Mgbe ndị mmadụ kpasuru ya iwe ma ọ bụ kparịa ya, o megwaraghị ha. (1 Pita 2:23) Jizọs diri ọnwụnwa ndị bịaara ya n’emeghị mkpesa. Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị ‘chesie echiche ike banyere onye ahụ diri ụdị mkparị ndị mmehie kparịrị ya.’ (Hib. 12:2, 3) N’enyemaka Jehova, anyịnwa ga-enwekwa ndidi ma tachie obi n’agbanyeghị ụdị nsogbu ọ bụla bịaara anyị.

Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi ka Ebreham, obi ga-esi anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị ugbu a, gọziekwa anyị karịchaa n’ụwa ọhụrụ o kwere anyị ná nkwa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Ebreham gbasara inwe ndidi? (Ndị Hibru 6:15) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

14 Ọ bụrụkwanụ na ihe ndị anyị na-atụ anya ha gbasara ọgwụgwụ ụwa ochie a emebeghị? O nwere ike ịbụ na ọ dịla anya anyị chewere ka ọ bịa, anyị ana-echezi na e nwere ike anyị agaghị anọ ndụ mgbe ọ ga-eme. Olee ihe ga-enyere anyị aka inwe ndidi ma chere ya? Ka anyị leba anya n’akụkọ Ebreham. Mgbe Ebreham dị afọ iri asaa na ise, ọ mụtabeghị nwa. Jehova kwere ya nkwa, sị: “M ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba.” (Jen. 12:1-4) Ebreham ọ̀ hụrụ ka nkwa ahụ mezuru? Ọ hụchaghị ya. Mgbe Ebreham gafere Osimiri Yufretis, afọ iri abụọ na ise agaakwa, ọ hụrụ ka a mụụrụ ya nwa nwoke bụ́ Aịzik. Ihe a bụ ọrụ ebube. Mgbe afọ iri isii ọzọ gachara, a mụrụ ụmụ ụmụ ya abụọ bụ́ Ịsọ na Jekọb. (Gụọ Ndị Hibru 6:15.) Ma, Ebreham ahụghị mgbe ụmụ ya ghọrọ nnukwu mba ma nweta ala ahụ e kwere ha ná nkwa. Ma, ya na Onye kere ya dị n’ezigbo mma. (Jems 2:23) Mgbe a ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ, obi ga-atọgbu ya atọgbu ịmata na okwukwe ya na otú o si nwee ndidi mere ka a gọzie mba niile. (Jen. 22:18) Olee ihe anyị na-amụta n’akụkọ a? O nwere ike anyị agaghị eji anya anyị hụ ka Jehova ga-emezu nkwa ya niile. Ma, ọ bụrụ na anyị nwee ndidi ka Ebreham, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị ugbu a, gọziekwa anyị karịchaa n’ụwa ọhụrụ o kwere anyị ná nkwa.​—Mak 10:29, 30.

15. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụ ma anyị mụwa ihe n’onwe anyị?

15 Baịbụl kọkwara banyere ọtụtụ ndị ọzọ nwere ndidi. (Jems 5:10) O nwere ike ịdị mma ka i mee nchọnchọ gbasara ha. b Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na e tere Devid mmanụ ịbụ eze mgbe ọ ka dị ezigbo obere, o cheere ruo ọtụtụ afọ tupu e chie ya eze. Simiọn na Ana ji obi ha nile fee Jehova ọtụtụ afọ ka ha na-eche ka ha hụ Mezaya ahụ e kwere ná nkwa. (Luk 2:25, 36-38) Ka ị na-amụ ụdị akụkọ ndị a, lee ma ị̀ ga-ahụ azịza ajụjụ ndị a: Olee ihe ọ ga-abụ ya nyeere onye a m na-agụ gbasara ya aka inwe ndidi? Olee otú inwe ndidi si baara ya uru? Olee otú m ga-esi eme ka ya? I nwekwara ike ịmụta ihe ma ị mụọ gbasara ndị na-enweghị ndidi. (1 Sam. 13:8-14) I nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ọ ga-abụ na o so n’ihe mere ha ji ghara inwe ndidi? Olee otú o si ghọ ha ahịa?’

16. Olee uru ụfọdụ inwe ndidi na-abara anyị?

16 Cheee gbasara uru inwe ndidi ga-abara gị. Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi, ọ na-eme ka obi na-atọkwu anyị ụtọ, obi ana-erukwu anyị ala. Inwe ndidi nwekwara ike ime ka ahụ́ na-agbasi anyị ike, isi ana-akpakọkwa anyị ọnụ. Ọ bụrụ na anyị ana-enwere ndị ọzọ ndidi, ọ na-eme ka anyị na ha dịrị ná mma, ọgbakọ ana-adịkwukwa n’otu. Ọ bụrụ na anyị eweghị iwe ọsọ ọsọ ma mmadụ kpasuo anyị iwe, o nwere ike ime ka nsogbu ahụ ghara ịka njọ. (Ihe e dere n’ala ala peeji Ọma 37:8; Ilu 14:29) Ma, nke kachanụ bụ na ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi, anyị na-eme ka Nna anyị nke eluigwe. Ọ ga-emekwa ka anyị na ya dịkwuo ná mma.

17. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

17 N’eziokwu, ndidi bụ ọmarịcha àgwà bara ezigbo uru. O nwere ike ọ gaghị adịrị anyị mfe mgbe niile ịna-enwe ndidi. Ma, Jehova ga-enyere anyị aka ịna-amụtakwu inwe ndidi. Ka anyị na-enwe ndidi na-eche ka ụwa ọhụrụ bịa, obi kwesịrị isi anyị ike na “anya Jehova dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ, bụ́ ndị na-atụ anya ịhụnanya ya.” (Ọma 33:18) Ka anyị niile kpebisie ike na anyị ga-eyiri àgwà a bụ́ ndidi ka uwe.

ABỤ NKE 41 Biko, Nụrụ Ekpere M

a Ọtụtụ ndị anaghị enwe ndidi n’ụwa Ekwensu a. Ma, Baịbụl gwara anyị ka anyị yiri ndidi ka uwe. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere àgwà a ji dịrị mkpa nakwa otú anyị ga-esi na-enwekwu ndidi.

b Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl gbasara ndị nwere ndidi, i nwere ike ịga n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, n’isiokwu bụ́ “Ndidi.”