Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

1923—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

1923—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

ỤLỌ NCHE Bekee nke January 1, 1923, sịrị: ‘Anyị na-atụ anya na afọ 1923 ga-amagbu onwe ya. Ọ bụ ezigbo ihe ọma meere anyị na anyị so na-agwa ndị mmadụ a na-echi ọnụ n’ala na ihe ga-emecha dịrị ha mma.’ Afọ ahụ ga-agbakwa Ndị Mmụta Baịbụl ume n’ihi na otú ha si efe Chineke na otú ha si ekwusa ozi ọma malitere gosiwe na ha dị n’otu, nke bụ́kwanụ ihe e ji ama ezigbo Ndị Kraịst taa.

ỌMỤMỤ IHE MERE KA HA DỊRỊ N’OTU

Kalenda e depụtara amaokwu Baịbụl na abụ ndị a ga-abụ

N’afọ ahụ, nzukọ Jehova gbanwere ihe ụfọdụ nyere aka mee ka Ndị Mmụta Baịbụl na-adị n’otu. Ụlọ Nche malitere ibipụta ihe e ji na-akọwa amaokwu Baịbụl ha na-amụ n’ọmụmụ ihe ha na-enwe kwa izu ha na-anọ ekpe ekpere, na-eto Chineke, na-akọkwa ihe ọma meere ha. Ihe ọzọ bụ na Ndị Mmụta Baịbụl bipụtara kalenda e depụtara ebe a ga-agụ na Baịbụl n’izu ọ bụla nakwa abụ e nwere ike ịbụ ma ha mụwa ihe n’onwe ha ma ọ bụ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ.

Ndị Mmụta Baịbụl gaa ọmụmụ ihe, ha na-akọ ihe mere mgbe ha gara ozi ọma, kwuo ihe mere ha ji ekele Jehova, bụọ abụ, ma ọ bụdị kpee ekpere. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Eva Barney mere baptizim n’afọ 1923, mgbe ọ dị afọ iri na ise. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịkọ ihe ọma meere gị, ị ga-akwụrụ ọtọ ma malite ikwu ihe dị ka, ‘M chọrọ ikele Onyenwe anyị maka ihe ọma niile ọ na-emere m.’” Ọ na-atọgbu ụfọdụ ụmụnna atọgbu ịkọ ihe a. Nwanna Nwaanyị Barney sịkwara: “E nwere otu nwanna nwoke merela agadi aha ya bụ Godwin. Ọ na-enwekarị ọtụtụ ihe ọ na-ekwu mere o ji ekele Onyenwe anyị. Ma, ọ bụrụ na nwunye ya achọpụta na ahụ́ agbakasịtụwala onye na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ, ọ na-adọtụ di ya n’uwe ya, ya anọrọzie ọdụ.”

Otu ugboro n’ọnwa ọ bụla, ọgbakọ ọ bụla na-enwe ụbọchị ha wepụtara maka ikpe ekpere, ito Chineke, nakwa ịkọ ihe ọma Chineke meere ha. Ụlọ Nche Bekee nke April 1, 1923, kwuru gbasara ọmụmụ ihe ahụ, sị: “E kwesịrị iji ọkara oge ọmụmụ ihe ahụ kọọ ihe ndị mere n’ozi ọma, gbaakwa ndị na-ekwusa ozi ọma ume. . . . Obi siri anyị ike na ihe a anyị ji otu obi na-eme ga-eme ka ụmụnna dịkwuo n’otu.”

Ọmụmụ ihe ahụ baara otu nwanna aha ya bụ Charles Martin ezigbo uru. Ọ dị afọ iri na itoolu, bụrụkwa onye nkwusa n’ọgbakọ ya dị na Vankuva dị na Kanada. Mgbe o chetara oge ahụ, ọ sịrị: “Ọ bụ ebe a bụ ebe mbụ m mụtara ihe m ga-ekwu n’ozi ụlọ n’ụlọ. Ọtụtụ mgbe, m na-anụ ka mmadụ na-akọ ihe ndị mere n’ozi ụlọ n’ụlọ. Ihe a mere ka m mata ihe m ga-ekwu na otú m ga-esi zaa ndị na-achọghị ige ozi ọma.”

IKWUSA OZI ỌMA MERE KA HA DỊKWUO N’OTU

Bulletin nke May 1, 1923

Ihe ọzọ mere ka ụmụnna dịkwuo n’otu bụ na ha wepụtara ụbọchị ndị ha na-eji ekwusa ozi ọma. Ụlọ Nche Bekee nke April 1, 1923, mara ọkwa, sị: “Ka anyị nwee ike ịdị n’otu na-arụ otu ọrụ . . . , anyị niile ga-eji Tuzdee, abalị mbụ n’ọnwa Mee, afọ 1923, kwusaa ozi ọma. Nke ahụ gachaa, anyị ga na-ejizi Tuzdee mbụ n’ọnwa ọ bụla na-ekwusa ozi ọma . . . Onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ọ bụla kwesịrị iso na-ekwusa ozi ọma.”

Ndị na-eto eto sokwa kwusaa ozi ọma a. Nwanna Nwaanyị Hazel Burford, onye dị naanị afọ iri na isii n’oge ahụ, sịrị: “Bulletin na-ekwu ihe anyị na ndị mmadụ nwere ike ikwurịta ka anyị buru ya n’isi. a Mụ na papa nnukwu m so gbasie mbọ ike n’ihe a niile.” Ma, o juru Nwanna Nwaanyị Burford anya otú obi dị otu nwanna na o so na-ekwusa ozi ọma. Ọ sịrị: “E nwere otu nwanna mere agadi ọ na-ewe ezigbo iwe na m so na-ekwusa ozi ọma. N’oge ahụ, ụfọdụ aghọtaghị na Ndị Mmụta Baịbụl niile, ma ‘ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọbịa,’ kwesịrị iso na-eto Onye Ukwu kere anyị.” (Ọma 148:12, 13) Ma, Nwanna Nwaanyị Burford ekweghị akwụsị ikwusa ozi ọma. O mechara gaa klas nke abụọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied, mechaakwa bụrụ onye ozi ala ọzọ na Panama. Ka oge na-aga, ụmụnna ndị ahụ mechara gbanwee otú ha si ele ndị na-eto eto na-ekwusa ozi ọma anya.

MGBAKỌ MERE KA ỤMỤNNA DỊKWUO N’OTU

Mgbakọ so nyere ụmụnna aka ịdịkwu n’otu. N’ọtụtụ mgbakọ ndị ahụ, e wepụtara ụbọchị ndị a ga-eji kwusaa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ná mgbakọ e nwere na Winipeg dị na Kanada, a kpọrọ mmadụ niile bịara mgbakọ ahụ ka ha soro kwusaa ozi ọma n’obodo ahụ n’abalị iri atọ na otu n’ọnwa Mach. Ụbọchị ndị a pụrụ iche e ji kwusaa ozi ọma mere ka a hụ ọtụtụ ndị mmadụ, ọ rụpụtakwara ezigbo ihe ọma. N’abalị ise n’ọnwa Ọgọst, ihe dị ka puku mmadụ asaa (7,000) bịara mgbakọ ọzọ e mere na Winipeg. Ọ bụ nke ahụ bụ mgbakọ kachanụ e nwetụrụla na Kanada n’oge ahụ.

Mgbakọ ọzọ pụrụ iche Ndịàmà Jehova nwere n’afọ 1923 bụ nke e nwere na Lọs Anjelis dị na Kalịfọnịa n’abalị iri na asatọ ruo abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Ọgọst. N’izu ndị bu ụbọchị e mere mgbakọ ahụ ụzọ, akwụkwọ akụkọ nọ na-akpọsa mgbakọ ahụ. Ndị Mmụta Baịbụl nyere akwụkwọ ịkpọ òkù karịrị narị puku ise (500,000). E tinyekwara foto ndị e ji na-akpọsa mgbakọ ahụ n’ụgbọala ọhaneze nakwa na nke ndị mmadụ nwe.

Mgbakọ Ndị Mmụta Baịbụl nwere na Lọs Anjelis n’afọ 1923

Na Satọdee, abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Ọgọst, Nwanna Rutherford kwuru okwu isiokwu ya bụ “Atụrụ na Ewu.” O mere ka o doo anya na “atụrụ” bụ ndị ezi omume, ndị ga-ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. O mechakwara kwuo okwu ma gụpụta ihe Ndị Mmụta Baịbụl kpebiri ime a kpọrọ “Ozi Ịdọ Aka ná Ntị.” N’ihe a, ha kwuru na ihe Krisendọm na-eme adịghị mma, gbaakwa ndị nwere obi eziokwu ume ka ha si na “Babịlọn Ukwu” pụta. (Mkpu. 18:2, 4) Ndị Mmụta Baịbụl na-anụ ọkụ n’obi n’ụwa niile ga-emecha kesaa ọtụtụ nde traktị e dere ihe a ha kpebiri.

“Ihe a anyị ji otu obi na-eme ga-eme ka ụmụnna dịkwuo n’otu”

N’ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ, ihe karịrị puku mmadụ iri atọ (30,000) bịara gee okwu ihu ọha Nwanna Rutherford kwuru nke isiokwu ya bụ “Mba Niile Zọ Ije Na-aga Amagedọn, ma Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị.” Ndị Mmụta Baịbụl tụrụ anya na ndị ga-abịa mgbakọ ahụ ga-ebu ibu. N’ihi ya, ha chọtara otu ámá egwuregwu a rụrụ ọhụrụ na Lọs Anjelis. Iji jide n’aka na onye ọ bụla bịara mgbakọ ahụ ga-anụ ihe a ga-ekwu, ụmụnna ji ígwè okwu a rụnyere n’ámá egwuregwu ahụ mee ka a nụ ihe a na-ekwu. Ọ bụkwa ihe ọgbara ọhụrụ n’oge ahụ. Ọtụtụ ndị ọzọ si na redio gere okwu ahụ.

OZI ỌMA RUKWARA N’EBE NDỊ ỌZỌ N’ỤWA

N’afọ 1923, ozi ọma nọ na-agbasa ná mba ndị dị n’Afrịka, India, Kọntinent Saụt Amerịka, na Yurop. N’India, otu nwanna aha ya bụ A. J. Joseph na-enye aka ebipụta akwụkwọ n’asụsụ Hindi, Tamụl, Telụgu, na Ọọdu, na-elekọtakwa nwunye ya na ụmụ ya isii.

Nwanna William R. Brown na ndị ezinụlọ ya

Na Siera Lion, Ndị Mmụta Baịbụl aha ha bụ Alfred Joseph na Leonard Blackman degaara isi ụlọ ọrụ anyị na Bruklin dị na Niu Yọk akwụkwọ ozi, rịọ ka e zite ndị ga-enyere ha aka. N’abalị iri na anọ n’ọnwa Eprel, afọ 1923, e mere ihe ha rịọrọ. Nwanna Alfred sịrị: “N’ime abalị otu Satọdee, a kpọrọ m na telefon mgbe m na-atụghị anya ya.” Ọ nụrụ olu onye ji oké olu jụọ ya, sị, “Ọ̀ bụ gị bụ onye ahụ detaara Watch Tower Society akwụkwọ ozi kwuo ka e zitere unu ndị na-ekwusa ozi ọma?” Nwanna Alfred zara ya, “Ee.” Ọ sịziri Nwanna Alfred: “Ọ bụ m ka ha zitere.” Onye nwe olu ahụ bụ Nwanna William R. Brown. N’ụbọchị ahụ ka ya na Antonia nwunye ya na ụmụ ha ndị nwaanyị abụọ ka dị obere, bụ́ Louise na Lucy, si Karịbian bata Siera Lion. Ụmụnna ndị nọ n’obodo ahụ ga-ahụ Nwanna Brown na ndị ezinụlọ ya n’oge na-adịghị anya.

Nwanna Alfred kwukwara, sị: “N’ụtụtụ echi ya, mụ na Leonard nọ na-amụ Baịbụl otú anyị na-eme kwa izu. Na mberede, anyị hụrụ otu nwoke toro ogologo n’ọnụ ụzọ. Ọ bụ Nwanna Brown. Ọ na-anụrụ eziokwu ọkụ n’obi nke na ọ chọrọ ikwu okwu ihu ọha n’echi ya.” N’ihe na-erughị otu ọnwa, Nwanna Brown nyefechara akwụkwọ niile o ji bịa. N’oge na-adịghị anya, e ziteere ya puku akwụkwọ ise (5,000) ọzọ. O teghịkwa aka ya enyechaa ha niile. Ma, ihe e ji mara Nwanna Brown abụghị onye na-ere akwụkwọ. N’oge niile o ji ịnụ ọkụ n’obi jeere Jehova ozi, ọ na-ekwu gbasara Baịbụl ma ọ na-ekwu okwu ya. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji na-akpọ ya Bible Brown.

Betel dị na Magdebọg n’ihe dị ka n’afọ 1923

Na Jamanị, ụmụnna kpebiri na ha ga-esi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Bamen kwapụ n’ihi na ọ naghịzi aba ndị na-arụ ebe ahụ. Ihe ọzọ bụ na ha nụrụ na ndị agha si Frans ga-abịa lụso obodo ahụ agha n’oge na-adịghị anya. Ndị Mmụta Baịbụl chọtara otu ụlọ dị na Magdebọg. Ebe ahụ yikwara ebe ga-adị mma maka ibi akwụkwọ. N’abalị iri na itoolu n’ọnwa Jun, a kwakọchara ihe ndị e ji ebi akwụkwọ nakwa ihe ndị ọzọ, kwagazie na Betel ọhụrụ dị na Magdebọg. N’ụbọchị na-esote ụbọchị a gwara isi ụlọ ọrụ anyị na ha akwafechaala ebe ahụ, akwụkwọ akụkọ kwuru na ndị Frans ewegharala Bamen. Ụmụnna ndị ahụ chọpụtara na nkwapụ ahụ ha kwapụrụ n’ebe ahụ bụ otú Jehova si gọzie ha ma chebe ha.

Nwanna George Young na Nwanna Nwaanyị Sarah Ferguson (n’aka nri) na nwanne ya nwaanyị

Na Brazil, Nwanna George Young mepere alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ ma malite ibi Ụlọ Nche n’asụsụ Pọtugiiz. Ọ gara ọtụtụ ebe kwusaa ozi ọma. N’ime ọnwa ole na ole, o nyefere ihe karịrị puku akwụkwọ asaa (7,000). Ọ tọgbukwara Nwanna Nwaanyị Sarah Ferguson atọgbu mgbe Nwanna Young bịara leta ezinụlọ ha. Ọ na-agụ Ụlọ Nche kemgbe afọ 1899, ma o nwebeghị ike ime baptizim iji gosi na o nyefeela Jehova onwe ya. Mgbe ọnwa ole na ole gara, Nwanna Nwaanyị Ferguson na ụmụ ya anọ mechara mee baptizim.

‘JIRI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI NA ỌṄỤ NA-EFE CHINEKE’

Ná ngwụcha afọ ahụ, Ụlọ Nche Bekee nke December 15, 1923, kọwara otú ihe a gbanwere n’ọmụmụ ihe, n’ozi ọma, nakwa ná mgbakọ si mee ka ụmụnna dịkwuo n’otu. Ọ sịrị: ‘O doro anya na okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ siri ike. Ka anyị jikere ịrụkwu ọrụ ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ na-efe Chineke n’afọ 1924.’

Afọ na-eso ya, bụ́ afọ 1924, ga-atọkwa Ndị Mmụta Baịbụl ụtọ. Ụmụnna nọ na Betel na-arụsi ọrụ ike kemgbe ọtụtụ ọnwa n’ala a zụtara na Staten Aịland. Ọ dị nso n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin. A rụchara ụlọ ndị a na-arụ n’ebe ahụ ná mmalite afọ 1924. O mere ka ụmụnna dịrị n’otu, meekwa ka ozi ọma ruo ọtụtụ ebe otú ọ na-emetụbeghị.

Ndị na-arụ ọrụ na Staten Aịland

a Ihe a na-akpọ ya ugbu a bụ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ.