Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 43

“Ọ Ga-eme Ka Unu Sie Ike”

“Ọ Ga-eme Ka Unu Sie Ike”

“[Jehova] ga-eme ka unu kwụsie ike. Ọ ga-eme ka unu sie ike, meekwa ka unu kwụrụ chịm.”​—1 PITA 5:10.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Olee otú Jehova si mee ka ndị fere ya n’oge ochie dị ike?

 OKWU CHINEKE na-ekwukarị na ndị ji obi ha niile fee Chineke dị ike. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ha chere na ha dị ike. Dị ka ihe atụ, n’oge ụfọdụ, Eze Devid chere na ya ‘siri ike ka ugwu,’ mana e nwekwara oge ndị “ụjọ jidere” ya. (Ọma 30:7) Ọ bụ eziokwu na Samsịn siri ezigbo ike mgbe mmụọ Chineke na-enyere ya aka, ma, ọ makwa na ọ bụrụ na Chineke enyeghị ya ike, ‘ike ga-agwụ ya, ya adịrị ka ụmụ nwoke niile ọzọ.’ (Ikpe 14:5, 6; 16:17) Ihe mere ụmụ nwoke ndị a rubeere Chineke isi ji sie ike bụ na Jehova mere ka ha dị ike.

2. Gịnị mere Pọl onyeozi ji kwuo na ya na-adị ike mgbe ike gwụrụ ya? (2 Ndị Kọrịnt 12:9, 10)

2 Pọl onyeozi ma na ọ bụ Jehova ga-eme ka ọ dị ike. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 12:9, 10.) E nwere ọrịa ndị Pọl rịara, otú a ọtụtụ n’ime anyị nwere ndị nke anyị na-arịa. (Gal. 4:13, 14) Mgbe ụfọdụ, o siiri ya ike ime ihe dị mma. (Rom 7:18, 19) O nwekwara oge ndị o chegburu onwe ya, ụjọ atụọkwa ya gbasara ihe nwere ike ime ya. (2 Kọr. 1:8, 9) Ma, mgbe ike gwụrụ Pọl, ọ na-adị ike. Olee ihe mere ka ọ dị ike? Jehova nyere Pọl ike o ji die nsogbu ndị bịaara ya.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 Jehova kwere anyị nkwa na ọ ga-emekwa ka anyị dị ike. (1 Pita 5:10) Ma, anyị ekwesịghị ịtụwa anya ka Jehova nye anyị ike ma ọ bụrụ na anyị agbaghị mbọ ọ bụla. Iji mee ihe atụ, njin ụgbọala na-enyere ya aka ịna-aga. Ma, onye na-akwọ ụgbọala ahụ ga-enyerịrị ụgbọala ahụ ọkụ ka o nwee ike ịga ebe ọ chọrọ ịga. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Jehova dị njikere inye anyị ike. Ma, a ga-enwerịrị ihe ndị anyị ga-eme ka Jehova nye anyị ike. Olee ihe ndị Jehova nyere anyị iji mee ka anyị dị ike? Olee ihe anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike inweta ike ahụ? Anyị ga-amata azịza ajụjụ ndị a ma anyị leba anya n’otú Jehova si mee ka mmadụ atọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl dị ike. Ha bụ Jona onye amụma, Meri nne Jizọs, na Pọl onyeozi. Anyị ga-ahụkwa otú Jehova si esi otú ahụ eme ka ndị na-efe ya taa dị ike.

IKPE EKPERE NA ỊMỤ IHE GA-EME KA Ị DỊ IKE

4. Olee otú anyị ga-esi enweta ike si n’aka Jehova?

4 Otu ụzọ anyị ga-esi nweta ike Jehova na-enye bụ ikpe ekpere. Jehova ga-aza ekpere anyị nye anyị “ike karịrị ike mmadụ.” (2 Kọr. 4:7) Ịmụ Okwu Chineke na ịtụgharị uche na ya nwekwara ike ime ka anyị dị ike. (Ọma 86:11) Ihe Jehova si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl na-agwa anyị “na-akpa ike.” (Hib. 4:12) Ọ bụrụ na i kpee ekpere ma gụọ Okwu Chineke, ị ga-enweta ike ị ga-eji edi nsogbu, na-enwe ọṅụ, ma ọ bụ rụọ ọrụ siri ike. Ka anyị lee otú Jehova si mee ka onye amụma ya bụ́ Jona dị ike.

5. Gịnị mere e ji kwesị ime ka Jona onye amụma dị ike?

5 Jona onye amụma kwesịrị inwe obi ike. Ọ gbaara ọrụ siri ike Jehova nyere ya ọsọ. Ihe a mere ka ọ fọ obere ka oké ifufe gbuo ya na ndị ya na ha nọ n’ụgbọ mmiri. Mgbe a tụbara ya n’ime mmiri, ebe ọ hụrụ onwe ya bụ ebe ọ na-anọtụbeghị mbụ, ya bụ, n’ime afọ nnukwu azụ̀ gbara ọchịchịrị. Olee otú i chere obi dị Jona mgbe ahụ? Ọ̀ tụrụ anya na ọ ga-anwụ ebe ahụ? Ọ̀ ga-abụ na o chere na Jehova ahapụla ya? Ọ ga-abụrịrị na Jona nọ na-echegbu onwe ya.

Dị ka Jona onye amụma, olee otú anyị ga-esi enweta ike mgbe nsogbu bịaara anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 ruo na nke 9)

6. Dị ka e kwuru na Jona 2:1, 2, 7, gịnị mere obi ji sie Jona ike mgbe ọ nọ n’afọ azụ̀?

6 Gịnị ka Jona mere ka o nweta ike n’ebe ahụ naanị ya nọ? Otu ihe o mere bụ ikpe ekpere. (Gụọ Jona 2:1, 2, 7.) Ọ bụ eziokwu na Jona emehiela Jehova, o chegharịrị, obi esiekwa ya ike na Jehova ga-anụ ekpere ya. Jona chebakwaara ihe dị n’Okwu Chineke ọ gụrụ n’oge ndị gara aga echiche. Olee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ? N’ekpere ya nke e dere na Jona isi 2, okwu ndị o kwuru ebe ahụ bụ ọtụtụ okwu ndị dị n’Abụ Ọma. (Dị ka ihe atụ, jiri ihe e kwuru na Jona 2:2, 5 tụnyere ihe e kwuru n’Abụ Ọma 69:1; 86:7.) O doro anya na Jona ma amaokwu Baịbụl ndị ahụ nke ọma. Otú o si chebara ihe ebe ahụ kwuru echiche mgbe ọ nọ ná nsogbu mere ka obi sie ya ike na Jehova ga-enyere ya aka. Jehova mechara mee ka azụ̀ ahụ gbọpụta Jona n’elu ala. Ọ dịzi njikere ịnabata ọrụ Jehova nyere ya ma rụọ ya.​—Jona 2:10–3:4.

7-8. Olee otú otu nwanna bi na Taịwan si nweta ike n’oge ọnwụnwa bịaara ya?

7 Akụkọ Jona nwere ike inyere anyị aka ma ọtụtụ nsogbu bịara anyị. Dị ka ihe atụ, otu nwanna bi na Taịwan aha ya bụ Zhiming b nwere ezigbo ọrịa ndị ọ na-arịa. Ihe ọzọ bụ na ndị ezinụlọ ya na-emekpọ ya ọnụ n’ihi na ọ na-efe Jehova. Ikpe ekpere na ịmụ ihe na-enyere ya aka inweta ike si n’aka Jehova. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na nsogbu abịara m, m na-echegbu onwe m nke na obi agaghị eruli m ala mụ amụọ ihe.” Ma, ọ naghị ada mbà. Ọ sịkwara: “Ihe mbụ m na-eme bụ ikpe ekpere. Ihe ọzọ m na-eme bụ ịkwụnye ihe m ji ege egwú ná ntị ma na-ege abụ Alaeze anyị. Mgbe ụfọdụ, m na-abụ abụ anyị n’olu dị ala ruo mgbe obi bịara ruo m ala, mụ amalitezie ịmụ ihe.”

8 Ihe na-enyere Zhiming aka inweta ike o ji edi nsogbu ndị siri ike na-abịara ya bụ ịmụ ihe n’onwe ya. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ ka na-enweta onwe ya n’ahụ́ a wara ya, otu nọọsụ gwara ya na ebe ọ bụ na ọbara dị ya n’ahụ́ ehizighị nne, na ọ ga-adị mkpa ka a mịnye ya ọbara. N’abalị bọtara ụbọchị a wara ya ahụ́, ọ gụrụ gbasara otu nwanna nwaanyị a wara ụdị ahụ́ a ga-awa yanwa. Ọbara nke nwanna nwaanyị ahụ aharughịdị ka nke yanwa. N’agbanyeghị ya, nwanna nwaanyị ahụ ekweghị ka a mịnye ya ọbara. Ọ gbakekwara. Akụkọ a Nwanna Zhiming gụrụ mere ka okwukwe ya sie ike.

9. Ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị maka ọnwụnwa bịaara gị, gịnị ka i nwere ike ime? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

9 Ọ̀ na-esiri gị ike ikpe ekpere kọọrọ Jehova otú obi dị gị ma nsogbu bịara gị, ka ike ọ̀ na-agwụ gị ịmụ ihe? Cheta na Jehova ma nnọọ otú ọ dị gị. N’ihi ya, ọ bụrụgodị na ọ bụ obere ihe ka i kwuru n’ekpere, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova ga-enye gị ihe dị gị mkpa. (Efe. 3:20) Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịgụ ihe ma ọ bụ ịmụ ihe n’ihi na ị na-arịa ọrịa, ike na-agwụ gị, ma ọ bụkwanụ na ị na-echegbu onwe gị, i nwere ike ige Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl nke a na-egere egere. Ihe ọzọ nwere ike ịbara gị uru bụ ige abụ Alaeze anyị ma ọ bụ ile vidio dị na jw.org. Jehova chọrọ ime ka ị dị ike. Ọ ga-emekwa ka ị dị ike ma ọ bụrụ na i kpee ekpere ma na-achọ azịza ekpere gị ahụ na Baịbụl nakwa n’ihe ndị ọzọ ọ na-enye anyị.

ỤMỤNNA GỊ GA-EMELI KA Ị DỊ IKE

10 Olee otú ụmụnna anyị si eme ka anyị dị ike?

10 Jehova nwere ike iji ụmụnna anyị mee ka anyị dị ike. Ha nwere ike ‘ịkasikwa anyị nnọọ obi’ mgbe ọnwụnwa bịaara anyị ma ọ bụ mgbe o siiri anyị ike ịrụ ọrụ e nyere anyị. (Kọl. 4:10, 11) Ndị enyi kacha dịrị anyị mkpa “n’oge nsogbu.” (Ilu 17:17) Ọ bụrụ na ike agwụ anyị, ụmụnna anyị nwere ike igboro anyị mkpa anyị, kasie anyị obi, gbaakwa anyị ume ịnọgide na-efe Jehova. Ka anyị lee otú ndị ọzọ si mee ka Meri nne Jizọs dị ike.

11 Gịnị mere e ji kwesị ime ka Meri dị ike?

11 Ọ dị mkpa ka Meri nweta ike ọ ga-eji mee uche Jehova. Chegodị otú o si chịrị obi n’aka mgbe mmụọ ozi Gebriel nyere ya ọrụ na-adịghị mfe. Ọ lụbeghị di, ma a gwara ya na ọ ga-adị ime. Ọ zụtụbeghị nwa, ma a gwara ya na ọ ga-elekọta nwa ga-aghọ Mezaya. Ebe ọ bụ na ya na nwoke ọ bụla enwebeghị mmekọahụ, olee otú ọ ga-esi agwa Josef bụ́ onye chọrọ ịlụ ya na ọ dị ime?​—Luk 1:26-33.

12 Dị ka e kwuru na Luk 1:39-​45, olee otú Meri si nweta ike dị ya mkpa?

12 Olee otú Meri si nweta ike o ji rụọ ọrụ a e nyere ya pụrụ iche ma sie ike? O kwere ka ndị ọzọ nyere ya aka. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Gebriel ka ọ gwakwuo ya ihe ndị ọzọ gbasara ọrụ ahụ e nyere ya. (Luk 1:34) Obere oge nke ahụ mechara, ọ gara “n’ala bụ́ ugwu ugwu,” n’otu obodo dị na Juda gaa leta onye ikwu ya aha ya bụ Elizabet. Njem ahụ ọ gara magburu onwe ya. Elizabet jara Meri mma. Jehova mekwara ka Elizabet kọọrọ Meri otu amụma gbasara nwa ọ ga-amụ. (Gụọ Luk 1:39-45.) Meri kwuru na Jehova “ji aka ya dị ike mee ihe a niile.” (Luk 1:46-51) Jehova si n’aka Gebriel na Elizabet mee ka Meri dị ike.

13 Olee ihe mere mgbe otu nwanna nwaanyị bi na Bolivia gwara ụmụnna ya ka ha nyere ya aka?

13 Dị ka Meri, ụmụnna gị nwekwara ike inyere gị aka. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị bi na Bolivia aha ya bụ Dasuri. Ụmụnna kwesịrị ime ka ọ dị ike. Mgbe a chọpụtara na papa ya na-arịa ọrịa ga-emecha gbuo ya, nke mere ka ọ nọrọ n’ụlọ ọgwụ, ọ chọrọ ịnọ na-emere papa ya ihe niile. (1 Tim. 5:4) Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ọ dịịrị ya mfe. Ọ sịrị: “Ọtụtụ mgbe, ike ime ya gwụrụ m.” Ọ̀ gwara ndị ọzọ ka ha nyere ya aka? O meghị otú ahụ ná mmalite. Ọ sịrị: “Achọghị m inye ụmụnna m nsogbu. M nọ na-eche, sị: ‘Ọ bụ Jehova ga-enye m ike dị m mkpa.’ Ma, m mechara chọpụta na otú a m na-anọrọ onwe m n’ekweghị ka ndị ọzọ nyere m aka pụtara na m na-agba mbọ ka naanị m buru nsogbu m.” (Ilu 18:1) Dasuri kpebiri na ya ga-edegara ụfọdụ ndị enyi ya akwụkwọ ozi kọwaara ha otú ihe si dịrị ya. Ọ sịrị: “Agaghị m akọchali otú ụmụnna m si gbaa m ezigbo ume. Ha buteere m nri n’ụlọ ọgwụ, gụọkwara m amaokwu Baịbụl ndị gbara m ume. Obi na-atọ m ezigbo ụtọ ịmara na anyị anọghị naanị anyị. Anyị nọ n’ezinụlọ Jehova buru ibu, ya bụ, ezinụlọ na-adị njikere inyere gị aka, soro gị bee ákwá, na-agbakwa gị ume ka ị ghara ịkwụsị ife Jehova.”

14 Olee ihe mere anyị kwesịrị iji kwe ka ndị okenye nyere anyị aka?

14 Otu n’ime ndị Jehova ji eme ka anyị dị ike bụ ndị okenye. Ha bụ onyinye Jehova na-eji eme ka anyị dị ike, meekwa ka anyị nweta ume. (Aịza. 32:1, 2) N’ihi ya, mgbe ọ bụla ị na-echegbu onwe gị, kọsara ndị okenye ihe na-echegbu gị. Ha chọọ inyere gị aka, jiri obi ụtọ nabata enyemaka ha. Jehova na-esi n’aka ha eme ka i nweta ike.

OLILEANYA MAKA ỌDỊNIHU GA-EME KA Ị DỊ IKE

15 Olee olileanya Ndị Kraịst niile nwere?

15 Nkwa ndị e kwere na Baịbụl nwere ike ime ka anyị nwee olileanya, nyekwa anyị ike anyị ga-eji ghara ịkwụsị ịna-efe Jehova. (Rom 4:3, 18-20) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị nwere olileanya magburu onwe ya ịdị ndụ ebighị ebi, ma ọ bụ n’ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs ma ọ bụ n’eluigwe. Olileanya a anyị nwere na-enye anyị ike anyị na-eji edi nsogbu, na-ekwusa ozi ọma, na-arụkwa ọrụ dị iche iche e nyere anyị n’ọgbakọ. (1 Tesa. 1:3) Ọ bụkwa otu olileanya ahụ mere ka Pọl onyeozi dị ike.

16 Gịnị mere e ji kwesị ime ka Pọl onyeozi dị ike?

16 E kwesịrị ime ka Pọl dị ike. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrịnt, o ji onwe ya tụnyere ite ájá na-esighị ike. E nwere oge ndị ‘nsogbu bịaara ya,’ ‘ihe agbagwojuo ya anya,’ ‘a kpagbuo ya,’ ‘kwadakwa ya.’ E nwedịrị ụfọdụ oge ọ gaara anwụ. (2 Kọr. 4:8-10) Pọl dere ihe ndị a mgbe ọ na-eje ozi ala ọzọ ya nke atọ. Mgbe o dechara ihe ndị a, nsogbu ndị ka ndị nke ahụ bịaara ya. Ìgwè mmadụ na-eme tigbuo zọgbuo lụsoro ya ọgụ, a nwụchiri ya, ụgbọ ọ nọ na ya kpuru, a tụkwara ya mkpọrọ.

17 Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 4:16-18, gịnị nyeere Pọl aka idi ọnwụnwa ndị bịaara ya?

17 Ihe nyeere Pọl aka idi nsogbu ndị a bụ ilekwasị anya n’olileanya o nwere. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:16-18.) Ọ gwara ndị Kọrịnt na n’agbanyeghị na “ike na-agwụ elu ahụ́” ya, ọ gaghị ekwe ka o mee ka ọ daa mbà. Pọl lekwasịrị anya n’ọdịnihu. Ngọzi ọ ga-esi n’olileanya o nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe enweta nọ “na-ehikwu nne.” Ọ dị njikere idi mkpagbu ọ bụla ka o nwee ike inweta ụgwọ ọrụ ya. Pọl tụgharịrị uche n’olileanya a, nke mere ka ‘ime ahụ́ ya na-esikwu ike kwa ụbọchị.’

18 Olee otú olileanya Nwanna Tihomir na ndị ezinụlọ ya nwere si mee ka ha dị ike?

18 E nwere otu nwanna bi na Bọlgeria aha ya bụ Tihomir. Olileanya o nwere mere ka ọ dị ike. N’afọ ole na ole gara aga, nwanne ya nwoke ọ tọrọ aha ya bụ Zdravko nwụrụ n’ihe mberede okporo ụzọ. Ruo oge ụfọdụ, Tihomir nọ na-eru ezigbo uju. Ihe ya na ndị ezinụlọ ya mere nyeere ha aka idi ya bụ na ha chere gbasara otú mbilite n’ọnwụ ga-adị. Ọ sịrị: “Dị ka ihe atụ, anyị na-ekwurịta ebe anyị na Zdravko ga-ezute, nri anyị ga-esiri ya, ndị anyị ga-akpọ ka ha bịa ná nnọkọ mbụ anyị na ya ga-enwe ma a kpọlite ya n’ọnwụ, nakwa ihe anyị ga-agwa ya gbasara oge ikpeazụ.” Tihomir kwuru na ilekwasị anya n’olileanya ha nwere nyeere ya na ndị ezinụlọ ya aka ịna-atachi obi, nakwa ịnọ na-eche oge Jehova ga-akpọlite nwanne ya nwoke.

Olee otú i chere ndụ gị ga-adị n’ụwa ọhụrụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19) c

19 Olee ihe i nwere ike ime ka olileanya i nwere sikwuo ike? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

19 Olee otú ị ga-esi eme ka olileanya i nwere sikwuo ike? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa, gụọ amaokwu Baịbụl ndị kọwara otú Paradaịs ga-adị, tụgharịakwa uche na ha. (Aịza. 25:8; 32:16-18) Chee gbasara otú ndụ ga-adị n’ụwa ọhụrụ. Were ya na ị na-ahụ onwe gị ebe ahụ. Olee ndị ị na-ahụ? Olee ụdị ụda ị na-anụ? Olee otú obi dị gị? Iji nyere gị aka ịmatatụ otú Paradaịs ga-adị, lee ihe ndị e sere n’akwụkwọ anyị gbasara Paradaịs, ma ọ bụkwanụ gị elee vidio egwú ndị dị ka Alaeze Chineke Na-abịa, N’Egbughị Oge Ọ Bụla, ma ọ bụ Chetụgodi Oge Ahụ. Ọ bụrụ na anyị ana-eche mgbe niile banyere ụwa ọhụrụ anyị na-atụ anya ya, nsogbu ndị anyị nwere ga-adị anyị ka ihe na-anaghị “adịte aka, idi ha na-adịkwa mfe.” (2 Kọr. 4:17) Jehova ga-eji olileanya o nyere gị mee ka ị dị ike.

20 Ọ bụrụgodị na ike gwụrụ anyị, olee otú anyị nwere ike isi nweta ike?

20 Ọ bụrụgodị na ike gwụrụ anyị, “ọ bụ Chineke ga-enye anyị ike.” (Ọma 108:13) Jehova enyela gị ihe ndị ga-eme ka ị dị ike. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ị chọrọ enyemaka iji rụọ ọrụ e nyere gị, iji die ọnwụnwa ndị na-abịara gị, ma ọ bụkwanụ iji na-enwe obi ụtọ, rịọsie Jehova arịrịọ ike n’ekpere, mụọkwa ihe n’onwe gị ka ị hụ otú Jehova ga-esi enyere gị aka. Kwe ka ụmụnna gị gbaa gị ume. Mee ka olileanya i nwere sie ike n’obi gị. I mee ihe ndị a, ‘Chineke ga-eji ike ya dị ebube mee ka ị dị ike, ka i wee na-atachi obi n’ihe niile, jirikwa ọṅụ na-edi ihe niile.’​—Kọl. 1:11.

ABỤ NKE 33 Tụkwasị Jehova Ibu Gị

a Ndị isiokwu a ga-enyere aka bụ ndị ike na-agwụ n’ihi ọnwụnwa bịaara ha nakwa ndị chere na ha agaghị arụli ọrụ e nyere ha. Anyị ga-ahụ otú Jehova ga-esi mee ka anyị dị ike, nakwa ihe anyị ga-eme ka anyị nweta enyemaka ya.

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

c NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị ntị chiri na-eche gbasara nkwa Baịbụl kwere. Ọ na-akpọ vidio egwú anyị ka o nyere ya aka ịhụ onwe ya n’ụwa ọhụrụ.