Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịma Ihe Ọhụrụ Ndị A Gbanwere n’Otú Anyị Si Ghọta Ihe Ụfọdụ

Obi dị anyị ụtọ na Jehova ji nwayọọ nwayọọ na-eme ka anyị na-aghọtakwu eziokwu Baịbụl ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (Dan. 12:4) N’agbanyeghị ya, o nwere ike isiri anyị ike ịmata ihe ndị kacha ọhụrụ a gbanwere n’otú anyị si ghọta ihe ndị dị na Baịbụl. Olee ebe anyị nwere ike ịhụ ihe ndị a a gbanwere na otú e si kọwaa ha?

• N’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, e nwere ihe ole na ole a kọwara n’isiokwu n’isiokwu. Gaa n’isiokwu bụ́ “Ndịàmà Jehova,” gaa n’isiokwu nta bụ́ “Ihe Ndịàmà Jehova Kweere,” gazie n’ebe e dere “Ime Ka Ihe Anyị Kweere Dokwuo Anya.”

• Na Watch Tower Publications Index, ị ga-ahụ ihe niile a gbanwere n’otú anyị si ghọta eziokwu Baịbụl. Ị ga-ahụ ha n’isiokwu bụ́ “Beliefs Clarified.” A haziri ha n’afọ n’afọ. Ị chọọ ịhụ ebe a haziri ha n’isiokwu n’isiokwu na Watchtower Library ma ọ bụ na Watchtower ONLINE LIBRARY, denye “understanding clarified” (tinyekwa akara na-egosi ihe mmadụ kwuru) n’ebe ị ga-edenye ihe ị na-achọ.

Ị mụwa ihe n’onwe gị, ọ ga-adị mma ka ị họrọ otu ihe a gbanwere n’oge na-adịbeghị anya, mee nchọnchọ gbasara ya, chọpụtakwa ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mere e ji gbanwee ya.