Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Niile Kwesịrị Ịmata Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ

Mmadụ Niile Kwesịrị Ịmata Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ebe ị na-agatụbeghị mbụ, gịnị ka ị ga-eme?

  1. 1. Itinye isi n’ụzọ ọ bụla i chere bụ́ ụzọ e si aga ya.

  2. 2. Isoro ndị ọzọ maka na i chere na ha ma ụzọ.

  3. 3. Ile GPS, map, ma ọ bụkwanụ ịgwa ezigbo enyi gị ma ụzọ ebe ahụ ka o zi gị ụzọ.

Ọ bụrụ na anyị ahọrọ nke mbụ ma ọ bụ nke abụọ, e nwere ebe anyị ga-agaru, ma o nwere ike ọ gaghị abụ ebe anyị bu n’obi. Ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ nke atọ, obi ga-esi anyị ike na anyị ga-eru ebe anyị na-aga.

Ndụ anyị dị ka ebe mmadụ nọ n’ụzọ na-eme njem. Anyị chọkwaranụ ka ụzọ anyị nọ na ya mee ka anyị nwee obi ụtọ n’ọdịnihu. Ma, ihe ga-eme ka o nwee isi ma ọ bụkwanụ ghara inwe bụ ebe anyị si enweta ndụmọdụ.

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ mkpebi ndị anyị na-eme anaghị akpatachara anyị nsogbu ná ndụ. Ma, e nwere ndị nke nwere ike ịkpa ndụ anyị aka ọjọọ. Mkpebi ndị ahụ na-egosi ihe ndị anyị weere ka ihe ọma na ihe ndị anyị weere ka ihe ọjọọ. Ha nwekwara ike ịbara anyị na ndị anyị hụrụ n’anya uru ma ọ bụ kpatara anyị na ha nsogbu ruo ogologo oge. Mkpebi ndị ahụ nwere ike ịgbasa:

  • Mmekọahụ na alụmdi na nwunye

  • Ịkwụwa aka ọtọ, ọrụ, na ego

  • Otú e si azụ ụmụaka

  • Otú e si emeso ndị ọzọ ihe

Olee otú ị ga-esi jide n’aka na ihe ndị ị na-ekpebi n’okwu ndị a ga-eme ka gị na ndị ezinụlọ gị nwee obi ụtọ n’ọdịnihu?

Ajụjụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-ajụ onwe ya bụ: Gịnị ga-enyere m aka ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ?

Magazin a ga-akọwa ihe mere ị ga-eji tụkwasị Baịbụl obi n’okwu gbasara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, nakwa otú ihe o kwuru ga-esi enyere gị aka.