Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 1

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

Ụjọ Tụwa Gị, Tụkwasị Jehova Obi

Ụjọ Tụwa Gị, Tụkwasị Jehova Obi

ISIOKWU AFỌ 2024: “Ụjọ tụwa m, m na-atụkwasị gị obi.”​—ỌMA 56:3.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ otú anyị ga-esi atụkwasịkwu Jehova obi ma kwụsị ịtụ ụjọ.

1. Gịnị mere ụjọ nwere ike iji tụọ anyị mgbe ụfọdụ?

 ANYỊ niile na-atụ ụjọ mgbe ụfọdụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl emeela ka anyị kwụsị ịtụ ụjọ ndị nwụrụ anwụ, ndị mmụọ ọjọọ, na ọdịnihu. Ma, anyị ka bi n’oge ihe e ji mara ya bụ “ihe ndị na-atụ egwu,” dị ka agha, ime mpụ, na ọrịa. (Luk 21:11) Anyị nwekwara ike ịtụ ụjọ mmadụ, ma ụjọ ndị ọchịchị na-emegide anyị ma ụjọ ndị ezinụlọ anyị na-emegide ezigbo ofufe. Ụfọdụ na-atụkwa ụjọ na ha agaghị edili ọnwụnwa bịaara ha ugbu a ma ọ bụ nke nwere ike ịbịara ha n’ọdịnihu.

2. Kọọ otú ihe dịịrị Devid mgbe ọ nọ na Gat.

2 E nwere oge ndị Devid tụrụ ụjọ. Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Sọl na-achọ igbu ya, ọ gbagara n’obodo ndị Filistia aha ya bụ Gat. Ọ dịghị anya, eze Gat bụ́ Ekish amata na Devid bụ dike ahụ a nọ na-agụrụ egwú na o gburu “iri puku kwuru iri puku” ndị Filistia. ‘Ezigbo ụjọ jidere’ Devid. (1 Sam. 21:10-12) Ọ nọ na-atụ ụjọ ihe Ekish nwere ike ime ya. Olee ihe nyeere Devid aka ịma ihe ọ ga-eme n’agbanyeghị na ụjọ na-atụ ya?

3. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 56:1-3, 11, olee otú Devid si kwụsị ịtụ ụjọ?

3 N’Abụ Ọma nke 56, Devid kwuru otú obi dị ya mgbe ọ nọ na Gat. Abụ ọma ahụ mere ka a mata ihe mere ụjọ ji jide Devid. O kwukwara ihe nyeere ya aka ịkwụsị ịtụ ụjọ. Mgbe ụjọ ji Devid, ọ tụkwasịrị Jehova obi. (Gụọ Abụ Ọma 56:1-3, 11.) Devid nwere ezigbo ihe mere o ji tụkwasị Jehova obi. Jehova nyeere Devid aka ya echepụta otú ọ ga-esi si ná nsogbu ahụ pụta. O mere ihe mmadụ na-agaghị echetụdị n’echiche. O mewere ka onye ara. Kama Ekish ga-achọwa otú ọ ga-esi gbuo Devid, ọ chọrọ ka a kpọpụrụ ya Devid. Ọ bụ otú ahụ ka Devid si gbalaga.​—1 Sam. 21:13–22:1.

4. Olee otú anyị ga-esi tụkwasịkwuo Jehova obi? Nye ihe atụ.

4 Anyịnwa ga-akwụsịli ịtụ ụjọ ma anyị tụkwasị Jehova obi. Ma, olee otú anyị ga-esi tụkwasịkwuo Jehova obi, nke ka nke, ma ụjọ bịa anyị? Chegodị banyere ihe atụ a. Ọ bụrụ na ị mata na e nwere ọrịa ị na-arịa, ụjọ nwere ike ịbịa gị ozugbo. Ma, obi nwere ike irutụ gị ala ma ọ bụrụ na ị tụkwasịrị dọkịta gị obi. O nwere ike ịbụ na ọ gwọọla ọtụtụ ndị rịara ụdị ọrịa ahụ. O nwere ike ige gị ntị nke ọma, mee ka obi sie gị ike na ọ ghọtara otú obi dị gị. O nwere ike ịgwa gị otú ọ chọrọ isi agwọ gị, bụ́kwanụ otú o sirila gwọọ ndị ọzọ. Anyị ga-enwe ike ịtụkwasịkwu Jehova obi ma ọ bụrụ na anyị echee banyere ihe ndị o merela, ihe ndị ọ na-eme ugbu a, na ihe ndị ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ọ bụ ihe Devid mere. Ka anyị na-eleba anya n’ihe ụfọdụ o kwuru n’Abụ Ọma nke 56, chee otú i nwekwara ike isi tụkwasịkwuo Jehova obi ma kwụsị ịtụ ụjọ.

GỊNỊ KA JEHOVA MERELA?

5. Mgbe ụjọ ji Devid, gịnị ka o chebaara echiche? (Abụ Ọma 56:12, 13)

5 N’agbanyeghị na Devid ka nọ ná nsogbu, ọ nọ na-eche banyere ihe ọma ndị Jehova mere n’oge gara aga. (Gụọ Abụ Ọma 56:12, 13.) Ọ bụ ihe Devid mere ná ndụ ya niile. Dị ka ihe atụ, ọ tụgharịrị uche mgbe ụfọdụ n’ihe ndị Jehova kere eke. Ihe ndị ahụ chetaara ya na Jehova pụrụ ime ihe niile, chọọkwa ka ihe dịrị ụmụ mmadụ ná mma. (Ọma 65:6-9) Devid tụgharịkwara uche n’ihe Jehova meere ndị ọzọ. (Ọma 31:19; 37:25, 26) Ihe ọ kacha chebara echiche bụ ihe Jehova meere yanwa n’oge gara aga. Jehova kwadoro Devid ma chebe ya malite mgbe ọ bụ nwata. (Ọma 22:9, 10) Chegodị otú ichewe ụdị ihe ndị a si mee ka Devid tụkwasịkwuo Jehova obi.

Ihe mere ka Devid tụkwasịkwuo Jehova obi bụ ilekwasị anya n’ihe ndị Jehova meere ya, ihe ọ na-emere ya, na ihe ndị ọ ka ga-emere ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5, nke 8, na nke 12) d


6. Anyị tụwa ụjọ, gịnị ga-enyere anyị aka ịtụkwasị Jehova obi?

6 Ụjọ bịa gị, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka Jehova merela?’ Chee banyere ihe ndị o kere eke. Dị ka ihe atụ, Jehova ekeghị ụmụ nnụnụ na okooko osisi n’oyiyi ya, ha agaghịkwa efeli ya ofufe, ma ọ na-elekọta ha. Ọ bụrụ na anyị ‘eleruo anya’ n’otú o si elekọta ha, obi ga-esikwu anyị ike na Jehova ga-elekọtakwa anyịnwa. (Mat. 6:25-32) Cheekwa banyere ihe Jehova meere ndị na-efe ya. I nwere ike ịmụ banyere otu onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, onye gosiri na o nwere okwukwe pụrụ iche, ma ọ bụkwanụ gị agụọ ihe a kọrọ banyere otu ohu Jehova n’oge anyị a. a Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ ịtụgharị uche n’otú Jehova sirila lekọta gị. Olee otú o si dọta gị n’ọgbakọ ya? (Jọn 6:44) Olee otú o sirila za ekpere gị? (1 Jọn 5:14) Olee uru ị na-erite kwa ụbọchị n’àjà ahụ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ji ndụ ya chụọ?​—Efe. 1:7; Hib. 4:14-16.

Ihe ga-enyere anyị aka ịtụkwasịkwu Jehova obi bụ ilekwasị anya n’ihe ndị o meere anyị, ihe ndị ọ na-emere anyị, na ihe ndị ọ ka ga-emere anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6, nke 9 na nke 10, nke 13 na nke 14) e


7. Olee otú ihe mere Daniel onye amụma si nyere Nwanna Nwaanyị Vanessa aka ịkwụsị ịtụ ụjọ?

7 E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Heiti aha ya bụ Vanessa. b Nsogbu tụrụ ya ezigbo ụjọ bịaara ya. Otu nwoke bi n’obodo ha na-akpọ ya ma na-ezitere ya ozi n’ekwentị kwa ụbọchị, na-enye ya nsogbu ka ọ bụrụ enyi ya nwaanyị. Vanessa jụwapụrụ isi. Ma, nwoke ahụ wesara ya ezigbo iwe, kwuodị na ya ga-eme ya ihe. Nwanna Nwaanyị Vanessa sịrị: “Ezigbo ụjọ bịara m.” Olee otú o si kwụsị ịtụ ụjọ? O mere ihe ndị ọ ga-emeli iji chebe onwe ya. Otu okenye nyeere ya aka ya akpọtụrụ ndị uwe ojii. Nwanna Nwaanyị Vanessa tụgharịkwara uche n’otú Jehova si chebe ndị na-ejere ya ozi n’oge gara aga. Ọ sịrị: “Onye mbụ m chetara bụ Daniel onye amụma. A tụbara ya n’olulu ihe juru ya bụ ọdụm agụụ ji n’agbanyeghị na o nweghị ihe o mere. Ma, Jehova chebere ya. M rịọrọ Jehova ka o mee ka nwoke ahụ kwụsị inye m nsogbu. Mgbe m mechara ihe a, ụjọ kwụsịrị ịtụ m.”​—Dan. 6:12-22.

GỊNỊ KA JEHOVA NA-EME UGBU A?

8. Gịnị ka obi siri Devid ike na ya? (Abụ Ọma 56:8)

8 Ọ bụ eziokwu na Devid nọ ná nsogbu nwere ike ịta isi ya mgbe ọ nọ na Gat, ma o kweghị ka ụjọ gbochie ya ime ihe dị mma. Kama ime otú ahụ, o chebaara ihe Jehova na-emere ya mgbe ahụ echiche. Devid ghọtara na Jehova na-eduzi ya ma na-echebe ya, nakwa na ọ ghọtara otú obi dị ya. (Gụọ Abụ Ọma 56:8.) Devid nwekwara ezigbo ndị enyi, dị ka Jonatan na Ahimelek bụ́ nnukwu onye nchụàjà. Ha gbara ya ume ma nyere ya aka. (1 Sam. 20:41, 42; 21:6, 8, 9) N’agbanyeghị na Eze Sọl chọrọ igbu Devid, o gbutelighị ya. Obi siri Devid ike na Jehova ma ọnwụnwa ndị bịaara ya, marakwa otú obi dị ya n’ihi ọnwụnwa ndị ahụ.

9. Gịnị ka Jehova na-ahụ gbasara onye ọ bụla n’ime anyị?

9 Ọ bụrụ na nsogbu bịaara gị mere ka ụjọ na-atụ gị, cheta na Jehova ma nsogbu ahụ nakwa otú o mere ka obi dị gị. Dị ka ihe atụ, ihe Jehova hụrụ abụghị naanị mmegbu e megburu ndị Izrel n’Ijipt, kamakwa, ọ hụrụ “ahụhụ ha [tara].” (Ọpụ. 3:7) Devid bụrụ abụ na Jehova hụrụ ‘otú e si na-emesi ya ike,’ hụkwa ‘na ọ na-atagbu onwe ya n’ahụhụ.’ (Ọma 31:7) Mgbe ndị Chineke na-ata ahụhụ, “ọ nọ na-ewute ya,” ma mgbe ihe kpatara ya bụ nzuzu ha zuzuru. (Aịza. 63:9) Ụjọ tụwa gị, Jehova na-aghọta otú obi dị gị. Ọ chọsikwara ike inyere gị aka ka ị kwụsị ịtụ ụjọ.

10. Gịnị mere obi ji sie gị ike na Jehova na-ahụ gị nakwa na ọ ga-enyere gị aka idi ọnwụnwa ọ bụla?

10 I nwere ike ịna-eche otú Jehova si akwado gị mgbe nsogbu na-atụ ụjọ bịaara gị. N’ihi ya, rịọ ya ka o nyere gị aka ịghọta otú o si na-akwado gị. (2 Eze 6:15-17) Chebarazie ajụjụ ndị a echiche: È nwere okwu e kwuru ma ọ bụ azịza a zara n’ọmụmụ ihe gbara gị ume? È nwere akwụkwọ, vidio, ma ọ bụ egwú anyị gbara gị ume? È nwere nwanna gwara gị okwu ma ọ bụ gụọrọ gị amaokwu Baịbụl mere ka obi sie gị ike? Ọ dị mfe iwere ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya na ihe e ji Okwu Chineke na-akụziri anyị ka ihe na-enweghị ihe ha bụ. Ma, cheta na ha bụ onyinye pụrụ iche Jehova nyere anyị. (Aịza. 65:13; Mak 10:29, 30) Ihe ndị a na-egosi na Jehova hụrụ gị n’anya. (Aịza. 49:14-16) Ha na-egosikwa na i kwesịrị ịtụkwasị ya obi.

11. Olee ihe nyeere Nwanna Nwaanyị Aida aka ịkwụsị ịtụ ụjọ?

11 E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Senigal aha ya bụ Aida. Ọ chọpụtara otú Jehova si kwado ya mgbe ọnwụnwa bịaara ya. Ọ bụ ya bụ nwa mbụ nne na nna ya mụrụ. N’ihi ya, nne na nna ya tụrụ anya ka ọ na-akpata nnukwu ego ọ ga-eji na-elekọta ma onwe ya ma hanwa. Ma, mgbe Nwanna Nwaanyị Aida selatara aka n’ọrụ ego ọ na-arụ ka o nwee ike ịbụ ọsụ ụzọ oge niile, ihe malitere isiri ya ike. Ihe a were ndị ezinụlọ ya iwe, ha ana-akatọ ya. Nwanna nwaanyị a sịrị: “Ụjọ tụwara m na agaghị m enweli ike inyere ndị mụrụ m aka nakwa na onye ọ bụla ga-ajụ m. M tadịrị Jehova ụta maka ikwe ka ihe siere m ike.” Ma, o mechara gee otu okwu n’ọmụmụ ihe. Ọ sịrị: “Nwanna kwuru okwu ahụ chetaara anyị na n’agbanyeghị otú ihe merenụ si gbawaa anyị obi, Jehova ma ha niile. Nwayọọ nwayọọ, esi m na ndụmọdụ ndị okenye na ndị ọzọ nyere m mata na Jehova hụrụ m n’anya. M malitere ikpe ekpere rịọ Jehova ka o mee ka obi sikwuo m ike. Obi mechara ruo m ala mgbe m hụrụ na Jehova zara ekpere m.” Ka oge na-aga, Nwanna Nwaanyị Aida chọtara ọrụ na-enye ya ego ịna-elekọta onwe ya ma na-asụ ụzọ, na-enyekwara ndị mụrụ ya na ndị ọzọ aka. Ọ sịrị: “Amụtala m ịtụkwasị Jehova obi m niile. Ka ọ dị ugbu a, m kpechaa ekpere, ụjọ m na-ala ka naị.”

GỊNỊ KA JEHOVA GA-EME N’ỌDỊNIHU?

12. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 56:9, gịnị ka obi siri Devid ike na ya?

12 Gụọ Abụ Ọma 56:9. Amaokwu a kwuru ihe ọzọ nyeere Devid aka mgbe ụjọ na-atụ ya. N’agbanyeghị na ọ nọ ná nsogbu nwere ike ịta isi ya, ọ tụgharịrị uche n’ihe Jehova ga-emere ya n’ọdịnihu. Devid ma na Jehova ga-anapụta ya mgbe oge ruru. A sị ka e kwuwe, Jehova ekwuola na ọ bụ Devid bụ eze ọzọ ga-achị Izrel. (1 Sam. 16:1, 13) Devid makwa na nkwa ọ bụla Jehova kwere emezuchaala, tinye mmezi.

13. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-eme?

13 Olee ihe Jehova kwere nkwa imere gị? Anyị anaghị atụ anya ka o gbochie nsogbu ọ bụla ịbịara anyị. c Ma, cheta na n’agbanyeghị ọnwụnwa bịaara gị n’ụwa ochie a, Jehova ga-ewepụ ya n’ụwa ọhụrụ ya. (Aịza. 25:7-9) Onye kere anyị nwere ikike zuru ezu ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, ịgwọ anyị, nakwa iwepụrụ anyị ndị niile na-emegide anyị.​—1 Jọn 4:4.

14. Olee ihe anyị nwere ike ịtụgharị uche na ya?

14 Ụjọ bịa gị, tụgharịa uche n’ihe Jehova ga-eme n’ọdịnihu. Chegodị otú obi ga-adị gị mgbe a ga-ebibi Ekwensu, mgbe ndị ọjọọ ga-emi ala ndị ezi omume anọchie ha, nakwa mgbe ezughị okè ga-eji nwayọọ nwayọọ na-ala ka naị. Otu ihe ngosi e mere ná mgbakọ ukwu e mere n’afọ 2014 gosiri otú anyị nwere ike isi na-atụgharị uche n’olileanya anyị. Otu nna gwara ndị ezinụlọ ya otú dị iche e nwere ike isi gụọ 2 Timoti 3:1-5 ma ọ bụrụ na amaokwu ndị ahụ buru amụma otú ihe ga-adị na Paradaịs. Ọ sịrị: “Ma mara nke a, na n’ụwa ọhụrụ, a ga-enwe ezigbo obi ụtọ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ ibe ha n’anya, ndị ji ihe gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe, ndị ma ihe ha ga-emeli, ndị dị umeala n’obi, ndị na-eto Chineke, ndị na-erubere ndị mụrụ ha isi, ndị nwere ekele, ndị na-eguzosi ike n’ihe, ndị hụrụ ndị ezinụlọ ha n’anya nke ukwuu, ndị na-achọ inwe nkwekọrịta, ndị na-ekwu okwu ọma banyere ndị ọzọ mgbe niile, ndị na-ejide onwe ha, ndị dị nwayọọ, ndị hụrụ ezi ihe n’anya, ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ndị na-adịghị agba isi akwara, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị hụrụ Chineke n’anya kama ịhụ ihe ụtọ n’anya, ndị ji obi ha niile na-asọpụrụ Chineke; gị na ndị dị otú a na-akpachi anya.” Gị na ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ụmụnna gị ùnu na-ekwurịta otú ihe ga-adị n’ụwa ọhụrụ?   

15. Ọ bụ eziokwu na ụjọ tụrụ Nwanna Nwaanyị Tanja, olee ihe nyeere ya aka ịkwụsị ịtụ ụjọ?

15 E nwere otu nwanna nwaanyị bi Nọt Masedonia aha ya bụ Tanja. Otú o si merie ụjọ na-atụ ya bụ ịtụgharị uche n’ihe ọma Jehova ga-eme n’ọdịnihu. Ndị mụrụ ya gbasiri mbọ ike ka ọ ghara ịmụ Baịbụl. Ọ sịrị: “Ụfọdụ n’ime ihe ndị m tụrụ ụjọ ha ga-emenụ mechara mee. Mama m na-eti m ihe mgbe ọ bụla m gara ọmụmụ ihe. Papa m na mama m kwuru na ha ga-egbu m ma m ghọọ Onyeàmà Jehova.” Ha mechara chụpụ Tanja n’ụlọ ha. Gịnị ka o mere? Ọ sịrị: “M nọ na-eche banyere otú m ga-esi na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi maka na m kpebiri ime ihe dị Jehova mma. M chekwara banyere otú Jehova ga-esi kwụọ m ụgwọ n’ụwa ọhụrụ ya maka ihe ọ bụla m hapụrụ n’ụwa ochie a nakwa otú m ga-esi chefuo ihe ọjọọ niile.” Tanja akwụsịghị ime ihe dị mma. Jehova nyekwaara ya aka ya enweta ebe ọ ga-ebi. Taa, Tanja bụ nwunye otu nwanna ji obi ya niile na-efe Jehova. Ha abụọ jikwa obi ụtọ na-eje ozi oge niile.

TỤKWASỊKWUO JEHOVA OBI TAA

16. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ike ka anyị na-ahụ ka ihe e kwuru na Luk 21:26-28 na-emezu?

16 N’oké mkpagbu na-abịanụ, ndị mmadụ ‘ga-atụbọ n’ihi egwu.’ Ma, ndị Chineke ga-akwụsi ike, nweekwa obi ike. (Gụọ Luk 21:26-28.) Gịnị mere na anyị agaghị atụ ụjọ? Ọ bụ n’ihi na n’oge ahụ, anyị amụtala ịtụkwasị Jehova obi. Nwanna Nwaanyị Tanja anyị kwuburu okwu ya kwuru na ihe ndị ọ mụtara n’oge gara aga na-enyere ya aka idi nsogbu ndị ọzọ na-abịara ya. Ọ sịrị: “Amụtala m na Jehova ga-enyeliri anyị aka idi nsogbu ọ bụla ma gọzie anyị. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ka ọ̀ bụ ndị mmadụ na-ekwu nke na-eme. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova ka ha ike. N’agbanyeghị na ọnwụnwa nwere ike isi ezigbo ike, ọ ga-emecha bie.”

17. Olee otú isiokwu afọ 2024 ga-esi enyere anyị aka? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

17 E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịtụ anyị ụjọ taa. Ma dị ka Devid, anyị anaghị ekwe ka ụjọ gbochie anyị ime ihe anyị kwesịrị ime. Isiokwu afọ 2024 bụ ekpere Devid kpere. O kpere ekpere sị Jehova: “Ụjọ tụwa m, m na-atụkwasị gị obi.” (Ọma 56:3) Dị ka otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru gbasara amaokwu a, Devid “anaghị eche mgbe niile banyere ihe mere ka ụjọ na-atụ ya ma ọ bụ banyere nsogbu ya. Kama, ọ tụkwasịrị Onye ga-anapụta ya obi.” Chee banyere isiokwu afọ 2024 n’ọnwa ndị na-abịa abịa, nke ka nke, mgbe nsogbu na-emenye ụjọ bịaara gị. Wepụta oge na-atụgharị uche n’ihe Jehova mere n’oge gara aga, ihe ọ na-eme ugbu a, nakwa ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu. I mee otú ahụ, ị ga-ekwu ka Devid, sị: “M tụkwasịrị Chineke obi; egwu anaghị atụ m.”​—Ọma 56:4.

Ebe otu nwanna nwaanyị na-atụgharị uche n’isiokwu afọ a mgbe ọdachi dakwasịrị ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

OLEE OTÚ ICHE BANYERE IHE NDỊ A GA-ESI MEE KA Ị KWỤSỊ ỊTỤ ỤJỌ?

  • Ihe Jehova mere n’oge gara aga

  • Ihe Jehova na-eme ugbu a

  • Ihe Jehova ga-eme n’ọdịnihu

ABỤ NKE 33 Tụkwasị Jehova Ibu Gị

a I nwere ike ịhụ ihe ndị e kwuru ga-eme ka okwukwe gị sikwuo ike na jw.org ma ọ bụrụ na i denye “ṅomie okwukwe ha” ma ọ bụ “akụkọ gbasara Ndịàmà Jehova” n’ebe a na-edenye okwu mmadụ chọrọ ịchọ. Na JW Library®, gaa n’ebe e dere “Isiokwu Dị Iche Iche,” pịa isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha.”

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

d NKỌWA FOTO: Devid chetara otú Jehova si nyere ya aka igbu anụ ọhịa bea, otú o si jiri Ahimelek na-enyere ya aka, nakwa otú ọ ga-esi eme ka ọ bụrụ eze.

e NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe o kweere na-atụgharị uche n’otú Jehova si nyere ya aka ịkwụsị ịṅụ sịga, otú o si si n’akwụkwọ ozi ndị enyi ya na-edetara ya na-agba ya ume, nakwa na ọ ga-eme ka ọ dịrị ndụ ebighị ebi na Paradaịs.