Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 2

ABỤ NKE 19 Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

Ì Jikerela Maka Ụbọchị Kacha Mkpa n’Afọ?

Ì Jikerela Maka Ụbọchị Kacha Mkpa n’Afọ?

“Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”​—LUK 22:19.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ ihe mere Ncheta Ọnwụ Jizọs ji pụọ ezigbo iche, otú anyị ga-esi kwadebe maka ya, nakwa otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka ịbịa ya.

1. Gịnị mere ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs ji bụrụ ụbọchị kacha mkpa n’afọ? (Luk 22:19, 20)

 NDỊ Jehova weere ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs ka ụbọchị kacha mkpa n’afọ. Ọ bụ naanị ya bụ ihe Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-echeta. (Gụọ Luk 22:19, 20.) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji atụsi anya Ncheta Ọnwụ Jizọs ike. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

2. Olee ụfọdụ ihe mere anyị ji atụ anya ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs?

2 Ncheta Ọnwụ Jizọs na-enyere anyị aka ịtụgharị uche n’uru ihe mgbapụta ahụ bara. Ọ na-echetara anyị ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà ahụ Jizọs chụrụ. (2 Kọr. 5:14, 15) Ọ na-emekwa ka anyị nwee ohere anyị na ụmụnna anyị ga-eji ‘gbaa ibe anyị ume.’ (Rom 1:12) Kwa afọ, ọtụtụ ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ụfọdụ n’ime ha na-emechadị lọghachikwute Jehova n’ihi otú e si jiri obiọma nabata ha. Ọtụtụ ndị nwere mmasị na-ebidokwa ịga ije n’ụzọ nke ndụ n’ihi ihe ha hụrụ na ihe ha nụrụ. Ka a sịkwa ihe mere anyị niile ji were Ncheta Ọnwụ Jizọs ka ihe pụrụ iche.

3. Olee otú Ncheta Ọnwụ Jizọs si eme ka anyị na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile dịrị n’otu? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

3 Cheekwa otú Ncheta Ọnwụ Jizọs si eme ka anyị na ụmụnna anyị n’ụwa niile dịrị n’otu. Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-ezukọ ime Ncheta Ọnwụ Jizọs ka anyanwụ na-ada gburugburu ụwa. Anyị niile na-egere okwu na-eme ka anyị ghọta otú ihe mgbapụta ahụ si dị mkpa. Anyị na-abụ abụ abụọ anyị ji eto Jehova, e bugharịa achịcha na mmanya, anyị ejirikwa obi anyị niile kwe “amen” n’ekpere anọ a ga-ekpe. Tupu awa iri abụọ na anọ agafee, ọgbakọ niile emechaala otu ihe ahụ. Chegodị otú obi si abụ Jehova na Jizọs sọ aṅụrị ka ha na-ahụ ka anyị ji obi anyị niile si otú a na-akwanyere ha ùgwù.

Ncheta Ọnwụ Jizọs na-eme ka anyị na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile dịrị n’otu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3) f


4. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

4 N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Olee otú anyị ga-esi kwadebe obi anyị maka Ncheta Ọnwụ Jizọs? Olee otú anyị ga-esi enyere ndị ọzọ aka irite uru na ya? Oleekwa otú anyị ga-esi nyere ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma aka? Azịza ajụjụ ndị a ga-enyere anyị aka ịkwadebe maka ihe omume a dị ezigbo mkpa.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI KWADEBE OBI ANYỊ MAKA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS?

5. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-atụgharị uche n’uru ihe mgbapụta baara anyị? (Abụ Ọma 49:7, 8) (b) Gịnị ka ị mụtara na vidio isiokwu ya bụ Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?

5 Otu n’ime ụzọ ndị kacha mkpa anyị ga-esi kwadebe obi anyị maka Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ịtụgharị uche n’uru àjà ahụ o ji ndụ ya chụọ bara. O nweghị otú anyị gaara esi gbapụta onwe anyị ná mmehie na ọnwụ. (Gụọ Abụ Ọma 49:7, 8; leekwa vidio aha ya bụ Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?) a N’ihi ya, o furu Jehova na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ezigbo ihe ịhazi ka Jizọs bịa nwụọ maka anyị. (Rom 6:23) Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharịkwu uche n’ihe o furu Jehova na Jizọs, anyị ga-aghọtakwu uru ihe mgbapụta ahụ bara. Anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ ihe mgbapụta ahụ furu Jehova na Jizọs. Ma ka anyị buru ụzọ kọwaa ihe ihe mgbapụta ahụ pụtara.

6. Olee otú e si kwụọ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ?

6 Ihe mgbapụta bụ ụgwọ a kwụrụ iji gbara ihe. Mmadụ mbụ bụ́ Adam zuru okè mgbe e kere ya. Mgbe o mehiere, olileanya ịdị ndụ ebighị ebi kwara ma yanwa ma ụmụ ndị ọ ga-amụta. Iji zụtaghachi ihe ahụ Adam tụfuru, Jizọs ji ndụ ya zuru okè chụọ àjà. N’oge niile Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, “o meghị mmehie ọ bụla, o kwughịkwa ihe ga-eduhie onye ọ bụla.” (1 Pita 2:22) Mgbe Jizọs nwụrụ, ọ bụ mmadụ zuru okè otú ahụ Adam zuru tupu ya emehie. Ndụ ya o ji chụọ àjà kwụrụ ụgwọ ndụ ahụ Adam tụfuru.​—1 Kọr. 15:45; 1 Tim. 2:6.

7. Olee ọnwụnwa ụfọdụ bịaara Jizọs mgbe ọ nọ n’ụwa?

7 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o rubeere Jehova isi n’ihe niile, ma mgbe o siiri ya ike ime otú ahụ. Jizọs zuru okè mgbe ọ bụ nwatakịrị. Ma, ndị mụrụ ya bụ ndị na-ezughị okè. N’agbanyeghị ya, o rubeere ha isi. (Luk 2:51) Mgbe Jizọs na-eto eto, o kweghị ka ndị ọzọ mee ka o nupụrụ ndị mụrụ ya isi ma ọ bụ kwụsị ime uche Jehova. Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, o kweghị ka Setan bụ́ Ekwensu nwata ya. Otu n’ime ọnwụnwa ndị Setan nwara ya bụ na ọ gwara ya hoo haa ka ọ kwụsị irubere Chineke isi. (Mat. 4:1-11) Setan kpebisiri ike ime ka Jizọs mehie, ka ọ ghara inwe ike ịgbapụta ụmụ mmadụ.

8. Olee ọnwụnwa ndị ọzọ tara akpụ Jizọs diri?

8 N’oge Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, o diri ọnwụnwa ndị ọzọ. Ndị iro ya kpagburu ya, chọọkwa igbu ya. (Luk 4:28, 29; 13:31) O dikwara ihe ndị na-eso ụzọ ya mejọrọ. (Mak 9:33, 34) Mgbe a nọ na-ekpe ya ikpe, e mekpọrọ ya ọnụ ma kwaa ya emo. E mechaziri gbuo ya otú e si egbu ndị omekome, ahụ́ fụkwara ya ezigbo ụfụ. (Hib. 12:1-3) Jehova echebeghị ya mgbe ọ na-edi ihe ikpeazụ mere ya n’ụwa. b​—Mat. 27:46.

9. Olee otú obi dị anyị maka àjà Jizọs chụrụ? (1 Pita 1:8)

9 O doro anya na Jizọs tara ezigbo ahụhụ ka ọ gbapụta anyị. Ọ̀ bụ na anyị anaghị ahụkwu Jizọs n’anya ma anyị chebara otú o si nwụọ n’ihi anyị echiche?​—Gụọ 1 Pita 1:8.

10. Gịnị ka inye ihe mgbapụta ahụ furu Jehova?

10 Oleekwanụ ihe o furu Jehova ka Jizọs nwee ike ịgbapụta ụmụ mmadụ? Jehova na Jizọs kacha dịrị ná mma karịa otú nna na nwa ya ọ bụla nwere ike ịdị. (Ilu 8:30) Chegodịnụ otú o si wute Jehova mgbe ọ hụrụ ka Jizọs na-ata ọtụtụ ahụhụ n’ụwa. O doro anya na ọ gbawara Jehova obi mgbe ọ hụrụ ka a na-emegbu Ọkpara ya, jụ ya, ma na-anwa ya.

11. Jiri ihe atụ gosi otú ọ ga-abụrịrị na obi dị Jehova mgbe e gburu Jizọs.

11 Nne ma ọ bụ nna ọ bụla nwa ya nwụtụrụla ma nke ọma otú ụdị ihe a si agbawa obi. Okwukwe anyị siri ezigbo ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ma, ọ naghị eme ka ọ ghara iwute anyị ma mmadụ nwụnahụ anyị. Ihe a na-enyere anyị aka ịghọta otú o si wute Jehova mgbe ọ hụrụ ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya tara ahụhụ ma nwụọ n’afọ 33 Oge Ndị Kraịst. c​—Mat. 3:17.

12. Gịnị ka i nwere ike ime tupu ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs?

12 Malite ugbu a ruo n’oge a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, gbalịa mụkwuo gbasara ihe mgbapụta ahụ ma ị mụwa ihe n’onwe gị ma ọ bụkwanụ unu ejiri ya mee ofufe ezinụlọ. Jiri Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Baịbụl mụkwuo gbasara ihe mgbapụta. d Gbalịakwa gụọ ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nke dị n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. N’ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs, echefukwala ile vidio Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị pụrụ iche. Ọ bụrụ na anyị akwadebe obi anyị maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị ga-enwe ike inyere ndị ọzọ aka ka ha ritekwa uru na ya.​—Ezra 7:10.

NYERE NDỊ ỌZỌ AKA KA HA RITE URU

13. Olee ihe mbụ anyị kwesịrị ime iji nyere ndị ọzọ aka ka Ncheta Ọnwụ Jizọs baara ha uru?

13 Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ka Ncheta Ọnwụ Jizọs baara ha uru? Ihe mbụ anyị kwesịrị ime bụ ịkpọ ha ka ha bịa. E wepụ ịkpọ ndị anyị na-ezi ozi ọma ka ha bịa, anyị nwekwara ike idepụta aha ndị anyị ma ka anyị kpọọkwa ha. O nwere ike ịbụ ndị ikwu anyị, ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, na ndị ọzọ. Ọ bụrụgodị na anyị enweghị akwụkwọ ịkpọ òkù e biri ebi ga-ezuru anyị ịkpọ ha, anyị nwere ike izigara ha nke na-adị n’ekwentị. Mmadụ ole ga-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs nwere ike iju anyị anya.​—Ekli. 11:6.

14. Nye ihe atụ gosiri na mmadụ iji aka ya kpọọ onye ọ ma ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na-aba ezigbo uru.

14 Ọ bụrụ na i jiri aka gị kpọọ onye ị ma ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, o nwere ike ime ka onye ahụ bịa ya. O juru otu nwanna nwaanyị di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova anya mgbe di ya gwara ya na ọ ga-eso ya aga Ncheta Ọnwụ Jizọs. Olee ihe mere o ji ju ya anya? Ọ bụ n’ihi na n’oge gara aga, ọ kpọọla di ya ọtụtụ ugboro ka ọ bịa, mana ọ bịaghị. Oleezi ihe mere o ji chọọ ịbịa na nke ugbu a? Di ya sịrị: “E nwere onye nyere m akwụkwọ ịkpọ òkù.” Ọ kọwara na e nwere okenye ya na ya ma kpọrọ ya ka ọ bịa. Nwoke ahụ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ ahụ nakwa n’ọtụtụ afọ na-eso ya.

15. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

15 Buru n’obi na ndị ị kpọrọ òkù nwere ike ịjụ ajụjụ, karịchaa, ma ọ bụrụ na ha abịatụbeghị ọmụmụ ihe anyị ọ bụla. Anyị kwesịrị iche gbasara ajụjụ ndị ha nwere ike ịjụ anyị, kwadokwa otú anyị ga-esi aza ha. (Kọl. 4:6) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Gịnị ka a ga-eme n’ebe ahụ?’ ‘Olee mgbe a ga-agbasa?’ ‘Gịnị ka m kwesịrị iyi aga?’ ‘À na-ana ego tupu a banye?’ ‘À ga-atụ ego n’ihe omume ahụ?’ Anyị kpọọ mmadụ ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị nwere ike ịjụ ya, sị, “È nwere ajụjụ ị ga-achọ ịjụ?” anyị azazie ya ajụjụ ahụ. Anyị nwekwara ike iji vidio bụ́ Na-echeta Ọnwụ Jizọs na Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? nyere ya aka ịghọta otú ọmụmụ ihe anyị na-adị. Isi nke 28 n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi kwukwara ụfọdụ ihe anyị nwere ike ịgwa onye ahụ.

16. Olee ajụjụ ndị ọzọ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs nwere ike ịjụ?

16 Ndị ọhụrụ bịachaa Ncheta Ọnwụ Jizọs, ha nwere ike inwe ajụjụ ndị ọzọ. Ha nwere ike ịna-eche ihe mere na o nweghị onye tara achịcha ma ṅụọ mmanya ahụ ma ọ bụ ihe mere o ji bụrụ naanị mmadụ ole na ole. Ha nwekwara ike ịna-eche ugboro ole anyị na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha nwekwara ike ịchọ ịma ma ọ̀ bụ otú a ka Ndịàmà Jehova si enwe ọmụmụ ihe ha niile. Ọ bụ eziokwu na a na-ekwu ọtụtụ n’ime ihe ndị a ma e kwuwe okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs, ndị ọhụrụ nwere ike ịchọ ka a kọwakwuoro ha ihe ndị a. Isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Otú Ndịàmà Jehova Si Eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Ji Dị Iche n’Otú Chọọchị Ndị Ọzọ Si Eme Ya?” dị na jw.org nwere ike inyere anyị aka ịza ha ụfọdụ ajụjụ ha. Anyị chọrọ ime ihe niile anyị nwere ike ime tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs, n’oge a na-eme ya, nakwa mgbe e mechara ya, iji nyere ndị “na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi” aka ka Ncheta Ọnwụ Jizọs baara ha uru.​—Ọrụ 13:48.

NYERE NDỊ KWỤSỊRỊLA ỊGA OZI ỌMA AKA

17. Olee otú ndị okenye nwere ike isi nyere ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma aka? (Ezikiel 34:12, 16)

17 N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, olee otú ndị okenye nwere ike isi nyere ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma aka? Gosinụ ha na unu hụrụ ha n’anya. (Gụọ Ezikiel 34:12, 16.) Tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs, gbalịanụ kpọọ ọtụtụ n’ime ha otú unu nwere ike. Meenụ ka obi sie ha ike na unu hụrụ ha n’anya nakwa na unu chọrọ inyere ha aka otú ọ bụla unu nwere ike. Kpọọ ha ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọ bụrụ na ha abịa, nabata ha nke ọma. E mechaa Ncheta Ọnwụ Jizọs, na-akpọtụrụ ụmụnna ndị a, na-enyekwara ha aka ka ha nwee ike ịlọghachikwute Jehova.​—1 Pita 2:25.

18. Olee otú anyị niile nwere ike isi nyere ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma aka? (Ndị Rom 12:10)

18 Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ nwere ike inyere ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs aka. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụ igosi ha na anyị hụrụ ha n’anya, na-enwere ha obiọma, na-akwanyekwara ha ùgwù. (Gụọ Ndị Rom 12:10.) Chetakwa na o nwere ike ịbụ na o siiri ha ike ịbịa. O nwere ike ịbụ na ụjọ na-atụ ha na a gaghị anabata ha nke ọma. e N’ihi ya, ajụla ha ajụjụ nwere ike imenye ha ihere ma ọ bụkwanụ kwuo ihe nwere ike iwute ha. (1 Tesa. 5:11) Ha bụ ụmụnna anyị. Obi dịkwa anyị ụtọ na ha bịara soro anyị fewekwa Jehova.​—Ọma 119:176; Ọrụ 20:35.

19. Olee uru icheta ọnwụ Jizọs na-aba?

19 Obi dị anyị ụtọ na Jizọs gwara anyị ka anyị na-echeta ọnwụ ya kwa afọ. Anyị ghọtakwara ihe mere o ji dị ezigbo mkpa. Ime ya na-abara anyị na ndị ọzọ ọtụtụ uru. (Aịza. 48:17, 18) Ọ na-eme ka anyị na-ahụkwu Jehova na Jizọs n’anya. Anyị na-egosikwa na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe ha meere anyị. Anyị na ụmụnna anyị na-adịkwu ná mma. Anyị nwekwara ike inyere ndị ọzọ aka ịmụta otú ha ga-esi nweta ihe ọma ndị a ga-abịara anyị n’ihi na Jizọs nwụrụ maka anyị. Ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji jikere maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a. Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị kacha mkpa n’afọ.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI . . .

  • kwadebe obi anyị maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

  • nyere ndị ọzọ aka ka Ncheta Ọnwụ Jizọs baara ha uru?

  • nyere ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma aka?

ABỤ NKE 18 Anyị Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta

a Jiri ebe a na-achọta ihe na jw.org chọta isiokwu nakwa vidio ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a.

b Gụọ isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Eprel 2021.

d Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị Anyị Nwere Ike Imere Nchọnchọ.”

e Lee foto ndị e ji kọwaa paragraf a. Gụọkwa igbe isiokwu ya bụ “ Gịnị Ka Ụmụnna Mere?” Ebe obi na-akaghị otu nwanna kwụsịrịla ịga ozi ọma ịbanye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma, o mechara kata obi banye. Ụmụnna nabatara ya nke ọma, ya na ha anọrịa.

f NKỌWA FOTO: Mgbe ndị Jehova nọ n’otu ebe n’ụwa na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, ụmụnna ha ndị nọ n’ebe ndị ọzọ na-akwado maka ihe omume ahụ pụrụ iche.