Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-emeso Ụmụ Nwaanyị Otú Jehova Si Emeso Ha?

Ị̀ Na-emeso Ụmụ Nwaanyị Otú Jehova Si Emeso Ha?

OBI dị anyị ụtọ na anyị na ọtụtụ ụmụ nwaanyị, ndị na-erubere Jehova isi, na-efekọ ya. Anyị hụrụ onye ọ bụla n’ime ụmụnna nwaanyị ndị a na-arụsi ọrụ ike n’anya. Anyị ejighịkwa ha egwu egwu. N’ihi ya, ụmụnna nwoke, gbalịanụ na-emere ha obiọma, na-akwanyere ha ùgwù, gharakwa ịna-emegbu ha. Ma, ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, o nwere ike ịna-esiri anyị ike mgbe ụfọdụ ime otú ahụ. E nwekwara ihe ọzọ mere o ji esiri ụfọdụ ụmụnna nwoke ike ime ya.

Ụfọdụ ụmụnna nwoke toro n’ebe ọtụtụ ụmụ nwoke na-emeso ụmụ nwaanyị ka ndị ha ka. Dị ka ihe atụ, otu onye nlekọta sekit nọ na Bolivia aha ya bụ Hans sịrị: “Ụfọdụ ụmụ nwoke toro n’ebe a na-agwa ụmụ nwoke ka ha jiri nwoke ha bụ na-akpa nganga. Ọ na-eme ka ha chee na ha ka ụmụ nwaanyị, na-akparịkwa ha.” Otu okenye bi na Taịwan aha ya bụ Shengxian sịrị: “N’ebe m bi, ọtụtụ ụmụ nwoke na-eche na ụmụ nwaanyị ekwesịghị itinye ọnụ n’okwu ọ bụla ụmụ nwoke na-ekwu. Ọ bụrụ na nwoke ekwuo ihe nwaanyị kwuru gbasara otu ihe, ndị enyi ya nwere ike ileda ya anya.” E nwere ụmụ nwoke ndị na-esi n’ụzọ ndị ọzọ egosi na e nweghị ihe ha ji ụmụ nwaanyị kpọrọ. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-ama njakịrị ndị e ji akparị ụmụ nwaanyị.

Obi dị anyị ụtọ na nwoke ga-agbanweli n’agbanyeghị omenala ndị obodo ha. Ọ ga-akwụsịli ikwere na nwoke ka nwaanyị. (Efe. 4:22-24) Ihe ga-enyere ya aka bụ ịna-eme ka Jehova. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara otú Jehova si emeso ụmụ nwaanyị, otú ụmụnna nwoke nwere ike isi mụta imeso ụmụ nwaanyị ka Jehova, nakwa otú ndị okenye ga-esi bute ụzọ n’ịkwanyere ụmụnna nwaanyị ùgwù.

OLEE OTÚ JEHOVA SI EMESO ỤMỤ NWAANYỊ?

Jehova gosiri anyị otú kacha mma e si emeso ụmụ nwaanyị. Ọ bụ Nna na-eme ebere. Ọ hụkwara ụmụ ya niile n’anya. (Jọn 3:16) Ọ na-ewerekwa ụmụ nwaanyị na-erubere ya isi ka ụmụ ọ hụrụ n’anya. Ka anyị leba anya n’ụzọ ndị Jehova si gosi na ọ hụrụ ụmụ nwaanyị n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù.

Ọ naghị akpapụ ha iche. Jehova kere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị n’oyiyi ya. (Jen. 1:27) O keghị ụmụ nwoke ha amara ihe ma ọ bụ nwee nkà karịa ụmụ nwaanyị. Ọ naghịkwanụ ewere ya na ụmụ nwoke ka ụmụ nwaanyị mma. (2 Ihe 19:7) O kere ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị otú ha ga-enwe ike ịghọta eziokwu dị na Baịbụl ma na-akpa ọmarịcha àgwà ndị ọ na-akpa. Jehova na-ewerekwa okwukwe ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ka otu, n’agbanyeghị ma olileanya ha ọ̀ bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ma ọ bụ ịbụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (2 Pita 1:1) O doro anya na Jehova anaghị emegbu ụmụ nwaanyị.

Ọ na-ege ha ntị. Nsogbu ụmụ nwaanyị na-enwe na otú obi na-adị ha na-emetụ Jehova n’obi. Dị ka ihe atụ, ọ nụrụ ekpere Rechel na Hana ma zaa ha. (Jen. 30:22; 1 Sam. 1:10, 11, 19, 20) Jehova mekwara ka e dee akụkọ ụmụ nwoke ndị gere ụmụ nwaanyị ntị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara Ebreham ka o gee nwunye ya bụ́ Sera ntị, ya emee otú ahụ. (Jen. 21:12-14) Eze Devid gere Abigel ntị. N’eziokwu, Devid kwuru na ọ bụ Jehova zitere Abigel ịgwa ya okwu. (1 Sam. 25:32-35) Jizọs na-eme nnọọ ka Nna ya. O gere mama ya bụ́ Meri ntị. (Jọn 2:3-10) Ihe ndị a gosiri na otu ụzọ Jehova si akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù bụ ige ha ntị.

Ọ tụkwasịrị ha obi. Dị ka ihe atụ, Jehova tụkwasịrị Iv obi, nye ya ọrụ ka o nye aka lekọta ụwa niile. (Jen. 1:28) O si otú ahụ gosi na ọ naghị ewere ya na di ya bụ́ Adam ka ya mma, kama, na ọ bụ onye inyeaka baara Adam uru. Jehova tụkwasịkwara ndị amụma nwaanyị bụ́ Debora na Họlda obi, nye ha ọrụ inye ndị ya ndụmọdụ, ma otu onyeikpe ma otu eze. (Ikpe 4:4-9; 2 Eze 22:14-20) Taa, Jehova na-atụkwasịkwa ụmụnna nwaanyị obi, na-enye ha ọrụ. Ụmụnna nwaanyị ndị a ji obi ha niile na-efe Chineke na-abụ ndị nkwusa, ndị ọsụ ụzọ, na ndị ozi ala ọzọ. Ha na-enye aka ese Ụlọ Nzukọ Alaeze na alaka ụlọ ọrụ dị iche iche, na-arụ ha ma na-arụzi ha. Ụfọdụ n’ime ha na-eje ozi na Betel, ụfọdụ ana-eje ozi n’ọfis ndị nsụgharị. Ụmụnna nwaanyị ndị a dị ka ìgwè ndị agha Jehova na-eji emezu uche ya. (Ọma 68:11) O doro anya na Jehova anaghị ele ụmụ nwaanyị anya ka ndị na-adịghị ike ma ọ bụ ndị na-enweghị ihe ha ga-emeli.

OLEE OTÚ ỤMỤNNA NWOKE GA-ESI MỤTA ỊNA-EMESO ỤMỤ NWAANYỊ OTÚ JEHOVA SI EMESO HA?

Ụmụnna nwoke, iji mata ma ànyị na-emeso ụmụnna nwaanyị otú Jehova si emeso ha, anyị kwesịrị ịchọpụta n’eziokwu ihe anyị na-eche gbasara ha na otú anyị si emeso ha. E kwesịkwara inyere anyị aka ime ya. Otú ahụ e nwere ike ile mmadụ ahụ́ chọpụta ma obi ya ọ̀ na-arụ ọrụ nke ọma ka ezigbo enyi anyị na Okwu Chineke ga-enyere anyị aka ịchọpụta ihe na-adịghị mma anyị na-eche gbasara ụmụ nwaanyị n’obi anyị. Olee ihe anyị ga-eme iji nweta ụdị enyemaka a?

Jụọ ezigbo enyi gị. (Ilu 18:17) Anyị kwesịrị ịjụ ezigbo enyi anyị, onye anyị ma na ọ dị obiọma ma na-elekwa ihe anya otú kwesịrị ekwesị ajụjụ ndị dị ka: “Olee otú i chere m si emeso ụmụnna nwaanyị? Hà nwere ike ikwu na m na-akwanyere ha ùgwù? È nwere ihe m kwesịrị ime iji na-emesokwu ha ihe nke ọma?” Ọ bụrụ na enyi gị agwa gị ebe ndị i nwere ike ịgbanwe, achọla ka ị zọrọ isi onwe gị. Kama ime otú ahụ, gbalịsie ike ka ị gbanwee.

Na-amụ Okwu Chineke. Ụzọ kacha mma anyị ga-esi amata ma otú anyị si emeso ụmụnna nwaanyị ọ̀ dị mma bụ iji Okwu Chineke na-atụle otú anyị si eche echiche na otú anyị si eme ihe. (Hib. 4:12) Ka anyị na-amụ Baịbụl, anyị ga-amụta banyere ụmụ nwoke mesoro ụmụ nwaanyị ihe nke ọma nakwa ụmụ nwoke na-emeghị otú ahụ. Anyị nwere ike ịchọpụta ihe dị iche n’ihe ha mere na ihe anyịnwa na-eme. Ihe ọzọ bụ na ịtụle ihe amaokwu Baịbụl dị iche iche kwuru nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ịkọwahie ihe Baịbụl kwuru iji kwado na anyị kwesịrị ịna-eleda ụmụ nwaanyị anya. Dị ka ihe atụ, na 1 Pita 3:7, e kwuru na e kwesịrị ‘ịna-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù maka na ha dị ka arịa na-esighị ike.’ a Ihe a ọ̀ pụtara na e kwesịrị ileda nwaanyị anya, na ọ maghị ihe ka nwoke? Mbanụ. Jiri ihe Pita kwuru tụnyere ihe e kwuru ná Ndị Galeshia 3:26-29. I mee otú ahụ, ị ga-achọpụta na Jehova họọrọ ụmụ nwaanyị na ụmụ nwoke ka ha bụrụ ndị ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe. Ọ bụrụ na anyị amụọ Okwu Chineke ma jụọ ezigbo enyi anyị ihe o chere gbasara otú anyị si emeso ụmụ nwaanyị, anyị nwere ike isi na ya mata otú anyị kwesịrị isi na-akwanyere ụmụnna anyị nwaanyị ùgwù kwesịrị ekwesị.

OLEE OTÚ NDỊ OKENYE SI AKWANYERE ỤMỤNNA NWAANYỊ ÙGWÙ?

Ụmụnna nwoke nọ n’ọgbakọ nwekwara ike ịmụta ịkwanyere ụmụnna nwaanyị ùgwù ma ha na-eme ka ndị okenye ọgbakọ. Olee otú ndị okenye si ebute ụzọ n’ịkwanyere ụmụnna nwaanyị ùgwù? Ka anyị hụ ụfọdụ ụzọ ha si eme ya.

Ha na-aja ụmụnna nwaanyị mma. Pọl onyeozi mere ihe dị mma ndị okenye ga-amụta ihe na ya. N’akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ nọ na Rom, ọ jara ụfọdụ ụmụnna nwaanyị mma. (Rom 16:12) Chegodịnụ otú obi si tọgbuo ụmụnna nwaanyị ndị ahụ mgbe a gụụrụ ọgbakọ ha akwụkwọ ozi ahụ Pọl dere. Ndị okenye taa kwesịkwara ịna-aja ụmụnna nwaanyị mma mgbe niile maka àgwà ọma ndị ha nwere na ọrụ ndị ha na-arụrụ Jehova. Ihe a na-eme ka ụmụnna nwaanyị mata na a na-akwanyere ha ùgwù nakwa na e ji ha kpọrọ ihe. Okwu na-agba ume okenye gwara ụmụnna nwaanyị ndị a nwere ike inyere ha aka ịnọsi ike n’ofufe Jehova.​—Ilu 15:23.

Na-aja ha mma

Ndị okenye jawa ụmụnna nwaanyị mma, ọ na-esi ha n’obi, ha na-akpọkwa okwu aha. Maka gịnị? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jessica sịrị: “Ọ dị mma ma ụmụnna nwoke sị nwanna nwaanyị ‘ị na-agbalị.’ Mana, ọ na-aka atọ anyị bụ́ ụmụnna nwaanyị ụtọ ma ụmụnna nwoke kpọọ okwu aha, dị ka ịja anyị mma maka otú anyị si akụziri ụmụ anyị ịnọ nwayọọ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ otú anyị si agba mbọ aga akpọta onye anyị na-amụrụ ihe ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ndị okenye akpọọ okwu aha ma ha jawa ụmụnna nwaanyị mma, ọ ga-eme ka ha mata na ha dị mkpa nakwa na e ji ha kpọrọ ihe n’ọgbakọ.

Ha na-ege ụmụnna nwaanyị ntị. Ndị okenye dị umeala n’obi na-aghọta na ọ bụghị naanị ha nwere ike ichepụta ihe dị mma. Ndị okenye dị otú a na-agwa ụmụnna nwaanyị ka ha kwuo ihe ha chere, na-egekwa ha ntị nke ọma mgbe ha na-ekwu ya. Ndị okenye na-esi otú a agba ụmụnna nwaanyị ume. Ọ na-abakwara hanwa bụ́ ndị okenye uru. Olee uru ọ na-abara ha? Otu okenye aha ya bụ Gerardo na-eje ozi na Betel sịrị: “Achọpụtala m na ịjụta ụmụnna nwaanyị ihe ha chere na-enyere m aka ịrụkwu ọrụ m nke ọma. Ọtụtụ mgbe, ha arụọla ọrụ ahụ ogologo oge karịa ọtụtụ ụmụnna nwoke.” N’ọgbakọ, ọtụtụ ụmụnna nwaanyị bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. N’ihi ya, ha ma ọtụtụ ihe gbasara ndị bi n’ebe ha na-ezi ozi ọma. Otu okenye aha ya bụ Bryan sịrị: “Ụmụnna anyị ndị nwaanyị nwere ọtụtụ àgwà magburu onwe ha nakwa nkà ndị a chọrọ n’ọgbakọ Jehova. N’ihi ya, na-amụta ezigbo ihe n’aka ha.”

Na-ege ha ntị

Ndị okenye ma ihe ekwesịghị ileghara aro ụmụnna nwaanyị tụrụ anya. Maka gịnị? Otu okenye aha ya bụ Edward sịrị: “Ihe nwanna nwaanyị kwuru nakwa ihe ọ ma nwere ike inyere nwanna nwoke aka ịghọta ihe niile gbasara otu okwu. O nwekwara ike inyere ya aka ịna-aghọtakwu otú obi dị ndị ọzọ.” (Ilu 1:5) Ọ bụrụgodị na okenye agaghị emeli ihe nwanna nwaanyị kwuru, ọ ka nwere ike ikele ya maka ihe o kwuru nakwa maka otú o si aghọta ihe.

Ha na-azụ ụmụnna nwaanyị. Ndị okenye ma ihe na-achọ ohere ndị ha ga-eji na-azụ ụmụnna nwaanyị. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịkụziri ụmụnna nwaanyị otú ha ga-esi na-eduzi nzukọ ozi ubi ma ọ bụrụ na e nweghị nwanna nwoke e mere baptizim nọ ya. E nwere ike ịkụziri ha otú e si eji ngwá ọrụ dị iche iche arụ ọrụ ka ha nwee ike na-enye aka arụzi ma ọ bụ na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. Na Betel, ndị okenye azụọla ụmụnna nwaanyị ka ha na-arụ ọtụtụ ọrụ, dị ka ịrụzi ihe, ịzụta ihe, idekọ ego, imepụta ihe ndị e ji arụ ọrụ na kọmputa, na ọrụ ndị ọzọ. Mgbe ndị okenye na-azụ ụmụnna nwaanyị, ha na-egosi na ha weere ụmụnna nwaanyị ka ndị ga-arụli ọrụ e nyere ha nakwa ndị a ga-atụkwasịli obi.

Na-azụ ha

Ọtụtụ ụmụnna nwaanyị na-eji ihe ha mụtara n’aka ndị okenye enyere ndị ọzọ aka. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụnna nwaanyị na-eji ihe a kụziiri ha gbasara ịrụ ụlọ enyere ndị ọzọ aka ịrụgharị ụlọ ha ma e nwee ọdachi. E nwekwara ụmụnna nwaanyị ndị na-eji ihe a kụziiri ha gbasara otú e si ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị akụziri ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ isi otú a ekwusa ozi ọma. Olee otú ụmụnna nwaanyị si ewere ndị okenye zụrụ ha? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jennifer sịrị: “Mgbe m so rụọ otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, otu okenye wepụtara oge ya zụọ m nke ọma. Ọ hụrụ ọrụ m rụrụ, jaakwa m mma maka ya. Mụ na ya ịrụkọ ọrụ tọgburu m atọgbu n’ihi na o mere ka m mata na e ji m kpọrọ ihe nakwa na a tụkwasịrị m obi.”

URU IMESO ỤMỤNNA NWAANYỊ KA ỤMỤNNE ANYỊ NA-ABA

Anyị hụrụ ụmụnna anyị nwaanyị ndị ji ofufe Jehova kpọrọ ihe n’anya otú Jehova hụrụ ha. N’ihi ya, anyị na-emeso ha ka ụmụnne anyị ndị nwaanyị. (1 Tim. 5:1, 2) Anyị ji ha kpọrọ ihe, obi dịkwa anyị ezigbo ụtọ na anyị na ha na-arụkọ ọrụ. Obi na-atọkwa anyị ezigbo ụtọ ma ha chọpụta na anyị hụrụ ha n’anya ma na-akwado ha. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Vanessa sịrị: “M na-ekele Jehova nke ukwuu na m nọ n’ọgbakọ ya. Ụmụnna nwoke ndị juru n’ọgbakọ ya na-agba m ume nke ukwuu.” Otu nwanna nwaanyị nọ na Taịwan sịrị: “Eji m obi m niile na-ekele Jehova maka iji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe nakwa maka ịna-akwanyere ha ùgwù. Ihe a na-eme ka okwukwe m na-esikwu ike, na-emekwa ka m na-eji ọgbakọ Jehova m nọ na ya akpọrọkwu ihe.”

Obi na-atọ Jehova ezigbo ụtọ ma ọ hụ ka ụmụnna nwoke ndị ji obi ha niile na-efe ya ji ụmụnna nwaanyị kpọrọ ihe ma na-akwanyere ha ùgwù otú yanwa na-eme. (Ilu 27:11) Otu okenye bi na Skọtland aha ya bụ Benjamin sịrị: “Ọtụtụ ụmụ nwoke nọ n’ụwa taa na-eleda ụmụ nwaanyị anya. N’ihi ya, ọ bụrụ na ụmụnna nwaanyị abata n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị kwesịrị ime ka ha ghọta na anyị hụrụ ha n’anya nakwa na anyị na-akwanyere ha ùgwù.” Ka anyị mee ike anyị niile ime ka Jehova ma na-ahụ ụmụnna anyị ndị nwaanyị n’anya, na-akwanyekwara ha ùgwù.​—Rom 12:10.

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe okwu bụ́ “arịa na-esighị ike” pụtara, gụọ isiokwu bụ́ “Uru nke ‘Ihe Ka Bụrụ nke Na-esighị Ike.’” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Mee 15, 2006. Gụọkwa isiokwu bụ́ “Nduzi Amamihe Dị na Ya Maka Ndị Di na Nwunye,” nke gbara n’Ụlọ Nche Mach 1, 2005.