Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 5

ABỤ NKE 27 A Ga-ekpughe Ụmụ Chineke

‘E Nweghị Ihe Ga-eme Ka M Gbakụta Gị Azụ’

‘E Nweghị Ihe Ga-eme Ka M Gbakụta Gị Azụ’

“[Chineke] kwuru, sị: ‘E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka m gbakụta gị azụ.’”​—HIB. 13:5b.

IHE A GA-AMỤ

A kwadebere isiokwu a ka o mee ka obi sie ndị na-efe Chineke nọ n’ụwa ike na a gaghị agbakụta ha azụ mgbe a ga-akpọrọ ndị e tere mmanụ niile ka fọrọ n’ụwa gaa eluigwe.

1. Olee mgbe a ga-akpọrọ Ndị Kraịst niile e tere mmanụ laa eluigwe?

 ỌTỤTỤ afọ gara aga, ndị Jehova chere, sị: ‘Olee mgbe a ga-akpọrọ onye nke ikpeazụ n’ime ndị e tere mmanụ gaa eluigwe?’ Anyị cheburu na ọ ga-abụ na ụfọdụ ndị e tere mmanụ nwere ike ịnọ n’ụwa ruo oge ụfọdụ mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs ma a lụchaa agha Amagedọn. Ma, n’Ụlọ Nche Julaị 15, 2013, anyị mụtara na a ga-akpọrọ ndị e tere mmanụ niile fọrọ n’ụwa laa eluigwe tupu a lụwa agha Amagedọn.​—Mat. 24:31.

2. Olee ajụjụ anyị nwere ike ịna-ajụ? Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

2 Ma, ajụjụ anyị nwere ike ịjụ bụ: Olee ihe ga-eme “atụrụ ọzọ” Kraịst, ndị ji obi ha niile na-efe Jehova n’ụwa n’oge “oké mkpagbu”? (Jọn 10:16; Mat. 24:21) Ụfọdụ ndị taa nwere ike ịna-echegbu onwe ha na ha agaghị ama ihe ha ga-eme eme ma ọ bụkwanụ na a ga-ahapụ ha mgbe a kpọọrọ ụmụnna ha e tere mmanụ ha hụrụ n’anya laa eluigwe. Ka anyị leba anya n’akụkọ abụọ a kọrọ na Baịbụl nwere ike ịgbata ha n’obi. Anyị ga-elebazi anya n’ihe ndị mere ha ekwesịghị ichegbuwe onwe ha.

OLEE IHE NA-AGAGHỊ EME?

3-4. Gịnị nwere ike ịna-echegbu ụfọdụ ndị? Maka gịnị?

3 Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche na atụrụ ọzọ ahụ ga-ahapụ eziokwu ma ọ bụrụ na e nweghịzi ndị e tere mmanụ so n’Òtù Na-achị Isi nọ n’ụwa ga na-eduzi ha. Ha nwere ike ịna-echeta akụkọ ụfọdụ a kọrọ na Baịbụl, ya emee ka ha na-echegbu onwe ha. Ka anyị leba anya n’akụkọ abụọ n’ime ha. Nke mbụ bụ gbasara nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Jehoyada. Ọ bụ nwoke ji obi ya niile fee Jehova. Ya na nwunye ya bụ́ Jehoshabịat chebere obere nwa bụ́ Jehoash ma nyere ya aka ịghọ ezigbo eze kwesịrị ntụkwasị obi. N’oge niile Jehoyada dị ndụ, Jehoash nọ na-eme nke ọma. Ma, mgbe Jehoyada nwụrụ, Jehoash kpawara àgwà ọjọọ. Ọ malitere ige ndị isi ọjọọ ntị ma hapụ Jehova.​—2 Ihe 24:2, 15-19.

4 Akụkọ ọzọ bụ gbasara Ndị Kraịst biri ndụ mgbe oge ndịozi gachara. Ọ bụ Jọn onyeozi bụ onye ikpeazụ n’ime ndịozi nwụrụ. N’oge niile Jọn onyeozi nọ ndụ, o nyeere ọtụtụ Ndị Kraịst aka ka ha ghara ịkwụsị ife Jehova. (3 Jọn 4) Jọn na ndịozi Jizọs ndị ọzọ so gbaa ezigbo mbọ chebe ọgbakọ Ndị Kraịst ka ndị si n’ezi ofufe dapụ ghara imebi ya. (1 Jọn 2:18; 2 Tesa. 2:7) Ma mgbe Jọn nwụchara, ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ ghọrọ ndị si n’ezi ofufe dapụ. N’oge na-adịghịkwa anya, ndị a si n’ezi ofufe dapụ malitere ịkụzi nkụzi ụgha n’ọgbakọ niile, na-emekwa ka ha na-eme omume ọjọọ.

5. Olee ihe akụkọ abụọ anyị tụlere na-egosighị?

5 Akụkọ Baịbụl abụọ a hà gosiri na ụdị ihe a ga-eme atụrụ ọzọ Kraịst ma a kpọrọ ndị e tere mmanụ laa eluigwe? N’oge ahụ, Ndị Kraịst ji obi ha niile na-efe Jehova, hà ga-akwụsị ime ihe ha mụtara n’aka ndị e tere mmanụ otú ahụ Jehoash mere ma ọ bụkwanụ ghọọ ndị si n’ezi ofufe dapụ otú ahụ ọtụtụ Ndị Kraịst mere mgbe ndịozi nwụchara? Azịza ya bụ mba. Obi siri anyị ike na ọ bụrụ na ndị e tere mmanụ niile agaa eluigwe, a ga-elekọta atụrụ ọzọ ahụ nke ọma, ha ana-efekwa Jehova. Olee ihe mere obi ji sie anyị ike?

A GAGHỊ EMEBI EZI OFUFE

6. Olee oge atọ anyị ga-eleba anya na ha ná nkenke?

6 Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na a gaghị emebi ezi ofufe ma n’oge ihe ga-ata ezigbo akpụ n’ọdịnihu? Ọ bụ n’ihi ihe anyị mụtara na Baịbụl gbasara oge a anyị nọ na ya. Oge a anyị nọ na ya dị ezigbo iche n’oge ụmụ Izrel nakwa n’oge ndịozi nwụchara. N’ihi ya, ka anyị lebakwuo anya n’oge atọ ndị a: (1) Oge ụmụ Izrel oge ochie, (2) oge ndịozi nwụchara, nakwa (3) oge anyị a, ya bụ, oge a “ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ.”​—Ọrụ 3:21.

7. N’oge ụmụ Izrel oge ochie, olee ihe mere ndị ji obi ha niile fee Jehova ji nwee obi ike mgbe ndị obodo ha na ndị eze ha malitere ime ihe ọjọọ?

7 Oge ụmụ Izrel oge ochie. Obere oge tupu Mosis anwụọ, ọ gwara ndị Izrel, sị: “Ama m nke ọma na m nwụọ, unu ga-akpa àgwà ọjọọ ma ghara idebe iwu ndị m na-enye unu.” (Diut. 31:29) Mosis dọkwara ndị Izrel aka ná ntị na ọ bụrụ na ha enupụrụ Jehova isi, Jehova ga-eme ka a dọrọ ha n’agha. (Diut. 28:35, 36) Ihe ahụ o kwuru ò mezuru? Ee. Ọtụtụ afọ Mosis nwụchara, ọtụtụ ndị eze chịrị Izrel kpara àgwà ọjọọ ma mee ka ndị Jehova mewe ihe ọjọọ. Ihe a mere ka Jehova taa ndị ọjọọ ahụ ahụhụ, meekwa ka a gharazie inwe onye Izrel ga na-achị ha. (Ezik. 21:25-27) Ma, mgbe ndị Izrel ndị ji obi ha niile na-efe Jehova hụrụ na ihe Jehova kwuru emezuola, o mere ka obi sie ha ike, ha ana-efe Chineke.​—Aịza. 55:10, 11.

8. Olee ihe mere na o kwesịghị iju anyị anya na Ndị Kraịst malitere ịkpa àgwà ọjọọ mgbe ndịozi nwụchara? Kọwaa.

8 Oge ndịozi nwụchara. Ò kwesịrị iju anyị anya na Ndị Kraịst malitere kpawa àgwà ọjọọ n’oge ndịozi nwụchara? O kwesịghị. Jizọs buru amụma na a ga-enwe ọtụtụ ndị ga-esi n’ezi ofufe dapụ. (Mat. 7:21-23; 13:24-30, 36-43) Ndịozi bụ́ Pọl, Pita, na Jọn kwukwara na ihe ahụ Jizọs buru n’amụma emezuwela n’oge ndịozi. (2 Tesa. 2:3, 7; 2 Pita 2:1; 1 Jọn 2:18) Obere oge onye nke ikpeazụ n’ime ndịozi nwụchara, Ndị Kraịst si n’ezi ofufe dapụ ghọrọ Babịlọn Ukwu ahụ, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. Ihe a mezuru amụma Jizọs.

9. Olee otú oge anyị bi na ya si dị iche n’oge ụmụ Izrel oge ochie nakwa n’oge ndịozi nwụchara?

9 Oge a “ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Oge a anyị bi na ya dị iche n’oge ụmụ Izrel oge ochie nakwa n’oge ndịozi nwụchara, ọtụtụ Ndị Kraịst aghọọ ndị si n’ezi ofufe dapụ. Olee ihe a kpọrọ oge anyị a? Ihe mbụ nwere ike ịgbata anyị n’obi bụ “oge ikpeazụ” nke ajọ ụwa ochie a. (2 Tim. 3:1) Ma, Baịbụl kwukwara na e nwere oge ọzọ malitere n’otu oge ahụ. Oge ahụ ga-adịgide ruo mgbe Alaeze Kraịst mere ka ụmụ mmadụ zuo okè, meekwa ka ụwa ghọọ paradaịs. A na-akpọ oge a oge a “ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” (Ọrụ 3:21) Oge a bidoro n’afọ 1914. Olee ihe e meziri ka ọ dị ọhụrụ? E chiri Jizọs Eze n’eluigwe. N’ihi ya, Jehova nweziri eze na-anọchi anya ya, bụ́ onye si n’agbụrụ Eze Devid. Ma, ọ bụghị naanị Alaeze ahụ ka Jehova mere ka ọ dị ọhụrụ. Jehova nyekwaara ndị na-efe ya nọ n’ụwa aka ka ha malite ife ya otú ọ chọrọ ọzọ. (Aịza. 2:2-4; Ezik. 11:17-20) À ga-emebi ya ọzọ?

10. (a) Olee ihe Baịbụl buru amụma ya gbasara ezigbo ofufe n’oge anyị a? (Aịzaya 54:17) (b) Olee ihe mere ụdị amụma ndị a ji eme ka obi sie anyị ike?

10 Gụọ Aịzaya 54:17. Chegodị gbasara amụma a: “Ngwá ọgụ ọ bụla a kpụrụ ka e jiri lụso gị ọgụ agaghị enwe isi.” Ihe a Baịbụl kwuru na-emezu n’oge anyị a. Ihe ọzọ na-emezu n’oge a bụ ihe Baịbụl kwuru na-agba ume. Ọ sịrị: “Jehova ga na-akụziri ụmụ gị niile ihe. Ụmụ gị ga-anọkwa nnọọ n’udo. A ga-eme ka ị bụrụ a kwaa a kwụrụ n’ime ezi omume. . . . Ị gaghị atụ egwu ihe ọ bụla, ụjọ agaghịkwa atụ gị, n’ihi na e nweghị ihe na-emenye ụjọ ga-abịa gị nso.” (Aịza. 54:13, 14) Setan bụ́ “chi nke oge a” agaghị enwelidị ike ime ka a kwụsị ọrụ ndị Jehova na-arụ taa, nke bụ́ ịkụziri ndị mmadụ gbasara Jehova. (2 Kọr. 4:4) A maliteghachila ife Jehova otú ọ chọrọ. A gaghịkwa emebi ya ọzọ. A ga-efegidekwa Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Ngwá ọgụ ọ bụla a kpụrụ ka e jiri lụso anyị ọgụ agaghị enwe isi.

GỊNỊ GA-EME?

11. Gịnị na-eme ka obi sie anyị ike na a gaghị ahapụ oké ìgwè mmadụ mgbe a ga-akpọrọcha ndị e tere mmanụ gaa eluigwe?

11 Gịnị ga-eme ma a kpọrọ ndị niile e tere mmanụ gaa eluigwe? Cheta na Jizọs bụ onye na-azụ anyị dị ka atụrụ. Ọ bụ ya bụ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. Jizọs kwuru hoo haa, sị: “Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.” (Mat. 23:10) Eze anyị na-achị achị ugbu a agaghị ahapụ ịrụ ọrụ ya. Ebe ọ bụ Kraịst na-achị, ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa ekwesịghị ịtụ ụjọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị amaghị ihe niile gbasara otú Kraịst ga-esi eduzi ndị ya n’oge ahụ. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’akụkọ ụfọdụ Baịbụl kọrọ na-eme ka obi sie anyị ike.

12. Olee otú Jehova si lekọta ndị ya (a) mgbe Mosis nwụrụ? (b) mgbe e nyere Ịlaịja ọrụ ọzọ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

12 Tupu ndị Izrel abanye n’Ala Nkwa, Mosis nwụrụ. Olee ihe mere ndị Chineke? Ebe ọ bụ na ohu Jehova ahụ na-enyere ha aka anwụọla, Jehova ọ̀ kwụsịrị inyere ndị ya aka? Mba. Jehova lekọtara ha oge niile ha ji obi ha fee ya. Tupu Mosis anwụọ, Jehova gwara ya ka ọ họpụta Joshụa ka ọ na-edu ndị ya. Mosis nọkwa na-azụ Joshụa kemgbe ọtụtụ afọ. (Ọpụ. 33:11; Diut. 34:9) Ihe ọzọ bụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwoke ndị ọzọ ruru eru Jehova ji eduzi ndị ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị isi otu puku otu puku mmadụ, ndị isi otu narị otu narị mmadụ, ndị isi mmadụ iri ise mmadụ iri ise, nakwa ndị isi mmadụ iri mmadụ iri. (Diut. 1:15) Chineke lekọtara nnọọ ndị ya nke ọma. Akụkọ ọzọ yikwara ya bụ akụkọ Ịlaịja. O nyeere ndị mmadụ aka ife Jehova ezigbo ofufe n’Izrel ruo ọtụtụ afọ. Mana, e nwere oge Jehova nyere ya ọrụ ọzọ na Juda. (2 Eze 2:1; 2 Ihe 21:12) Jehova ọ̀ gbakụtara ndị ya nọ n’ebo iri nke Izrel azụ? Mba. Ịlaịja zụrụ Ịlaịsha ruo ọtụtụ afọ. E nwekwara “ụmụ ndị amụma,” ndị ọ ga-abụ na a haziri ha n’ihe dị ka ụlọ akwụkwọ ebe a na-azụ ha n’oge ahụ. (2 Eze 2:7) N’ihi ya, e nwere ọtụtụ ndị ji obi ha na-efe Jehova na-eduzi ndị Chineke n’oge ahụ. Jehova nọgidere na-emezu uche ya. Ọ nọkwa na-elekọta ndị ji obi ha niile na-efe ya.

Mosis (foto nke dị n’aka ekpe) na Ịlaịja (foto nke dị n’aka nri) zụrụ ndị ga-anọchi ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)


13. Olee ihe Jehova kwere anyị nkwa ya ná Ndị Hibru 13:5b? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 N’ihi ihe ndị a anyị lebarala anya, olee ihe i chere ga-eme ma onye nke ikpeazụ n’ime ndị e tere mmanụ gaa eluigwe? Anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị. Baịbụl kwuru otu eziokwu ga-eme ka obi sie anyị ike. Ọ sịrị: E nweghị ihe ga-eme ka Jehova gbakụta ndị ya nọ n’ụwa azụ. (Gụọ Ndị Hibru 13:5b.) Dịkwa ka Mosis na Ịlaịja, Ndị Kraịst e tere mmanụ taa, ndị na-eduzi ndị Chineke, ghọtara na ọ dị mkpa ka ha na-azụ ndị ọzọ. Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị so n’Òtù Na-achị Isi azụọla ọtụtụ ụmụ nwoke so n’atụrụ ọzọ ka ha na-eduzi ndị Chineke. Dị ka ihe atụ, ha ahaziela ọtụtụ ụlọ akwụkwọ a na-anọ azụ ndị okenye, ndị nlekọta sekit, ndị so na Kọmitii Alaka, ndị okenye na-elekọta ngalaba dị iche iche na Betel, nakwa ndị ọzọ. Òtù Na-achị Isi na-azụkwa ndị na-enyere ha aka nọ na kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi. Ndị a na-enyere ha aka ji obi ha niile na-eje ozi ugbu a, na-arụkwa ọtụtụ nnukwu ọrụ n’ọgbakọ Jehova. A na-azụ ha ugbu a ka ha nwee ike ịrụrụ ọrụ ilekọta atụrụ Jizọs na-aga.

Òtù Na-achị Isi arụsiela ọrụ ike zụọ ndị na-enyere ha aka. Ha ahaziekwala maka ụlọ akwụkwọ dị iche iche a na-anọ azụ ndị okenye, ndị nlekọta sekit, ndị so na Kọmitii Alaka, ndị okenye na-elekọta ngalaba dị iche iche na Betel, nakwa ndị ozi ala ọzọ n’ụwa niile (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)


14. Gịnị bụ isi ihe anyị mụrụ n’isiokwu a?

14 Ihe dị mkpa anyị na-amụta bụ na mgbe a kpọọrọ onye nke ikpeazụ n’ime ndị e tere mmanụ gaa eluigwe ná ngwụcha oké mkpagbu, a ka ga na-efekwa Jehova otú ọ chọrọ n’ụwa ebe a. Obi dị anyị ụtọ na Jizọs Kraịst bụ Onye Ndú anyị. N’ihi ya, a gaghị akwụsị ife Jehova otú ọ chọrọ. N’eziokwu, n’oge ahụ, Gọg onye Megọg, ya bụ, ọtụtụ mba gbakọrọ aka ọnụ, ga-alụso anyị ọgụ. (Ezik. 38:18-20) Ma, ha ga-akụ afọ n’ala n’ọgụ ahụ dị mkpirikpi ha ga-alụso ndị Chineke. Ha agaghị emeli ka ndị Jehova kwụsị ife ya. Jehova ga-anapụta ndị ya. Jọn onyeozi hụrụ “oké ìgwè mmadụ,” ya bụ, atụrụ ọzọ Kraịst, n’ọhụụ. A gwara Jọn na “oké ìgwè mmadụ” a “si n’oké mkpagbu ahụ pụta.” (Mkpu. 7:9, 14) N’eziokwu, e nweghị ihe ọ bụla ga-eme ha.

15-16. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 17:14, gịnị ka Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-eme n’oge a ga-alụ agha Amagedọn, oleekwa ihe mere ihe a ji agba anyị ume?

15 Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Oleekwanụ gbasara ndị e tere mmanụ? Olee ihe ha ga-eme ma ha si n’ụwa ebe a gaa eluigwe?’ Baịbụl zara ajụjụ ahụ. O kwuru na ndị ọchịchị ụwa a “ga-alụso Nwa Atụrụ ahụ agha.” Nke bụ́ eziokwu bụ na a ga-emeri ha. Baịbụl sịrị: “Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha.” Olee ndị ga-enyere ya aka? Amaokwu ahụ sịrị na ọ bụ “ndị Chineke kpọrọ,” “ndị ọ họọrọ,” na “ndị jisiri ya aka ike.” (Gụọ Mkpughe 17:14.) Olee ndị ha bụ? Ha bụ ndị e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ. N’ihi ya, n’oge a ga-akpọrọ onye nke ikpeazụ n’ime ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa laa eluigwe ná ngwụcha oké mkpagbu, otu n’ime ọrụ ndị mbụ ha ga-arụ bụ ịlụ ọgụ. Ọrụ a pụrụ ezigbo iche. Ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ na-alụbu ọgụ tupu ha aghọọ Ndịàmà Jehova. E nwedịrị ụfọdụ n’ime ha bụbu ndị amị. Ma, ha mechara ghọọ ezigbo Ndị Kraịst, mụtakwa ịna-eme udo. (Gal. 5:22; 2 Tesa. 3:16) Ha kwụsịrị ịna-akwado agha ndị a na-alụ. Ma, mgbe a ga-akpọlite ha ha agaa eluigwe, ha na Jizọs Kraịst na ndị mmụọ ozi ya ga-eso na-arụkọ ọrụ. Ha ga-eso lụọ agha ikpeazụ a ga-alụso ndị iro Chineke.

16 Chegodị gbasara ya. N’ụwa ebe a, ụfọdụ n’ime ndị e tere mmanụ emeela agadi. Ike adịghịzi ha. Mana, a kpọlite ha n’ọnwụ n’eluigwe, ha ga-abụzi ndị mmụọ ozi dị ike na-enweghị ike ịnwụ anwụ, ndị e nyere ọrụ ha na Eze Jizọs Kraịst iso lụọ agha. A lụchaa agha Amagedọn, ha ga-eso nyere ụmụ mmadụ aka ka ha zuo okè. Obi siri anyị ike na ha ga-emere ụmụnna ha nọ n’ụwa ihe ọma mgbe ha nọ n’eluigwe karịa otú ha nwere ike ime mgbe ha bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè n’ụwa.

17. Olee otú anyị si mara na aka agaghị akpa ohu Chineke ọ bụla n’oge a ga-alụ agha Amagedọn?

17 Ì so n’atụrụ ọzọ ahụ? Ọ bụrụ na i so, olee ihe ga-eme mgbe a ga-amalite ịlụ agha dị ezigbo mkpa bụ́ agha Amagedọn? Ihe ị ga-eme dị mfe. Ọ bụ ịtụkwasị Jehova obi, sorokwa ntụziaka ya. Olee otú i nwere ike isi eme ya? Baịbụl sịrị: “Gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime, mechiekwanụ ọnụ ụzọ mgbe unu banyechara. Zoonụ nwa mgbe nta, ruo mgbe Chineke wechara iwe.” (Aịza. 26:20) Aka agaghị akpa ndị niile ji obi ha na-efe Jehova ma n’eluigwe ma n’ụwa. Obi siri anyị ezigbo ike otú o siri Pọl onyeozi na ‘ma ọchịchị ma ihe ndị dị ugbu a ma ihe ndị ga-abịa abịa agaghị enwe ike ime ka Chineke kwụsị ịhụ anyị n’anya.’ (Rom 8:38, 39) Na-echeta mgbe niile na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na o nweghị ihe ga-eme ka ọ gbakụta gị azụ.

Ọ BỤRỤ NA A KPỌRỌ ONYE NKE IKPEAZỤ N’IME NDỊ E TERE MMANỤ GAA ELUIGWE,

  • olee ihe na-agaghị eme?

  • gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na a gaghị emebi ezigbo ofufe?

  • olee ihe mere obi nwere ike iji sie anyị ike na Jehova ga-elekọta ndị ya?

ABỤ NKE 8 Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị