Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 7

ABỤ NKE 51 Anyị Nyefere Chineke Onwe Anyị

Ihe Ndị Anyị Ga-amụta n’Aka Ndị Naziraịt

Ihe Ndị Anyị Ga-amụta n’Aka Ndị Naziraịt

“Ọ bụụrụ Jehova onye dị nsọ n’oge niile ọ bụ onye Naziraịt.”​—ỌNỤ ỌGỤ. 6:8.

IHE A GA-AMỤ

Otú ihe ndị Naziraịt mere ga-esi enyere anyị aka inwe obi ike na ịhapụ ihe ụfọdụ iji fee Jehova.

1. Olee àgwà magburu onwe ya ndị Jehova na-akpa kemgbe ụwa?

 Ì JI adịm ná mma gị na Jehova kpọrọ ezigbo ihe? O doro anya na i ji ya kpọrọ ihe. Ọ bụghị naanị gị mere otú ahụ. Kemgbe oge ochie, ọtụtụ ndị na-eme otú ahụ. (Ọma 104:33, 34) Ọtụtụ ndị ahapụla ihe ụfọdụ iji fee Jehova nke ọma. Ọ bụkwa ihe a ka ndị nọ n’Izrel oge ochie a na-akpọ ndị Naziraịt mere. Ole ndị ka ha bụ? Gịnịkwa ka anyị ga-amụta n’aka ha?

2. (a) Olee ndị bụ́ ndị Naziraịt? (Ọnụ Ọgụgụ 6:1, 2) (b) Gịnị mere ụfọdụ ndị Izrel ji kpebie ịbụ ndị Naziraịt?

2 Okwu Hibru a sụgharịrị “Naziraịt” pụtara “Onye E Wepụtara Iche” ma ọ bụ “Onye E Nyefere Chineke.” E ji okwu a kọwaa ndị Izrel ụfọdụ gbanwere ọtụtụ ihe ná ndụ ha iji fee Chineke n’ụzọ pụrụ iche. N’Iwu Mosis, nwoke ma ọ bụ nwaanyị nwere ike ikpebi ikwe Jehova nkwa pụrụ iche na ọ ga-abụ onye Naziraịt ruo oge ụfọdụ. a (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 6:1, 2.) Nkwa ahụ pụtara na ọ ga-edebe iwu ụfọdụ ọ na-adịghị mkpa ka ndị Izrel ndị ọzọ debe. Gịnịzi nwere ike ime ka onye Izrel họrọ ịbụ onye Naziraịt? Ọ ga-abụ ezigbo ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ na obi ụtọ o nwere maka ngọzi niile Jehova gọziri ya.​—Diut. 6:5; 16:17.

3. Olee otú ndị Chineke taa si yie ndị Naziraịt?

3 Nhazi Chineke mere ka a na-enwe ndị Naziraịt kwụsịrị mgbe e ji “iwu Kraịst” dochie Iwu Mosis. (Gal. 6:2; Rom 10:4) Ma, dịkwa ka ndị Naziraịt, ndị Jehova taa na-egosi na ha chọsiri ike iji obi ha niile na mkpụrụ obi ha niile na uche ha niile na ike ha niile na-efe Jehova. (Mak 12:30) Anyị na-esi n’obi anyị ekwe Jehova nkwa ime otú ahụ mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe anyị kwere ná nkwa ahụ, anyị kwesịrị ịdị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ ka anyị nwee ike fee Jehova. Ka anyị na-eleba anya n’otú ndị Naziraịt si emezu nkwa ha kwere, anyị ga-amụta ihe dị mkpa gbasara otú anyị ga-esi emezu nkwa anyịnwa kwere. b (Mat. 16:24) Ka anyị leba anya n’ihe atụ ụfọdụ.

DỊRỊ NJIKERE ỊHAPỤ IHE ỤFỌDỤ

4. Dị ka e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 6:3, 4, olee ihe nwere ike ime ka o siere mmadụ ike imezu nkwa ya ịbụ onye Naziraịt?

4 Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 6:3, 4. Ndị Naziraịt na-ezere ịṅụ mmanya ọ bụla na-aba n’anya nakwa ihe ọ bụla si n’osisi vaịn, dị ka mkpụrụ vaịn na achịcha e ji ya mee. Ọ ga-abụ na ndị nọ ha gburugburu na-eji ihe ndị a eme onwe ha obi ụtọ ọtụtụ mgbe, ebe ọ bụkwanụ na ha adịghị njọ. Baịbụl kwuru na mmanya bụ onyinye si n’aka Chineke, nakwa na ọ “na-eme ka obi tọọ mmadụ ụtọ.” (Ọma 104:14, 15) Ma, ndị Naziraịt ji obi ha niile kweta izere ha n’agbanyeghị na ihe ndị ahụ nwere ike ime ka ndụ na-atọ ha ụtọ. c

Ị̀ dị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ iji fee Jehova dị ka ndị Naziraịt? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo na nke 6)


5. Gịnị ka Nwanna Madián na nwunye ya Marcela kpebiri ịhapụ? Maka gịnị?

5 Dị ka ndị Naziraịt, anyịnwa taa na-ahapụkwa ihe ụfọdụ ka anyị nwee ike jiri oge buru ibu na-efe Jehova. Legodị akụkọ Nwanna Madián na Marcela nwunye ya. d Di na nwunye a bara ọgaranya. Nwanna Madián na-arụ ezigbo ọrụ nke mere ka ha biri n’ụlọ mara mma. Ma, ha chọrọ ijikwu oge ha na-ejere Jehova ozi. N’ihi ya, ha kpebiri ịgbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ ha. Nwanna Madián na nwunye ya sịrị: “Anyị malitere iselata aka n’otú anyị si emefu ego. N’ihi ya, anyị kwagara n’ụlọ dị obere karịa nke mbụ anyị nọ, reekwa ụgbọala anyị.” Ọ bụghị iwu na nwanna a na nwunye ya ga-eme ihe ndị a ha mere. Ma, ha kpebiri ime ya n’ihi na o mere ka ọ dịrị ha mfe iji oge bukwuru ibu na-ejere Jehova ozi. Obi dị ha ụtọ na ha mere ihe ndị a. Ihe ha mere jukwara ha afọ.

6. Gịnị mere Ndị Kraịst taa ji ahapụ ihe ụfọdụ iji fee Chineke? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

6 Ọ na-atọ Ndị Kraịst taa ụtọ ịhapụ ihe ụfọdụ ka ha nwee ike iwepụtakwu oge na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. (1 Kọr. 9:3-6) Jehova enyeghị anyị iwu ka anyị hapụ ihe ndị ahụ. Ihe ndị ahụ adịghịkwa njọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ekpebiela ịhapụ ibi n’ụlọ ha gaara achọ ibi, ịrụ ọrụ ha gaara achọ ịrụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. Ụfọdụ ndị ekpebiekwala ka ha cheretụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ tupu ha amụọ nwa. Ụfọdụ kpebiri ịga ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ime otú ahụ nwere ike ime ka ha gaa biri n’ebe dị anya n’ebe ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha nọ. Ọtụtụ n’ime anyị na-eji obi anyị ahapụ ihe ndị a n’ihi na anyị chọrọ inye Jehova ihe kacha mma anyị nwere. Ka obi sie gị ike na Jehova ji ihe ọ bụla ị hapụrụ iji fee ya kpọrọ ihe, ma ihe ahụ ò buru ibu ma ọ̀ dị ntakịrị.​—Hib. 6:10.

DỊRỊ NJIKERE ỊNỌPỤ ICHE

7. Olee ihe mere o nwere ike iji esiri ụfọdụ ndị Naziraịt ike imezu nkwa ha? (Ọnụ Ọgụgụ 6:5) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

7 Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 6:5. Ndị Naziraịt na-ekwe nkwa na ha agaghị akpụ isi ha. Ihe a bụ ihe na-egosi na ha ji obi ha niile na-erubere Jehova isi. Ọ bụrụ na onye Izrel ekpebie ịbụ onye Naziraịt ruo ogologo oge, isi ya ga-eto, ya adịkwa mfe ndị ọzọ ịhụ ya. Ọ bụrụ na ndị nọ ya gburugburu akwado mkpebi o mere ịbụ onye Naziraịt, o nwere ike ọ gaghị esiri ya ike. Ma, ọ dị mwute na e nwere oge ụfọdụ ndị Izrel na-ejighị ndị Naziraịt kpọrọ ihe ma ọ bụkwanụ kwado ha. N’oge Emọs onye amụma, ndị Izrel si n’ezi ofufe dapụ “nọ na-enye ndị Naziraịt mmanya ka ha ṅụọ.” Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji na-eme ya bụ ka ndị Naziraịt mebie nkwa ha kwere na ha agaghị aṅụ mmanya. (Emọs 2:12) N’oge ụfọdụ, onye Naziraịt ga-akatarịrị obi ka o nwee ike imezu nkwa o kwere nakwa ka o nwee ike ịdị iche ná ndị ọzọ.

Onye Naziraịt kpebisiri ike imezu nkwa ya na-adị njikere ịnọpụ iche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)


8. Gịnị gbara gị ume n’akụkọ Nwanna Benjamin?

8 N’enyemaka Jehova, anyịnwa nwekwara ike ịkata obi ka anyị nwee ike ịdị iche ọ bụrụgodị na anyị bụ ndị ụjọ ma ọ bụ ndị ihere. Legodị akụkọ Nwanna Benjamin bi na Nọọwee. Ọ dị afọ iri. Ndị ụlọ akwụkwọ ha nwere ememme ha mere iji gosi na ha na-akwado ndị nọ na Yukren, bụ́ ebe a na-alụ agha. A gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha yiri uwe na-acha ụcha e ji mara mba Yukren bụọ abụ. Nwanna Benjamin kpebiri na ya agaghị eso ha eme ihe a. N’ihi ya, ọ gara nọrọ ebe dị anya n’ebe ha na-eme ememme ahụ. Ma, otu onye nkụzi ha hụrụ ya ma jiri oké olu kpọọ ya, sị: “Bịa ebe a soro anyị. Anyị niile na-eche gị!” Benjamin katara obi ma gakwuru onye nkụzi ya, sị: “Adị m iche, anaghịkwa m eso eme ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ Ndịàmà Jehova nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị aga agha.” Onye nkụzi ha kwetara ihe a o kwuru ma hapụ ya ka ọ gawa. Ma, ụmụ klas ha malitere ịjụ ya ihe mere na o sonyereghị ha. Ezigbo ụjọ malitere ịtụ Benjamin, ya achọọ ibe ákwá. Ma, ọ katara obi kọwaara ụmụ klas ha ihe ọ gwara onye nkụzi ha. Mgbe e mechara, Nwanna Benjamin gwara ndị mụrụ ya na ya chọpụtara na Jehova nyeere ya aka ịgwa ndị mmadụ ihe o kweere.

9. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka obi Jehova ṅụrịa?

9 Ebe ọ bụ na anyị kpebiri ime uche Jehova, anyị dị iche ná ndị nọ gburugburu anyị. Anyị kwesịrị ịkata obi iji gwa ndị ọrụ ibe anyị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ihe ọzọ bụkwa na ebe ọ bụ na àgwà ndị mmadụ na-eretọ kwa ụbọchị, o nwere ike isiri anyị ezigbo ike ime ihe Baịbụl kwuru nakwa ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. (2 Tim. 1:8; 3:13) Ma, na-echeta mgbe niile na anyị ‘na-eme Jehova obi ụtọ’ ma anyị kata obi dịrị iche ná ndị na-anaghị efe ya.​—Ilu 27:11; Mal. 3:18.

BUTE JEHOVA ỤZỌ NÁ NDỤ GỊ

10. Gịnị mere o nwere ike iji siere ndị Naziraịt ike ime ihe dị n’Ọnụ Ọgụgụ 6:6, 7?

10 Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 6:6, 7. Ndị Naziraịt anaghị aga ozu nso. Anyị lee ya anya elu elu, o nwere ike iyi ka e nweghị oké ihe ọ bụ. Ma n’oge e dere Baịbụl, ọ na-esiri onye Naziraịt ike ime ihe a ma onye ikwu ya nwụọ. N’oge ahụ, ọ na-abụkarị omenala ndị mmadụ ịnọ ozu onye ha nwụrụ anwụ nso. (Jọn 19:39, 40; Ọrụ 9:36-40) Ma, nkwa onye Naziraịt kwere agaghị ekwe ya mee ihe ahụ. Ọ bụrụgodị na onye ezinụlọ onye Naziraịt anwụọ, o kwesịrị igosi na o nwere okwukwe siri ike ma mezuo nkwa o kwere. Jehova mere ka ndị ohu ya ndị a dị ike, mee ka ha nwee ike idi ihe ndị ahụ siri ike.

11. Gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ikpebisi ike ime mgbe ọ na-ekpebi ihe gbasara ezinụlọ ya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị ejighị nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị nyefere ya onwe anyị egwu egwu. Ihe a na-agbasakwa ihe anyị na-eme n’ihe gbasara ndị ezinụlọ anyị. Anyị na-agbasi mbọ ike ilekọta ndị ezinụlọ anyị. Ma, anyị anaghị ebute ihe gbasara ndị ezinụlọ anyị ụzọ kama ibute nke Jehova. (Mat. 10:35-37; 1 Tim. 5:8) Mgbe ụfọdụ, ime ihe a pụtara na anyị ga-eme mkpebi na-agaghị adị ndị ezinụlọ anyị mma iji mee Jehova obi ụtọ.

Ị̀ dị njikere ibute ime uche Jehova ụzọ ma n’oge ihe siri ike? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) e


12. Mgbe Nwanna Alexandru na-ekpebi ihe siri ike ọ ga-eme n’ezinụlọ ya, gịnị ka o mere, gịnị ka ọ na-emeghị?

12 Ka anyị lee akụkọ Nwanna Alexandru na nwunye ya Dorina. Mgbe ha mụchara Baịbụl otu afọ, nwunye ya kwụsịrị, chọọkwa ka di ya kwụsị. Ma, Nwanna Alexandru weturu obi ma jiri akọ gwa ya na ya agaghị akwụsị ịmụ Baịbụl. Ihe a were nwunye ya iwe, ya agbalịakwa ịmanye ya ka ọ kwụsị ịmụ Baịbụl. Nwanna Alexandru sịrị na ọ gbalịrị ike ya ịghọta ihe mere obi ji dị nwunye ya otú ahụ. Mana ọ dịghịrị ya mfe. N’oge ụfọdụ, nwunye ya katọọ ya ma gwa ya okwu ọjọọ, ọ na-adị ya ka ya kwụsị ịmụ Baịbụl. Ma, Nwanna Alexandru nọsiri ike na-ebute ihe gbasara ofufe Jehova ụzọ. Ma, ọ na-egosikwa nwunye ya na ọ hụrụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. Ihe a mere ka nwunye ya malitekwa ịmụ Baịbụl, mechaakwa mee baptizim.​—Gaa na jw.org lee vidio isiokwu ya bụ Alexandru Văcar na Dorina Nwunye Ya: Ịhụnanya Nwere Ogologo Ntachi Obi na Obiọma n’isiokwu bụ́ “Eziokwu Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ.”

13. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ Jehova na ndị ezinụlọ anyị n’anya?

13 Ọ bụ Jehova hiwere ezinụlọ. Ọ chọkwara ka anyị na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. (Efe. 3:14, 15) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwe obi ụtọ, anyị kwesịrị ịna-eme ihe Jehova chọrọ. Ka obi sie gị ike na Jehova ji mbọ ị na-agba na ihe ndị ị na-ahapụ iji fee ya kpọrọ ihe. Mbọ ị na-agba ilekọta ezinụlọ gị nakwa igosi ha na ị hụrụ ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù na-atọkwa Jehova ezigbo ụtọ.​—Rom 12:10.

KA ANYỊ NA-AGBA IBE ANYỊ UME ỊDỊ KA NDỊ NAZIRAỊT

14. Olee ndị anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-agwa okwu na-agba ume karịchaa?

14 Ndị niile kpebiri ife Jehova taa kwesịrị ịdị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ n’ihi otú ha si hụ Jehova n’anya. Mgbe ụfọdụ, ime ihe a anaghị adị mfe. Olee otú anyị ga-esi nyere ibe anyị aka ịhapụ ihe ụfọdụ maka Jehova? Ọ bụ ịna-agwa ibe anyị okwu na-agba ume. (Job 16:5) È nwere ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ unu na-agbalị ịhapụ ihe ụfọdụ ha na-eme ka ha nwee ike wepụtakwuo oge na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova? Ị̀ ma ụfọdụ ndị na-eto eto na-akata obi na-anọpụ iche n’ụlọ akwụkwọ ha, ọ bụ eziokwu na ọ naghị adịrị ha mfe ime otú ahụ? È nwere ụfọdụ ndị a na-amụrụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ ụmụnna anyị ndị ọ na-esiri ike ịnọsi ike n’ofufe Jehova n’ihi mmegide ndị ezinụlọ ha na-emegide ha? Ka anyị jiri ohere ọ bụla dapụtaara anyị na-agwa ụmụnna ndị a anyị hụrụ n’anya anyị na ha na-efekọ Jehova okwu ga-agba ha ume, na-egosi ha na obi dị anyị ụtọ maka otú ha si ahapụ ihe ụfọdụ nakwa otú ha si akata obi.​—Faị. 4, 5, 7.

15. Olee otú ụfọdụ ndị sirila kwado ndị nọ n’ozi oge niile?

15 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike inyere ụmụnna anyị nọ n’ozi oge niile aka. (Ilu 19:17; Hib. 13:16) Ọ bụ ihe a ka otu nwanna nwaanyị mere agadi bi na Siri Lanka chọsiri ike ime mgbe e tinyekwuru ego n’ego ezumike nká ya. Ọ chọrọ inyere ụmụnna nwaanyị abụọ na-asụ ụzọ aka ka ha nọgide n’ọrụ ọsụ ụzọ ha n’obodo ha ihe siri ezigbo ike. N’ihi ya, o kpebiri iwepụta ego ụfọdụ ọ ga-eji na-akwụrụ ha ego ha na-emefu na telefon kwa ọnwa. Ihe a nwanna nwaanyị a mere magburu onwe ya.

16. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị Naziraịt oge ochie?

16 N’eziokwu, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe mara ezigbo mma n’aka ndị Naziraịt oge ochie wepụtara onwe ha ijere Jehova ozi. Ma, ileba anya n’akụkọ ndị Naziraịt na-akụziri anyị ihe ọzọ gbasara Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova. Obi siri ya ike na anyị chọrọ ime ya obi ụtọ nakwa na anyị dị njikere ịhapụ ihe ọ bụla ọ dị mkpa ka anyị hapụ iji mezuo nkwa anyị kwere ya mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. Ọ na-akwanyere anyị ùgwù na-ahapụ anyị ka anyị jiri aka anyị kpebie ụzọ anyị ga-esi gosi ya na anyị hụrụ ya n’anya. (Ilu 23:15, 16; Mak 10:28-30; 1 Jọn 4:19) Ndokwa Chineke mere ka e nwee ndị Naziraịt na-egosi na Jehova na-ahụ ihe ọ bụla anyị hapụrụ iji fee ya nakwa na o ji ya kpọrọ ihe. Ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị akwụsị ife Jehova, dịrịkwa njikere inye ya ihe kacha mma anyị nwere.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú ndị Naziraịt si kata obi ma hapụ ihe ụfọdụ iji fee Jehova?

  • Olee otú anyị nwere ike isi na-agba ibe anyị ume taa ịdị ka ndị Naziraịt?

  • Gịnị ka ndokwa Chineke mere ka e nwee ndị Naziraịt na-egosi na Jehova nwere obi ike na ya gbasara ndị na-efe ya?

ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

a Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Jehova ji aka ya họpụta ụfọdụ ndị Naziraịt, ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Izrel ji aka ha wepụta onwe ha ịbụ ndị Naziraịt.​—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ndị Naziraịt Jehova Ji Aka Ya Họpụta.”

b Mgbe ụfọdụ, akwụkwọ anyị na-eji ndị Naziraịt atụnyere ndị nọ n’ozi oge niile. Ma, n’isiokwu a, anyị ga-elekwasị anya n’otú onye ọ bụla nyefere Jehova onwe ya nwere ike isi eme ka ndị Naziraịt.

c O yiri ka e nweghị ọrụ ọzọ e nyere ndị Naziraịt ha ga-arụ iji mezuo nkwa ha.

d Gaa na jw.org n’isiokwu bụ́ “Anyị Kpebiri Ilegide Anya Otu Ebe.” Ọ gbara n’isiokwu bụ́ “Akụkọ Gbasara Ndịàmà Jehova.”

e NKỌWA FOTO: Ebe onye Naziraịt nọ n’elu ụlọ ya na-ele ebe e bu onye ezinụlọ ya ọ hụrụ n’anya na-aga ili. Nkwa o kwere Jehova mere ka ọ ghara ịgaru nso ebe ahụ.