Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwee Obi Ụtọ Ka I Ji Ndidi Na-echere Jehova

Nwee Obi Ụtọ Ka I Ji Ndidi Na-echere Jehova

Ị̀ NA-ATỤ anya ịhụ mgbe Jehova ga-ewepụ ihe ọjọọ niile ma mee ka ihe niile dị ọhụrụ? (Mkpu. 21:1-5) O doro anya na ị na-atụ anya ya. Ma, ọ naghị adị mfe mgbe niile inwe ndidi ma chere Jehova, karịchaa, ma nsogbu bịara anyị. Ọ bụrụ na ihe anyị na-atụ anya ya abịaghị ozugbo ozugbo, o nwere ike ime ka ike gwụ anyị.​—Ilu 13:12.

Ma, Jehova chọrọ ka anyị nwee ndidi ma chere ya ka o mee ihe mgbe oge ya ruru. Gịnị mere o ji chọọ ka anyị chere ya? Gịnị ga-enyere anyị aka iji obi ụtọ na-echere ya?

GỊNỊ MERE JEHOVA JI CHỌỌ KA ANYỊ CHERE?

Baịbụl kwuru, sị: “Jehova na-enwere unu ndidi ka o meere unu amara. Ọ gaghịkwa agba nkịtị. Ọ ga-emere unu ebere. Jehova bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị niile na-atụ anya ya na-enwe obi ụtọ.” (Aịza. 30:18) Ndị Aịzaya gwara ihe a bụ ndị Juu dị isi ike. (Aịza. 30:1) Ma, e nwere ụfọdụ ndị Juu ji obi ha niile na-efe Jehova. Ihe ahụ Aịzaya kwuru mere ka ha nwee olileanya. Ọ na-emekwa ka ndị ji obi ha niile na-efe Jehova taa nwee olileanya.

N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe ndidi ma chere n’ihi na Jehova na-enwe ndidi ma na-echere. O kpebiela mgbe ọ ga-ebibi ụwa ochie a. Ọ na-echekwa ka ụbọchị ahụ na awa ahụ ruo. (Mat. 24:36) N’oge ahụ, ọ ga-edo anya nke ọma na ebubo niile Setan boro Jehova na ndị na-efe ya bụ ụgha. Jehova ga-ebibizi Setan na ndị ọ bụla na-akwado ya. Ma, “ọ ga-emere [anyị] ebere.”

Ka ọ dị ugbu a, Jehova nwere ike ọ gaghị ewepụrụ anyị nsogbu ndị na-abịara anyị, ma ọ na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-enweli obi ụtọ ka anyị na-echere ya. Dị ka Aịzaya kwuru, anyị nwere ike inwe obi ụtọ mgbe anyị na-atụ anya ihe ọma ndị ga-emenụ. (Aịza. 30:18) a Olee otú anyị ga-esi na-enwe ụdị obi ụtọ ahụ? E nwere ihe anọ ga-enyere anyị aka.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ MGBE ANYỊ NA-ECHERE JEHOVA

Na-eche banyere ihe ọma ndị na-eme ná ndụ gị. Eze Devid hụrụ ọtụtụ ihe ọjọọ mere mgbe ọ dị ndụ. (Ọma 37:35) Ma, o dere, sị: “Gba nkịtị n’ihu Jehova, na-atụsikwa anya ya ike. Ewerela onye na-akpa nkata ọjọọ iwe maka na nkata ọ na-akpa na-agaziri ya.” (Ọma 37:7) Devid mere ihe a o kwuru mgbe o lekwasịrị anya ná nkwa Jehova kwere ịzọpụta ya. Obi dịkwa ya ezigbo ụtọ maka ihe ọma niile Jehova meere ya. (Ọma 40:5) Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ihe ọma ndị na-eme ná ndụ anyị ma ghara ịna-eche banyere nsogbu ndị e nwere gburugburu anyị, ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-echere Jehova.

Jiri ohere ọ bụla na-eto Jehova. O nwere ike ịbụ na ọ bụ Devid dere Abụ Ọma 71. Ọ sịrị Jehova: “M ga na-echere gị. M ga-etokwu gị.” (Ọma 71:14) Olee otú ọ ga-esi na-eto Jehova? Ọ ga na-akọrọ ndị ọzọ banyere Jehova ma na-abụku ya abụ otuto. (Ọma 71:16, 23) Dị ka Devid, anyị ka nwere ike ịna-enwe ọṅụ mgbe anyị na-echere Jehova. Anyị na-eto Jehova n’ozi anyị, ná mkparịta ụka anyị na ndị mmadụ na-enwe kwa ụbọchị, nakwa n’abụ anyị na-abụ mgbe anyị na-efe ya. Oge ọzọ ị ga-abụ abụ Alaeze, ọ ga-adị mma ka i chee echiche nke ọma banyere ihe ndị na-agba ume e kwuru n’abụ ahụ.

Kwe ka ụmụnna gị na-agba gị ume. Mgbe nsogbu bịaara Devid, ọ sịrị Jehova, “M ga-anọ n’ihu ndị na-erubere gị isi gosi na m tụkwasịrị obi n’aha gị.” (Ọma 52:9) Anyịnwa nwekwara ike inweta agbamume n’aka ndị anyị na ha na-efekọ Jehova, ọ bụghị naanị n’ọmụmụ ihe na n’ozi ọma, kamakwa, mgbe anyị na ha na-anọrị.​—Rom 1:11, 12.

Mee ka olileanya gị sikwuo ike. Abụ Ọma 62:5 sịrị: “M nwere ndidi, na-echere Chineke, n’ihi na ọ bụ ya na-eme ka m nwee olileanya.” Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị nwee olileanya siri ike, karịchaa ma ọ bụrụ na ọgwụgwụ ụwa ochie abịaghị mgbe anyị tụrụ anya na ọ ga-abịa. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa ya nille n’agbanyeghị afọ ole anyị nwere ike iche ka ha mezuo. Anyị nwere ike ime ka olileanya anyị sikwuo ike ma ọ bụrụ na anyị ana-amụ Babụl, ya bụ, amụma ndị dị na ya, ihe ndị gosiri na ihe ndị e dere na ya bụ otu, nakwa ihe dị iche iche Jehova mere ka anyị mata gbasara onwe ya. (Ọma 1:2, 3) Anyị kwesịkwara ịna-ekwe ‘ka mmụọ nsọ na-edu anyị mgbe anyị na-ekpe ekpere’ ka anyị na Jehova na-adị ná mma ka anyị nọ na-eche ka o mezuo nkwa ndụ ebighị ebi o kwere anyị.​—Jud 20, 21.

Dị ka Eze Devid, ka obi sie gị ike na anya Jehova dị n’ebe ndị na-echere ya nọ. Ọ na-egosikwa na ọ hụrụ ha n’anya. (Ọma 33:18, 22) Nwee ndidi ma na-echere Jehova. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-eche banyere ihe ọma ndị na-eme ná ndụ gị, ịna-eto Chineke, ikwe ka ụmụnna gị na-agba gị ume, nakwa ịna-eme ka olileanya magburu onwe ya i nwere na-esikwu ike.

a Okwu Hibru e si sụgharịta “na-atụ anya” nwekwara ike ịpụta “ịtụsi anya ike ka ihe mee.” Ọ na-egosi na ọ bụghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị na-atụsi anya ike ka Chineke zọpụta anyị.