Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Abụọ A Họpụtara Ọhụrụ Ka Ha Soro n’Òtù Na-achị Isi

Mmadụ Abụọ A Họpụtara Ọhụrụ Ka Ha Soro n’Òtù Na-achị Isi

NA WENEZDEE, abalị iri na asatọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2023, a mara ọkwa pụrụ iche na jw.org na a họpụtala Nwanna Gage Fleegle na Nwanna Jeffrey Winder ka ha soro n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ha abụọ efeela Jehova ruo ọtụtụ afọ.

Nwanna Gage Fleegle na nwunye ya Nadia

A mụrụ Nwanna Fleegle n’ebe ọdịda anyanwụ Pensụlvenịa dị n’Amerịka. Ndị mụrụ ya bụ Ndịàmà Jehova. Mgbe ọ ka na-eto eto, ezinụlọ ha kwagara otu ime obodo a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Obere oge ha kwafechara ebe ahụ, o mere baptizim n’abalị iri abụọ n’ọnwa Nọvemba, afọ 1988.

Nne na nna Nwanna Fleegle na-agba ya ume mgbe niile ka ọ banye ozi oge niile. Ha na-akpọkarị ndị nlekọta sekit na ndị na-eje ozi na Betel ka ha bịa n’ụlọ ha. Nwanna Fleegle hụkwara na ụmụnna ndị a na-enwe obi ụtọ. O teghị anya o mechara baptizim, ya amalite ịsụ ụzọ n’abalị mbụ n’ọnwa Septemba afọ 1989. Mgbe afọ abụọ gachara, o mere ihe o kpebiri ime kemgbe ọ dị afọ iri na abụọ, ya bụ, ije ozi na Betel. Ọ malitere ije ozi na Betel dị na Bruklin n’ọnwa Ọktoba afọ 1991.

Na Betel, Nwanna Fleegle rụrụ n’ebe a na-ekwe akwụkwọ ruo afọ asatọ. E mechara gwa ya ka ọ rụwa ná Ngalaba Ije Ozi. N’oge ahụ, ọ nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ Rọshịan amụ ihe ruo afọ ụfọdụ. N’afọ 2006, ọ lụrụ nwunye ya bụ́ Nadia. O sokwa ya jewe ozi na Betel. Ha abụọ nọrọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ Pọtugiiz amụ ihe, nọọkwa ihe karịrị afọ iri n’ọgbakọ na-eji Spanish amụ ihe. Mgbe Nwanna Fleegle rụchara ná Ngalaba Ije Ozi ruo ọtụtụ afọ, a gwara ya ka ọ na-arụ n’Ọfis Kọmitii Izi Ihe, mechaakwa sị ya rụwa n’Ọfis Kọmitii Ije Ozi. N’ọnwa Mach afọ 2022, a họpụtara ya ka o soro ná ndị na-enyere Kọmitii Ije Ozi nke Òtù Na-achị Isi aka.

Nwanna Jeffrey Winder na nwunye ya Angela

Nwanna Winder toro na Murieta dị na Kalịfọnịa, Amerịka. Nne na nna ya bụ Ndịàmà Jehova. O mere baptizim n’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Mach afọ 1986. N’ọnwa na-eso ya, o kpebiri ịsụ ụzọ inyeaka. Ọ tọrọ ya ụtọ nke na ọ chọrọ ịsụrụ ụzọ inyeaka na-aga. Mgbe ọ rụchara ọsụ ụzọ inyeaka ruo ụfọdụ ọnwa, ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile n’abalị mbụ n’ọnwa Ọktoba afọ 1986.

Mgbe Nwanna Winder ka na-eto eto, ọ gara leta ụmụnne ya abụọ tọrọ ya na-eje ozi na Betel n’oge ahụ. O mere ka ọ chọọ ije ozi na Betel ma o tolite. N’ọnwa Mee afọ 1990, a kpọrọ ya ka o jewe ozi na Betel dị na Wọlkil.

Na Betel, Nwanna Winder jere ozi n’ọtụtụ ngalaba. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ngalaba Na-ahụ Maka Ihicha Ihe, Ngalaba Na-ahụ Maka Ọrụ Ugbo na Ịkpa Ụmụ Anụmanụ, na Ọfịs Na-elekọta Ezinụlọ Betel. Ọ lụrụ nwunye ya bụ́ Angela n’afọ 1997. Ha abụọ ka na-eje ozi na Betel kemgbe ahụ. N’afọ 2014, e zigara ha Wọwik, ebe Nwanna Winder nyere aka n’ịrụ isi ụlọ ọrụ anyị. N’afọ 2016, ha gafere n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, ebe Nwanna Winder rụrụ ọrụ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Vidio na Ihe Ndị A Na-egere Egere. Mgbe afọ anọ gachara, e zighachikwara ha Wọwik. Nwanna Winder malitere ịrụ ọrụ n’Ọfis Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Na-arụ Ọrụ na Betel. N’ọnwa Mach afọ 2022, a họpụtara ya ka o soro ná ndị na-enyere Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Na-arụ Ọrụ na Betel nke Òtù Na-achị Isi aka.

Ekpere anyị bụ ka Jehova gọzie ụmụnna ndị a bụ́ “onyinye” ka ha na-arụsi ọrụ ike n’ịkwado Alaeze Chineke.​—Efe. 4:8.