Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ihe Baịbụl kwuru gbasara Jehova ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu?

Baịbụl mere ka o doo anya na Jehova nwere ike ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. (Aịza. 45:21) Mana, ọ kọwaghị ihe niile gbasara otú o si eme ya, mgbe ọ na-eme ya, ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọ na-ahọrọ ịma. N’ihi ya, anyị amaghị ihe niile gbasara otú Jehova si ama ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma, e nwere ihe ụfọdụ anyị ma.

Jehova ga-emeli ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Ma mgbe ụfọdụ, ọ na-eji aka ya ahọrọ ihe ụfọdụ ọ na-agaghị eme. Ebe ọ bụ na Jehova nwere amamihe na-enweghị atụ, o nwere ike ịmata ihe ọ bụla ọ chọrọ ga-eme n’ọdịnihu. (Rom 11:33) Ebe ọ bụ Jehova kacha ejide onwe ya, o nwekwara ike ikpebi na ya agaghị ama ihe ga-eme.​—I nwere ike ịtụle Aịzaya 42:14.

Jehova na-eme ka uche ya mee. Olee otú ihe a si enyere anyị aka ịmata otú Jehova nweruru ike ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu? Aịzaya 46:10 sịrị: “Ọtụtụ afọ tupu ihe ga-eme emee, m na-ekwu na ọ ga-eme. Ọtụtụ afọ tupu e mee ihe a na-emebeghị, m na-ekwu na a ga-eme ya. M na-asị, ‘Ihe m kpebiri ga-emerịrị, m ga-emekwa ihe ọ bụla dị mụ mma.’”

N’ihi ya, otu ihe mere Jehova nwere ike iji ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu bụ na o nwere ike ime ka ihe mee. Ọ dịghị mkpa ka Jehova chọpụta ihe ga-eme n’ọdịnihu otú ahụ anyị na-eme mgbe ụfọdụ ma anyị lewe fim, anyị eburu ụzọ gaa lee ihe mere n’ebe ngwụcha ya. Kama, Jehova nwere ike ikpebi ihe ga-eme n’oge a kara aka, ya emeekwa ka ihe ahụ mezuo mgbe oge ahụ ruru.​—Ọpụ. 9:5, 6; Mat. 24:36; Ọrụ 17:31.

Ọ bụ ya mere Baịbụl ji eji okwu dị ka “zubere” akọwa ihe Jehova na-eme n’ihe gbasara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. (2 Eze 19:25; Aịza. 46:11) Okwu Hibru e si sụgharịta okwu a gbasara okwu pụtara “ọkpụite.” (Jere. 18:4) Otú ahụ onye bụ́ aka ochie n’ịkpụ ite nwere ike iji ụrọ kpụọ ite mara ezigbo mma, Jehova nwekwara ike ime ka ihe mee iji mezuo uche ya.​—Efe. 1:11.

Jehova na-ahapụ ndị mmadụ ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-eme. Ọ naghị ekpebiri onye nke ọ bụla ihe ga-eme ná ndụ ya. Ọ naghịkwanụ eme ka ndị ezigbo mmadụ mee ihe ga-eme ka e bibie ha. Ọ na-ahapụ mmadụ niile ka ha jiri aka ha kpebie ụdị ndụ ha ga-ebi. Ma, ọ na-agba ha ume ka ha kpebie ime ihe dị mma.

Ka anyị lee ihe atụ abụọ. Nke mbụ bụ gbasara ndị bi na Ninive. Jehova kwuru na a ga-ebibi obodo ahụ n’ihi omume ọjọọ ha. Ma mgbe ndị bi n’obodo ahụ chegharịrị, Jehova “gbanwere obi ya banyere ọdachi ahụ o kwuru na ya ga-eme ka ọ dakwasị ha. O wetaghịzi ya.” (Jona 3:1-10) Jehova gbanwere obi ya gbasara ihe o kwuru na ọ ga-eme ndị Ninive n’ihi na ha kpebiri ichegharị mgbe ọ dọrọ ha aka ná ntị.

Nke abụọ bụ amụma e buru gbasara ọchịagha aha ya bụ Saịrọs. E buru amụma na ọ ga-atọhapụ ndị Juu a dọọrọ n’agha ka ha nwee ike ịga rụghachi ụlọ nsọ Jehova. (Aịza. 44:26–45:4) Saịrọs bụ́ eze Peshia mezuru amụma ahụ. (Ezra 1:1-4) Ma, Saịrọs efeghị ezi Chineke. Jehova ji Saịrọs mezuo amụma ya. Mana, ọ manyeghị ya ife ya.​—Ilu 21:1.

N’eziokwu, ihe ndị a abụghị ihe niile Jehova na-echebara echiche mgbe ọ na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịghọtacha otú Jehova si eche echiche na otú o si eme ihe. (Aịza. 55:8, 9) Ma, ihe Jehova mere ka anyị mata gbasara onwe ya na-eme ka okwukwe anyị sie ike na ọ na-eme ihe dị mma mgbe niile, ma otú o si ekwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.