Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chọpụta Ihe Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ Dị n’Okwu Chineke Ga-abara Gị Uru

Chọpụta Ihe Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ Dị n’Okwu Chineke Ga-abara Gị Uru

IHE I NWERE IKE ỊMỤ

Chọpụta Ihe Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ Dị n’Okwu Chineke Ga-abara Gị Uru

Mgbe anyị na-agụ Baịbụl, anyị nwere ike ịchọpụta ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’Okwu Chineke ma anyị mee nchọnchọ na ha. Ma, olee otú ha ga-esi bakwuoro anyị uru?

Lebakwuo anya n’ihe ndị dị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, chọpụta onye dere amaokwu ahụ ị na-agụ, onye o degaara ya, na mgbe o ji dee ya. Gịnị gbara amaokwu ahụ ị na-agụ gburugburu, ya bụ, ihe mere tupu ihe ahụ ị na-agụ emee nakwa ihe ndị mere mgbe o mechara?

Chee gbasara ihe ndị i nwere ike ịmụta na ha. Otú ị ga-esi eme ya bụ ime nchọnchọ n’ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee otú obi dị ndị a kọrọ akụkọ ha n’ebe ahụ m gụrụ? Olee àgwà ndị ha kpara? Gịnị mere m kwesịrị iji eme ka ha ma ọ bụ ghara ịna-eme ka ha?’

Na-eme ihe ndị ị mụtara mgbe ị nọ n’ozi ọma ma ọ bụ mgbe gị na ndị mmadụ na-emekọ ihe. Ị na-eme ihe ndị a, ị ga-ama ihe otú Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu ma ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma unu na-eme ha.”​—Jọn 13:17.

• Ihe ga-enyere gị aka: N’ọmụmụ ihe etiti izu anyị, e nwere ebe a na-akpọ Akụ̀ Ndị Si n’Okwu Chineke. Chọpụta otú ihe dị ebe ahụ nwere ike isi nyere gị aka ịma otú ị ga-esi eme ihe ị gụrụ na Baịbụl. A na-enwe ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, ihe ndị anyị nwere ike ichebara echiche, nakwa foto ndị anyị nwere ike ịtụle.