Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 19

ABỤ NKE 22 Alaeze Chineke Na-achị​—Ya Bịawa

Olee Ihe Anyị Ma Gbasara Otú Jehova Ga-esi Kpee Ndị Mmadụ Ikpe n’Ọdịnihu?

Olee Ihe Anyị Ma Gbasara Otú Jehova Ga-esi Kpee Ndị Mmadụ Ikpe n’Ọdịnihu?

‘O nweghị onye Jehova chọrọ ka e bibie.’​—2 PITA 3:9.

IHE A GA-AMỤ

Ka obi sie anyị ike na ikpe Jehova ga-ekpe ndị mmadụ n’ọdịnihu ga-abụ ikpe ziri ezi.

1. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na anyị bi n’oge na-eme obi ụtọ?

 ANYỊ bi n’oge na-eme obi ụtọ. Kwa ụbọchị, anyị na-ahụ ka amụma ndị e buru na Baịbụl na-emezu. Dị ka ihe atụ, anyị na-ahụ ka “eze ugwu” na “eze ndịda” na-amarịta aka onye ga-achị ụwa niile. (Dan. 11:40) Anyị na-ahụ ka a na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke otú a na-ekwusatụbeghị ya, ọtụtụ nde mmadụ ana-anabata ya ma fewe Jehova. (Aịza. 60:22; Mat. 24:14) A na-ejikwa Okwu Chineke enyeju anyị afọ nke ọma “n’oge kwesịrị ekwesị.”​—Mat. 24:45-47.

2. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya? Ma, gịnị ka anyị kwesịrị ịmata?

2 Jehova ka na-enyekwara anyị aka ịghọtakwu ihe ndị dị mkpa ga-eme n’oge na-adịghị anya. (Ilu 4:18; Dan. 2:28) Ka obi sie anyị ike na mgbe oké mkpagbu ga-ebido, anyị ga-ama ihe niile anyị kwesịrị ịma nke ga-enyere anyị aka ịtachi obi ruo n’isi ma dịrị n’otu n’oge ahụ ga-esi ezigbo ike. Ma, anyị kwesịrị ịghọta na e nwere ihe ụfọdụ anyị na-amaghị gbasara ihe ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya. N’isiokwu a, anyị ga-ebu ụzọ kọwaa ihe mere anyị ji gbanwee ihe anyị kwuburu banyere ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ụfọdụ anyị ma banyere ọdịnihu na ihe Nna anyị nke eluigwe ga-eme.

IHE NDỊ ANYỊ NA-AMAGHỊ

3. Gịnị ka anyị kwuburu gbasara mgbe Jehova ga-emechi ụzọ ka ndị mmadụ ghara ịbịa sonyere anyị? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

3 N’oge gara aga, anyị kwuru na ozugbo oké mkpagbu malitere, Jehova agaghịzi ekwe ka ndị mmadụ kpebie ife ya ka ha nwee ike ịlafere Amagedọn. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na anyị chere na onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla e kwuru okwu ya n’akụkọ Iju Mmiri nwere ihe ọ na-anọchi anya ya n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, anyị chere na otú ahụ Jehova si mechie ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ tupu Iju Mmiri ebido ka ọ ga-emechi ụzọ ma oké mkpagbu malite ka ndị mmadụ ghara inwe ike ịhapụ ụwa Setan nwee okwukwe na Jehova ma soro ná ndị a ga-azọpụta.​—Mat. 24:37-39.

4. Ànyị ka na-ekwu na ihe niile gbasara Iju Mmiri nwere ihe ha nọchiri anya ha? Kọwaa.

4 Ànyị kwesịrị iche na ihe ọ bụla mere n’Iju Mmiri ahụ nwere ihe ọ na-anọchi anya ya ga-eme n’ọdịnihu? Azịza ya bụ mba. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl ekwughị otú ahụ. a Jizọs kwuru na oge ọnụnọ ya ga-adị ka “oge Noa.” Mana, o nweghị ihe o kwuru gosiri na ihe ọ bụla mere n’Iju Mmiri ahụ nwere ihe ọ na-anọchi anya ya ga-eme n’ọdịnihu. O kwughịkwanụ na mmechi Chineke mechiri ụgbọ Noa nwere ihe pụrụ iche ọ nọchiri anya ya ga-eme n’ọdịnihu. Ma, ihe a apụtaghị na e nweghị ihe anyị ga-amụtali n’ihe Baịbụl kọrọ banyere Noa na Iju Mmiri.

5. (a) Gịnị ka Noa mere tupu Iju Mmiri? (Ndị Hibru 11:7; 1 Pita 3:20) (b) Olee otú ozi ọma Noa kwusara si yie nke anyị na-ekwusa taa?

5 Mgbe Noa nụrụ ozi ịdọ aka ná ntị Jehova ziri, ọ rụrụ ụgbọ iji gosi na o nwere okwukwe. (Gụọ Ndị Hibru 11:7; 1 Pita 3:20.) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ndị nụrụ ozi ọma Alaeze Chineke kwesịrị ime ihe ha mụtara. (Ọrụ 3:17-20) Pita kpọrọ Noa “onye nọ na-ekwusa ihe bụ́ ezi omume.” (2 Pita 2:5) Ma, dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị amaghị ma Noa ọ̀ gbalịrị ikwusara onye ọ bụla bi n’ụwa n’oge ahụ ozi ọma tupu Iju Mmiri abịa. Taa, anyị na-agbalị ikwusara ndị nọ n’ụwa niile ozi ọma. Anyị na-ejikwa ịnụ ọkụ n’obi eme ya. N’agbanyeghị otú anyị si gbaa mbọ, anyị agaghị ezili onye ọ bụla nọ n’ụwa ozi ọma tupu ọgwụgwụ abịa. N’ihi gịnị?

6-7. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na anyị agaghị ezili mmadụ niile nọ n’ụwa ozi ọma tupu ọgwụgwụ eruo? Kọwaa.

6 Chegodị gbasara ihe Jizọs kwuru banyere ebe anyị ga-ekwusaru ozi ọma. O kwuru na a ga-ekwusa ozi ọma “n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà.” (Mat. 24:14) A na-emezu amụma ahụ taa karịa otú e mezutụrụla ya. Ozi banyere Alaeze Chineke dị ugbu a n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ. Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa taa nwekwara ike isi na jw.org nụ ozi ọma gbasara Alaeze Chineke.

7 Ma, Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya na ha “agaghị agazuli obodo ndị dị n’Izrel” ma ọ bụ kwusaara mmadụ niile ozi ọma tupu ya abịa. (Mat. 10:23; 25:31-33) Ihe a Jizọs kwuru ga-emekwa n’oge anyị a. Ọtụtụ nde mmadụ taa bi n’ebe a machiri anyị ikwusa ozi ọma. Ihe ọzọkwa bụ na a na-amụ ọtụtụ narị ụmụaka ná nkeji ọ bụla. Anyị na-agbalị ike anyị niile ikwusara ndị si “mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile” ozi ọma Alaeze. (Mkpu. 14:6) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaghị ezili mmadụ niile nọ n’ụwa ozi ọma tupu ọgwụgwụ eruo.

8. Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ gbasara ikpe Jehova ga-ekpe n’ọdịnihu? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

8 N’ihi ihe a anyị kwurula, anyị nwere ike ịna-eche, sị: Gịnị ga-emekwanụ ndị na-anụghị ozi ọma tupu oké mkpagbu amalite? Olee otú Jehova na Ọkpara ya o nyefere ọrụ ikpe ikpe ga-esi kpee ha ikpe? (Jọn 5:19, 22, 27; Ọrụ 17:31) Amaokwu Akwụkwọ Nsọ e si nweta isiokwu a sịrị na ‘o nweghị onye Jehova chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.’ (2 Pita 3:9; 1 Tim. 2:4) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova agwabeghị anyị azịza ajụjụ ndị a. O jighịkwanụ anyị ụgwọ ịgwa anyị ihe ọ bụla gbasara ihe o merela ma ọ bụ ihe ọ ka ga-eme.

Olee ihe Jehova ga-eme gbasara ndị na-enweghị ohere ịnụ ozi ọma tupu oké mkpagbu amalite? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8) c


9. Gịnị ka Jehova si na Baịbụl mee ka anyị mara?

9 Jehova si n’Okwu ya gwa anyị ihe ụfọdụ ọ ga-eme. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị na Jehova ga-akpọlite “ndị ajọ omume” na-enweghị ohere ịnụ ozi ọma ma gbanwee. (Ọrụ 24:15; Luk 23:42, 43) Ihe a emeela ka a jụọ ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa.

10. Olee ajụjụ ndị ọzọ anyị nwere ike ịjụ?

10 À ga-ebibi ndị niile nwụrụ n’oge oké mkpagbu ruo mgbe ebighị ebi nke na ha agaghịzi enwe olileanya mbilite n’ọnwụ? Baịbụl mere ka o doo anya na a gaghị akpọlite ndị kpachaara anya na-emegide Jehova nakwa ndị ya na ndị agha ya gburu n’Amagedọn. (2 Tesa. 1:6-10) Ndị ọzọ kwanụ? Dị ka ihe atụ, ọrịa, nká, ọdachi, ma ọ bụ ndị mmadụ nwere ike igbu ụfọdụ ndị n’oge oké mkpagbu. (Ekli. 9:11; Zek. 14:13) Ụfọdụ n’ime ndị a hà nwere ike iso ná “ndị ajọ omume” a ga-akpọlite n’ụwa ọhụrụ? Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị amaghị.

IHE NDỊ ANYỊ MA

11. Gịnị ka a ga-eji kpee ndị mmadụ ikpe n’Amagedọn?

11 Anyị ma ihe ụfọdụ gbasara ihe ga-eme n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, anyị ma na n’Amagedọn, a ga-ekpe ndị mmadụ ikpe n’ihi otú ha si meso ụmụnna Kraịst ihe. (Mat. 25:40) Ndị bụ́ atụrụ bụ ndị gosiri na ha na-akwado Kraịst na ndị e tere mmanụ. Anyị makwa na ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka ga-anọ n’ụwa ma oké mkpagbu malite nakwa na a gaghị akpọrọ ha laa eluigwe ruo mgbe ọ fọrọ obere ka Amagedọn malite. Ebe ọ bụ na ụfọdụ ụmụnna Kraịst ka ga-anọ n’ụwa, ndị nwere ezi obi nwere ike inwe ohere ịkwado ha na ọrụ ndị ha na-arụ. (Mat. 25:31, 32; Mkpu. 12:17) Gịnị mere ihe ndị a e kwuru ji dị mkpa?

12-13. Gịnị ka ụfọdụ ndị nwere ike ime ma ha hụchaa ka e bibiri “Babịlọn Ukwu”? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

12 Ọ bụrụgodị na oké mkpagbu amalitechaa, ụfọdụ ndị hụrụ ka e bibiri “Babịlọn Ukwu” nwere ike icheta na Ndịàmà Jehova ekwuola kemgbe ọtụtụ afọ na ihe a ga-eme. Ụfọdụ ndị hụrụ ya hà nwere ike ịgbanwe obi ha?​—Mkpu. 17:5; Ezik. 33:33.

13 Ọ bụrụ na o mee, ọ ga-adị ka ihe mere n’Ijipt n’oge Mosis. Cheta na “ọtụtụ ndị dị iche iche” sooro ndị Izrel mgbe ha si n’Ijipt na-apụ. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ndị ahụ malitere inwe okwukwe na Jehova mgbe ha hụrụ ka aka ná ntị Mosis dọrọ ndị Ijipt gbasara ahụhụ iri a ga-ata ndị Ijipt mezuru. (Ọpụ. 12:38) Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee mgbe e bibichara Babịlọn Ukwu, ànyị ga-eche na ọ dịghị mma na Jehova kwere ka e nwee ndị bịara sonyere anyị mgbe ọ fọrọ obere ka ọgwụgwụ ruo? Mbanụ. Anyị kwesịrị ime ka Nna anyị nke eluigwe bụ́ “Chineke nwere ọmịiko ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya na eziokwu ya dị ukwuu.” b​—Ọpụ. 34:6.

Ụfọdụ ndị hụrụ mgbe e bibiri “Babịlọn Ukwu” ga-echeta na ọ dịla anya Ndịàmà Jehova kwuru na ọ ga-eme (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13) d


14-15. Ihe ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu ọ̀ bụ mgbe onye ahụ nwụrụ ma ọ bụ ebe onye ahụ bi? Kọwaa. (Abụ Ọma 33:4, 5)

14 Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ụmụnna nwere ike ikwu gbasara onye ezinụlọ ha na-anaghị efe Jehova. Ha nwere ike ịsị: “Ọ bụrụ na ọ nwụọ tupu oké mkpagbu amalite, ọ ga-akara ya mma n’ihi na ọ ga-eme ka anyị nwee olileanya na a ga-akpọlite ya.” O doro anya na ọ bụ ezigbo ihe ka ha na-ebu n’obi ekwu ụdị ihe ahụ. Ma, ihe ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu abụghị mgbe onye ahụ nwụrụ. Jehova bụ Onyeikpe zuru okè. Ikpe ya niile na-ezi ezi. (Gụọ Abụ Ọma 33:4, 5.) Obi kwesịrị isi anyị ike na “Onye na-ekpe ụwa niile ikpe” ga-eme ihe ziri ezi.​—Jen. 18:25.

15 E nwekwara ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwuo na ihe ga-egosi ma mmadụ ọ̀ ga-adị ndụ ebighị ebi abụghị ebe onye ahụ bi. Anyị agatụdịghị echewe echiche na Jehova ga-ekwu na ọtụtụ nde mmadụ bụ “ewu” n’ihi na ha bi n’obodo ndị ha na-enweghị ike ịnụ ozi ọma gbasara Alaeze Chineke. (Mat. 25:46) Onye na-ekpe ụwa niile ikpe ziri ezi na-eche gbasara ndị ahụ karịa otú anyị nwere ike iche. Anyị amaghị ihe niile Jehova ga-eme n’oge oké mkpagbu. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha ga-enwe ohere ịmụta gbasara Jehova, nwee okwukwe na ya, ma mee ihe gosiri na ha na-akwado Jehova mgbe ọ ga-eme ka ndị niile nọ n’ụwa mata na ọ dị nsọ.​—Ezik. 38:16.

Oké mkpagbu malitechaa, . . . ụfọdụ ndị hụrụ ya hà nwere ike ịgbanwe obi ha?

16. Gịnị ka anyị matarala gbasara Jehova? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

16 Anyị esila na Baịbụl anyị na-amụ mata na Jehova anaghị eji ndụ ndị mmadụ egwu egwu. O nyere Ọkpara ya ka ọ nwụọ ka anyị niile nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Anyị niile na-ahụ ihe ndị gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. (Aịza. 49:15) Ọ ma aha onye ọ bụla n’ime anyị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ma onye ọ bụla n’ime anyị nke ọma nke na ọ bụrụgodị na anyị anwụọ, o nwere ike ikegharị anyị, mee ka anyị nwee àgwà niile anyị nweburu, na-echetakwa ihe niile anyị mabu. (Mat. 10:29-31) N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ga-ekpe onye ọ bụla n’ime anyị ikpe kacha zie ezie n’ihi na ọ ma ihe, bụrụ onye ezi omume, na-emekwa ebere.​—Jems 2:13.

Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-ekpe onye ọ bụla ikpe kacha zie ezie n’ihi na ọ ma ihe, bụrụ onye ezi omume, na-emekwa ebere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)


17. Gịnị ka anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu na-eso nke a?

17 Ihe ndị a anyị ghọtakwuru emeela ka anyị mata na ozi ọma anyị dị ezigbo mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ? Oleekwa ihe na-eme ka anyị na-ekwusa ozi ọma n’akwụsịghị akwụsị? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a nke ọma n’isiokwu na-eso nke a.

ABỤ NKE 76 Olee Otú Ọ Na-adị Gị?

a Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara ihe mere e ji gbanwee ihe a a gbanwere, gụọ isiokwu bụ́ “Otú Ahụ Bụ Ụzọ Ị Kwadoro.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Mach 15, 2015, peeji nke 7 ruo na nke 11.

b E bibichaa Babịlọn Ukwu, a ga-anwa ndị ohu Jehova niile ọnwụnwa n’oge Gọg onye Megọg ga-alụso ha agha. A ga-anwakwa ndị niile sooro ndị Jehova ma e bibichaa Babịlọn Ukwu.

c NKỌWA FOTO: Foto atọ na-egosi ihe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị ghara ịnụ ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile: (1) Otu nwaanyị bi ebe a na-anaghị ekwe mmadụ kpee okpukpe ọzọ na-abụghị nke obodo ahụ, (2) di na nwunye bi ebe ndị ọchịchị machiri ikwusa ozi ọma, na-atakwa ndị na-ekwusa ya ahụhụ, na (3) otu nwoke bi n’ebe dị ezigbo ime, ebe a na-agaghị agaruli zie ya ozi ọma.

d NKỌWA FOTO: Ebe otu nwa agbọghọ hapụrụ ọgbakọ chetara ihe a kụziiri ya gbasara mbibi a ga-ebibi “Babịlọn Ukwu.” O kpebiri ịlọghachi n’ọgbakọ ma laghachikwuru nne na nna ya bụ́ Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, anyị kwesịrị ime ka Nna anyị nke eluigwe nwere ọmịiko ma dị obi ebere, nweekwa obi ụtọ na onye mmehie alọghachila.