Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 20

ABỤ NKE 67 “Kwusaa Okwu Chineke”

Ka Ịhụnanya Mee Ka Ị Na-ekwusa Ozi Ọma

Ka Ịhụnanya Mee Ka Ị Na-ekwusa Ozi Ọma

“A ga-ebukwa ụzọ kwusaa ozi ọma ná mba niile.” ​—MAK 13:10.

IHE A GA-AMỤ

Otú ịhụnanya si eme ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na obi anyị niile na-ekwusa ozi ọma.

1. Gịnị ka anyị mụtara ná nnọkọ a na-enwe kwa afọ nke afọ 2023?

 NÁ NNỌKỌ a na-enwe kwa afọ nke afọ 2023, a obi dị anyị ụtọ mgbe e mere ka ihe ụfọdụ anyị kweere dokwuo anya, a maakwa ụfọdụ ọkwa mere anyị obi ụtọ gbasara ozi ọma anyị. Dị ka ihe atụ, anyị mụtara na ụfọdụ ndị nwere ike inwe ohere ịbịa sonyere ndị Jehova ma e bibichaa Babịlọn Ukwu. A gwakwara anyị na malite n’ọnwa Nọvemba afọ 2023, ọ dịghịzi mkpa ka ndị nkwusa dee ihe niile gbasara ozi ha ma ha nyewe akụkọ ozi ha. Ihe ndị a a gbanwere ò gosiri na ozi anyị adịchaghịzi mkpa? Mbanụ.

2. Gịnị mere ozi ọma anyị ji na-adịkwu mkpa kwa ụbọchị? (Mak 13:10)

2 Ka ụbọchị ọ bụla na-agafe ka ozi ọma anyị na-akakwu mkpa. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na oge adịghịzi. Ka anyị lee ihe Jizọs kwuru gbasara ikwusa ozi ọma n’oge ikpeazụ a. (Gụọ Mak 13:10.) Dị ka e kwuru n’akwụkwọ Matiu, Jizọs kwuru na a ga-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile tupu “ọgwụgwụ” abịa. (Mat. 24:14) “Ọgwụgwụ” o kwuru okwu ya bụ mgbe a ga-ebibi ụwa Setan kpamkpam. Jehova ekpebiela “ụbọchị na awa” ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu ga-eme. (Mat. 24:36; 25:13; Ọrụ 1:7) Kwa ụbọchị, anyị na-erukwu nso n’oge ahụ. (Rom 13:11) Ma, anyị kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma ruo mgbe ọgwụgwụ ga-abịa.

3. Olee ihe mere anyị ji ekwusa ozi ọma?

3 E nwere ajụjụ dị mkpa anyị kwesịrị ichebara echiche: Gịnị mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma? Ọ bụ ịhụnanya. Ihe ndị anyị na-eme n’ikwusa ozi ọma na-egosi na anyị ji ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe, nakwa na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya. Nke kachanụ bụ na ọ na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya, jirikwa aha ya kpọrọ ihe. Ka anyị lebara ihe ndị a anya otu otu.

ANYỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA N’IHI NA ANYỊ JI OZI ỌMA KPỌRỌ IHE

4. Olee otú ọ na-adị anyị ma anyị nụ ozi mere anyị obi ụtọ?

4 Ì nwere ike icheta otú obi dị gị mgbe e ziri gị ozi mere gị obi ụtọ? O nwere ike ịbụ na onye ezinụlọ unu mụrụ nwa ọhụrụ ma ọ bụkwanụ na e nyere gị ọrụ ị na-achọ inweta kemgbe. O doro anya na ọ nọ na-anụ gị ọkụ n’obi ịkọrọ ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị ihe ọma a meere gị. Ụdị ihe ahụ ò mere gị mgbe ị nụrụ ozi kacha ozi niile mma, ya bụ, ozi ọma Alaeze Chineke?

5. Olee otú ọ dị gị mgbe mbụ ị mụtara eziokwu dị n’Okwu Chineke? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

5 Chegodị otú obi dị gị mgbe mbụ ị nụrụ eziokwu si n’Okwu Chineke. Ị mụtara na Nna gị nke eluigwe hụrụ gị n’anya, na ọ chọrọ ka i soro ná ndị na-efe ya, na o kwere nkwa iwepụ ihe mgbu na ịta ahụhụ, na ị ga-enweli olileanya ịhụ ndị gị nwụrụ anwụ ọzọ mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ, nakwa ọtụtụ ihe ọma ndị ọzọ. (Mak 10:29, 30; Jọn 5:28, 29; Rom 8:38, 39; Mkpu. 21:3, 4) Eziokwu ndị ahụ mere ka obi bụrụ gị sọ aṅụrị. (Luk 24:32) Ihe ndị ahụ ị mụtara tọgburu gị atọgbu. O nweghịkwa otú ị ga-esi nụchaa eziokwu ndị ahụ gbachi nkịtị.​—I nwere ike ịtụle Jeremaya 20:9.

Mgbe mbụ anyị nụrụ ozi ọma, o nuru anyị enu n’obi, anyị achọọkwa izi ya ndị ọzọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


6. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Ernest na Rose nwunye ya?

6 Chegodị banyere otu nwanna aha ya bụ Ernest. b Ọ dị ihe dị ka afọ iri mgbe papa ya nwụrụ. Ernest kwuru, sị: “M nọ na-achọsi ike mgbe ahụ ka m mata ma mpa m ọ̀ gaala eluigwe ka ọ̀ bụ na nke ya agaala kpamkpam. M hụ ụmụaka ndị ọzọ mpa ha ka nọ ndụ, ya ana-adị m ka m bụrụ ha.” Ernest na-agakarị n’ili papa ya, gbusa ikpere n’ala ma kpee ekpere, sị: “Chineke, biko, m chọrọ ịma ebe mpa m nọ.” Mgbe ihe dị ka afọ iri na asaa papa Ernest nwụrụ gachara, a gwara ya ka a mụwara ya Baịbụl, ya ekweta. Obi tọgburu ya atọgbu mgbe ọ matara na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, na ha dị ka ndị nọ n’oké ụra, nakwa na Baịbụl kwere nkwa na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ n’ọdịnihu. (Ekli. 9:5, 10; Ọrụ 24:15) N’ikpeazụ, ọ matara azịza ajụjụ ndị na-enye ya nsogbu kemgbe. Eziokwu Baịbụl Ernest na-amụta tọrọ ya ezigbo ụtọ. Nwunye ya aha ya bụ Rose so ya mụwa Baịbụl. Ihe ọ mụtara tọkwara ya ezigbo ụtọ. Ha mere baptizim n’afọ 1978. Ha kọọrọ ndị ezinụlọ ha, ndị enyi ha, nakwa onye ọ bụla ọzọ chọrọ ige ntị ihe ndị a ha ji kpọrọ ihe. Ihe a mere ka Nwanna Ernest na nwunye ya nyere ihe karịrị mmadụ iri asaa aka ịmata Jehova ma mee baptizim.

7. Gịnị na-eme ma eziokwu ndị dị na Baịbụl gbanyesie mgbọrọgwụ ike n’obi anyị? (Luk 6:45)

7 O doro anya na ọ bụrụ na anyị ejiri eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe nke ukwuu, anyị ga-akọrọ ya ndị ọzọ. (Gụọ Luk 6:45.) Ọ ga-adị anyị otú ọ dị ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị sịrị: “Anyịnwa enweghị ike ịkwụsị ikwu gbasara ihe anyị ji anya anyị hụ na ihe anyị ji ntị anyị nụ.” (Ọrụ 4:20) Anyị ji eziokwu kpọrọ ihe nke ukwuu nke na anyị chọrọ ịkọrọ ya ọtụtụ ndị.

ANYỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA N’IHI NA ANYỊ HỤRỤ NDỊ MMADỤ N’ANYA

8. Gịnị mere anyị ji achọ izi ndị mmadụ ozi ọma? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ  Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs.”) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

8 Anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya otú ahụ Jehova na Ọkpara ya hụrụ ha n’anya. (Ilu 8:31; Jọn 3:16) Anyị na-emetara ndị ‘na-amaghị Chineke’ na ndị ‘na-enweghị olileanya’ ebere. (Efe. 2:12) Nsogbu ụwa mere ka ha dị ka ndị iyi na-eri. Anyị jikwa ihe e nwere ike iji adọpụta ha, ya bụ, ozi ọma Alaeze Chineke. Otú anyị si hụ ha n’anya ma na-enwere ha ọmịiko na-eme ka anyị gbasie mbọ ike kwusaara ha ozi ọma. Ozi a bara ezigbo uru nwere ike ime ka ha nwee olileanya, nyere ha aka ibi ndụ kacha mma ugbu a, meekwa ka ha nwee olileanya inweta “ndụ nke bụ́ ezigbo ndụ,” ya bụ, ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke.​—1 Tim. 6:19.

Otú anyị si hụ ndị mmadụ n’anya ma na-enwere ha ọmịiko na-eme ka anyị gbaa ezigbo mbọ izi ha ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)


9. Olee aka ná ntị anyị na-adọ ndị mmadụ gbasara ọdịnihu, maka gịnị? (Ezikiel 33:7, 8)

9 Otú anyị si hụ ndị mmadụ n’anya na-emekwa ka anyị gaa dọọ ha aka ná ntị gbasara ọgwụgwụ ụwa ochie a ji ọsọ na-abịa. (Gụọ Ezikiel 33:7, 8.) Anyị na-enwere ndị agbata obi anyị na ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova ọmịiko. Ọtụtụ ndị na-eme ihe ndị dịịrị ha n’amaghị ihe na-aga ime, ya bụ, “oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, a gaghịkwa enwe ya ọzọ.” (Mat. 24:21) Anyị chọrọ ka ha mara ihe ga-eme n’oge ahụ a ga-ekpe ndị mmadụ ikpe. A ga-ebibi okpukpe ụgha, bibizie ụwa Setan niile n’Amagedọn. (Mkpu. 16:14, 16; 17:16, 17; 19:11, 19, 20) Ekpere anyị bụ ka ọtụtụ ndị gee ntị n’ozi ọma anyị ga-ezi ha ma kpebie isoro anyị na-efe Jehova ugbu a. Ma, gịnị ga-eme ndị na-egeghị anyị ntị ugbu a, ma ndị ezinụlọ anyị anyị hụrụ n’anya?

10. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị?

10 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jehova nwere ike ikpebi ịzọpụta ndị gbanwere obi ha mgbe ha hụrụ mbibi a ga-ebibi Babịlọn Ukwu. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na ọ dịkwuola mkpa ugbu a ka anyị na-adọ ha aka ná ntị. Chegodị banyere ihe a: Ha nwere ike icheta ihe anyị na-agwa ha ugbu a n’oge ahụ. (I nwere ike ịtụle Ezikiel 33:33.) O nwere ike ịbụ na ha ga-echeta aka ná ntị anyị dọrọ ha, ya emee ka ha soro anyị fewe Jehova tupu oge agaa. Dị ka onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ nọ na Filipaị, onye gbanwere obi ya naanị mgbe “oké ala ọma jijiji mere,” ụfọdụ ndị na-anaghị ege anyị ntị ugbu a nwere ike ịgbanwe obi ha ma ihe ga-eme ka ụwa maa jijiji mechaa, ya bụ, mbibi Babịlọn Ukwu.​—Ọrụ 16:25-34.

ANYỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA N’IHI NA ANYỊ HỤRỤ JEHOVA N’ANYA, JIRIKWA AHA YA KPỌRỌ IHE

11. Olee otú anyị si enye Jehova otuto, nsọpụrụ, ma na-ekweta na ọ dị ike? (Mkpughe 4:11) (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

11 Ihe kacha mkpa mere anyị ji ekwusa ozi ọma bụ na anyị hụrụ Jehova Chineke n’anya, jirikwa aha ya dị nsọ kpọrọ ihe. Anyị na-ewere ozi anyị ka otu ụzọ dị mkpa anyị si eto Chineke anyị anyị hụrụ n’anya. (Gụọ Mkpughe 4:11.) Anyị ji obi anyị niile kweta na Jehova Chineke bụ onye dị ike, na o ruru eru ka ndị na-efe ya too ya ma sọpụrụ ya. Anyị na-eto Jehova ma na-asọpụrụ ya ma anyị na-agwa ndị mmadụ ihe doro anya gosiri na ọ bụ ya “kere ihe niile” nakwa na ihe mere anyị ji dịrị ndụ bụ na o nyere anyị ndụ. Anyị na-ekweta na Jehova dị ike ma ọ bụrụ na anyị ejiri oge anyị, ike anyị, na akụ̀ anyị na-ekwusa ozi ọma otú anyị nwere ike. (Mat. 6:33; Luk 13:24; Kọl. 3:23) Igbu ya nkenke, ọ na-atọgbu anyị atọgbu ikwu gbasara Chineke anyị hụrụ n’anya. Ọ na-enukwa anyị enu ịgwa ndị ọzọ gbasara aha ya nakwa ụdị onye ọ bụ. Maka gịnị?

Anyị na-egosi na anyị kwetara na Jehova dị ike ma anyị jiri oge anyị, ike anyị, na akụ̀ anyị na-ekwusa ozi ọma otú anyị nwere ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


12. Olee otú anyị si edo aha Jehova nsọ n’ozi ọma?

12 Otú anyị si hụ Jehova n’anya na-eme ka anyị na-edo aha ya nsọ. (Mat. 6:9) Anyị chọrọ iso mee ka a mata na ihe Ekwensu kwuru gbasara Jehova bụ ụgha chara acha. (Jen. 3:1-5; Job 2:4; Jọn 8:44) Anyị nọrọ n’ozi ọma, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịgwa ndị niile chọrọ ige anyị ntị eziokwu gbasara Jehova na ụdị onye ọ bụ. Anyị chọrọ ka onye ọ bụla mara na àgwà ọ kacha nwee bụ ịhụnanya, na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, nakwa na Alaeze ya ga-eme ka nsogbu niile kwụsị, weta udo, meekwa ka ụmụ mmadụ na-enwe obi ụtọ. (Ọma 37:10, 11, 29; 1 Jọn 4:8) Ọ bụrụ na anyị ana-agwa ndị mmadụ gbasara Jehova, anyị na-edo aha ya nsọ. Obi na-adịkwa anyị ụtọ n’ihi na anyị na-arụ ọrụ mere ka a kpọọ anyị Ndịàmà Jehova. Olee otú ọ bụ?

13. Gịnị mere obi ji atọgbu anyị atọgbu ịza Ndịàmà Jehova? (Aịzaya 43:10-12)

13 Jehova họọrọ anyị ka anyị bụrụ “ndị àmà” ya. (Gụọ Aịzaya 43:10-12.) Afọ ole na ole gara aga, otu akwụkwọ ozi si n’aka Òtù Na-achị Isi kwuru na ihe ọma kacha meere onye ọ bụla n’ime anyị bụ na anyị na-aza Ndịàmà Jehova. c Maka gịnị? Ka anyị legodị otu ihe atụ. Ka e were ya na e boro gị ebubo na i mere ihe ọjọọ. Ị chọrọ ka mmadụ bịa gbaara gị akaebe n’ụlọikpe. Onye ị ga-ahọrọ bụ onye ị maara nke ọma ma tụkwasị obi, onye ndị mmadụ na-ele anya ọma, nke ga-eme ka e jiri akaebe ọ ga-agbara gị kpọrọ ihe. Mgbe Jehova họọrọ anyị ka anyị bụrụ Ndịàmà ya, o gosiri na ọ ma anyị nke ọma nakwa na ọ tụkwasịrị anyị obi na anyị ga-agwa ndị ọzọ na ọ bụ naanị ya bụ ezi Chineke. Obi na-atọgbu anyị atọgbu ịgbara Jehova àmà nke na anyị na-eji ohere ọ bụla eme ka ndị mmadụ mara aha ya, na-akụghasịkwa ụgha dị iche iche a ghara gbasara ya. Anyị na-esi otú a eme ihe dabara n’aha na-atọgbu anyị atọgbu ịza, nke bụ́ Ndịàmà Jehova.​—Ọma 83:18; Rom 10:13-15.

ANYỊ GA NA-EKWUSA OZI ỌMA RUO ỌGWỤGWỤ

14. Olee ihe ndị na-eme obi ụtọ anyị na-atụ anya ha ga-eme n’ọdịnihu?

14 Anyị na-atụ anya ịhụ ihe ndị na-eme obi ụtọ ga-eme n’ọdịnihu. Anyị na-atụ anya na Jehova ga-agọzi anyị, e nwekwuo ọtụtụ ndị ga-anabata eziokwu tupu oké mkpagbu amalite. Obi dịkwa anyị ụtọ na n’oge oké mkpagbu, bụ́ oge ga-akacha taa akpụ, ndị mmadụ nwere ike ịhapụ ụwa Ekwensu ma soro anyị na-efe Jehova.​—Ọrụ 13:48.

15-16. Gịnị ka anyị ga na-eme, ruokwa ole mgbe?

15 Ma, e nwere ọrụ anyị ga na-arụ ugbu a. Ihe ọma meere anyị na e nyere anyị ọrụ a na-agaghị arụ ọzọ, nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. Ma, anyị ga na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị gbasara ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya. E kwesịrị ime ka ndị mmadụ mata na mbibi ụwa ochie a ji ọsọ na-abịa. Ọ bụrụzie na oge ikpe ahụ eruo, ha ga-amara na ihe anyị gwara ha si n’aka Jehova Chineke.​—Ezik. 38:23.

16 N’ihi ya, gịnị ka anyị kpebisiri ike ime? Anyị ji ozi ọma kpọrọ ihe, hụkwa ndị mmadụ n’anya. Nke kachanụ bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, jirikwa aha ya kpọrọ ihe. N’ihi ya, anyị kpebisiri ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, jiri ya kpọrọ ihe, ruo mgbe Jehova ga-asị: “O zuola.”

ABỤ NKE 54 “Lekwa Ụzọ”

a E nwere nnọkọ ahụ a na-enwe kwa afọ n’abalị asaa n’ọnwa Ọktoba afọ 2023, n’Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Niubọg, nke dị na Niu Yọk, Amerịka. E mechara wepụta ihe omume ahụ niile n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova.® Agba nke mbụ ya gbara na nke ọnwa Nọvemba afọ 2023, nke abụọ agbaa na nke Jenụwarị afọ 2024.

c Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Mach afọ 2007, peeji nke 4.