Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 23

ABỤ NKE 28 Ịbụ Enyi Jehova

Jehova Na-akpọ Anyị Ka Anyị Bụrụ Ndị Ọbịa Ya

Jehova Na-akpọ Anyị Ka Anyị Bụrụ Ndị Ọbịa Ya

“Ụlọikwuu m ga-adị ebe ha nọ. M ga-abụ Chineke ha.”​—EZIK. 37:27.

IHE A GA-AMỤ

Ihe ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe ịbụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu Jehova pụtara nakwa otú Jehova si elekọta ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị ọbịa ya.

1-2. Olee òkù Jehova na-akpọ ndị ji obi ha niile na-efe ya?

 MMADỤ jụọ gị, ‘Olee otú i si were Jehova?’ i nwere ike ịsị ya, ‘Jehova bụ Nna m, Chineke m, na Enyi m.’ E nwekwara aha ndị ọzọ i nwere ike itu Jehova ma ọ bụ ihe i nwere ike iji akọwa ya. Ma, ị̀ na-ewere ya ka onye kpọrọ gị ka ị bụrụ ọbịa ya?

2 Eze Devid ji Jehova tụnyere onye kpọrọ ndị mmadụ òkù, jirikwa ndị ji obi ha niile na-efe ya tụnyere ndị ọbịa ya. Ọ jụrụ, sị: “Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị? Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ gị?” (Ọma 15:1) Okwu ndị a si n’ike mmụọ nsọ mere ka anyị mata na anyị nwere ike ịbụ ndị ọbịa Jehova, ma ọ bụ ndị enyi ya. Òkù a Jehova kpọrọ anyị magburu onwe ya.

JEHOVA CHỌRỌ KA ANYỊ BỤRỤ NDỊ ỌBỊA YA

3. Ònye bụ onye ọbịa mbụ Jehova? Oleekwa otú Jehova na onye ọbịa ya si were ibe ha?

3 Tupu Jehova ekewe ihe, ọ nọ naanị ya. Ma, e nwere mgbe o ruru, ya anabata Ọkpara ya n’ụlọikwuu ya. Obi dịkwa Jehova ụtọ ime ya. Baịbụl kwuru na ‘ihe gbasara Jizọs na-eme Jehova ezigbo obi ụtọ.’ Ọkpara ya bụ onye ọbịa mbụ ya. Ọ nọkwa ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ihu Jehova mgbe niile.’​—Ilu 8:30.

4. Olee ndị ọzọ ghọrọ ndị ọbịa Jehova?

4 Jehova keziri ndị mmụọ ozi, kpọọ ha ka ha bụrụkwa ndị ọbịa ya. Baịbụl kpọrọ ndị mmụọ ozi “ụmụ Chineke,” kwuokwa na obi na-atọ ha ụtọ na ha na Jehova nọ. (Job 38:7; Dan. 7:10) E nwere oge ọ bụ naanị ndị bụ́ mmụọ, ndị bi n’ebe Jehova bi, bụ ndị ọbịa ya, ma ọ bụ ndị enyi ya. Mana, o mechara mee ka ụmụ mmadụ nọ n’ụwa bụrụkwa ndị enyi ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ịnọk, Noa, Ebreham, na Job. Baịbụl kwuru na ndị ahụ fere Chineke bụ ndị enyi ya, ma ọ bụ ndị “so ezi Chineke na-eje ije.”​—Jen. 5:24; 6:9; Job 29:4; Aịza. 41:8.

5. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’amụma e buru n’Ezikiel 37:26, 27?

5 Kemgbe ụwa, Jehova nọkwa na-akpọ ndị enyi ya ka ha bụrụ ndị ọbịa ya. (Gụọ Ezikiel 37:26, 27.) Dị ka ihe atụ, anyị si n’amụma Ezikiel mụta na Jehova chọrọ ka ya na ezigbo ndị na-efe ya dịrị ná mma. O kwere nkwa na ya na ha “ga-agba ọgbụgba ndụ udo.” Amụma a na-akọwa oge a ga-eme ka ndị nwere olileanya ịga eluigwe na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa dịrị n’otu, nọrọkwa n’ụlọikwuu ya ma bụrụ “otu ìgwè atụrụ.” (Jọn 10:16) Oge ahụ bụ ugbu a.

CHINEKE NA-ELEKỌTA ANYỊ EBE Ọ BỤLA ANYỊ NỌ

6. Olee otú mmadụ si aghọ ọbịa n’ụlọikwuu Jehova? Olee ebe ụlọikwuu ya dị?

6 N’oge e dere Baịbụl, ụlọikwuu mmadụ bụ ebe ọ na-anọ ezuru ike, na-ezerekwa mmiri na anwụ. Ọ bụrụ na mmadụ kpọrọ onye ọzọ ka ọ bịa n’ụlọikwuu ya, onye ahụ ọ kpọrọ na-atụ anya ka o lekọta ya nke ọma. Anyị nyefee Jehova onwe anyị, anyị na-aghọ ndị ọbịa n’ụlọikwuu ya. (Ọma 61:4) Jehova na-enye anyị ihe niile dị anyị mkpa ga-eme ka anyị na ya na-adị ná mma. Anyị na ndị ọzọ bụ́ ndị ọbịa n’ụlọikwuu ya na-abụkwa enyi. Ụlọikwuu ya adịghị naanị n’otu ebe. O nwere ike ịbụ na ị gaala obodo ọzọ. Ikekwe, ị gara mgbakọ pụrụ iche, gị ahụ ndị ọzọ obi dị ụtọ na ha nọ n’ụlọikwuu Jehova. Ụlọikwuu ya dị n’ebe ọ bụla ndị ji obi ha niile na-efe ya nọ.​—Mkpu. 21:3.

7. Gịnị mere anyị nwere ike iji ekwu na ndị nwụrụ anwụ fere Jehova ka bụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu ya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

7 Oleekwanụ maka ndị nwụrụ anwụ ji obi ha niile fee Jehova? È kwesịrị ikwu na ha ka bụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu Jehova? Ee. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ha ka dị ndụ n’anya Jehova. Jizọs sịrị: “Mgbe Mosis dere gbasara osisi ogwu na-ere ọkụ, o kwuru na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ kpọrọ Jehova ‘Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’ Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, n’ihi na n’anya ya, ha niile dị ndụ.”​—Luk 20:37, 38.

E nwedịrị ike iwere ndị nwụrụ anwụ fere Jehova ka ndị ọbịa n’ụlọikwuu ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)


IHE ANYỊ GA-EME NA URU ANYỊ NA-ERITE

8. Olee uru ndị ọbịa Jehova na-erite n’ụlọikwuu ya?

8 Otú ahụ mmadụ nwere ike ịnọ n’ụlọikwuu zuru ike, zerekwa anwụ na mmiri, ụlọikwuu Jehova na-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara ịkpa adịm ná mma anyị na ya aka, na-emekwa ka anyị nwee ezigbo olileanya. Ọ bụrụ na anyị anọrọ Jehova nso, e nweghị ihe ọ bụla Setan ga-eme anyị ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Ọma 31:23; 1 Jọn 3:8) N’ụwa ọhụrụ, Jehova ga na-echebe ndị na-efe ya ka ihe ọ bụla ghara ime adịm ná mma ha na ya. Ọ ga-echebekwa ha ka ọnwụ ghara igbu ha.​—Mkpu. 21:4.

9. Olee otú Jehova chọrọ ka ndị ọbịa ya si na-akpa àgwà?

9 Ọ bụ ihe ọma na-enweghị atụ meere anyị na anyị bụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu Jehova. Anyị na ya nwere ike ịdị n’ezigbo mma ruo mgbe ebighị ebi. Olee otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ma anyị chọọ ịka bụrụ ndị ọbịa Jehova? Mmadụ kpọọ gị ka ị bịa n’ụlọ ya, ị ga-achọ ịma ihe ọ na-atụ anya ka i mee. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịtụ anya ka i yipụ akpụkpọ ụkwụ gị tupu gị abata n’ụlọ ya. Obi ga-adịkwa gị ụtọ ime ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị bụ́ ọbịa Jehova. Anyị chọrọ ịma ihe Jehova chọrọ ka anyị mee ka anyị nwee ike ịna-abụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu ya. Otú anyị si hụ Jehova n’anya na-eme ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime “iji na-eme ya obi ụtọ.” (Kọl. 1:10) Ọ bụ eziokwu na anyị na-ewere Jehova ka Enyi anyị, anyị kwesịkwara icheta na ọ bụ Chineke anyị na Nna anyị, onye anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ. (Ọma 25:14) Anyị buru ya n’obi, ọ ga-eme ka anyị na-atụ egwu ya. Anyị agaghịkwa echefu onye ọ bụ. Ịkwanyere Jehova ezigbo ùgwù otú a ga-enyere anyị aka izere omume ga-akpasu ya iwe. N’eziokwu, anyị chọrọ ‘iji obi umeala soro Chineke anyị na-eje ije.’​—Maị. 6:8.

JEHOVA ELEGHỊ NDỊ IZREL ANYA N’IHU MGBE HA NỌ N’ALA ỊKPA

10-11. Olee otú otú Jehova si meso ndị Izrel ihe mgbe ha nọ n’ala ịkpa Saịnaị si gosi na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu?

10 Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu n’otú o si emeso ndị ọbịa ya. (Rom 2:11) Anyị ga-aghọtakwu na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu n’otú o si meso ụmụ Izrel ihe mgbe ha nọ n’ala ịkpa Saịnaị.

11 Mgbe Jehova napụtachara ndị Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt, ọ họpụtara ndị nchụàjà ka ha na-eje ozi n’ụlọikwuu ya. E nyekwara ndị Livaị ọrụ ha ga na-arụ n’ụlọikwuu ahụ. Jehova ò lekọtara ndị na-arụ ọrụ n’ụlọikwuu ahụ ma ọ bụ ndị bi gburugburu ya karịa ndị ọzọ? Mba. Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu.

12. Olee otú Jehova si gosi na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu mgbe mba Izrel malitere ọhụrụ? (Ọpụpụ 40:38) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

12 Ndị Izrel niile nwere ike ịbụ ezigbo ndị enyi Jehova n’agbanyeghị ma hà na-arụ ọrụ n’ụlọikwuu ahụ, ma hà bi nso n’ụlọikwuu ahụ, ma ọ bụkwanụ n’ebe dị anya. Dị ka ihe atụ, Jehova mere ka ndị Izrel niile na-ahụ ogidi ígwé ojii nakwa ogidi ọkụ na-adị n’elu ụlọikwuu ahụ. (Gụọ Ọpụpụ 40:38.) Ọ bụrụ na ígwé ojii ahụ amalite ịga n’ebe ọhụrụ, ndị kachadị nọrọ n’ebe dị anya n’ụlọikwuu ahụ na-ahụ ya, kwakọta ngwongwo ha, tọtuo ụlọikwuu ha, sorokwa ndị Izrel ndị ọzọ na-aga. (Ọnụ Ọgụ. 9:15-23) Mmadụ niile nwere ike ịnụ ụda opi abụọ pụrụ ezigbo iche na-adasi ike e ji ọlaọcha rụọ nke na-agwa onye ọ bụla na oge eruola ka ha kwalie. (Ọnụ Ọgụ. 10:2) O doro anya na ibi nso n’ụlọikwuu ahụ abụghị ihe na-egosi na mmadụ na Jehova dị ná mma karịa ndị bi ya n’ebe dị anya. Kama, onye ọ bụla nọ ná mba ọhụrụ a nwere ike ịbụ ọbịa Jehova, obi esiekwa ya ike na Jehova ga na-eduzi ya ma na-echebe ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. N’agbanyeghị ebe anyị bi n’ụwa, Jehova ga-ahụli anyị n’anya, na-elekọta anyị, ma na-echebe anyị.

Ụlọikwuu Jehova na-adị n’etiti ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu. O gosiri na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)


JEHOVA ANAGHỊ ELE MMADỤ ANYA N’IHU TAA

13. Gịnị bụ otu ụzọ Jehova si egosi na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu taa?

13 Ụfọdụ ndị ohu Jehova taa bi nso n’isi ụlọ ọrụ anyị ma ọ bụkwanụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị. Ụfọdụ ndị na-ejedị ozi n’ebe ndị a. Ihe a emeela ka ha soro na-arụ ọtụtụ ọrụ a na-arụ n’ebe ndị a, ha na ndị na-eduzi nzukọ Jehova ana-arụkọkwa ọrụ. E nwere ndị nlekọta sekit nakwa ndị na-eje ụdị ozi oge niile ndị ọzọ pụrụ iche. Ọ bụrụ na i so n’ọtụtụ ndị na-anaghị eje ụdị ozi a ugbu a, obi sie gị ike na Jehova, bụ́ onye kpọrọ anyị òkù, hụrụ ndị niile bụ́ ndị ọbịa ya n’anya. Ọ na-elekọtakwa ha niile. (1 Pita 5:7) Chineke na-enye ohu ya nke ọ bụla nri si n’Okwu ya, na-eduzi ya, ma na-echebe ya.

14. Olee ụzọ ọzọ Jehova si egosi na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu?

14 Ihe ọzọ na-egosi na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu bụ na o mere ka ndị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa nwee ike inweta Baịbụl. Asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl bụ Hibru, Arameik, na Grik. Ndị nwere ike ịgụ asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl, ha na Jehova hà dị n’ezigbo mma karịa ndị na-enweghị ike ịgụ ha? Mbanụ.​—Mat. 11:25.

15. Olee ihe ọzọ gbasara Baịbụl na-egosi na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

15 Ihe na-eme ka ihe anyị dị Jehova mma abụghị otú anyị gụruru akwụkwọ ma ọ bụkwanụ ma ànyị ma asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl. Jehova emeghị ka ọ bụrụ naanị ndị gụrụ oké akwụkwọ ga-enweta amamihe ya. Kama, ọ na-eme ka mmadụ niile nọ n’ụwa nweta ya, ma hà gụrụ oké akwụkwọ ma ọ bụ na ha agụghị. A sụgharịakwala Okwu ya bụ́ Baịbụl n’ọtụtụ puku asụsụ, ya emee ka ndị nọ n’ụwa niile nwee ike ịna-erite uru n’ihe ọ na-akụzi, sikwa na ya na-amụta otú ha ga-esi abụ ndị enyi ya.​—2 Tim. 3:16, 17.

Olee otú ịsụgharị Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ si egosi na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)


AKWỤSỊLA ỊBỤ ONYE ỌBỊA JEHOVA

16. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 10:34, 35, gịnị ka anyị ga-eme ka ihe anyị na-adị Jehova mma?

16 Ọ bụ ihe ọma na-enweghị atụ meere anyị na Jehova nabatara anyị ka anyị bụrụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu ya. Ọ bụ ya kacha dịrị obiọma, hụ anyị n’anya, na-elekwa anyị ọbịa. Ihe ọzọ bụ na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu. Ọ na-anabata anyị niile n’agbanyeghị ebe anyị bi, ezinụlọ anyị, otú anyị gụruru akwụkwọ, agbụrụ anyị, afọ ole anyị dị, ma ọ bụkwanụ ma ànyị bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ma, ọ bụ naanị ndị na-erubere ya isi ka ọ na-anabata ịbụ ndị ọbịa ya.​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

17. Olee ebe anyị ga-esi amatakwu otú anyị ga-esi abụ ọbịa n’ụlọikwuu Jehova?

17 N’Abụ Ọma 15:1, Devid jụrụ, sị: “Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị? Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ gị?” Mmụọ nsọ mere ka Devid zaa ajụjụ ndị a. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ ọ dị mkpa ka anyị na-eme ka anyị nwee ike ịna-abụ ọbịa n’ụlọikwuu Jehova.

ABỤ NKE 32 Na-akwado Jehova