Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

“Ị Gaghị Agaru Ya Otu Afọ Nwụfuo”

Zachaeus Martyn

“Ị Gaghị Agaru Ya Otu Afọ Nwụfuo”
  • MGBE A MỤRỤ YA n’Afọ 1880

  • MGBE O MERE BAPTIZIM n’Afọ 1942

  • ONYE Ọ BỤ Ọ malịtere ọrụ ịsụ ụzọ oge niile mgbe ọ dị afọ iri asaa na abụọ.

E NWEGHỊ onye ya na Zachaeus mụrụ Baịbụl tupu ya amalite ịbịa ọmụmụ ihe. Ọ bịawara ọmụmụ ihe mgbe ọ gụchara akwụkwọ abụọ Ndịàma Jehova bipụtara. Aha otu bụ Salvation, nke ọzọ abụrụ The Harp of God. Akwụkwọ ndị a mere ka o doo ya anya na ya ahụla ndị na-akụzi eziokwu dị na Baịbụl.

N’otu ụtụtụ Sọnde, n’afọ 1941, Zachaeus gawara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Nke a bụ nke mbụ ọ na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Isi n’ụlọ ya ruo n’ebe Ndịàmà Jehova na-amụ ihe dị kilomita asatọ. Ọ ga-akpọda otu nnukwu ugwu mgbe ọ na-aga. O rutere n’ebe ahụ awa ole na ole tupu oge ọmụmụ ihe eruo maka na ọ maghị oge ọmụmụ ihe ji ebido. Ọ nọdụrụ ala otu ebe na-eche ka ụmụnna bịa. Mgbe ọ gachara ọmụmụ ihe Sọnde ugboro atọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ gwara ndị chọọchị Anglịkan ka ha wepụ aha ya n’akwụkwọ ha n’ihi na ya abụkwaghị onye òtù ha.

Otu ezigbo enyi ya kparịrị ya. Ọ gwara ya, sị: “Okongwu, lee ka m gwa gị, ọ bụrụ na i sie ọnwụ na-arị ugwu a, na-arịda, ebe ị na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ị gaghị agaru ya otu afọ nwụfuo.” Nwoke ahụ nọ ndụ hụ Zachaeus ka ọ na-arị ugwu ahụ, na-arịda ugboro abụọ n’izu ruo afọ ise. Ma nwoke ahụ nwụrụ mgbe afọ ise ahụ gachara. Mgbe ọ nwụchara, afọ iri abụọ na ise agaakwa, Zachaeus ka na-awụ gam gam.

Zachaeus jegideere Jehova ozi ruo ọnwụ. Ọ nwụrụ mgbe ọ gbara afọ iri itoolu na asaa.