Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Ha Chọrọ Ile Ya

Ha Chọrọ Ile Ya

N’AFỌ 1956, ụmụnna nọ na Fritaụn lere fim a na-akpọ The New World Society in Action. Ha kwuru, sị:

“Anyị kwụrụ ụgwọ otu ụlọ ezumezu kacha buo ibu na Fritaụn. Anyị nyere otu puku mmadụ akwụkwọ ka ha bịa. Anyị nọ na-eche ma ndị mmadụ hà ga-abịakwa. Mgbe ọ fọrọ nkeji iri atọ ka anyị malite, ọ bụ naanị mmadụ iri abụọ na ise bịarala. Mgbe ọ fọrọ ihe na-erughị nkeji iri na ise, otu narị mmadụ bịakwuru. Ka a na-eme ka a na-eme, narị mmadụ ise a nọjuchaala oche niile e nwere ebe ahụ. Otu narị mmadụ ọzọ guzozi ọtọ na-ele fim ahụ. Narị mmadụ ise ọzọ nọzi n’èzí maka na ụlọ ahụ abaghị ha. Anyị jụrụ ha ma hà ga-echere ka anyị gosi fim ahụ ọzọ? Ha asị anyị na ha ga-echere. Ha cheere n’eziokwu n’agbanyeghị na mmiri na-ezo.”

Ndị niile lere fim a na ọmarịcha fim ndị ọzọ n’ebe dị iche iche na Siera Lion, karịrị iri puku mmadụ asatọ.