Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Jehova Enyerela M Ezigbo Aka

Jay Campbell

Jehova Enyerela M Ezigbo Aka
  • MGBE A MỤRỤ YA n’Afọ 1966

  • MGBE O MERE BAPTIZIM n’Afọ 1986

  • ONYE Ọ BỤ Ọrịa polio kpọnwụrụ ya ụkwụ, ma o mechara bụrụ onye ọsụ ụzọ oge niile.

MỤ NA mama m bi na Fritaụn. Anyị dara ogbenye. E nwekwara ndị ọzọ dara ogbenye anyị na ha bi n’otu èzí. Kemgbe m dị obere, si n’úkwù m gbadaa nwụrụ anwụ. Ihere na-eme m ịpụta èzí maka na amaghị m ihe ndị ọzọ ga-ekwu ma ha hụ m. Ọ bụ ya mere na mgbe mbụ ụkwụ m kpara n’èzí bụ mgbe m dị afọ iri na asatọ.

Mgbe m dị afọ iri na asatọ, otu nwaanyị Onyeàmà Jehova, bụ́ onye ozi ala ọzọ, bịara ozi ọma n’èzí anyị. Aha ya bụ Pauline Landis. Mgbe ọ hụrụ m, ọ gwara m na ya ga-achọ ịkụziri m Baịbụl. Ma, m gwara ya na amaghị m otú e si agụ na otú e si ede. Ya asị m na nsogbu adịghị, na ya ga-akụzikwara m otú e si agụ na otú e si ede. M kwetara ka ọ kụziwere m Baịbụl.

Ihe ndị Pauline kụziiri m na Baịbụl tọrọ m ụtọ. Otu ụbọchị, agwara m ya na m ga-achọ ịbịa ọmụmụ ihe ha na-enwe n’ụlọ dị ma a gafechaa ụlọ anyị. M gwara ya na m ga-eji ihe m ji aga ije abịa.

Mgbe Pauline bịara ịkpọrọ m ka anyị gaa ọmụmụ ihe, mama m na ndị èzí anyị chị obi n’aka na-ele otú m ga-esi aga. M weere ihe m ji aga ije, dowe ya n’ihu m, jide ya aka, huru ehuru na-aga ije. Ka m na-aga, ndị èzí anyị bidoro ịbara Pauline mba. Ha sịrị ya: “Ọ ga-emerụkwa ahụ́ o! O meela ihe a mbụ, ma o kweghị ya.”

Pauline medara obi jụọ m, sị: “Jay, ị̀ ka chọrọ ịga?”

Mụ asị ya, “Ee! M ka chọrọ ịga.”

Ndị èzí anyị nọ na-ele m anya ruo mgbe m pụrụ n’ámá. Mgbe m gaara ruo n’ámá, mkpu pụrụ ha n’ọnụ, ha akụọrọ m aka.

Ọmụmụ ihe ụbọchị ahụ tọrọ m ụtọ. Ihe ọzọ m gwara onwe m bụ na m ga-agbalịsi ike gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Tupu mụ eruo ebe ahụ, m ga-eji ihe ahụ m ji aga ije gara ruo ná ngwụcha ámá anyị, gbaa tagzi ruo n’ebe dị nso n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụmụnna abịazie kuru m rịa nnukwu ugwu dị ebe ahụ. Ọ na-abụkarị m rute, mụ agbanwee uwe m n’ihi na uwe m yi bịa na-abụ apịtị apịtị. Ma, otu nwanna nwaanyị bi na Swizaland nyeere m ezigbo aka. Ọ zụtaara m ígwè ndị ngwọrọ. M jirizie ígwè a na-aga mụ adị ùgwù n’anya.

Ka m na-agụ akụkọ Ndịàmà Jehova nwere nkwarụ, m bịara wepụtakwuo oge na-ejere Jehova ozi. M ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile n’afọ 1988. M rịọrọ Jehova ka o mee ka m nwee ike inyere otu onye ezinụlọ anyị aka ịghọ Onyeàmà Jehova. M rịọkwara ya ka o nyere m aka ịkụziri otu onye ọzọ Baịbụl, onye ahụ aghọọkwa Onyeàmà Jehova. Jehova zara m ekpere a. Akụziiri m ụmụ nwanne m nwaanyị abụọ Baịbụl, ha aghọọ ndị Jehova. Akụzikwaara m otu nwaanyị m ziri ozi ọma n’okporo ámá ihe, ya aghọọkwa Onyeàmà Jehova.

Ugbu a, anaghịzi m enwe ike iji aka m abụọ agba ígwè m. Ọ bụzi ndị ọzọ na-akwagharị m. Ahụ́ na-egbukwa m mgbu mgbe niile. Ma, achọpụtala m na ịkụziri ndị ọzọ gbasara Jehova na-eme ka m nwetatụ onwe m. Jehova enyerela m ezigbo aka n’ihi na ọṅụ m na-enwe ma m nọrọ n’ozi ọma na-akasi m obi. Jehova emeela ka m jiri ndụ m na-eme ihe bara uru ugbu a.