Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Esi M na Nwata Bụrụ Onye Agha, Ma Ugbu A, Abụ M Ọsụ Ụzọ Oge Niile

Esi M na Nwata Bụrụ Onye Agha, Ma Ugbu A, Abụ M Ọsụ Ụzọ Oge Niile

MGBE m dị afọ iri na isii ndị agha nnupụisi manyere m iso ha. Ha na-enye m ọgwụ ike na mmanya na-aba n’anya. Ọ na-abụkarị m ṅụchaa ha, mụ ebido kwawa mgbọ aghara aghara. Eso m ndị òtù a lụọ ọtụtụ agha, kpaakwa arụ. M na-akwa mmakwaara ugbu a maka ihe ndị ahụ m mere.

E nwere otu ụbọchị otu agadi nwoke, bụ́ Onyeàmà Jehova, bịara ozi ọma n’ebe anyị bi. Ọtụtụ ndị na-atụ anyị ụjọ, ma na-asọ anyị asọ. Ma nwoke Onyeàmà Jehova a na-abịa akụziri anyị Baịbụl. Mgbe ọ gwara m bịa ọmụmụ ihe ha, m gara. O nweghị ihe e kwuru n’ọmụmụ ihe ahụ m ka na-echeta. Ma, echefubeghị m otú ha si nabata m. Ha nabatara m nke ọma.

Mgbe agha ahụ bịara kpụrụ ọkụ n’ọnụ, mụ na Ndịàmà Jehova anaghịzi ahụ. Ka a na-alụ agha ahụ, emerụrụ m ezigbo ahụ́. E bukwa m gaa ebe a na-agwọ ndị òtù anyị merụrụ ahụ́. Tupu a lụchaa agha ahụ, esi m ebe ahụ gbapụ ma gbaga n’ebe ndị gọọmenti na-achị. N’ebe ahụ ka m nọ chilie aka elu na abụghịzi m onye agha nnupụisi. N’ihi ya, gọọmenti kpọgara m ebe ha na-azụ ndị agha nnupụisi chịliri aka elu. A nọ ebe ahụ kụziere anyị otú anyị na ndị mmadụ ga-esi biri n’udo.

Ma, e nwere ihe bụ mkpa m mgbe ahụ. Ọ bụ otú m nwere ike isi mata Chineke. Amalitere m ịga chọọchị Pentikọstal. Ma, ọ na-abụ m bịa chọọchị, ha ana-asị na m bụ Ekwensu a na-ahụ anya. N’ihi ya, m malitere chọwa Ndịàmà Jehova. Mgbe m hụrụ ha, mụ na ha malitere ịmụ Baịbụl, mụ ebido gawa ọmụmụ ihe ha. Mgbe m gwara ha arụ niile m kpara, ha gụụrụ m otu ihe Jizọs kwuru na Matiu isi itoolu, amaokwu nke iri na abụọ na nke iri na atọ. N’ebe ahụ, Jizọs sịrị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma. . . . ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.”

Amaokwu Baịbụl ndị a ha gụụrụ m ruru m n’obi. Ma m nwere daga m ji na-echebe onwe m. Ewepụtara m ya nye nwanna nwoke mụ na ya na-amụ Baịbụl, sị ya: “Eji m daga a echebe onwe m. Ma ugbu a, amatala m na Jehova na Jizọs hụrụ m n’anya, na ha ga-echebekwa m. Ọ dịghịzi uru daga a ga-abara m.”

Ụmụnna kụziiri m otú e si agụ na otú e si ede. E mechakwara mee m baptizim. Ka oge na-aga, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ oge niile. Ugbu a, m na-ekwusara ndị mụ na ha sobu kwaa mgbọ n’oge ahụ ozi ọma. Ha na-aja m mma n’ihi otú m si nwee ike ịhapụ ndụ ọjọọ anyị biri n’oge ahụ ma kpawazie àgwà ọma. Mụ na onyeisi anyị n’oge ahụ mụdịrị Baịbụl.

N’oge ahụ m bụ onye agha nnupụisi, amụrụ m ụmụ nwoke atọ. Mgbe m ghọrọ Onyeàmà Jehova, m gbalịrị inyere ha aka ka ha mụta eziokwu. Otu ihe na-eme m obi ụtọ ugbu a bụ na otu nwa m bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Di ọkpara m emeela baptizim, ọ bụkwa onye ọsụ ụzọ inyeaka ugbu a.