Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Anyị Gbanahụrụ Ndị Agha Nnupụisi

Andrew Baun

Anyị Gbanahụrụ Ndị Agha Nnupụisi
  • MGBE A MỤRỤ YA n’Afọ 1961

  • MGBE O MERE BAPTIZIM n’Afọ 1988

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụ onye ọsụ ụzọ oge niile n’obodo Pendembu tupu agha amalite n’afọ 1991. Obodo Pendembu dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Siera Lion.

N’OTU ehihie, ndị agha nnupụisi batara n’obodo anyị. Ha nọ na-agbali égbè elu ruo ihe dị ka awa abụọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ụmụaka égbè ha bu na-anyịgbu. Ha ruchara unyi, dịkwa mkpakara n’anya. Ntutu isi ha tụhịchara atụhị, anya na-achakwa ha ọbara ọbara ka ndị ṅụrụ ọgwụ ike.

Mgbe chi bọrọ, ha malitere igbu ndị mmadụ aghara aghara. E nwere ndị ha gbupụrụ ụkwụ na aka, nweekwa ndị ha gbagburu agbagbu. Ha dinakwara ọtụtụ ụmụ nwaanyị n’ike. Ebe niile na-agba ghara ghara. Nwanna Amara Babawo na ezinụlọ ya, nakwa mmadụ anọ na-abịa ọmụmụ ihe anyị, gbatara ọsọ ndụ n’ụlọ m. Anyị niile chị obi n’aka.

Obere oge, otu onyeisi ndị agha nnupụisi bịara n’ụlọ m. Ọ gwara anyị na a chọghị ịchọ anyị achọ n’ogige ndị agha n’ụtụtụ echi. Ọ gwakwara anyị na anyị bịaruo, na ha ga-ebido ịzụ anyị maka ịga agha. Ọ bụ eziokwu na anyị jụ ịga agha ahụ, e nwere ike igbu anyị, anyị kpebisiri ike na anyị agaghị aga. Anyị nọ na-ekpe ekpere abalị ahụ dum. Anyị biliri n’isi ụtụtụ, gụọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, na-echezi ka ndị agha nnupụisi ahụ bịa kpụrụ anyị. Ma ha abịaghị ọzọ.

“Nke a unu na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ọ pụtara na unu bụ Ndịàmà Jehova”

Otu ụbọchị, otu onyeisi ndị agha nnupụisi ahụ na mmadụ anọ n’ime ndị òtù ya bịara jiri anya ike biri n’ụlọ m. Ha achụpụghị anyị. N’ihi ya, anyị nọgidere na-enwe ọmụmụ ihe ma na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụlọ anyị. Otu ụbọchị anyị na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ụfọdụ ndị agha gwara anyị, sị: “Nke a unu na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ọ pụtara na unu bụ Ndịàmà Jehova.” Ha enweghị mmasị ịmụ Baịbụl, ma ha na-akwanyere anyị ùgwù.

Otu ụbọchị, otu nnukwu ọchịagha ha bịara ka ọ mara otú ndị òtù ya bi n’ụlọ m mere. O gbuchapụụrụ Nwanna Babawo ma kwee ya n’aka. O ji olu ike gwa ndị agha ya bi n’ụlọ m, sị: “Bịa, ùnu hụrụ nwoke a? Ọ bụ ọga m, bụrụkwa ọga unu. Ọkọ kọọ ya na ndị ha na ya nọ, mụ na unu achịpụ ya. Ùnu nụrụ ihe m kwuru?” Ha niile asị, “Ee! Nna anyị ukwu.” Ọchịagha ahụ nyeziri anyị akwụkwọ ikike o ji machie onye agha nnupụisi ọ bụla ịkpa anyị aka. Ọ gwara ndị agha ya na anyị bụ ndị udo.

Mgbe ọnwa ole na ole gachara, ndị agha nnupụisi ahụ malitere ịlụso ibe ha ọgụ. Nke a mere ka anyị gbaa ọsọ ndụ gbaga Laịberịa. Ma, ndị agha nnupụisi nke nọ na Laịberịa bidokwara nyewe anyị nsogbu. Anyị gwara ha na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Otu n’ime ha jụrụ anyị, sị: “Gịnị ka Jọn isi atọ amaokwu iri na isii kwuru?” Mgbe anyị gụrụ ihe ebe ahụ kwuru n’isi, ọ hapụrụ anyị.

Ka anyị na-aga, anyị hụkwara otu onyeisi ndị agha nnupụisi. Ọ gwara mụ na Nwanna Babawo ka anyị sowe ya. Anyị chere na nke anyị na-eme agwụla. Ma onye agha nnupụisi ahụ gwara anyị na ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl tupu agha ebido. O nyere anyị ego. Ọ nakwaara anyị akwụkwọ ozi anyị chọrọ inye ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị nso n’ebe ahụ ka o nye ha ya. O teghị aka, ụmụnna abụọ ebutere anyị nri na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. Ha dukwaara anyị gaa n’ebe aka na-agaghị akpa anyị.