Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Nwoke Ụlọ Nche

James Koroma

Nwoke Ụlọ Nche
  • MGBE A MỤRỤ YA n’Afọ 1966

  • MGBE O MERE BAPTIZIM n’Afọ 1990

  • ONYE Ọ BỤ Ọ na-esi Fritaụn ewega akwụkwọ ozi na Gini n’oge a na-alụ agha. Ọ na-esikwa na Gini ebute akwụkwọ anyị na Fritaụn.

MGBE ndị agha nnupụisi ahụ na ndị agha gọọmenti na-alụ agha na Fritaụn n’afọ 1997, ewepụtara m onwe m ịna-esi na Fritaụn ewega akwụkwọ ozi n’ebe e ji mere alaka ụlọ ọrụ na Kọnakrị, dị na Gini.

O nwere otu ụbọchị mụ na ụmụ nwoke ndị ọzọ banyere ụgbọala n’ebe ọhaneze na-abanye ụgbọala. Mgbe anyị na-aga, anyị nọ na-anụ ụda égbè n’ihu anyị, obi wụnyekwara anyị n’afọ. Ka anyị na-agbafe okporo ámá ndị dị n’ebe ahụ, ndị agha nọ na-agba égbè aghara aghara. Onye kwọ anyị laghachiri azụ sizie ụzọ ọzọ. Mgbe anyị gbatụrụ ụzọ ahụ, anyị hụrụ ndị agha nnupụisi ọzọ, ha akwụsị anyị ma sị anyị niile rịtuo. Mgbe ha jụkasịchara anyị ajụjụ ahụ́, ha hapụrụ anyị. Ka anyị gbakwa na-aga, ndị agha ọzọ kwụsịrị anyị. Ma ha mechara hapụ anyị n’ihi na otu n’ime ndị anyị na ha so ma onyeisi ha. Ka anyị rutewere ná ngwụcha obodo ahụ, anyị hụkwara ndị agha nnupụisi ọzọ. Ha kwụsịrị anyị ma mechaa sị anyị gawa. Ka anyị gba na-aga, anyị gbafere ọtụtụ ebe ndị agha na-eche nche n’ụzọ. Anyị rutere Kọnakrị ná mgbede. Ụgbọala anyị bụcha uzuzu uzuzu.

N’oge ndị ọzọ m na-aga na-alọta, m na-ebute akwụkwọ, ihe ndị e ji arụ ọrụ n’ọfis, akwụkwọ ụfọdụ e dere ihe gbasara alaka ụlọ ọrụ, nakwa nri na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka. M na-agbakarị tagzi ma ọ bụ bọs. Mgbe ụfọdụkwa, m na-akwụ ndị na-ebu ibu ụgwọ ka ha butere m akwụkwọ ndị ahụ ma ọ bụ mụ etinye ha n’ụgbọ epeepe gafee ọtụtụ mmiri.

O nwere otu ụbọchị m si Fritaụn jiri bọs buru ihe ndị e ji arụ ọrụ n’ọfis na-aga Kọnakrị. Mgbe anyị rutere n’ókè Siera Lion na Gini, ndị agha nnupụisi nọ ebe ahụ kwụsịrị anyị. Mgbe otu n’ime ha gwuru ihe ndị m bu anya, ọ jụkasịwara m ajụjụ ahụ́. Ka ọ nọ na-ajụ m ajụjụ a, anya m legharịrị, mụ ahụ otu n’ime ha mụ na ya so gaa akwụkwọ. Ndị agha ibe ya nọ na-akpọ ya Gaa Gaa n’Ogwu. N’ime ha niile, o nweghị onye ihu ya na-atụ ụjọ ka nke ya. Agwara m onye agha ahụ na-ajụkasị m ajụjụ ahụ́ na m bịara ịhụ Gaa Gaa n’Ogwu. Ozugbo ahụ, mụ akpọọ ya. Ozugbo o lere m anya, ya amata m ma gbara bịa makụọ m. Ka mụ na ya nọ na-achị, obere oge, ya ekechie ihu.

Ọ sịrị m: “Nnaa, kee ije? Ò nwere onye na-enye gị nsogbu?”

M gwara ya na nsogbu adịghị, na m chọrọ ịga Gini.

Ọ gwara ndị agha ibe ya ozugbo ahụ ka ha hapụ anyị, gwakwa ha akpakwala ihe ndị anyị bu aka.

Si ụbọchị ahụ gawa, mgbe ọ bụla ụgbọala m nọ na ya gbarutere ebe ahụ Gaa Gaa n’Ogwu na ndị agha ibe ya na-anọ, ọ na-agwa ndị òtù ha ka ha pụọ n’ụzọ ka anyị gafere. M na-enye ndị agha ahụ Ụlọ Nche na Teta!, obi na-atọkwa ha ụtọ. Ha mechara kpọwa m Nwoke Ụlọ Nche.