Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Ihe Ka Dayamọnd Mma

Tamba Josiah

Ihe Ka Dayamọnd Mma
  • MGBE A MỤRỤ YA n’Afọ 1948

  • MGBE O MERE BAPTIZIM n’Afọ 1972

  • ONYE Ọ BỤ Ọ rụrụ ọrụ n’ebe a na-egwute dayamọnd tupu ya abụrụ Onyeàmà Jehova. O sozi na Kọmitii Alaka dị na Siera Lion.

ARỤRỤ m ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị Briten na-egwute dayamọnd n’obodo Tongo Filds n’afọ 1970. Obodo a dị n’ebe ugwu Kenema. Ha nwejuru dayamọnd enweju. M na-agakwa achọ dayamọnd n’onwe m mgbe ụfọdụ. Ọ na-abụ m chọta dayamọnd, mụ agaa ree ya na Kenema ma nọrọ ebe ahụ kporie ndụ tupu mụ alọta.

N’afọ 1972, mụ na Ndịàmà Jehova hụrụ, anyị malitekwara ịmụ Baịbụl. Mgbe ọnwa ise gachara, ndị okenye hụrụ na m ruru eru ka e mee m baptizim. Ma, e nwere otu nsogbu m nwere. Nsogbu ahụ bụ na enweghị m oge ezumike m ga-eji gaa mgbakọ a ga-anọ mee m baptizim. N’ihi ya, agwara m onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ ka ọ rụchitere m ọrụ. Ọ gwara m na ya ga-arụchitere m ọrụ ahụ ma ọ bụrụhaala na m ga-ekwe enye ya ego a na-akwụ m n’izu. Agwara m ya na nsogbu adịghị, n’ihi na baptizim ahụ a na-aga ime m karịrị ego. Ma, mgbe m lọtara mgbakọ ahụ, ọ gwara m enyekwala ya ego n’ihi na ife Chineke ka ihe niile mkpa. Mgbe ọnwa isii gachara, m hapụrụ ezigbo ọrụ ahụ m na-arụ ma ghọọ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche, si otú ahụ na-akpakọbara onwe m akụ̀ n’eluigwe.—Mat. 6:19, 20.

Emechakwara m bụrụ onye nlekọta sekit. Arụrụ m ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na ọrụ sekit ruo afọ iri na asatọ. Ọrụ abụọ a kpọgara m ọtụtụ ebe na Siera Lion. Ka oge na-aga, alụrụ m nwaanyị. Aha ya bụ Christiana. Ọ hụrụ Jehova n’anya, ọ na-akwadokwa m nke ọma. Jehova mechara jiri otu nwa nwaanyị gọzie mụ na nwunye m. Anyị gụrụ ya Lynette.

E nwere mgbe m na-achọgharị dayamọnd, ma emechara m chọta ihe ka dayamọnd mma. Ihe ka ya mma m chọtara bụ eziokwu gbasara Jehova na ihe ọma ndị ọ na-emere anyị n’ihi ozi anyị na-ejere ya

N’oge ahụ a na-alụ agha na Siera Lion, mụ na nwunye m na-asụ ụzọ n’obodo Bo. Obodo a bụ ebe ọzọ dayamọnd juru eju na Siera Lion. Anyị nyeere ọtụtụ ndị nọ na Bo aka ha abụrụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe ihe dị ka afọ anọ gachara, ọtụtụ ndị batara n’ọgbakọ anyị. Dị ka ihe atụ, e kee mmadụ ole nọ n’ọgbakọ anyị ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ isii batakwuru n’ọgbakọ. E nwere ọgbakọ atọ ugbu a na-eme nke ọma n’obodo Bo.

N’afọ 2002, a họpụtara m ka m soro na Kọmitii Alaka dị na Siera Lion. Mụ na nwunye m Christiana bi nso na Betel. Ana m esi ebe ahụ anyị bi abịa ọrụ na Betel kwa ụbọchị. Ma, nwunye m bụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche. Nwa anyị nwaanyị na-eje ozi na Betel. O sokwa ná ndị na-asụgharị asụsụ Krio.

E nwere mgbe m na-achọgharị dayamọnd, ma emechara m chọta ihe ka dayamọnd mma. Ihe ka ya mma m chọtara bụ eziokwu gbasara Jehova na ihe ọma ndị ọ na-emere anyị n’ihi ozi anyị na-ejere ya. Enyekwarala m mmadụ iri na asatọ aka ha aghọọ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs. O doro anya na Jehova agọziela m mmaji kwuru mmaji.