Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Obodo Siera Lion Tọwara M Ụtọ

Cindy McIntire

Obodo Siera Lion Tọwara M Ụtọ
  • MGBE A MỤRỤ YA n’Afọ 1960

  • MGBE O MERE BAPTIZIM n’Afọ 1974

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụ onye ozi ala ọzọ kemgbe afọ 1992. O jeela ozi na Gini nakwa na Senigal. Ọ na-eje ozi ugbu a na Siera Lion.

MGBE m kwatara na Siera Lion, o were m naanị izu abụọ, ebe ahụ atọwa m ụtọ. Ọ na-eju m anya otú ndị mmadụ si ebu nnukwu ibu n’isi na-aga n’ejideghị ya aka. Ebe niile bụ mmadụ mmadụ. Ụmụaka na-egwu egwu ebe niile n’okporo ámá, na-agba egwú, na-akụkwa aka. Obi na-atọkwa ndị Siera Lion ụtọ. Ha na-eyi ụdị efe dị iche iche mara mma. Ihe ndị a niile na-eme m obi ụtọ n’obodo a.

Ihe kacha atọ m ụtọ na Siera Lion bụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ndị Siera Lion na-anabata ndị ọbịa nke ọma. Ha anaghị eji Baịbụl egwu egwu. Ha na-egekwa ntị nke ọma mgbe a na-akọwara ha ihe dị na Baịbụl. Ndị mmadụ na-akpọkarị m bịa n’ụlọ ha. Ọ na-abụ mụ na ha nọchaa, m na-ala, ụfọdụ n’ime ha edupụ m. Àgwà ọma ndị a ha na-akpa mere ka ọ dịrị m mfe idi nsogbu ndị dị ka ụkọ mmiri na ọkụ a na-ewere mgbe niile ebe ahụ.

Ndị mmadụ na-ajụ m mgbe ụfọdụ ma owu ọ̀ na-ama m. Ihe mere ha ji ajụ m ihe a bụ na alụbeghị m di. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe m na-eme nke mere na owu anaghị ama m. Eji m ndụ m na-eme ihe bara uru.