Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Mere n’Afọ 1914

Ihe Ndị Mere n’Afọ 1914

ỤLỌ NCHE January 1, 1914 nke Bekee kwuru, sị: “Anyị ma na ọ bụ n’afọ 1914 ka anyị ga-ezi ndị mmadụ ozi ọma karịa otú anyị ziri ha ya n’afọ ndị gara aga.” Tupu afọ 1914 eruo, Ndị Mmụta Baịbụl nọ na-atụ anya afọ ahụ. Mgbe afọ ahụ malitere, ha kpọkwuru ije ozi ọma mkpa. Otú Ndị Mmụta Baịbụl si gbaa mbọ kwusaa ozi ọma n’afọ ahụ mere ka nde kwuru nde mata nkwa Chineke kwere ụmụ mmadụ na Baịbụl. Ma, ndị na-anaghị efe Chineke gbara mbọ na-eme ihe ọzọ.

Ọgba Aghara Malitere n’Ọtụtụ Ebe

Ná mmalite afọ 1914, e nwere ọgba aghara n’ebe a na-egwu kol n’otu obodo dị n’Amerịka. Ndị na-egwu kol jụrụ ịrụ ọrụ n’ihi ihe ndị isi ụlọ ọrụ ha na-eme ha. Ka a na-eme ka a na-eme, a chụpụ ha n’ebe a rụụrụ ha ụlọ, ha gaa jiri tapolin rụọ ebe ha bi. N’abalị iri abụọ n’ọnwa Eprel afọ ahụ, ọgụ dara ebe ahụ, a gbawa ndị mmadụ égbè, mechaa gbaa ebe ahụ ọkụ. Otú a ihe si na-eme mere ka ndị ahụ na-egwu kol malite igbu ndị na-eche nche n’ụlọ ọrụ kol. Ọgba aghara ahụ tara isi ọtụtụ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị na ụmụaka. E mechara kpọọ ndị soja ka ha bịa kwụsị ọgba aghara ahụ.

Ọgba aghara nke dị na Yurop kadị nke Amerịka njọ. Dị ka ihe atụ, n’abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Jun afọ 1914, otu nwa okorobịa onye Bọznia aha ya bụ Gavrilo Princip gbagburu Francis Ferdinand, onye gaara abụ eze Ọstria. Ọ bụ ọnwụ Ferdinand kpasuru Agha Ụwa Mbụ. Ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ afọ ahụ, agha ahụ ezuola Yurop niile.

E Kwusiri Okwu Ikwusa Ozi Ọma Ike ná Mgbakọ

N’agbanyeghị na e nwere ọgba aghara n’ọtụtụ ebe n’ụwa, Ndị Mmụta Baịbụl nọ na-echetara ibe ha na ha ekwesịghị iji ikwusa ozi ọma egwuri egwu. Ha enwetụbeghị mgbakọ na Saụt Afrịka. Ma, mgbakọ mbụ ha nwere n’obodo ahụ malitere n’abalị iri n’ọnwa Eprel afọ 1914. Ndị bịara ya dị iri mmadụ atọ na anọ. Nwanna William W. Johnston so gaa mgbakọ ahụ. O kwuru, sị: ‘Ndị bịara mgbakọ ahụ dị nnọọ ntakịrị. Ndị e mere baptizim fọrọ obere ka ha bụrụ ọkara ndị bịara mgbakọ ahụ. Ha dị mmadụ iri na isii, ụmụ nwoke asatọ na ụmụ nwaanyị asatọ.’ N’ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ, ha kwurịtara otú ka mma ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma na Saụt Afrịka. Na e nwere ihe karịrị iri puku ndị nkwusa itoolu na Saụt Afrịka ugbu a gosiri na ndị nkwusa ole na ole ahụ nọ n’obodo ahụ n’afọ 1914 ejighị ikwusa ozi ọma gwuo egwu.

N’ụbọchị ahụ e gburu onye ahụ gaara abụ eze Ọstria, Ndị Mmụta Baịbụl malitere mgbakọ na Klintịn Ayọwa dị n’Amerịka. N’ụbọchị nke atọ ná mgbakọ ahụ, nwanna A. H. MacMillan gwara ndị bịara mgbakọ ahụ, sị: “Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke kwụọ anyị ụgwọ, anyị ekwesịghị ịhapụ ịna-eme ihe ọ chọrọ. Anyị kwesịrị ịna-ezi onye ọ bụla anyị hụrụ ozi ọma.”

Nde Kwuru Nde Kiriri Fim Photo-Drama

Fim “Photo-Drama of Creation,” ya bụ, “Foto Ihe Nkiri nke Okike,” bụ fim ọ na-abụ e tinye, egwú na-akpọ, olu mmadụ ana-akọwa ihe a na-egosi. Ụbọchị mbụ e gosiri ndị mmadụ fim a bụ n’abalị iri na otu n’ọnwa Jenụwarị afọ 1914. Ebe e gosiri ha ya bụ na Niu Yọk Siti. N’ụbọchị ahụ, ihe kiriri ya dị puku mmadụ ise. Ọtụtụ ndị ọzọ ekirighị ya n’ihi na ebe ahụ abaghị ha.

Otu Ụlọ Nche kwuru na a rụọla ọrụ na fim “Photo-Drama of Creation” afọ abụọ, ma, n’ọnwa Jenụwarị afọ 1914, ha arụchabeghị ya otú ha chọrọ ka ọ dị. Malite na Jenụwarị ruo n’ihe dị ka ọnwa Jun afọ ahụ, ụmụnna ndị na-arụ ọrụ na fim ahụ kpakwuru ya aka ka o wee dịkwuo mma. Dị ka ihe atụ, ha tinyere ebe nwanna Charles Taze Russell kwuru okwu o ji kọwaa fim ahụ. Okwu ahụ o kwuru mere ka ọhaneze mara ndị mepụtara ya.

E nwere mgbe o ruru, a na-egosi ya n’obodo a, a na-egosikwa ya n’obodo ọzọ n’otu oge ahụ. Obodo ndị e gosiri ya n’oge ahụ dị iri asatọ. Ka ọ na-eru ọnwa Julaị afọ 1914, a malitere igosi ya ndị mmadụ na Glasgo nakwa na Lọndọn. Obodo abụọ a dị na Briten. N’ọnwa Septemba afọ ahụ, e gosiri ya ndị mmadụ na Denmak, Finland, Jamanị, Swidin, na Swizaland. E gosikwara ya ndị mmadụ n’Ọstrelia nakwa na Niu Ziland n’ọnwa Ọktoba afọ ahụ. Ndị kiriri fim ahụ n’afọ 1914 karịrị nde mmadụ itoolu.

Na fim ahụ, e nwere ọtụtụ ihe e mere otú ha ga na-emegharị ahụ́ nakwa ndị nke na-anaghị emegharị ahụ́. A na-anụkwa olu na-akọwa ihe ndị ahụ e sere ese. Ọ bụghị obere ego ka e ji mepụta ya. Ndị ma otú e si egosi ndị mmadụ fim ahụ ehighịkwa nne. Ọ bụ ya mere e ji buru ụzọ gosiwe ya ndị bi n’ebe ndị mepere emepe. Ma, a chọkwara ka ndị bi n’ime ime obodo lee fim ahụ. N’ihi ya, Ndị Mmụta Baịbụl mepụtara fim a n’ụdị abụọ ọzọ. Ha adịghịkwa ogologo. A kpọrọ nke mbụ “Eureka Drama Y.” Fim a bụ ihe nkiri slaịd e tinyere okwu ndị si na Baịbụl nakwa egwú. A kpọrọ nke abụọ “Eureka Drama X.” E nwekwara “Eureka Family Drama.” Ọ bụghị fim. Ihe dị na ya bụ naanị okwu a na-egere egere. O pekwara ezigbo mpe. Mgbe ọ na-erula ngwụcha afọ 1914, ya bụ, mgbe ọ na-erubeghị ọnwa anọ e wepụtara fim “Eureka Drama,” ihe karịrị iri puku mmadụ asaa elela ya n’Amerịka.

Ndị Kọpọtụa na Ndị Ọzọ Wepụtara Onwe Ha Na-ekwusa Ozi Ọma

N’agbanyeghị na fim ahụ mere ka ọtụtụ ndị na-ege ntị n’ozi ọma, Ndị Mmụta Baịbụl ma na ọ bụghị naanị otú ahụ ka ha kwesịrị isi na-ezi ozi ọma. E nwere akwụkwọ ozi nwanna Charles Taze Russell degaara ndị kọpọtụa (ya bụ, ndị ọsụ ụzọ) n’oge ahụ. Ọ sịrị: ‘Ndị kacha enyere ndị mmadụ aka ịghọ Ndị Kraịst bụ ndị kọpọtụa. N’ihi ya, anyị agaghị achọ ka ndị kọpọtụa soro na-egosi ndị mmadụ fim a. Ka ụmụnna ndị ọzọ na-egosi ya ndị mmadụ.’

N’ọnwa Jenụwarị afọ 1914, ndị bụ́ ndị kọpọtụa dị narị asatọ na iri ise. N’afọ ahụ, akwụkwọ bụ́ Studies in the Scriptures ha nyere ndị mmadụ karịrị narị puku asaa. Otu Ụlọ Nche kwuru na obi dị ụmụnna ndị ọzọ ụtọ maka otú ndị kọpọtụa si ekwusa ozi ọma. Ọ gwakwara ụmụnna ka ha na-agba ha ume n’ihi na ihe na-esikwara ha ike otú ahụ ọ na-esiri ndị ọzọ ike.

Ụmụnna ndị ọzọ na-abụghị ndị kọpọtụa nyekwara ndị mmadụ traktị ndị e biri n’asụsụ dị iche iche. N’afọ 1914, traktị bụ́ The Bible Students Monthly ha nyere ndị mmadụ karịrị nde iri anọ na asaa. Ha nyekwara ha traktị ndị ọzọ.

Ọtụtụ ndị hụrụ otú Ndị Mmụta Baịbụl si jiri obi ha niile na-ekwusa ozi ọma. Ha na-ezi mmadụ niile ozi ọma, ha anaghịkwa ana ndị bịara ọmụmụ ihe ha ego onyinye. Ihe a mere otu ụkọchukwu ji kwuo, sị: “Obere oge ugbu a, ndị mmadụ ga-echewe na ịna ha ego onyinye bụ ihe ọjọọ. Gịnị ka anyị ga-emezi? Pastọ Russell na-ewetara anyị aha ọjọọ.”

Oge Ndị Jentaịl Gwụrụ

Ndị Mmụta Baịbụl kweere na oge ndị Jentaịl ma ọ bụ oge ndị mba ọzọ e kwuru okwu ya na Luk 21:24 ga-agwụ n’ihe dị ka abalị mbụ n’ọnwa Ọktoba afọ 1914. Ha nọ na-eche ka ọnwa ahụ bịawa abịa. Ụfọdụ ụmụnna nwedịrị kaadị ha ji agụkọ ụbọchị ole fọrọ. Ọtụtụ n’ime ha chere na ha ga-aga eluigwe n’ụbọchị ahụ.

N’ụtụtụ abalị abụọ n’ọnwa Ọktoba afọ 1914, Nwanna Russell maara ndị Betel ọkwa mgbe ọ batara n’ebe ha na-anọ eri nri. Ọ sịrị: “Oge ndị Jentaịl agwụla; ndị eze ha achịchaala.” Ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ ma ihe ahụ o kwuru maka na ọ dị n’abụ nke 171 n’akwụkwọ abụ ha na-abụ n’oge ahụ. Kemgbe afọ 1879, ihe dị n’akwụkwọ abụ ha bụ “Oge ndị Jentaịl agwụwala.” Ma, ebe ọ bụ na “oge ndị Jentaịl” ma ọ bụ “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” agwụla, ihe ahụ ha na-abụ adabaghịzi adaba. (Luk 21:24) E mechara degharịa ya n’akwụkwọ abụ anyị.

Kaadị ụmụnna ji agụkọ ụbọchị ole fọrọ tupu ha agawa eluigwe

Mgbe afọ 1914 na-agwụla, e chiela Jizọs Kraịst eze n’eluigwe. Ụfọdụ ụmụnna chere na ha arụchaala ọrụ e nyere ha. Ha amaghị na ha na-abanye n’oge a ga-anwale ha, yọchaakwa ha. Isiokwu afọ 1915 bụ “Ùnu pụrụ ịṅụ iko nke m na-aga ịṅụ?” O si na Matiu 20:22. “Iko” Jizọs bu n’obi bụ ahụhụ niile ọ ga-ata tupu e gbuo ya. O ruola mgbe a ga-akpagbu Ndị Mmụta Baịbụl. Mkpagbu a ga-esi ma n’aka ụmụnna ha ma n’aka ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ha edie mkpagbu ahụ, ọ ga-egosi na ha na-erubere Jehova isi.