Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga

Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga

N’ọhụụ, Jehova mere ka Ezikiel hụ nnukwu ụgbọ ịnyịnya na-agba n’eluigwe. Ụgbọ ịnyịnya ahụ nọchiri anya ndị ohu Jehova nọ n’eluigwe. N’agbanyeghị na o buru ezigbo ibu, ọ na-agba oké ọsọ, na-agbanwekwa ebe ọ na-aga n’egbughị oge. (Ezik. 1:15-28) Ihe ndị magburu onwe ha ndị ohu Jehova megasịrị n’afọ gara aga na-egosi na ha so ụgbọ ịnyịnya ahụ na-aga ụkwụ na ụkwụ.

NÁ NKEBI A

Ọgbakọ Jehova Na-aga n’Ihu

O doro anya na Jehova kwadoro ka e bupụ isi ụlọ ọrụ anyị na Niu Yọk Siti gaa Wọwik.

E Ji JW.ORG Ezi “Mba Niile” Ozi Ọma

Ihe dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet na-enyere anyị aka izi “mba niile” ozi ọma.

Obi Dị Ha Ụtọ Maka Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET

Ọtụtụ ndị detara akwụkwọ ozi ekele maka Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET.

Katuun Anyị Na-atọ Ụmụaka Ezigbo Ụtọ

Gụọ gbasara otú vidio a si na-enyere ezinụlọ dị iche iche aka, na-emekwa ka ụmụaka na-akpa ezigbo àgwà.

Ile Ihe Ndị Ga-eme Gị Obi Ụtọ

Gụọ banyere ihe ndị merela n’ọgbakọ Jehova kemgbe afọ 33.

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

Okwu ndị a gbasara Ndịàmà Jehova nọ ná mba iri na abụọ ka dị n’ụlọikpe. Ha na-egosikwa na a ka nwere ike ịna-emegide Ndịàmà Jehova maka ihe ha kweere.

Ihe Ndị Mere n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

Ndịàmà Jehova na-agba mbọ arụ ebe mara mma ha na-anọ efe Chineke.

Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Nyefere Jehova

Gụọ banyere alaka ụlọ ọrụ ndị e nyefere Jehova.