Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Katuun Anyị Na-atọ Ụmụaka Ezigbo Ụtọ

Katuun Anyị Na-atọ Ụmụaka Ezigbo Ụtọ

N’ụwa niile, e nweghị ebe a na-amaghị nwata nwoke ahụ mere otu n’ime fim ndị a na-akpọ Bụrụ Enyi Jehova. Aha ya bụ Kelechi. A sụgharịala fim nke mbụ ahụ n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri atọ. Ọtụtụ ndị edetakwala akwụkwọ ozi iji kelee anyị maka fim ndị ahụ.

Akwụkwọ ozi a si n’aka ụmụnne abụọ. Otu dị afọ iri na otu nke ọzọ adịrị afọ asatọ. Ha sịrị: “Anyị chọrọ inye onyinye anyị ji akwado ọrụ ikwusa ozi ọma. Ihe a bụ ego anyị retere n’ụmụ ehi abụọ anyị kpara. Ihe mere anyị ji enye unu ego a bụ na anyị chọrọ ka unu jiri ya metakwuo fim Bụrụ Enyi Jehova. Anyị na-eche na ọ ga-adị mma ka Kelechi nwee nwanne nwaanyị ka ọ ghara ịbụ naanị ya ka nne na nna ya ga na-apa apa. Ọ bụ fim Kelechi kacha atọ anyị ụtọ.”

Ọtụtụ ụmụaka bu fim ahụ n’isi, ma abụ ya niile ma okwu e ji kọwaa ya. Otu nwanna nwaanyị kwuru na ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ ha dị otu narị, nakwa na ụmụaka ndị na-erubeghị afọ iri nọ n’ọgbakọ ha dị iri anọ. Nwanna nwaanyị ahụ nọ n’ebe ihu n’ụbọchị ha ji abụ nke 120 mechie ọmụmụ ihe. O kwuru na anya mmiri gbara ya mgbe ọ nụrụ ka ụmụaka ahụ ji obi ha niile na-abụ ya.

Otu nwaanyị kwuru na mgbe nwa nwa ya lere fim ahụ ugboro abụọ, o kwuru na ya ga na-edewezi ihe ndị ya ji egwu egwu ebe ha kwesịrị ịdị ka ha ghara ịkwatu onye ọ bụla. Nwata ahụ kwuru na ya ga-eji aka ya dewe ihe ndị ahụ ebe ha kwesịrị ịdị tupu ya erie nri.

N’otu ime obodo dị na Saụt Afrịka, e nwere otu ụlọ ụmụaka na-enuga kwa ụbọchị. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bi ebe ahụ. Ụfọdụ chere na ọ bụ swiit ndị ahụ na-ere mere ụmụaka ahụ ji aga ebe ahụ. Ma, ihe mere ha ji aga bụ na ụmụaka ibe ha na-akpọ ha ka ha gaa lee fim Kelechi n’asụsụ Kosa. E nwere mgbe ụmụaka gara ebe ahụ dị iri na otu, ha niile bukwa abụ 120 n’isi.

N’Ekwedọ, e nwere ụmụaka abụọ aha ha bụ Isaac na Saul. Otu dị afọ asatọ, nke ọzọ adịrị afọ ise. Ha abụghị Ndịàmà Jehova. Ha na-asụ asụsụ Kichua. Ọ na-abụ e nye ha ego ha ga-eji azụrụ ihe, ha edewe ya ka ha jiri ya zụọ égbè ụmụaka, mma na ihe e ji alụ ọgụ. Otu ụbọchị, mama ha gwara ha ka ha dozie ime ụlọ ha, tinyekwa ihe niile ha ji egwu egwu n’ime katọn dị n’okpuru àkwà ha. Mgbe e mechara, e nwere onye nyere ha fim Bụrụ Enyi Jehova, ha niile elee ya. Ka otu izu ha lere fim ahụ gachara, mgbe mama ha na-azacha ụlọ ha, ọ chọpụtara na naanị ihe dịzi na katọn ahụ bụ ụgbọala ụmụaka ji egwu egwu. Ọ jụrụ ha ebe ihe ndị ọzọ ha ji egwu egwu dị. Ha asị ya, “Anyị etufuola ha maka na Jehova achọghị ka anyị jiri ihe ndị ahụ na-egwu egwu.” Ugbu a, Isaac hụhaala ka ụmụaka ndị ọzọ ji ihe ndị dị ka égbè egwu egwu, ọ sị ha: “Ejizila ihe ahụ egwu egwu. Jehova kpọrọ ya asị.”

Kroeshia: Abụ anyị na-atọgbu ụmụaka atọgbu