Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Ile Ihe Ndị Ga-eme Gị Obi Ụtọ

Ile Ihe Ndị Ga-eme Gị Obi Ụtọ

N’ọnwa Ọktoba 2012, e mepere ebe e dewere ihe ndị na-egosi otú ihe sirila gaa n’ọgbakọ Jehova kemgbe ụwa na Bruklin dị na Niu Yọk. Ihe ndị dị ebe ahụ na-egosikwa otú e sirila kpagbuo ndị na-eso ụzọ Jizọs. Onye ọ bụla chọrọnụ nwere ike ịbịa ebe ahụ legharịa anya.

N’izu mbụ e mepere ebe ahụ, ndị Betel na ihe karịrị puku mmadụ anọ na narị abụọ bịara lee ihe ndị dị ebe ahụ. Nwanna nwaanyị aha ya bụ Naomi bi nso ebe ahụ, o sokwa ná ndị mbụ bịara legharịa anya ebe ahụ. Mgbe o legharịchara anya, ọ sịrị: “Otú e si hazie ihe ndị ahụ n’oge ha mere nyeere m aka ịghọtakwu mgbe ihe ndị ahụ mere nakwa ihe mere ha ji mee. M mụtara ọtụtụ ihe gbasara ọgbakọ Jehova na ihe ndị mere na ya n’oge anyị a.”

Ihe ndị e dewere ebe ahụ bụ ihe ndị mere malite n’afọ 33 ruo oge anyị a. E kere ha ụzọ anọ. Ebe nke ọ bụla nwere isiokwu nke ya nke si na Baịbụl. Tupu mmadụ amalite ile ihe ndị dị n’ebe nke ọ bụla, ọ ga-ebu ụzọ lee obere vidio ga-akọwara ya ihe ndị ọ na-aga ịhụ. Vidio ndị ahụ dị n’asụsụ Bekee ma i nwere ike ige ha n’asụsụ asaa ọzọ.

Isiokwu ebe nke mbụ bụ, “Ụmụ Mmadụ Hụrụ Ọchịchịrị n’Anya.” O si n’ihe Jizọs kwuru na Jọn 3:19. Baịbụl buru amụma na ndị ọjọọ ga-amalite “na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ” mgbe ndịozi Jizọs ga-anwụcha. (Ọrụ Ndịozi 20:30) Ha ga-emesi onye ọ bụla na-ekweghị nke ha kwuru ike.

Isiokwu nke abụọ bụ, “Ka Ìhè Nwupụta.” O si ná 2 Ndị Kọrịnt 4:6. O gosiri otú ndị chọrọ ịmata nke bụ́ eziokwu si malite ịmụ Baịbụl n’ihe dị ka otu narị afọ na iri atọ gara aga. Ha jụrụ ozizi niile na-esighị na Baịbụl ma malite ịgwa ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl n’atụghị ụjọ. Nkebi a gosiri ọtụtụ ihe ọhụrụ ha mụtara na Baịbụl nakwa otú ọnụ ọgụgụ ha si malite ihi nne tupu Agha Ụwa Mbụ amalite.

Ị ga-ahụkwa ebe e dewere ihe ndị ka na-echetara anyị ike ọgbakọ Jehova kparala ma a bịa n’ime fim. N’afọ 1914, Ndị Mmụta Baịbụl, bụ́ ihe a na-akpọbu Ndịàmà Jehova, malitere igosi ndị mmadụ fim a kpọrọ “Photo-Drama of Creation.” Na fim ahụ, e nwere ihe ndị na-emegharị ahụ́ na ihe ndị na-anaghị emegharị ahụ́, a na-anụkwa olu ndị mmadụ. Nde kwuru nde mmadụ lere ya. Ihe ndị e dewere ebe ahụ bụ ụfọdụ ihe ndị e ji mee fim ahụ, okwu na-anaghị ewe oge e ji kọwaa ya na ihe karịrị narị slaịd ise dị na ya.

Isiokwu ebe nke atọ bụ, “Dragọn ahụ Wee Wee Iwe.” O si ná Mkpughe 12:17, bụ́ ebe na-ekwu otú Setan si akpagbu ndị Kraịst. Ebe a na-akọwa otú Ndị Kraịst si jụ itinye aka n’agha. E dewere foto na ihe ndị ọzọ gosiri otú e si kpagbuo ụmụnna ndị jụrụ ịga agha. E nwekwara ụfọdụ obere vidio na-egosi otú e si taa ha ahụhụ. Dị ka ihe atụ, e nwere vidio na-egosi ihe e mere Remigio Cuminetti, bụ́ onye Ịtali, mgbe ọ jụrụ iyi uwe ndị soja aga Agha Ụwa Mbụ. Vidio ọzọ na-egosi otú e si chụọ Alois Moser bụ́ onye Ọstria n’ọrụ, tụọkwa ya mkpọrọ na Dakau maka na ọ jụrụ ikwu na nzọpụta si n’aka Hitler. N’ebe a, a rụrụ ụlọ mkpọrọ gbara itiri nke yiri ụlọ mkpọrọ ndị ahụ a tinyere Ndịàmà Jehova. E tinyekwara foto ụfọdụ ụmụnna ndị a tụrụ mkpọrọ na Gris, Japan, Poland, ebe bụbu Yugoslavia, nakwa ebe ndị ọzọ n’ime ya.

Isiokwu ebe nke ikpeazụ bụ, “Ozi Ọma A Na-ezi Mba Niile.” O si ná Mkpughe 14:6. Ọ na-akọwa otú Ndịàmà Jehova si ekwusa ozi ọma kemgbe oge ikpeazụ a. Foto ndị a mapawara ebe ahụ na-egosi otú ọnụ ọgụgụ ha si na-ehi nne, otú ha si na-ekwusasi ozi ọma ike nakwa otú ha si egosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya. Ihe ikpeazụ dị n’ebe ahụ bụ kọmputa a na-ekiri foto ụlọ Ndịàmà Jehova ji mere isi ụlọ ọrụ ha n’ihe karịrị otu narị afọ gara aga.

Ọ bụ na 25 Kolọmbịa Haịts, Bruklin, ka ihe ndị a dị. A na-emepe ya site na Mọnde ruo Fraịdee, malite n’elekere asatọ ụtụtụ ruo elekere ise ná mgbede. A naghị akwụ ụgwọ. Ọ bụrụ na i bi na Niu Yọk Siti, gbalịa bịa lee ihe ndị a maka na ha ga-abara gị uru.