Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst, sị: “Na-echetanụ ndị nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ dị ka à ga-asị na e kere unu na ha agbụ.” (Hib. 13:3) Anyị na-echeta ụmụnna anyị ndị nọ mkpọrọ n’ebe dị iche iche. Anyị na-arịọkwa Jehova “maka ndị eze na ndị niile nọ n’ọkwá dị elu; ka anyị wee na-ebi ndụ dị nwayọọ na nke dị jụụ ná nsọpụrụ Chineke zuru ezu na iji ihe kpọrọ ihe.”—1 Tim. 2:1, 2; Efe. 6:18.

N’afọ gara aga, e nwere okwu gbasara Ndịàmà Jehova n’ebe dị iche iche. Lee ụfọdụ n’ime ha:

Na Rọshịa, ndị Chọọchị Ọtọdọks na ndị ọchịchị na-agbalị ime ka ụmụnna anyị kwụsị izi ndị mmadụ ozi ọma n’obodo ahụ. Ma, ha ka ‘na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisakwa ozi ọma.’ (Ọrụ Ndịozi 5:42) E nwere iwu ndị ọchịchị Rọshịa tiri ha ji ejide onye ọ bụla na-agba gọọmenti mgba okpuru. Ma, ha na-eji iwu a emesi ụmụnna anyị ike. Ha machikwara ụfọdụ akwụkwọ anyị maka na ha na-asị na ihe dị na ha na-agba ọchịchị ha mgba okpuru. Akwụkwọ anyị ha machiri dị iri asaa, ha tinyere aha akwụkwọ ndị ahụ n’aha akwụkwọ ndị ọzọ ha machiri n’obodo ahụ. N’ihi ya, ndị uwe ojii na-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’ụlọ ụmụnna anyị na-achịkọrọ akwụkwọ ndị ahụ. Ha na-akpọchi ọtụtụ ụmụnna, seekwa ha foto maka na ha na-aga ozi ọma. Ha na-amanyekwa ha ime ihe ha na-ekwesịghị ime.

N’ọnwa Mee 2013, a kpụpụrụ ụmụnna iri na isii ụlọikpe n’obodo a na-akpọ Taganrọg maka na ha gara ọmụmụ ihe na ozi ọma. Nke a bụ nke mbụ a na-akpụpụ ụmụnna anyị ụlọikpe maka okpukpe anyị kemgbe ọchịchị ndị Sọviet Yuniọn dara. N’ebe ọzọ n’obodo ahụ, ndị ọchịchị na-arịọ ụlọikpe ka ha maa ụmụnna anyị ikpe ma kwuo na ihe dị n’akwụkwọ anyị ụfọdụ na-egosi na ụmụnna anyị na-agba ọchịchị mgba okpuru.

Ndị ọchịchị Eritria ka na-echikwa ụmụnna anyị ọnụ n’ala. Dị ka ihe atụ, n’ọnwa Julaị 2013, bụ́ mgbe anyị nwetara akụkọ a, iri ụmụnna ise na abụọ nọ mkpọrọ. N’ime ndị a, e nwere ụmụnna nwoke asatọ dị ma o pekarịa mpe iri afọ asaa nakwa ụmụnna nwaanyị isii. E nwekwara ụmụnna atọ ndị ọ bụ kemgbe Septemba 24, 1994, ka a tụrụ ha mkpọrọ maka na ha jụrụ ịga agha. Aha ha bụ Paulos Eyassu, Isaac Mogos, na Negede Teklemariam.

Ihe karịrị ọkara n’ime ha bụ n’ụlọ mkpọrọ Meiter dị n’Asmara ka ha nọ. Ọ na-abụ ndị ọchịchị chọọ ịta ụfọdụ n’ime ụmụnna ndị a ahụhụ, ha etinye ha n’ime tank e gwunyere n’ala. Malite n’Ọktoba 2011 ruo n’Ọgọst 2012, ha tinyere ụmụnna iri abụọ na ise n’ime tank ahụ. N’oge okpomọkụ, ndị wọda na-ahapụ ha ka ha pụtatụ nara ikuku maka na ebe ahụ na-ekpo ajọ ọkụ. Ma, ha anaghị enye ụmụnna ndị ahụ nri na mmiri nke ọma, n’ihi ya, ahụ́ esighị ha ike. N’Ọgọst 2012, otu nwanna nwoke dị afọ iri isii na asatọ nwụrụ n’ihi arụrụala a na-arụsa ha. Aha ya bụ Yohannes Haile. I chetaranụ na Nwanna Misghina Gebretinsae nwụkwara otu ebe ahụ n’afọ 2011.