Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Ihe Ndị Mere n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

Ihe Ndị Mere n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

Ndị Uwe Ojii Nyere Aka Butuo Blọk

Na Jọjia, ụmụnna na-aga mgbakọ n’otu ụlọ ọrụ kara nká dị n’otu obodo a na-akpọ Kutaịsi kemgbe afọ iri na atọ. Ha na-eji wọtapruf ekpuchi elu ụlọ ahụ ka mmiri ghara ịna-ama ha. Ma ugbu a, ha enweela Ụlọ Nzukọ Alaeze e ji eme mgbakọ. Mgbe a na-arụ ya, ụmụnna iri ise nọ na-ebutu blọk n’ụgbọala mgbe ndị uwe ojii bịara ka ha mara ihe ha na-eme. Mgbe ha hụrụ otú ụmụnna ndị ahụ si jiri obi ụtọ na-arụ ọrụ, ha jara ha mma, nyekwara ha aka butuo blọk ndị ahụ. Ha gwara ha kpọọ ha ma e nwee onye nyere ha nsogbu. Ndị uwe ojii ahụ kwukwara na ha ga-abịa mgbakọ mbụ a ga-anọ n’Ụlọ Nzukọ ahụ nwee ma a rụchaa ya.

O Rere Ígwè Ya

E nwere otu nwanna onye Buruundi aha ya bụ Malachi. Ọ bụ okenye ọgbakọ. Ọ na-akọ ugbo, na-ejikwa ígwè ya ebu ibu. Mgbe a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, o kpebiri na ya ga na-aga ọrụ ebe ahụ kwa ụbọchị. Ma, olee ebe ọ ga-esi nweta ego ọ ga-eji na-enye ezinụlọ ya nri ọnwa abụọ ahụ a ga-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, ebe ọ bụ na ọ gaghị na-aga ọrụ nke ya? O rere ígwè ya, kee ego ya abụọ, nye nwunye ya otu ka o were na-azụta nri, were nke fọrọ tinye n’igbe onyinye. Ụmụnna ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze kụziiri ya ọrụ nke ọma n’ihi otú o si agba mbọ. Mgbe a rụchara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, ndị mmadụ malitere nyewe ya ọrụ ịrụ ụlọ n’ihi na a hụrụ na ịrụ ụlọ edoola ya anya. Ọ zụtakwalanụ ígwè ọzọ.

Ha Ji Obi Ụtọ Nyere Ụmụnna Aka

Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ime ime Malawi anaghị adị mfe. N’afọ ije ozi gara aga, e nwere ebe a rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụzọ e si aga ebe ahụ mebichara emebi. Ụmụnna anyị na-eji ụgbọala siri ezigbo ike si n’alaka ụlọ ọrụ anyị buru ihe e ji arụ ọrụ na-aga ebe ahụ. Ụmụnna ndị a na-arụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze a kwuru na obi dị ndị obodo ha ụtọ maka ụlọ a ha na-arụ. Ọtụtụ ndị na-abụghị ụmụnna na-abịa enyere ha aka, ụfọdụ na-arụgide ọrụ chi ejie. Ha na-eso ebu ájá, na-akụwa nkume, na-ebu simenti na gbamgbam. E nwedịrị mgbe ọnụ ọgụgụ ha na-aka nke ụmụnna. Ihe mere ndị obodo a ji tinye aka n’ọrụ a bụ na ha hụrụ otú Ndịàmà Jehova si agba mbọ na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ime obodo.

Ụmụ Ha Malitere Ire Swiit

E nwere otu nwanna nwoke ya na nwunye ya bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Kot Devụa. Ha na-amụrụ otu nwoke na ndị be ya ihe n’asụsụ Bete. Ụmụ ya dị iri. E mere ndokwa na a ga-enwe mgbakọ mbụ n’asụsụ Bete n’obodo a na-akpọ Daloa n’ọnwa Mee 2013. Nwoke a na ndị ezinụlọ ya chọkwara ịga. Ihe onye ọ bụla ga-akwụ iji gaa ma lọta bụ ihe dị ka narị naịra atọ. Ma, o nweghị ego ọ ga-eji gbaara ụmụ ya niile ụgbọ. Nwoke a chetara ihe ha ga-eme ka ha nweta ego ha ga-eji aga mgbakọ a. O nyere ada ya ihe dị ka otu narị naịra, gwa ya ka o jiri ya malite ime swiit ọ ga na-ere. Mgbe o rere swiit ndị ahụ, o nwetara ego ga-ezuru ya ịga mgbakọ. Nwoke ahụ nyeziri ụmụ ya ndị ọzọ ihe dị ka otu narị naịra otu narị naịra ka ha were na-eme swiit ha ga na-ere iji nweta ego ha ga-eji aga mgbakọ. Ha niile mechara soro ụmụnna gaa mgbakọ ahụ. Obi dị ha ezigbo ụtọ na ha gara mgbakọ ahụ e nwere n’asụsụ ha.