Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Nyefere Jehova

Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Nyefere Jehova

N’abalị iri abụọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2012, Ndịàmà Jehova nọ na Koria ji obi ụtọ nyefee Jehova ụlọ ndị ha rụrụ ọhụrụ nakwa ndị nke ha rụgharịrị n’alaka ụlọ ọrụ ha. Obi ha juru n’ọṅụ n’ihi na e chetaara ha otú ụmụnna anyị si jiri obi ha niile na-efe Jehova kemgbe otu narị afọ n’obodo ahụ. Afọ 2012 bụ nke mbụ ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nọ na Koria na-akarị otu narị puku. Ihe dị ka otu puku ụmụnna na narị abụọ bụ́ ndị Koria na narị ụmụnna abụọ na iri atọ na itoolu si mba itoolu rụrụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ a. Ihe ọhụrụ ndị ha rụrụ bụ ụlọ obibi, ebe a na-anọ ebi akwụkwọ, ebe a na-anọ ahụ maka ihe ndị a na-egere egere na vidio, nakwa ebe a na-edozi ụgbọala. Ha rụgharịkwara ọtụtụ ụlọ ndị ọzọ dị n’alaka ụlọ ọrụ ahụ.

Onye kwuru okwu e ji nyefee alaka ụlọ ọrụ a bụ Anthony Morris. O so n’Òtù Na-achị Isi. Puku ụmụnna atọ na iri atọ na asaa gere okwu ahụ. N’echi ya, e nwere nnọkọ pụrụ iche n’otu ụlọ ezumezu. E ji Ịntanet mee ka ụmụnna ndị nọ n’ihe karịrị otu puku ọgbakọ na narị atọ na Koria nụ ihe e kwuru ná nnọkọ ahụ. Ndị niile gere okwu ahụ ma ụmụnna ma ndị ọzọ dị otu narị puku na puku iri na ise na narị asaa na iri asatọ na abụọ.

Ndịàmà Jehova nọ na Laịberịa agaghị echefu abalị itoolu n’ọnwa Mach afọ 2013 echefu. Ọ bụ ụbọchị ahụ ka e nyefere Jehova ụlọ ndị ha rụgharịrị nakwa ndị nke ha rụrụ ọhụrụ n’alaka ụlọ ọrụ ha. Ụmụnna ndị si mba iri na otu bịakwara ya. Obi dị mmadụ niile ụtọ mgbe Guy Pierce, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu e ji nyefee alaka ụlọ ọrụ ahụ. I chetaranụ na a lụrụ agha na Laịberịa ihe karịrị afọ iri. Agha ahụ mere ka a ghara ịrụcha ọrụ ahụ otú a tụburu anya ya. Otu n’ime ala ebe a rụrụ ụlọ ọhụrụ bụ ala dị n’akụkụ alaka ụlọ ọrụ ahụ, bụ́ ebe ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru na-ezobu. E nwekwara mgbe ndị gbara ọsọ ndụ bi ebe ahụ. Ụmụnna ndị na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ a dị iri ise na otu. Obi dị ha ezigbo ụtọ maka na ihe ọhụrụ a rụụrụ ha bụ ụlọ obibi nwere ọnụ ụlọ iri atọ na ise, ọfis ndị ọhụrụ, ebe a na-ebusa akwụkwọ, ebe a na-anọ arụzi ihe ndị mebiri emebi, ebe a na-anọ esi nri na ebe a na-anọ eri nri.

Ndị Jọjia ejighị ife Chineke egwu egwu. Mgbe Sọviet Yuniọn dara, Jọjia nweere onwe ya, ọtụtụ ndị ghọkwara Ndịàmà Jehova. O teghịkwa aka, a malite ịkpagbu ha. Ma, a naghịzi akpagbu ha nke otú ahụ. N’abalị isii n’ọnwa Eprel afọ 2013, ihe ụmụnna anyị nọ na Jọjia na-agaghị echefu echefu mere. N’ụbọchị ahụ, David Splane, onye so n’Òtù Na-achị Isi, nyefere Jehova ụlọ ndị a rụnyere n’alaka ụlọ ọrụ dị n’obodo ahụ. Ụlọ ndị ọzọ ọ raara nye bụ otu Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ na ebe ndị bịara Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze nakwa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị na Nwunye Ha ga na-aga akwụkwọ. Ndị gere okwu Nwanna Splane bụ narị ụmụnna atọ na iri atọ na asatọ, bụ́ ndị si obodo iri abụọ na anọ, nakwa ihe karịrị narị ụmụnna asatọ bụ́ ndị Jọjia.

Jọjia

N’echi ya, Nwanna Splane kwuru okwu pụrụ iche. E ji Ịntanet mee ka puku ụmụnna iri na ise na narị abụọ nọ n’ọgbakọ dị iche iche gere okwu ahụ. Obi tọrọ ụmụnna anyị ụtọ n’ihi ụmụnna ndị ahụ si mba ofesi bịa. Otu nwanna nwoke sịrị, “Ugbu a ka m matara otú ụwa ọhụrụ ga-adị.”

N’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Jun afọ 2013, e nyefere Jehova ụlọ elu a rụrụ ọhụrụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Yọngọn, bụ́ isi obodo Mianmaa. Guy Pierce, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu e ji nyefee alaka ụlọ ọrụ a. Ndị gere okwu ya dị otu puku na iri na atọ, ụfọdụ n’ime ha si mba iri na otu ọzọ bịa. E nwere ụmụnna ndị gara n’ọdụ ụgbọelu ka ha nabata ụmụnna ndị si mba ofesi na-abịa. Ihe e dere n’akwụkwọ ha ji bụ “Ndịàmà Jehova, Nnọọnụ.” Mgbe ha nọ ebe ahụ, otu nwoke bịakwutere ha, jụọ ha ma ọ̀ bụ ndị na-abịa ịgbara mmadụ àmà ma ọ bụ akaebe n’ụlọikpe ka ha na-eche. Ha gwara ya na ọ bụ ndị enyi ha ka ha na-eche. Ya ajụzie ha onye bụ́ Jehova. Ha ji ohere ahụ zie ya ozi ọma. Nwoke a jụrụ ha ihe a n’ihi na a machiri ọrụ Ndịàmà Jehova n’obodo ha, ọ maghịkwa banyere ha. N’ụbọchị na-eso ụbọchị a raara ụlọ ahụ nye Jehova, e nwere nnọkọ pụrụ iche n’ụlọ ezumezu ndị Mianmaa. Isiokwu okwu Nwanna Pierce kwuru bụ “Jiri Obi Na-aghọta Ihe Na-efe Jehova.” Puku ụmụnna abụọ na narị itoolu na iri isii na atọ nọ n’ebe isii dị iche iche na Mianmaa gere okwu ahụ na telefon. Otu ọkwọ ụgbọala bugara ụfọdụ ụmụnna n’ebe ha gara nnọkọ ahụ na Yọngọn, sịrị: “Achọpụtara m na unu adịghị eme ka ndị chọọchị ndị ọzọ. Unu na-akpa àgwà ọma, na-eji ejiji dị mma, dịkwa obiọma. Ahụtụbeghị m ndị dị ka unu.”

Mianmaa: Ebe ụmụnna ndị Mianmaa na-anabata ndị na-abịa maka alaka ụlọ ọrụ a na-aga inyefe Jehova

Ọṅụ juru ụmụnna ndị nọ na Mọldova obi n’abalị atọ n’ọnwa Julaị afọ 2013. N’ụbọchị ahụ, Stephen Lett, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu e ji nyefee Jehova ụlọ ọhụrụ ndị ha rụnyere n’alaka ụlọ ọrụ ha. Ihe ndị ha rụrụ ọhụrụ bụ otu ụlọ elu dị okpukpu atọ nwere ọnụ ụlọ iri na ebe a na-adọwa akwụkwọ nakwa Ụlọ Nzukọ Alaeze dị okpukpu abụọ. Ọgbakọ asaa na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze a. Obi dị ụmụnna iri atọ na atọ na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ ụtọ ịnabata ụmụnna ndị si mba dị iche iche bịa. Ụmụnna ndị ahụ si Amerịka, Ayaland, Jamanị, Nedalandz, Romenịa, Rọshịa, na Yukren. Ụmụnna ndị ji obi ha niile fee Jehova mgbe a machiri ọrụ Ndịàmà Jehova na Mọldova bịakwara nnọkọ a. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ji aka na-edepụta ihe dị n’akwụkwọ anyị, na-ekesakwara ya ụmụnna ndị ọzọ n’oge ahụ. Ụfọdụ n’ime ndị bịara nnọkọ a bụ ndị a chụgara ha na nne ha na nna ha Saịberia mgbe ndị Sọviet Yuniọn na-akpagbu Ndịàmà Jehova. Na Sọnde abalị asaa n’ọnwa Julaị 2013, e nwere nnọkọ pụrụ iche nke puku mmadụ iri na anọ na narị asaa na ise bịara. Ụmụnna enwetụbeghị nnọkọ ọnụ ọgụgụ ndị bịara ya ruru otú a na Mọldova. A sụgharịrị okwu ahụ Nwanna Lett kwuru n’asụsụ Romenian nakwa n’asụsụ Rọshịan.

Na-ekpe Ekpere Mgbe Niile, Adakwala Mbà

Jizọs gwara anyị ka anyị ‘na-ekpe ekpere mgbe niile, gharakwa ịda mbà.’ (Luk 18:1) Okwukwe anyị na-esikwu ike ma anyị na-agwa Chineke otú obi dị anyị. N’ihi ya, ‘na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị,’ ‘nọgidesiekwa ike n’ekpere.’ (1 Tesa. 5:17; Rom 12:12) Ka ị na-eme otú ahụ, ‘ka Chineke nke udo jiri ihe ọma niile kwadebe gị ime uche ya. Ka o si n’aka Jizọs Kraịst na-arụ ihe ahụ dị mma n’anya ya n’ime gị.’—Hib. 13:20, 21.